Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi
Ezi Ụmụnna Anyị:
Ebe anyị bụ ndị na-efe Jehova, anyị ji Okwu ya bụ́ Baịbụl kpọrọ ihe. Anyị kwetasiri ike na akụkọ ndị a kọrọ na ya bụ eziokwu, na ihe ndị e kwuru na ya ga-enyere anyị aka ná ndụ, nakwa na ha na-egosi na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. (Abụ Ọma 119:105; Luk 1:3; 1 Jọn 4:19) Anyị chọsiri ike inyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu magburu onwe ya dị n’Okwu Chineke. N’ihi ya, obi dị anyị ụtọ iwepụta akwụkwọ a aha ya bụ “Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl.” Ka anyị kọọrọ unu ihe ụfọdụ gbasara akwụkwọ a.
Ọ bụ ụmụaka ka a kacha buru n’obi dee akwụkwọ a. Ma, e nwekwara ike iji ya kụziere ndị toro eto chọrọ ịmụtakwu Baịbụl ihe. Ebe ọ bụ na e dere Baịbụl maka mmadụ niile, o doro anya na anyị niile ga-amụta ihe n’akụkọ ndị a kọrọ na ya ma anyị gụọ ha. Ha ga-emekwa ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ.
Ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ a si na Baịbụl. Ha kọọrọ anyị gbasara ụmụ mmadụ, malite n’oge Chineke bidoro ike ihe gawazie. A gbara mbọ dee akwụkwọ a ka ihe ndị a kọrọ na Baịbụl doo anya ma dị mfe nghọta. E dekwara ha n’usoro ha si mee n’ebe niile o kwere omume.
Ma, ihe e mere n’akwụkwọ a abụghị naanị ịkọ akụkọ ndị dị na Baịbụl. Kama, e dere akwụkwọ a ma see foto ndị dị na ya otú ga-eme ka anyị ghọta akụkọ ndị ahụ ma mata otú obi dị ndị a kọrọ gbasara ha.
Akwụkwọ a ga-enyere anyị aka ịmata na Baịbụl kọrọ gbasara ụmụ mmadụ, ma ndị rubeere Jehova isi ma ndị na-erubereghị ya isi. Ọ ga-enyekwara anyị ịmụta ihe n’ihe ha mere. (Ndị Rom 15:4; 1 Ndị Kọrịnt 10:6) Akwụkwọ a nwere nkebi iri na anọ. Na mbido nkebi nke ọ bụla, e kwuru ihe ụfọdụ gbasara akụkọ ndị a ga-akọ na ya na ihe ụfọdụ a ga-amụta na ya.
Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, i nwere ike ịgụrụ nwa gị otu isiokwu, gị na ya ekwurịtazie ihe e sere na ya. Unu nweziri ike gụọ ebe ndị akụkọ ahụ si na Baịbụl. Nyere nwa gị aka ka ọ hụ otú ihe e kwuru na Baịbụl si daba n’ihe a kọrọ n’isiokwu nke ọ bụla. E nwekwara ike isi otú a nyere onye torola eto aka ịmata isi ihe Baịbụl na-ekwu.
Anyị na-atụ anya na akwụkwọ a ga-enyere ma ụmụntakịrị ma ndị torola eto nwere ezi obi aka ịmụta ihe n’Okwu Chineke ma mee ihe ha mụtara. Ihe a ga-eme ka ha bịa fewe Jehova ma soro n’ezinụlọ ya ọ hụrụ n’anya.
Anyị bụ ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova