ISI NKE 28
Jakị Belam Kwuru Okwu
Ndị Izrel anọọla n’ala ịkpa ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri anọ. Ha emeriela ọtụtụ obodo ndị siri ike. Ugbu a ha mara ụlọikwuu n’ọzara Moab nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, oge eruola ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ. Ụjọ tụwara eze ndị Moab aha ya bụ Belak na ndị Izrel ga-anara ha ala ha. N’ihi ya, ọ kpọrọ otu nwoke aha ya bụ Belam ka ọ bịa na Moab bụọ ndị Izrel ọnụ.
Ma Jehova gwara Belam, sị: “Abụla ndị Izrel ọnụ.” N’ihi ya, Belam jụrụ ịga. Eze Belak kpọrọ ya nke ugboro abụọ ka ọ bịa ma kwe nkwa inye ya ihe ọ bụla ọ chọrọ. Belam jụkwara ịga. Chineke gwaziri ya, sị: ‘I nwere ike ịga. Ma, ọ bụ naanị ihe m gwara gị kwuo ka ị ga-ekwu.’
Belam rịgooro n’elu jakị ya gawa Moab. O bu n’obi ịbụ ndị Izrel ọnụ n’agbanyeghị na Jehova gwara ya emela otú ahụ. Mmụọ ozi Jehova nọchiiri Belam ụzọ ugboro atọ. Belam ahụghị mmụọ ozi ahụ, ma jakị ya hụrụ ya. Ihe mbụ jakị ahụ mere bụ ịhapụ ụzọ tinye isi n’ọhịa. Ọ gaziri dagide mgbidi, ụkwụ Belam echigide ná mgbidi ahụ. N’ikpeazụ, ọ makpuuru n’etiti ụzọ. Belam kụchara jakị ya osisi ugboro atọ ahụ.
Na nke ugboro atọ ahụ, Jehova mere ka jakị ahụ kwuo okwu. Jakị Belam jụrụ ya, sị: ‘Gịnị mere i ji na-akụ m ihe?’ Belam gwara ya, sị: ‘I mere m ka m yie onye iberiibe. A sị na m ji mma agha, m gaara egbu gị.’ Jakị ahụ sịrị ya: ‘M na-ebu gị kemgbe ọtụtụ afọ. M̀ metụla gị otú a mbụ?’
Jehova meziri ka Belam hụ mmụọ ozi ahụ. Mmụọ ozi ahụ gwara Belam, sị: ‘Jehova gwara gị abụla ndị Izrel ọnụ.’ Belam sịrị ya: ‘Emeela m ihe ọjọọ. M ga-alaghachi.’ Ma, mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: ‘I nwere ike ịga Moab, ma ọ bụ naanị ihe Jehova gwara gị kwuo ka ị ga-ekwu.’
Belam, ọ̀ mụtara ihe n’ihe a merenụ? Mba. Belam mechara chọọ ịbụ ndị Izrel ọnụ ugboro atọ, ma na nke ọ bụla, Jehova mere ka ọ gọzie ha. Ndị Izrel mechara lụso ndị Moab agha ma gbuo Belam. A sị na Belam gere Jehova ntị, ì chere na ọ garaghị akara ya mma?
“Lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla, n’ihi na mmadụ nwegodị ọtụtụ ihe, ihe o nwere anaghị eme ka ọ dị ndụ.”—Luk 12:15