Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 67 p. 160-p. 161 para. 4
  • “Ọ Dịtụbeghị Onye Ọzọ Si Otú A Kwuo Okwu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọ Dịtụbeghị Onye Ọzọ Si Otú A Kwuo Okwu”
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Ejideghị Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Mụta Ihe Site n’Ihe Mere Nikọdimọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Jizọs Akụziere Nikọdimọs Ihe n’Abalị
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • “Oge Awa Ya Aka-abịaghị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 67 p. 160-p. 161 para. 4
Ebe ndị agha e dunyere ka ha gaa jide Jizọs gba aka ya lọta

ISI NKE 67

“Ọ Dịtụbeghị Onye Ọzọ Si Otú A Kwuo Okwu”

JỌN 7:32-52

  • E ZIPỤ NDỊ ỌRỤ NCHE KA HA GAA JIDE JIZỌS

  • NIKỌDIMỌS AGBACHITERE JIZỌS

Jizọs ka nọkwa na Jeruselem, ebe a na-eme Ememme Ụlọ Ndò. Obi tọrọ ya ụtọ na “ọtụtụ ndị n’ime ìgwè mmadụ ahụ nwere okwukwe n’ebe ọ nọ.” Ma, obi adịghị ndị ndú okpukpe ndị Juu mma. Ha zipụrụ ndị ọrụ nche, ya bụ, ndị e nwere ike ịkpọ ndị uwe ojii ha, ka ha gaa jide Jizọs. (Jọn 7:31, 32) Ma, Jizọs agbaghị ọsọ.

Kama ịgba ọsọ, Jizọs nọgidere na-akụziri ndị mmadụ ihe n’ihu ọha na Jeruselem. Ọ gwara ha, sị: “Mụ na unu ka ga-anọtụkwu tupu mụ alakwuru onye ahụ zitere m. Unu ga-achọ m, ma unu agaghị ahụ m, unu apụghịkwa ịbịa ebe m nọ.” (Jọn 7:33, 34) Ndị Juu aghọtaghị ihe ọ na-ekwu. Ha ana-agwarịta ibe ha, sị: “Olee ebe nwoke a bu n’uche ịga, nke mere na anyị agaghị ahụ ya? Ò bu n’uche ịgakwuru ndị Juu gbasasịrị n’etiti ndị Grik ka o wee zie ndị Grik ihe? Gịnị ka okwu a o kwuru pụtara, nke bụ́ ‘Unu ga-achọ m, ma unu agaghị ahụ m, unu apụghịkwa ịbịa ebe m nọ’?” (Jọn 7:35, 36) Ma, ihe Jizọs na-ekwu okwu ya bụ ọnwụ ọ na-aga ịnwụ na mkpọlite a ga-akpọlite ya n’ọnwụ, ya agaa eluigwe, ebe ndị iro ya na-agaghị eruteli.

O ruola n’abalị nke asaa nke Ememme Ụlọ Ndò. N’ụtụtụ ọ bụla kemgbe ememme a malitere, onye nchụàjà na-awụba mmiri si n’Ọdọ Mmiri Siloam n’ime nnukwu efere ka o si ebe ahụ sọrọ sọba n’ebe ịchụàjà. Jizọs kwuziri ihe ọ ga-abụ na o ji ya mee ka ndị mmadụ cheta ihe a onye nchụàjà na-eme. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọ bụla nkụ, ya bịakwute m ṅụọ mmiri. Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, dị nnọọ ka Akwụkwọ Nsọ kwuru, ‘Mmiri nke na-enye ndụ ga-esi n’ime ya na-asọpụta.’”—Jọn 7:37, 38.

Ihe Jizọs na-ekwu bụ ihe ga-eme mgbe a ga-eji mmụọ nsọ tee ndị na-eso ụzọ ya mmanụ, ha enwezie olileanya ịga eluigwe. E tere ha mmanụ ahụ mgbe Jizọs nwụchara. Malite n’ụbọchị Pentikọst nke afọ na-esote afọ Jizọs kwuru ihe ahụ, ọtụtụ ndị malitere inweta mmiri nke ndụ n’ihi na ndị na-eso ụzọ Jizọs e ji mmụọ nsọ tee mmanụ bidoro ịkọrọ ọtụtụ ndị eziokwu gbasara Kraịst.

Ụfọdụ ndị nụrụ ihe Jizọs kụziri kwuru, sị: “Onye a bụ n’ezie Onye Amụma Ahụ.” Ọ ga-abụ na onye amụma ha bu n’obi bụ onye amụma ahụ ka Mozis ukwuu nke e kwuru na ọ ga-abịa. Ndị ọzọ nọkwa na-ekwu, sị: “Onye a bụ Kraịst.” Ma, ndị ụfọdụ nọ na-ajụ, sị: “Kraịst ọ̀ ga-esi na Galili bịa? Ọ̀ bụ na Akwụkwọ Nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi n’agbụrụ Devid, na ọ ga-esi na Betlehem bụ́ obodo nta ebe Devid biri?”—Jọn 7:40-42.

Ihe a mere ka ìgwè mmadụ ahụ ghara inwe otu olu. Ọ bụ eziokwu na o nwere ndị chọrọ ka e jide Jizọs, ma o nweghị onye bitụrụ ya aka. Mgbe ndị ahụ e zipụrụ ka ha gaa jide Jizọs lọghachiri gbara aka Jizọs, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii jụwara ha, sị: “Gịnị mere unu akpọtaghị ya?” Ndị ọrụ nche ahụ zara ha, sị: “Ọ dịtụbeghị onye ọzọ si otú a kwuo okwu.” Iwe bịara ndị ndú okpukpe ahụ, ha emewezie ndị ọrụ nche ahụ akaja, na-agwakwa ha okwu ọjọọ. Ha sịrị ha: “È duhiewokwa unu onwe unu? Ọ̀ dị otu n’ime ndị na-achị achị ma ọ bụ n’ime ndị Farisii nke nwere okwukwe n’ebe ọ nọ? Ma ìgwè mmadụ a nke na-amaghị Iwu ahụ bụ ndị a bụrụ ọnụ.”—Jọn 7:45-49.

Ebe Nikọdimọs na-agbachitere Jizọs

Mgbe ihe a nọ na-eme, Nikọdimọs, bụ́ onye Farisii na onye so ná ndị Sanhedrin, katara obi gbachitere Jizọs. Ọ sịrị: “Iwu anyị ọ̀ na-ekpe mmadụ ikpe ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nụ n’ọnụ onye ahụ wee mara ihe ọ na-eme?” Ha zara ya, sị: “Gị onwe gị kwa, ì si na Galili? Chọọ n’Akwụkwọ Nsọ, ị ga-ahụ na ọ dịghị onye amụma ga-esi na Galili.” Ihe dị ka afọ abụọ na ọnwa isii tupu ihe a emee, Nikọdimọs bịakwutere Jizọs n’abalị, mee ka ọ mara na ya nwere okwukwe n’ebe ọ nọ.—Jọn 7:51, 52.

O nweghị ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru na onye amụma ga-esi na Galili bịa. Ma, o kwuru ihe gosiri na Kraịst ga-esi na Galili bịa n’ihi na ọ sịrị na a ga-ahụ “oké ìhè” na “Galili nke ndị mba ọzọ.” (Aịzaya 9:1, 2; Matiu 4:13-17) Ihe ọzọ bụkwa na a mụrụ Jizọs na Betlehem bụ́ ebe e buru n’amụma na a ga-amụ Mesaya, Jizọs sikwa n’agbụrụ Devid bụ́ agbụrụ e buru n’amụma na Mesaya ahụ ga-esi abịa. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ na ndị Farisii macha ihe ndị a niile, ma ọ bụ ha kọọrọ ndị mmadụ ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu ha kweere banyere Jizọs.

  • Gịnị ka Jizọs kwuru banyere mmiri, nke nwere ike ime ka ndị mmadụ cheta ihe a na-eme n’ụlọ nsọ n’ụtụtụ ọ bụla n’oge a na-eme Ememme Ụlọ Ndò?

  • Gịnị mere ndị e zigara ka ha gaa jide Jizọs ejidelighị ya, gịnịkwa ka ndị ndú okpukpe mere?

  • Olee ihe gosiri na Kraịst ga-esi na Galili bịa?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya