NKEBI NKE ABỤỌ
‘Unu Merụrụ Ụlọ Nsọ M’—A Kwụsịrị Ife Chineke Ezigbo Ofufe
IHE NKEBI A NA-EKWU: Ndị bi na Juda na Jeruselem kwụsịrị ife Chineke, mewezie arụ
Jehova hụrụ ndị Izrel n’anya ma na-elekọta ha maka na ha bụ ‘ndị ya pụrụ iche.’ (Ọpụ. 19:5) Ma, ihe ha mere bụ ịnọ n’ụlọ nsọ Jehova na-efe chi ụgha dị iche iche. Ihe a ha mere gbawara Jehova obi, meekwa ka a kọchaa ya. Gịnị mere ndị Izrel ji mewe ụdị ihe ọjọọ a? Olee ihe anyị ga-amụta n’amụma Ezikiel buru gbasara mbibi a ga-ebibi Jeruselem? Oleekwa ihe anyị ga-amụta n’otú ndị Izrel na mba ndị gbara ha gburugburu si mekọọ ihe?