AJỤJỤ NKE 3
Olee Otú M Ga-esi Na-agwa Papa M na Mama M Okwu?
GỊNỊ KA Ị GA-EME?
Chegodị banyere ihe atụ a: N’otu abalị Wednezdee, otu nwa okorobịa dị́ afọ iri na asaa aha ya bụ Geoffrey rụchara ọrụ o kwesịrị ịrụ n’ụlọ, chọzie izurutụ ike. Ọ gbanyere tiivi, gaa nọrọ n’oche na-amasịkarị ya.
Ozugbo ahụ, papa ya batara, gbarụọ ihu, sị:
“Geoffrey! Gịnị mere i ji nọrọ ebe ahụ na-ele tiivi kama ịga nyere nwanne gị nwoke aka rụọ ihe onye nkụzi nyere ya ka ọ rụọ n’ụlọ? Ò nwekwadịrị mgbe ị na-eme ihe a gwara gị?”
Geoffrey amalite ịtamu, “Ọ bịakwala ọzọ.” O kwuru ya otú papa ya ga-anụ ya.
Papa ya bịara ya nso, sị ya, “Nwoke m, ị̀ sịrị gịnị?”
Geoffrey arọọ papa ya anya, maa ọsụ, sị: “O nweghị.”
Ezigbo iwe bịara papa ya. Ya ejiri iwe sị Geoffrey, “Esikwala otú ahụ agwa m okwu!”
Ọ bụrụ na ị bụ Geoffrey, olee otú ị gaara esi gwa papa gị okwu ka unu ghara ise okwu?
CHEGODỊ ECHICHE
Ịgwa papa gị na mama gị okwu yiri ịnya ụgbọala. Ọ bụrụ na ị nyara ụgbọala ruo ebe ihe nọchiri ụzọ, ị ga-achọrọ ụzọ ọzọ.
DỊ KA IHE ATỤ:
Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Leah kwuru, sị: “Ọ na-esiri m ike ịkọrọ papa m ihe. Mgbe ụfọdụ, m ga-anọ na-akọrọ ya ihe, ya asị m, ‘Ewela iwe, ị̀ sịrị gịnị?’”
Ọ DỊKARỊA ALA, E NWERE IHE ATỌ LEAH NWERE IKE IME.
Iji olu ike gwa papa ya okwu.
Leah nwere ike iji olu ike sị papa ya: “Ihe a dị mkpa! Geenụ m ntị!”
Ịkwụsị ịkọrọ papa ya ihe ahụ.
Leah nwere ike kwụsị ịkọrọ papa ya nsogbu ahụ o nwere.
Ịchọta oge ọzọ ka mma ọ ga-akọrọ papa ya nsogbu ahụ.
Leah nwere ike gakwuru papa ya n’oge ọzọ, kọọrọ ya nsogbu ahụ, ma ọ bụ dee ya edee nye papa ya.
Olee nke i chere Leah kwesịrị ime?
CHEGODỊ ECHICHE: Papa Leah na-eche ihe ọzọ. Ọ bụ ya mere na ọ chọpụtaghị na iwe na-ewe Leah. Ọ bụrụ na Leah ahọrọ Nke A, papa ya agaghị aghọta ihe mere o ji jiri olu ike gwa ya okwu. Ọ bụrụ na Leah ejiri olu ike gwa papa ya okwu, o nwere ike ọ gaghị eme ka papa ya gee ya ntị, ọ gaghịkwa egosi na ọ na-asọpụrụ papa ya. (Ndị Efesọs 6:2) O doro anya na ịhọrọ Nke A agaghị abara ya uru.
Ihe nọchiere gị ụzọ, ị ga-esi ụzọ ọzọ gawa ebe ị na-aga. Otú ahụ ka ị ga-esikwa chọta ụzọ ọzọ ị ga-esi gwa papa gị na mama gị okwu
Ịhọrọ Nke B nwere ike iyi ka ọ̀ kacha mfe, ma ọ bụghị ya kacha mma. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Leah chọọ ka nsogbu o nwere bie, o kwesịrị ịkọrọ ya papa ya. Papa ya kwesịrị ịma ihe bụ́ nsogbu ya ka o nwee ike inyere ya aka. Leah gbachi nkịtị, nsogbu ya agaghị ebi, papa ya agaghịkwanụ enyere ya aka.
Leah họrọ Nke CH, ọ pụtara na o kweghị ka ihe ọ bụla gbochie ya ịkọrọ papa ya ihe bụ́ nsogbu ya. Kama, ọ ga-agba mbọ gwa papa ya ihe bụ́ nsogbu ya n’oge ọzọ. Ma, obi nwere ike ịdị Leah mma ozugbo ma o kpebie ide ya ede nye papa ya.
O dee ya edee, o nwere ike ime ka o dee ihe niile ọ chọrọ ikwu. Papa ya gụọ ihe ahụ o dere, ọ ga-aghọta ihe ọ chọrọ ịgwa ya. O nwekwara ike ịghọtakwu ihe bụ́ nsogbu ya. N’ihi ya, Nke CH ga-abara Leah na papa ya uru. Ma Leah ọ̀ bịakwutere papa ya ma ò dere ya ede, ịhọrọ Nke CH pụtara na ọ “na-achụso ihe na-eweta udo” otú ahụ Baịbụl kwuru.—Ndị Rom 14:19.
Olee ihe ndị ọzọ Leah nwere ike ime?
Lee ma ị̀ ga-echeta ihe ọzọ Leah nwere ike ime ma dee ya n’okpuru ebe a. Dezie ihe o nwere ike ịkpata.
EKWULA IHE PAPA GỊ NA MAMA GỊ GA-AGHỌTAHIE
Cheta na ọ bụghị mgbe niile ka ihe i kwuru na ihe papa gị na mama gị chere na i kwuru na-abụ otu.
DỊ KA IHE ATỤ:
Ka e were ya na papa gị na mama gị jụrụ gị ihe mere iwe ji ewe gị. Gị asị ha, “Achọghị m ikwu banyere ya.”
Ma, ihe ha ga-aghọta bụ: “Agaghị m akọrọ unu n’ihi na atụkwasịghị m unu obi. Ọ bụ ndị enyi m ka m ga-akọrọ ya. Ọ bụghị unu.”
Weregodị ya na e nwere nsogbu gị na ya na-alụ, mama gị ma ọ bụ papa gị achọọ inyere gị aka. Gị asị ya: “Enyela onwe gị nsogbu. Nsogbu a akarịghị m.”
Gịnị ka papa gị na mama gị nwere ike ịghọta?
Olee otú ka mma i nwere ike isi kwuo ya?