Abụ 149
Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta
Nke E Biri Ebi
Jehova Nna,
anyị na gị dịzi ná mma
N’ih’ịhụnanya kachanụ
i gosir’anyị.
Ị chụr’Ọkpara gị n’àjà
k’anyị dị ndụ.
Ọ bụ ih’ọma kachanụ
i meer’anyị niile.
(KORỌS)
Ọ nwụrụ k’a gbapụt’anyị.
Ọbara ya n’azọpụta.
A’yị g’eji obi anyị dum
n’ekele gị ru’ebigh’ebi.
Jizọs ji obi ya niile
chụ’àjà mak’anyị.
O nyere ndụ ya
n’ihi n’ọ hụr’anyị n’anya.
A’yị dum gaar’anwụ
m’a sị n’o nyeghị ndụ ya.
Anyị nwezir’olileanya
n’anyị g’adị ndụ.
(KORỌS)
Ọ nwụrụ k’a gbapụt’anyị.
Ọbara ya n’azọpụta.
A’yị g’eji obi anyị dum
n’ekele gị ru’ebigh’ebi.
(Gụọkwa Hib. 9:13, 14; 1 Pita 1:18, 19.)