Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hf nkebi 7 p. 22-25
  • Otú Unu Ga-esi Na-azụ Nwa Unu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Unu Ga-esi Na-azụ Nwa Unu
  • Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1 MEE KA Ọ DỊRỊ NWA GỊ MFE ỊNA-AGWA GỊ OKWU
  • 2 GHỌTA IHE HA BU N’OBI
  • 3 JIKỌỌNỤ AKA ỌNỤ
  • 4 HAZIENỤ OTÚ UNU GA-ESI ZỤỌ ỤMỤ UNU
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Bible Ọ̀ Pụrụ Inyere Gị Aka Ịzụ Ụmụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ịzulite Ezinụlọ Siri Ike N’ụzọ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
hf nkebi 7 p. 22-25
Ebe otu nna na nwa ya na-emezi ígwè ha

ISIOKWU NKE 7

Otú Unu Ga-esi Na-azụ Nwa Unu

“Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị; kụnye ha n’ime ụmụ gị.”—Diuterọnọmi 6:6, 7

Mgbe Chineke malitere ezinụlọ, o nyere ndị nne na nna ọrụ ịzụ ụmụ ha. (Ndị Kọlọsi 3:20) N’ihi ya, ọ bụ nne na nna ka ọ dịịrị ịzụ nwa ha ka ọ hụ Jehova n’anya. Ha kwesịrị ịzụ ya ka ọ ghọọ ezigbo mmadụ mgbe o toro. (2 Timoti 1:5; 3:15) Ha kwesịkwara ịma ihe dị nwa ha n’obi. Ị manụ na ọ na-abụ nne ehi na-ata ahịhịa, nwa ya ana-ele ya anya n’ọnụ. N’ihi ya, nne na nna kwesịrị ibu ụzọ hụ Jehova n’anya tupu ha akụziwere nwa ha ka ọ hụ ya n’anya.—Abụ Ọma 40:8.

1 MEE KA Ọ DỊRỊ NWA GỊ MFE ỊNA-AGWA GỊ OKWU

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) I kwesịrị ịna-akpa àgwà otú ga-eme ka ọ dịrị ụmụ gị mfe ịna-agwa gị ihe dị ha n’obi. Ụmụ gị kwesịrị ịma na ị ga-ege ha ntị mgbe ọ bụla ha chọrọ ịgwa gị ihe. Na-eme ka ahụ́ ruo ha ala ka ha nwee ike ịgwa gị ihe dị ha n’obi. (Jems 3:18) Ọ bụrụ na ụmụ gị ma na ị ga-akatọ ha ma ọ bụ baara ha mba ma ha gwawa gị okwu, ha nwere ike ghara ịna-agwa gị ihe dị ha n’obi. N’ihi ya, na-enwere ha ndidi, na-emekwara ha ihe na-egosi na ị hụrụ ha n’anya.—Matiu 3:17; 1 Ndị Kọrịnt 8:1.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Ekwela ka ọ na-esiri ụmụ gị ike ịgwa gị okwu

  • Gbalịa ka gị na ụmụ gị na-ekwurịta okwu mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe ha dabara ná nsogbu

2 GHỌTA IHE HA BU N’OBI

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye na-egosi na ya nwere nghọta n’okwu ga-enweta ihe ọma.” (Ilu 16:20) Ọ bụrụ na nwa gị agwa gị okwu, i kwesịrị ịgba mbọ ka ị ghọta ihe mere o ji kwuo ihe o kwuru. Ụmụaka na-etinyekarị nnu na ose n’ihe ha na-ekwu. Oge ụfọdụ, ihe ha kwuru anaghị abụcha ihe ha chọrọ ikwu. Ma, cheta na Baịbụl sịrị: “Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu.” (Ilu 18:13) N’ihi ya, ewela iwe ma nwa gị kwuo ihe ị na-aghọtachaghị.—Ilu 19:11.

Ebe otu nne na-ewe oké iwe n’ihi ihe nwa ya nwaanyị kwuru

IHE I NWERE IKE IME:

  • N’agbanyeghị ihe nwa gị na-agwa gị, abachila ya ọnụ, hapụ ya ka o kwuchaa ihe dị ya n’obi

  • Cheta otú obi na-adị gị mgbe ị ha ka ya na ihe ndị i ji kpọrọ ihe mgbe ahụ

3 JIKỌỌNỤ AKA ỌNỤ

IHE BAỊBỤL KWURU: “Nwa m, ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” (Ilu 1:8) Ọ bụ nne na nna ka Jehova gwara ka ha na-azụ ụmụ ha. Unu kwesịrị ịkụziri ụmụ unu ka ha na-erubere unu isi. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ụmụaka na-ama ma nne ha na nna ha hà nwere otu olu n’otú ha si azụ ha. (1 Ndị Kọrịnt 1:10) Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ekwekọrịtaghị n’ihe ụfọdụ gbasara otú unu si azụ ụmụ unu, unu ekwesịghị ime ka ha mara. Ọ bụrụ na ha amata, ha nwere ike ledawa unu anya.

Ebe otu nna kpọpụrụ nwa iche n’ebe mama ya na nwanne ya nwoke nọ na-adọ ya aka ná ntị

IHE I NWERE IKE IME:

  • Kwekọrịtanụ otú unu ga-esi na-azụ ụmụ unu

  • Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị enweghị otu olu n’ihe ụfọdụ gbasara otú unu si azụ ụmụ unu, gee ya ntị ka ị mata ihe mere na o kwetaghị ihe ị na-ekwu

4 HAZIENỤ OTÚ UNU GA-ESI ZỤỌ ỤMỤ UNU

IHE BAỊBỤL KWURU: “Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị.” (Ilu 22:6) Nwa gị agaghị aba uru ma ọ bụrụ na ị zụghị ya nke ọma. N’ihi ya, unu kwesịrị ịhazi otú unu ga-esi na-azụ ụmụ unu. Cheta na unu kwesịkwara ịna-adọ ha aka ná ntị. (Abụ Ọma 127:4; Ilu 29:17) Ma, ọ bụghị mgbe niile ka e kwesịrị ịta nwatakịrị ahụhụ ma a dọwa ya aka ná ntị. Unu kwesịrị ime ka ha ghọta ihe mere unu ji nye ha iwu. (Ilu 28:7) Kụzierenụ ha ka ha nwee mmasị n’Okwu Jehova, ka ha na-emekwa ihe ha mụtara na ya. (Abụ Ọma 1:2) Ime otú a ga-enye aka zụọ akọnuche ha nke ọma.—Ndị Hibru 5:14.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Nyere ụmụ gị aka ka ha mata Chineke, matakwa na ha kwesịrị ịtụkwasị ya obi

  • Nyekwara ha aka ka ha mata ihe ndị nwere ike ime ka ha tinye aka n’omume rụrụ arụ nakwa otú ha ga-esi na-ezere ha. Kụziere ha ihe ha ga-eme ma mmadụ chọọ ka ha na ya nwee mmekọahụ

Ebe nne na nna na-akụziri nwa ha nwoke ife Jehova malite na nwata ruo mgbe o mere baptizim

“Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị”

JEHOVA GA-AGỌZI MBỌ Ị NA-AGBA

Chineke nyere nne na nna ọ bụla ọrụ gbara ọkpụrụkpụ. Ọrụ ahụ bụ ịkụziri ụmụ ha ka ha na-eche echiche otú Jehova si eche echiche. (Ndị Efesọs 6:4) Jehova ma na ọrụ ahụ adịghị mfe. Ma, ọ bụrụ na ị zụọ nwa gị nke ọma, ọ ga-ewetara Chineke otuto, meekwa gịnwa obi ụtọ.—Ilu 23:24.

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A . . .

  • Gịnị ka m ga-eme ka ọ dịrị nwa m mfe ịna-agwa m ihe ọ bụla dị ya n’obi?

  • Olee ihe m ga-amụta n’otú nne na nna ndị ọzọ si azụ ụmụ ha?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya