Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ypq ajụjụ 1 p. 3-5
  • Olee Ụdị Onye M Bụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ụdị Onye M Bụ?
  • Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ụdị Onye M Bụ?
    Teta!—2012
  • Olee Otú M Nwere Ike Isi Merie Ọnwụnwa?
    Teta!—2008
  • 9 Chọpụta Ụdị Onye Ị Bụ
    Teta!—2018
  • Olee Otú M Ga-esi Merie Ọnwụnwa?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
ypq ajụjụ 1 p. 3-5
Ebe otu nwa agbọghọ nọ na-eche ihe ọ ga-eme mgbe ọ naara otu karama mmanya biya a kwụperela akwụpe

AJỤJỤ NKE 1

Olee Ụdị Onye M Bụ?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

Ịmata ụdị onye ị bụ na ihe i kweere ga-enyere gị aka ime ihe dị́ mma ma e nyewe gị nsogbu ka i mee ihe ọjọọ.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Karen gara oriri na nkwari. Ọ nọfebeghị nkeji iri, ya anụ olu enyi ya nwaanyị bụ́ Jessica ka o si n’azụ jụọ ya, sị:

“Nke a i guzokwanụ ebe ahụ?”

Karen tụgharịrị hụ ka Jessica bu karama mmanya biya abụọ a ka kwụpere akwụpe. Jessica nyewere Karen otu karama mmanya ma sị ya, “Ị̀ ga-asị na i torubeghị ikporitụ ndụ?”

Karen chọrọ ịsị mba. Ma, cheta na Jessica bụ enyi ya. Karen achọghị ka o chewe na ọ bụ Mgbeeke. Ihe ọzọ bụ na Jessica so ná ndị e weere ka ezigbo mmadụ. Ebe ọ na-aṅụ mmanya, ọ pụtara na ọ bụghị ihe ọjọọ. Karen kwuru n’obi ya, sị: ‘Ọ bụ naanị mmanya. Ya na ịṅụ ọgwụ ọjọọ abụghị otu.’

Ọ bụrụ na ị bụ Karen, gịnị ka ị ga-eme?

CHEGODỊ ECHICHE

Ka i nwee ike ime ihe dị́ mma ma ụdị ihe a mee gị, i kwesịrị ịmata ụdị onye ị bụ. Ịmata ụdị onye ị bụ pụtara na ị ga-ama ihe ndị i kpebiri ịna-eme na ihe ndị i kweere. Ọ ga-eme ka ị kata obi na-eme ihe i kpebiri ime kama ime ihe ndị ọzọ chọrọ ka i mee.​—⁠1 Ndị Kọrịnt 9:​26, 27.

Gịnị ga-enyere gị aka ịna-akata obi? Ịza ajụjụ ndị anyị ga-atụle ugbu a ga-enyere gị aka.

1 OLEE IHE NDỊ M GA-EMELI?

Ịmata ihe ị ga-emeli ga-eme ka ị na-akata obi.

IHE Ị GA-AMỤTA NA BAỊBỤL: Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụgodị na abụghị m ọkà n’ikwu okwu, n’ezie, adịghị m otú ahụ n’ihe ọmụma.” (2 Ndị Kọrịnt 11:⁠6) Pọl ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ọ bụ ya mere na o kweghị ka ọnụ ndị mmadụ na-akọ ya mee ka ọ daa mbà. O kweghịkwa ka okwu ọjọọ ha na-agwa ya mee ka ọ ghara ịkata obi mee ihe dị́ mma.​—⁠2 Ndị Kọrịnt 10:10; 11:⁠5.

CHEBARA ONWE GỊ ECHICHE: Dee otu ihe ị ma eme nke ọma.

Dee otu ezigbo àgwà ị na-akpa. (Dị ka ihe atụ, ị̀ dị obiọma? Ị̀ na-emesapụ aka? À na-atụkwasịli gị obi? Ị̀ na-abịa ihe n’oge?)

2 OLEE EBE NDỊ M NA-ANAGHỊ EME NKE ỌMA?

Ọ bụrụ na ị kpacharaghị anya, ebe ị na-anaghị eme nke ọma nwere ike ime ka ị ghara ịbụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ.

IHE Ị GA-AMỤTA NA BAỊBỤL: Pọl ma ebe ndị ọ na-anaghị eme nke ọma. O dere, sị: “N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị, ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie.”​—⁠Ndị Rom 7:​22, 23.

CHEBARA ONWE GỊ ECHICHE: Olee ebe ị na-anaghị eme nke ọma nke i kwesịrị ịgba mbọ ka i mezie?

3 OLEE IHE NDỊ M KPEBIRI IME?

Ị̀ ga-abanye n’ụgbọala gwa onye na-anya ya ka o buru gị gbawa gburugburu n’otu ebe ruo mgbe mmanụ ụgbọala ya gwụrụ? Onye mere ụdị ihe ahụ dara iberiibe. Ọ bụ ịla ego n’iyi.

Gịnị ka ihe a na-akụziri gị? I nwee ihe ndị i kpebiri ime, ọ ga-eme ka ị na-eme ihe ndị bara uru ma ghara ịna-eme ihe na-enweghị isi na ọdụ.

IHE Ị GA-AMỤTA NA BAỊBỤL: Pọl dere, sị: “Otú m si agba ọsọ abụghị ihe a na-ejighị n’aka.” (1 Ndị Kọrịnt 9:26) Pọl kpebiri ihe ndị ọ ga-eme, gbalịsiekwa ike mee ha kama ịfanye aka n’ụkwụ na-eche ka ihe ọma bịara ya.​—⁠Ndị Filipaị 3:​12-14.

CHEBARA ONWE GỊ ECHICHE: N’okpuru ebe a, dee ihe atọ ị chọrọ ime n’afọ na-abịanụ.

4 OLEE IHE NDỊ M KWEERE?

Osisi mgbọrọgwụ ya siri ezigbo ike nke oké ifufe na-ebutulighị

Ọ bụrụ na ị mata ụdị onye ị bụ na ihe dị́ mma i kwesịrị ime, ị ga-adị ka osisi gbanyesiri mgbọrọgwụ ike, nke oké ifufe na-agaghị ebutuli

Ọ bụrụ na e nweghị ihe ndị i kweere, ị gaghị ama ihe ị ga-eme eme. Ị ga na-agbanwe ka ogwumagala ka obi dị́ ndị ọgbọ gị mma. I mee otú ahụ, ọ ga-egosi na ị gaghị abụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ.

Ma, ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị i kweere, ọ ga-eme ka ị bụrụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eme.

IHE Ị GA-AMỤTA NA BAỊBỤL: O nwere ike ịbụ mgbe Daniel onye amụma ka na-eto eto ka o “kpebisiri ike n’obi ya” na ya ga-erubere iwu Chineke isi n’agbanyeghị na ọ bụghị ya na ndị ezinụlọ ya bi. (Daniel 1:⁠8) Ihe a o mere gosiri na ọ chọrọ ịbụ ụdị mmadụ ọ chọrọ ịbụ. Daniel mere ihe ndị o kweere.

CHEBARA ONWE GỊ ECHICHE: Olee ihe ndị i kweere? Dị ka ihe atụ: Ì kweere na Chineke dị? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere i ji kwere? Olee ihe ndị mere ka obi sie gị ike na Chineke dị?

Ì kwetara na irubere iwu Chineke isi ga-abara gị uru? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere i ji kweta?

Mee elu mee ala, ọ bụ gị ga-ekpebi ụdị onye ị chọrọ ịbụ. Ị̀ ga-adị ka akwụkwọ kpọrọ nkụ nke ikuku na-ebugharị, ka ị̀ ga-adị ka osisi siri ike, nke oké ifufe na-agaghị emeli ihe ọ bụla? I kpebisie ike na ị ga-abụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ, ị ga-adị ka osisi ahụ. Ọ ga-enyere gị aka ịza ajụjụ bụ́ Olee ụdị onye m bụ?

IHE M GA-EME

  • Legodị anya n’ihe atọ ahụ i dere ị chọrọ ime n’ajụjụ nke atọ. Dezie otu ihe ị ga-eme n’ọnwa a ka i nwee ike ime nke ọ bụla n’ihe atọ ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya