Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yc ihe ọmụmụ 5 p. 12-13
  • Samuel Akwụsịghị Ime Ihe Dị Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Samuel Akwụsịghị Ime Ihe Dị Mma
  • Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Samuel Nọgidere Na-eme Ihe Ziri Ezi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Nwatakịrị Nke Na-ejere Chineke Ozi
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • O “Wee Na-eto n’Ebe Jehova Nọ”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • O “Wee Na-eto n’Ebe Jehova Nọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Kụziere Ụmụ Gị Ihe
yc ihe ọmụmụ 5 p. 12-13

ISI NKE 5

Samuel Akwụsịghị Ime Ihe Dị Mma

N’oge ochie, ndị mmadụ na-aga efe Jehova n’ụlọikwuu. Samuel malitere ibi na ya mgbe ọ bụ nwatakịrị. Ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ na-arụ ọrụ. Ị̀ ma otú Samuel si gaa biri ebe ahụ? Ka anyị buru ụzọ kwuo gbasara mama ya. Aha ya bụ Hana.

Mgbe Hana lụrụ di, ọ nọrọ ọtụtụ afọ n’amụghị nwa. Ma, ọ chọrọ ịmụta nwa. N’ihi ya, ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya nwa. O kwere Jehova nkwa na ọ bụrụ na ya amụta nwa nwoke, na ya ga-akpọta ya n’ụlọikwuu ka o biri ebe ahụ, na-arụkwa ọrụ ebe ahụ. Jehova zara ekpere ya. Ya amụta nwa nwoke, gụọ ya Samuel. Hana mekwara ihe o kwere Jehova ná nkwa. Mgbe Samuel dị ihe dị ka afọ anọ, ọ kpọgara ya n’ụlọikwuu ka o biri ebe ahụ na-ejere Chineke ozi.

N’ụlọikwuu, a na-enwe onye ọrụ ya bụ ịchụrụ Jehova àjà. A na-akpọ ya nnukwu onye nchụàjà. Onye bụ nnukwu onye nchụàjà mgbe Samuel bịara n’ụlọikwuu bụ Ilaị. Ụmụ ya ndị nwoke abụọ na-arụkwa ọrụ n’ebe ahụ. Ì chetara na ụlọikwuu bụ ebe a na-anọ efe Chineke? N’ihi ya, ndị mmadụ kwesịrị ịna-eme ihe dị mma n’ebe ahụ. Ma, ụmụ Ilaị anaghị eme ihe dị mma. Samuel makwa na ihe ha na-eme adịghị mma. Samuel ò so ha mewe ihe na-adịghị mma?— Mba. Ọ nọgidere na-eme ihe dị mma, otú ahụ mama ya na papa ya kụziiri ya.

Gịnị ka i chere Ilaị kwesịrị ime ụmụ ya abụọ ahụ?— O kwesịrị ịta ha ahụhụ. O kwesịghị ịhapụ ha ka ha ka na-arụ ọrụ n’ụlọ Chineke. Ma, ọ hapụrụ ha. Iwe were Jehova, ya ekpebie na ya ga-ata ma Ilaị ma ụmụ ya abụọ ahụ ahụhụ.

Ebe Samuel na-agwa Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ilaị okwu

Samuel ziri Ilaị ozi Jehova ziri ya

Otu ụbọchị, mgbe Samuel na-ehi ụra n’abalị, ọ nụrụ ka a kpọrọ ya: ‘Samuel!’ Ya agbara ọsọ gakwuru Ilaị. Ma, ọ gwara ya na ya akpọghị ya. A kpọkwara ya òkù a ọzọ, ya agakwurukwa Ilaị. Ma, ọ gwakwara ya na ya akpọghị ya. Mgbe ọ gara nke ugboro atọ, Ilaị gwara ya na ọ bụrụ na a kpọọ ya ọzọ, ya sị: ‘Jehova biko kwuwe; m na-ege ntị.’ Ọ bụ ihe a ka Samuel kwuru mgbe a kpọrọ ya ọzọ. Mgbe o kwuru ihe a, Jehova asị ya: ‘Gwa Ilaị na m ga-ata ya na ndị ezinụlọ ya ahụhụ maka ihe ọjọọ ha na-eme.’ Ì chere na izi Ilaị ozi a dịịrị Samuel mfe?— Mba. O mechara zie Ilaị ozi ahụ n’agbanyeghị na ọ mabughị otú ọ ga-esi zie ya ya. Jehova mekwara ihe ahụ o kwuru. E gburu ụmụ Ilaị abụọ ahụ, Ilaị mechakwara nwụọ.

E nwere ezigbo ihe anyị ga-amụta n’aka Samuel. Mgbe ọ hụrụ na ndị ọzọ na-eme ihe na-adịghị mma, ọ kwụsịghị ime ihe dị mma. Ọ bụrụ gịnwa, gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga na-eme ihe dị mma otú ahụ Samuel mere? Ọ bụrụ na ị kwụsịghị ime ihe dị mma, ị ga-eme Jehova obi ụtọ, meekwa papa gị na mama gị.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ

  • 1 Samuel 2:22-26; 3:1-21

AJỤJỤ:

  • Olee nkwa mama Samuel kwere Jehova?

  • Gịnị ka Samuel ma na ụmụ Ilaị na-eme n’ụlọikwuu?

  • Gịnị ka Jehova gwara Samuel ka o mee?

  • Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-eme ka Samuel?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya