NKEBI NKE ANỌ
“M Ga-eji Ịnụ Ọkụ n’Obi Mee Ka A Mara na Aha M Dị Nsọ”—Ezigbo Ofufe Akwụsịghị n’Agbanyeghị Ọgụ A Lụsoro Ya
IHE NKEBI A NA-EKWU: Jehova ga-echebe ndị ya n’oké mkpagbu
Jehova hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ma, anyị ga-aza ya ajụjụ maka ihe ọ bụla anyị mere. Olee otú obi na-adị ya ma ndị sị na ha na-efe ya na-akpa àgwà ndị gosiri na e nweghị ihe ha ji ya kpọrọ? Olee otú Jehova ga-esi ekpebi ndị ọ ga-echebe n’oge oké mkpagbu? Gịnị mere Jehova, bụ́ Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya, ga-eji bibie ọtụtụ nde mmadụ ndị na-eme ihe ọjọọ?