Abụ 146
Unu Meere M Ya
Atụrụ ọzọ nke Kraịst so ndị e tere ’manụ,
bụ́ ndị Jizọs g’alụ, n’arụk’ọrụ ọnụ.
Jizọs Kraịst g’akwụ anyị ụgwọ
mak’ilekọta
ndị e tere ’manụ n’ịkasi h’obi.
(KORỌS)
“Unu kasie h’obi, unu kasiri m.
Ihe unu meere ha, unu meere m ya.
Ọ bụ m k’unu gbaara mbọ unu gbaara ha.
Unu meere ha, unu meere m ya.
Ihe unu meere ha, unu meere m ya.”
“Unu nyere mụ nri n’oge niil’agụụ ji m,
Unu dum gbokwaara m mkpa m ọ bụla.”
Ha g’ajụ ya mgbe ha ji
meere y’ihe ndị a.
Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst g’asịkwa ha:
(KORỌS)
“Unu kasie h’obi, unu kasiri m.
Ihe unu meere ha, unu meere m ya.
Ọ bụ m k’unu gbaara mbọ unu gbaara ha.
Unu meere ha, unu meere m ya.
Ihe unu meere ha, unu meere m ya.”
“Unu gere mụ ntị, rụọ kw’ọtụtụ ọrụ ọma.
Unu sokw’ụmụnna m kwusaa ozi ọma.”
Eze anyị g’agwa ndị
nọ́ ya n’aka nri, sị:
“Ketanụ ndụ ebigh’ebi n’ụw’ọhụrụ.”
(KORỌS)
“Unu kasie h’obi, unu kasiri m.
Ihe unu meere ha, unu meere m ya.
Ọ bụ m k’unu gbaara mbọ unu gbaara ha.
Unu meere ha, unu meere m ya.
Ihe unu meere ha, unu meere m ya.”
(Gụọkwa Ilu 19:17; Mat. 10:40-42; 2 Tim. 1:16, 17.)