Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 137 p. 310-p. 311 para. 2
  • Ọtụtụ Narị Mmadụ Hụrụ Jizọs Tupu E Mee Ememme Pentikọst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọtụtụ Narị Mmadụ Hụrụ Jizọs Tupu E Mee Ememme Pentikọst
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mpụta Ndị Ikpeazụ, na Pentikọst 33 O.A.
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Mpụta Ndị Ikpeazụ, na Pentikọst nke 33 O.A.
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • ‘Unu Ga-abụ Ndị Àmà M’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Jehova Bụ Onye Na-achị Anyị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 137 p. 310-p. 311 para. 2
Ihe a bụ mgbe Jizọs na-alaghachi eluigwe

ISI NKE 137

Ọtụtụ Narị Mmadụ Hụrụ Jizọs Tupu E Mee Ememme Pentikọst

MATIU 28:16-20 LUK 24:50-52 ỌRỤ NDỊOZI 1:1-12; 2:1-4

  • JIZỌS APỤTA N’IHU ỌTỤTỤ NDỊ

  • JIZỌS ALAGHACHI ELUIGWE

  • JIZỌS AWỤSA NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA DỊ IHE DỊ KA OTU NARỊ MMADỤ NA IRI ABỤỌ MMỤỌ NSỌ

Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, o mere ka ndịozi ya iri na otu bịakwute ya n’otu ugwu dị na Galili. Ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ sokwa ha gaa. Ha dị ihe dị ka narị mmadụ ise. Ụfọdụ n’ime ha nweburu obi abụọ na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. (Matiu 28:17; 1 Ndị Kọrịnt 15:6) Ihe Jizọs kwuru mgbe ha zukọtara mere ka onye ọ bụla n’ime ha kwetasie ike na a kpọlitela ya n’ọnwụ.

Jizọs gwara ha na Chineke enyela ya ikike niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa. Ọ gwaziri ha, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:18-20) N’eziokwu, Jizọs adịla ndụ, chọọkwa ka ndị na-eso ụzọ ya na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

Ọ bụ mmadụ niile na-eso ụzọ Jizọs, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị ma ụmụaka, ka Jizọs gwara ka ha mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ndị mmegide nwere ike ịgbalị ịkwụsị ha ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe. Ma, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” Ebe ọ dị otú ahụ, gịnị ka Jizọs ga-emere ndị na-eso ụzọ ya? Ọ gwara ha, sị: “Lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” Jizọs ekwughị na a ga-enye ndị niile na-eso ụzọ ya ike ịrụ ọrụ ebube. N’agbanyeghị nke ahụ, mmụọ nsọ ga na-enyere ha aka.

Jizọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya “ruo ụbọchị iri anọ” a kpọlitechara ya n’ọnwụ. Ọ na-eji ahụ́ dị iche iche apụta ma jiri “ọtụtụ ihe àmà doro anya gosi ha na ya dị ndụ.” Ọ gwakwara ha “ihe dị iche iche banyere alaeze Chineke.”—Ọrụ Ndịozi 1:3; 1 Ndị Kọrịnt 15:7.

O nwere ike ịbụ na Jizọs gwara ndịozi ya ka ha laghachi Jeruselem mgbe ha ka nọ na Galili. Mgbe ha na ya zukọrọ na Jeruselem, ọ gwara ha, sị: “Unu esila na Jeruselem pụọ, kama cherenụ ihe Nna m kwere ná nkwa, nke unu nụrụ banyere ya n’ọnụ m; n’ihi na Jọn ji mmiri mee baptizim, ma a ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim ụbọchị ole na ole mgbe nke a gasịrị.”—Ọrụ Ndịozi 1:4, 5.

Jizọs na ndịozi ya mechara zukọta ọzọ. O duuru ha “garuo Betani,” bụ́ nke dị ná mkpọda ebe ọwụwa anyanwụ Ugwu Oliv. (Luk 24:50) N’agbanyeghị ihe niile Jizọs gwarala ha banyere ịhapụ ha laghachi eluigwe, ha ka chere na Alaeze ya ga-adị n’ụwa ebe a.—Luk 22:16, 18, 30; Jọn 14:2, 3.

Ndịozi Jizọs jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ na-eweghachiri Izrel alaeze ahụ n’oge a?” Ọ gwara ha, sị: “Ọ dịrịghị unu ịmara oge ahụ ma ọ bụ mgbe a kara aka nke Nna m debere ka ọ dị n’aka ya.” Mgbe ahụ, o kwughachiri ọrụ ha ga-arụ. Ọ sịrị ha: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.”—Ọrụ Ndịozi 1:6-8.

Ihe a bụ mgbe Jizọs na-alaghachi eluigwe, ndịozi ya ana-ele ya

Mgbe Jizọs na ndịozi ya nọ n’Ugwu Oliv, o bidoro ịla eluigwe. Tupu ha amara ihe na-emenụ, ígwé ojii kpuchiri ya, ha ahụzighị ya. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ bụzi mmụọ, ma na-apụta n’ụdị mmadụ. Ma o jighị ahụ́ mmadụ o ji pụta na nke ugbu a laghachi eluigwe, kama, o ji ahụ́ mmụọ. (1 Ndị Kọrịnt 15:44, 50; 1 Pita 3:18) Ka ndịozi ya nọ na-ele anya n’eluigwe, “ụmụ nwoke abụọ ndị yi uwe ọcha” pụtara guzoro ha n’akụkụ. Ha bụ ndị mmụọ ozi bịara n’ụdị mmadụ. Ha jụrụ ndịozi Jizọs, sị: “Ndị Galili, gịnị mere unu ji guzoro na-ele anya na mbara igwe? Jizọs a, onye e si n’ebe unu nọ kpọgoro na mbara igwe, ga-esi otú a bịa, ya bụ, n’otu ụzọ ahụ unu hụrụ ya ka ọ na-abanye na mbara igwe.”—Ọrụ Ndịozi 1:10, 11.

Mgbe Jizọs na-alaghachi eluigwe, ọhaneze ahụghị ya. Ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya. Ọ ga-abịakwa “n’otu ụzọ ahụ.” Nke a pụtara na ọhaneze agaghị ahụ ya ma ọ bụ mara na ọ bịala. Ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ga-ama na ọ bịala, ya bụ, na ọ bụrụla eze n’Alaeze eluigwe.

Ndịozi Jizọs laghachiri Jeruselem. Ka ụbọchị na-aga, ha na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs na “Meri nne Jizọs nakwa ụmụnne ya ndị ikom” zukọtara. (Ọrụ Ndịozi 1:14) Ndị a nọgidere n’ekpere. Otu ihe ha kpere ekpere maka ya bụ ka a chọta onye na-eso ụzọ Jizọs ga-anọchi Judas Iskarịọt ma mee ka ndịozi Jizọs dịrịghachi iri na abụọ. (Matiu 19:28) Onye ha chọrọ ka ọ nọchie Judas bụ onye hụrụ Jizọs n’oge ọ na-eje ozi ya n’ụwa, hụkwa ya mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. Ha fere nza ka ha mata onye Chineke chọrọ ka a họpụta. Nza a bụ nza ikpeazụ e fere na Baịbụl. (Abụ Ọma 109:8; Ilu 16:33) Nza ahụ mara Matayas. Ọ ga-abụ na o so na mmadụ iri asaa ahụ Jizọs zipụrụ ka ha gaa kwusaa ozi ọma. A họpụtaziri ya, “e wee gụnye ya n’onye so ná ndịozi iri na otu ahụ.”—Ọrụ Ndịozi 1:26.

Mgbe abalị iri gachara Jizọs laghachiri n’eluigwe, ndị Juu mere Ememme Pentikọst nke afọ 33. Ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọrọ n’ụlọ elu dị na Jeruselem. Ha dị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ. Ozugbo ahụ, ụzụ nke na-ada ka oké ifufe juru n’ụlọ ahụ dum. A hụrụ ihe dị ka ire ọkụ n’isi onye ọ bụla nọ n’ime ụlọ ahụ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs niile bidoro ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche. Ihe ndị a gosiri na ha anatala mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ a ha natara mezuru nkwa ahụ Jizọs kwere ha, nke bụ́ na a ga-ezitere ha mmụọ nsọ.—Jọn 14:26.

  • Ole ndị ha na Jizọs nọ n’otu ugwu dị na Galili mgbe ọ gwara ha ihe ha ga-eme? Olee ihe Jizọs gwara ha?

  • Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ndị na-eso ụzọ ya hà hụrụ ya ruo ụbọchị ole? Oleekwa ihe Jizọs na-eme mgbe ahụ?

  • Ebe ọ bụ na ọhaneze ahụghị Jizọs oge ọ na-alaghachi eluigwe, olee otú ọ ga-esi abịaghachi?

  • Gịnị mere na Pentikọst nke afọ 33?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya