Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 66 p. 156-p. 157 para. 1
  • Ezra Kụziri Iwu Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezra Kụziri Iwu Chineke
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezra
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Izi Ihe Gị Ọ̀ Dị Irè?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Ga-enyere Gị Aka Mgbe Ihe Siiri Gị Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Jehova Chọrọ Ka Anyị Jiri Obi Anyị Niile Na-efe Ya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 66 p. 156-p. 157 para. 1
Ebe Ezra na ndị Izrel zukọrọ n’ámá, ya ana-eto Jehova, ndị Izrel achịlie aka ha elu iji gosi na ha kwadoro ihe ọ na-ekwu

ISI NKE 66

Ezra Kụziri Iwu Chineke

O ruola ihe dị ka afọ iri asaa kemgbe ọtụtụ ndị Izrel si Babịlọn laghachi Jeruselem. Ma, a ka nwere ụfọdụ n’ime ha bi n’obodo dị iche iche ndị Peshia na-achị. Otu n’ime ha bụ onye nchụàjà aha ya bụ Ezra. Ọ kụziiri ndị Izrel Iwu Jehova. Mgbe Ezra nụrụ na ndị Izrel bi na Jeruselem anaghị edebe Iwu Jehova, ọ chọrọ ka ọ gaa nyere ha aka. Atazaksis eze Peshia gwara ya, sị: ‘Chineke nyere gị amamihe ka ị na-akụzi Iwu ya. Lawa, kpọrọkwa ndị niile chọrọ iso gị laa.’ Ezra na ndị niile chọrọ ịlaghachi Jeruselem nwere nnọkọ. Ha rịọrọ Jehova ka o duo ha ka ihe ọjọọ ghara ime ha n’ụzọ. Mgbe ha kpechara ekpere, ha lawara.

Mgbe ọnwa anọ gachara, ha ruru Jeruselem. Ndị isi ndị Izrel gwara Ezra, sị: ‘Ndị Izrel enupụrụla Jehova isi. Ha lụrụ ụmụ nwaanyị ndị na-efe arụsị.’ Gịnị ka Ezra mere? O gburu ikpere n’ala n’ihu ndị Izrel kpee ekpere, sị: ‘Jehova, i meerela anyị ọtụtụ ihe ọma. Ma, anyị emehiela gị.’ Ndị Izrel chegharịrị, ma ha ka nọ na-eme ihe na-adịghị mma. Ezra họpụtara ndị okenye na ndị ikpe ka ha lebara okwu ahụ anya. Mgbe ha lebachara ya anya, ha malitere ịchụla ndị nwunye ha bụ́ ndị na-efe arụsị. Ha nọ na-eme ihe a ruo ọnwa atọ.

Afọ iri na abụọ a chụlachara ụmụ nwaanyị ndị ahụ, a rụghachiri mgbidi niile gbara Jeruselem gburugburu. N’ihi ya, Ezra kpọkọtara ndị Izrel n’ámá ka ọ gụpụtara ha Iwu Chineke. Mgbe o mepere akwụkwọ Iwu ahụ, ndị Izrel guzoro ọtọ, ya amalite ito Jehova. Ha niile chịliri aka elu iji gosi na ha kwadoro ihe o kwuru. Ezra gụpụtaziiri ha Iwu Chineke ma kọwaara ha ya. Ha gekwara ya ntị nke ọma. Ha kwetara na ha emehiela Jehova ọzọ, beekwa ákwá. N’echi ya, Ezra gụpụtakwuuru ha ihe e dere n’Iwu Chineke. Mgbe ọ na-agụ ya, ha chọpụtara na oge ha kwesịrị ime Ememme Ụlọ Ndò eruwela. Ha bidoro ịkwadebe maka ya ozugbo.

Ndị Izrel mere ememme ahụ abalị asaa. Ha ṅụrịrị ọṅụ ma kelee Jehova maka otú o si mee ka ihe ndị ha kụrụ n’ubi mee nke ọma. Malite n’oge Joshụa, e nwebeghị Ememme Ụlọ Ndò ndị Izrel mere dị ka nke a. Mgbe ha mechara ememme a, ha zukọtakwara kpee ekpere, sị: ‘Jehova, ọ bụ gị napụtara anyị mgbe anyị na-agbara ndị Ijipt ohu, nye anyị nri n’ọzara, nyekwa anyị ala a mara ezigbo mma. Ma, anyị emehiela gị ugboro ugboro. I ziteere anyị ndị amụma gị ka ha dọọ anyị aka ná ntị, ma anyị egeghị ha ntị. Ị nọkwa na-enwere anyị ndidi. I mezukwara nkwa i kwere Ebreham. Ugbu a, anyị na-ekwe gị nkwa na anyị ga na-erubere gị isi.’ Ha dekwara nkwa a ha kwere Jehova n’akwụkwọ. Ndị isi ha, ndị Livaị, na ndị nchụàjà bịanyekwara aka na ya.

“Ndị na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya na-enwe obi ụtọ.”​—Luk 11:28

Ajụjụ: Gịnị ka Ezra kụziiri ndị Izrel zukọtara na Jeruselem? Olee ihe ndị Izrel kwere nkwa na ha ga-eme?

Ezra 7:1-28; 8:21-23, 31, 32; 9:1–10:19; Nehemaya 8:1-18; 9:1-38

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya