Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yc ihe ọmụmụ 9 p. 20-21
  • Jeremaya Akwụsịghị Ịgwa Ndị Mmadụ Ihe Jehova Kwuru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jeremaya Akwụsịghị Ịgwa Ndị Mmadụ Ihe Jehova Kwuru
  • Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Zigara Jeremaya Ka O Kwusaa Okwu Ya
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Gwa Ha Okwu A”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Kụziere Ụmụ Gị Ihe
yc ihe ọmụmụ 9 p. 20-21

ISI NKE 9

Jeremaya Akwụsịghị Ịgwa Ndị Mmadụ Ihe Jehova Kwuru

Ebe ọtụtụ ndị iwe ji gbara Jeremaya okirikiri

Gịnị mere ihe Jeremaya na-ekwu ji ewe ndị a iwe?

Ebe a na-adọpụta Jeremaya n’olulu apịtị miri emi

Jehova nyeere Jeremaya aka, ya apụta n’olulu a

Oge ụfọdụ, ndị mmadụ na-achị anyị ọchị ma ọ bụ wee iwe ma anyị chọọ izi ha ozi ọma. Ụdị ihe a nwere ike ime ka ike ịga ozi ọma gwụ anyị. Ò nweela mgbe mmadụ chịrị gị ọchị, gị asị na ị chọghịzi ịga ozi ọma?— Baịbụl kọrọ gbasara otu nwa okorobịa hụrụ Jehova n’anya. Aha ya bụ Jeremaya. Ọ fọrọ obere ka ọ kwụsị ịgwa ndị mmadụ banyere Jehova. Ka anyị mụọ gbasara Jeremaya.

Mgbe Jeremaya bụ nwa okorobịa, Jehova gwara ya ka ọ gwa ndị Izrel ka ha kwụsị ime ihe ọjọọ. Ịgwa ndị mmadụ ihe a siiri Jeremaya ike, ụjọ tụkwara ya. Ọ bụ ya mere o ji gwa Jehova, sị: ‘Amaghị m ihe m ga-agwa ha. Abụ m nwatakịrị.’ Ma, Jehova sịrị ya: ‘Atụla ụjọ. M ga-enyere gị aka.’

Ihe a Jehova gwara Jeremaya mere ka ọ malite ịgwa ndị mmadụ na Jehova ga-ata ha ahụhụ ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị ime ihe ọjọọ. Ì chere na ha mere ihe Jeremaya gwara ha?— Mba. Ụfọdụ nọ na-achị ya ọchị, ebe iwe were ndị ọzọ. O nwedịrị ndị nke chọrọ igbu ya. Olee ihe i chere Jeremaya mere mgbe ha nọ na-eme ihe a niile?— Ụjọ bịara ya, ya ekwuo na ya ga-akwụsị ịgwa ndị mmadụ ihe Jehova kwuru. Ma, ọ̀ kwụsịrị?— Mba. Ọ kwụsịghị ịgwa ha ihe Jehova kwuru n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya. Jehova ekweghịkwa ka ihe ọ bụla mee ya maka na ọ kwụsịghị ịgwa ha ihe o kwuru.

Dị ka ihe atụ, o nwere ụbọchị ndị iro Jeremaya tụbara ya n’olulu apịtị. E nweghị nri ọ ga-eri ma ọ bụ mmiri ọ ga-aṅụ. Ha chọrọ ka ọ nọrọ ebe ahụ nwụọ. Ma, Jehova nyeere ya aka, ya esi ebe ahụ pụta.

Gịnị ka ị mụtara n’aka Jeremaya?— Ọ bụ eziokwu na e nwere mgbe ụjọ tụrụ ya, ma ọ kwụsịghị ịgwa ndị mmadụ ihe Jehova kwuru. I ziwe ndị mmadụ ozi ọma, ha nwere ike chịwa gị ọchị ma ọ bụkwanụ wewe iwe. Ha mee otú a, ihere izi ndị mmadụ ozi ọma nwere ike mewe gị ma ọ bụkwanụ gị atụwa ụjọ. Ekwekwala ka ụdị ihe a mee ka ị kwụsị izi ndị mmadụ ozi ọma. Jehova ga-enyere gị aka otú ahụ o nyeere Jeremaya.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ

  • Jeremaya 1:4-8; 20:7-9; 26:8-19, 24; 38:6-13

AJỤJỤ:

  • Gịnị ka Jehova gwara Jeremaya ka o mee?

  • Olee ihe mere o ji fọ obere ka Jeremaya kwụsị ịgwa ndị mmadụ ihe Jehova kwuru?

  • Olee otú Jehova si nyere Jeremaya aka?

  • Gịnị ka ị mụtara n’aka Jeremaya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya