Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 13 p. 36-p. 37 para. 1
  • Jekọb na Ịsọ Kpeziri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jekọb na Ịsọ Kpeziri
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụmụ Ejima Ndị Na-eyighị
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Jekọb Ketara Ihe A Na-ekenye Ọkpara
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Jekọb Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 13 p. 36-p. 37 para. 1
Ebe Jekọb na-akpọrọ Ịsọ isiala, Ịsọ agbara ọsọ gakwuru ya

ISI NKE 13

Jekọb na Ịsọ Kpeziri

Jehova kwere Jekọb nkwa na ọ ga-echebe ya otú o chebere Ebreham na Aịzik. Jekọb gara biri n’ebe a na-akpọ Heran. Ọ nọ ebe ahụ lụọ nwaanyị, mụta ọtụtụ ụmụ ma baa ọgaranya.

Jehova mechara gwa Jekọb, sị: “Laghachi n’ala nna gị.” N’ihi ya, Jekọb na ezinụlọ ya malitere ogologo njem iji laghachi. Ka ha na-aga, ụfọdụ ndị bịara gwa Jekọb, sị: ‘Nwanne gị Ịsọ na-abịa, ya na narị ụmụ nwoke anọ (400).’ Ụjọ tụrụ Jekọb na Ịsọ chọrọ igbu ya na ndị ezinụlọ ya. N’ihi ya, ọ rịọrọ Jehova, sị: ‘Biko, napụta m n’aka nwanne m nwoke.’ N’echi ya, Jekọb zigaara Ịsọ onyinye. O nyere ya ọtụtụ atụrụ, ewu, ehi, kamel, na jakị.

Mgbe Jekọb nọ naanị ya n’abalị ụbọchị ahụ, ọ hụrụ otu mmụọ ozi. Ya na Jekọb malitere ịgba mgba. Ha gbagidere mgba chi abọọ. Ọ bụ eziokwu na mmụọ ozi ahụ merụrụ Jekọb ahụ́, Jekọb ahapụghị ya. Mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: “Hapụ m ka m laa.” Ma Jekọb sịrị ya: ‘Agaghị m ahapụ gị ruo mgbe ị gọziri m.’

Mmụọ ozi ahụ mechara gọzie Jekọb. Ihe a mere ka Jekọb mata na Jehova agaghị ekwe ka Ịsọ gbuo ya.

Mgbe chi bọchara, Jekọb nọ n’ebe dị anya hụ Ịsọ na narị ụmụ nwoke anọ (400) ka ha na-abịa. Jekọb gafere ndị ezinụlọ ya ma kpọọrọ nwanne ya isiala ugboro asaa. Ịsọ gbaara ọsọ gakwuru Jekọb ma makụọ ya. Ha abụọ malitere ibe ákwá ma kpezie. Olee otú i chere obi dị Jehova maka otú Jekọb si mee ka ya na nwanne ya kpezie?

Ịsọ mechara laghachi n’ụlọ ya, Jekọb alawara onwe ya. Jekọb mụrụ ụmụ nwoke iri na abụọ. Aha ha bụ Ruben, Simiọn, Livaị, Juda, Dan, Naftalaị, Gad, Asha, Ịsaka, Zebulọn, Josef, na Benjamin. Jehova si n’aka Josef, bụ́ otu n’ime ụmụ Jekọb, zọpụta ndị na-efe ya. Ị̀ ma otú o si mee ya? Ka anyi chọpụta n’isi nke 14.

“Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu, ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe.”​—Matiu 5:44, 45

Ajụjụ: Gịnị mere e ji gọzie Jekọb? Olee otú ya na nwanne ya si kpezie?

Jenesis 28:13-15; 31:3, 17, 18; 32:1-29; 33:1-18; 35:23-26

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya