Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yc ihe ọmụmụ 1 p. 4-5
  • Ihe A Na-amabughị Chineke Mere Ka Anyị Mara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe A Na-amabughị Chineke Mere Ka Anyị Mara
  • Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Nzuzo I Nwere Ike Ịkọrọ Ndị Ọzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2018
  • Ihe Nzuzo Ndị Kraịst Na-agaghị Anwa Anwa Idebe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Otu Ihe Omimi Dị Nsọ Amalite Imeghe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Kụziere Ụmụ Gị Ihe
yc ihe ọmụmụ 1 p. 4-5
Ebe ndị mmụọ ozi na-ege ntị ka Jizọs na-akụziri ndị mmadụ gbasara Alaeze Chineke

ISI NKE 1

Ihe A Na-amabughị Chineke Mere Ka Anyị Mara

Ò nwetụla ihe mmadụ gwara gị, sị gị agwakwala ya onye ọzọ?—a E nwere ike ikwu na ihe ahụ bụ ihe nzuzo. E nwere ihe Baịbụl kpọrọ “ihe nzuzo dị nsọ.” Ihe mere o ji kpọọ ya ihe dị nsọ bụ na o si n’aka Chineke. Ihe mere o ji kpọọkwa ya ihe nzuzo bụ na ndị mmadụ amabughị ya. Ndị mmụọ ozi chọkwara ịma ihe ahụ. Ị̀ chọrọ ịma ihe ihe ahụ bụ?—

Gịnị ka ì chere ndị mmụọ ozi a chọrọ ịma?

N’oge ochie mgbe Chineke kere ụwa, o kere nwoke mbụ na nwaanyị mbụ. Aha ha bụ Adam na Iv. Chineke nyere ha ebe mara mma ha bi. Ebe ahụ bụ ogige Iden. A sị na Adam na Iv mere ihe Chineke gwara ha, ha na ụmụ ha gaara eme ka ụwa niile maa mma ka ogige Iden. Ha gakwaara ebi na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ì chetara ihe Adam na Iv mere?—

Adam na Iv mere ihe Chineke sị ha emela. Ọ bụ ya mere na anyị ebighị na paradaịs ugbu a. Ma, Chineke sịrị na ya ga-eme ka ụwa niile maa mma. Ndị ga-ebi na ya ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Olee otú Chineke ga-esi eme ihe a niile? Ruo ọtụtụ afọ, ndị mmadụ amaghị otú ọ ga-esi eme ihe a. Chineke agwaghị ya onye ọ bụla.

Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ọ kụzikwuuru ndị mmadụ banyere ihe ahụ ha na-amabughị. Ọ gwara ha na ọ gbasara Alaeze Chineke. Jizọs gwara ndị mmadụ ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze ahụ bịa. Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.

Obi ọ̀ dị gị ụtọ maka ihe a Chineke mere ka anyị mara?— Cheta na ọ bụ naanị ndị na-eme ihe Jehova gwara anyị mee ga-ebi na Paradaịs. Baịbụl kwuru na e nwere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị rubeere Jehova isi. Ị̀ chọrọ ịma banyere ha?— Ka anyị mụọ banyere ụfọdụ n’ime ha. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi na-eme ka ha.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ

  • Mak 4:11

  • 1 Pita 1:12

  • Jenesis 1:26-28; 2:8, 9; 3:6, 23

  • Matiu 6:9, 10

  • Abụ Ọma 37:11, 29

a N’ọtụtụ ebe n’akwụkwọ a, ị ga-ahụ ebe a kara akara a (—) n’ebe a jụrụ ajụjụ. I ruo ebe ahụ, cheretụ ka nwatakịrị ị na-akụziri ihe zaa ajụjụ ahụ.

AJỤJỤ:

  • Gịnị mere na ụwa a abụghị paradaịs ugbu a?

  • Olee ihe nzuzo Baịbụl kwuru okwu ya?

  • Gịnị ka Jizọs kụziiri ndị mmadụ banyere ihe ahụ ha na-amabughị?

  • Gịnị ka ị ga-eme ka i wee biri na Paradaịs?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya