Abụ 141
Na-achọ Ndị Udo
(Luk 10:6)
Jizọs nyer’iwu k’e kwus’a ozi ọma.
Ma n’ọkọchị ma n’oge oyi,
O kwusar’okwu Jehova.
Ọ hụr’atụrụ Chineke n’anya.
Si n’ụtụtụ
ruo n’abalị, ọ n’aga chọọ ha.
N’ụlọ n’ụlọ, n’okpor’ámá,
A’yị n’akọrọ ’madụ niile
N’o ruwel’oge nsogbu niile g’ebi.
(KORỌS)
N’ụwa niile,
A’yị n’achọ ndị udo n’ebe niile.
K’anyị chọta
Ndị chọrọ k’a zọpụta ha.
K’ony’ọ bụla
Nụ ozi ọm’anyị.
A’yị n’achọkwu ha; oge adịghịzi.
Anyị chọta naanị otu onye,
A’yị chọrọ k’a zọpụta ya.
A’yị n’agaghachi n’ih’ịhụnanya.
A’yị n’eme ka ndị obi gbawara
nwet’onwe ha.
A’yị n’achọ ha n’ebe niile.
A’yị hụ ndị chọr’ịnụ ozi ọma,
Obi ụtọ n’eme k’ike ghar’ịgwụ anyị.
(KORỌS)
N’ụwa niile,
A’yị n’achọ ndị udo n’ebe niile.
K’anyị chọta
Ndị chọrọ k’a zọpụta ha.
K’ony’ọ bụla
Nụ ozi ọm’anyị.
(Gụọkwa Aịza. 52:7; Mat. 28:19, 20; Luk 8:1; Rom 10:10.)