Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fg ihe ọmụmụ 12 ajụjụ 1-5
  • Olee Otú Ị Ga-esi Bịaruo Chineke Nso?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ị Ga-esi Bịaruo Chineke Nso?
  • Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú I Nwere Ike Isi Bịaruo Chineke Nso?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Otú Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
fg ihe ọmụmụ 12 ajụjụ 1-5

ISI NKE 12

Olee Otú Ị Ga-esi Bịaruo Chineke Nso?

1. Chineke ọ̀ na-anụ ekpere niile?

Nwoke na-ekpe ekpere

Chineke chọrọ ka ụdi mmadụ niile bịaruo ya nso. Otú ha ga-esi eme ya bụ ikpegara ya ekpere. (Abụ Ọma 65:2) Ma, ọ bụghị ekpere niile ka ọ na-anụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwoke na-emegbu nwunye ya, Chineke nwere ike ghara ịna-anụ ekpere ya. (1 Pita 3:7) Mgbe ụmụ Izrel kpọchiri ntị na-eme ihe ọjọọ, Chineke egeghị ntị n’ekpere ha. N’eziokwu, ọ bụ ùgwù ka Chineke kwanyeere anyị, hapụ anyị ka anyị na-ekpeku ya ekpere. Ma, ọ bụrụ na mmadụ mere ezigbote mmehie ma chegharịa, Chineke ga-anụ ekpere ya.​—Gụọ Aịzaya 1:15; 55:7.

Lee vidio bụ́ Chineke Ọ̀ Na-aza Ekpere Niile?

2. Olee otú anyị kwesịrị isi kpegara Chineke ekpere?

Ekpere bụ otu n’ime ụzọ anyị si efe Chineke. N’ihi ya, ọ bụ naanị Jehova, Onye kere anyị, ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere. (Matiu 4:10; 6:9) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị kwesịrị ikpegara Chineke ekpere n’aha Jizọs n’ihi na Jizọs nwụrụ maka mmehie anyị. (Jọn 14:6) Jehova achọghị ka ekpere anyị bụrụ nke anyị bu n’isi ma ọ bụ nke e dere n’akwụkwọ. Kama, ọ chọrọ ka anyị na-agwa ya ihe si anyị n’obi.​—Gụọ Matiu 6:7; Ndị Filipaị 4:6, 7.

Chineke na-anụdị ekpere anyị kpere n’ime obi anyị. (1 Samuel 1:12, 13) Ọ gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere mgbe niile. Anyị nwere ike ikpe ekpere mgbe anyị chọrọ ịlaba, mgbe anyị tetara, mgbe anyị chọrọ iri nri, nakwa mgbe nsogbu bịaara anyị.​—Gụọ Abụ Ọma 55:22; Matiu 15:36.

3. Gịnị mere Ndị Kraịst ji ezukọta amụ Okwu Chineke?

Ndị na-agụ Baịbụl n’ọmụmụ ihe

Ịbịaru Chineke nso adịghị mfe n’ihi na anyị bi n’ụwa ebe ọtụtụ ndị na-ekweghị na Chineke. A gwa ha na Chineke kwere nkwa iweta udo n’ụwa a, ha ejiri ya mere ihe ọchị. (2 Timoti 3:1, 4; 2 Pita 3:3, 13) N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị na Ndị Kraịst ibe anyị na-ezukọ, ka anyị nwe ike ịna-agbarịta ibe anyị ume.​—Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.

Ọ bụrụ na anyị na ndị hụrụ Chineke n’anya abụrụ enyi, ha ga-enyere anyị aka ịbịaru Chineke nso. N’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ị ga-ahụ ndị nwere okwukwe na Chineke. Ha ga-enyekwara gị aka ka okwukwe i nwere na Chineke sikwuo ike.​—Gụọ Ndị Rom 1:11, 12.

4. Olee otú ị ga-esi bịaruo Chineke nso?

Nwoke na-agụ Baịbụl n’oge ọ na-ezu ike

Ihe ga-enyere gị aka ịbịaru Jehova nso bụ ichebara ihe ndị ị mụtarala n’Okwu ya echiche. Chebara ihe ndị Chineke na-eme echiche, chebara ndụmọdụ ya echiche, ya na nkwa ndị o kwere. Ikpe ekpere na ichebara ihe ndị a echiche ga-eme ka anyị ghọtakwuo otú Chineke hụruru anyị n’anya nakwa ụdị amamihe o nwere.​—Gụọ Jọshụa 1:8; Abụ Ọma 1:1-3.

Ọ bụrụ na i nwere okwukwe na Chineke, ị ga-abịaru ya nso. Ma, i kwesịrị ịna-eme ka okwukwe gị na-esikwu ike. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-echebara ihe ndị e ji Baịbụl kụziere gị echiche.​—Gụọ Matiu 4:4; Ndị Hibru 11:1, 6.

5. Olee uru ịbịaru Chineke nso ga-abara gị?

Jehova anaghị eji ndị hụrụ ya n’anya egwu egwu. Ọ na-enyere ha aka ka ha ghara ime ihe ọ bụla ga-eme ka okwukwe ha nyụọ ka ọkụ. Ọ chọghịkwa ka ndụ ebighị ebi o kwere ha ná nkwa kwaa ha. (Abụ Ọma 91:1, 2, 7-10) Ọ na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ibi ụdị ndụ nwere ike ịkpatara anyị ọrịa ma ọ bụ nke ga-eme ka anyị ghara inwe obi ụtọ. Jehova na-akụziri anyị otú kacha mma anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ.​—Gụọ Abụ Ọma 73:27, 28; Jems 4:4, 8.

Ndị na-atụrụ ndụ

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?, isi nke 17.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya