Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 1/1 p. 16-17
  • Ebe Devid Nọrọ Gbuo Otu Oké Dike!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ebe Devid Nọrọ Gbuo Otu Oké Dike!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Jehova Nwe Agha Nke A”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Akụkọ Devid na Golayat, Ò Mere Eme n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • “Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Nọrọnụ na “Ndagwurugwu nke Ugwu M”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 1/1 p. 16-17

Ihe A Hụrụ n’Ala Nkwa ahụ Ndagwurugwu Ila

Ebe Devid Nọrọ Gbuo Otu Oké Dike!

Ọ BỤ nanị ihe ndekọ Bible ole na ole bụ ndị na-akpali akpali karịa nke ahụ kọwara otú o si bụrụ na “Devid [weere] ébé, werekwa nkume, ka onye Filistia n’ike,” oké dike ahụ, bụ́ Golaịat. (1 Samuel 17:50) Nke a bụ na Ndagwurugwu Ila.

Ma olee ebe ndagwurugwu ahụ dị, oleekwa otú ọ dị? Ịmara nke a ga-enyere gị aka iji anya nke uche gị hụ oké mmeri nke a nwa okorobịa ahụ e tere mmanụ dị ka onye gaje ịbụ eze Israel n’ọdịnihu nwere. Chineke mesịrị soro Devid banye n’ọgbụgba ndụ alaeze nke pụrụ iwetara anyị abamuru ebighị ebi, nke a kwesịkwara inye anyị ihe ndị ọzọ mere anyị ga-eji chọọ ịmụta ihe mere na Ndagwurugwu Ila.

Ndị Filistia biri n’ogologo ụsọ oké osimiri nke ala Kenean. Ahịrị oké ugwu Judia ndị ahụ dị n’okpuru ọchịchị ndị Israel (n’ebe ndịda nke Jerusalem). Ya mere otú ahụ ka i si ahụ ya—ndị iro nọ n’ebe ndagwurugwu nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ, ndị ohu Chineke nọ n’ala dị elu n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ha nwere n’etiti ha ókèala a na-azọ azọ nke ghọrọ ihe mgbochi, bụ́ ugwu ndị ahụ dị ala karị, ndị a na-akpọ Shephelah. Olee ụzọ ndị Filistia pụrụ isi busoo Israel agha? Ụzọ ezì uche dị na ya ha ga-esi jee bụ otu wadi, ma ọ bụ ụzọ ngabiga si ọwụwa anyanwụ gaa ọdịda anyanwụ, nke otu n’ime ndị bụ isi na ha bụ Ndagwurugwu Ila ahụ. Nke a gbatịrị site n’ọzara ndị ahụ dị nso obodo ha nke Gat na Ekrọn, gbagoo n’elu gabiga Shephelah ahụ, ruo n’oké ugwu ndị ahụ ihe dị ka 15 maịlụ [24 kilomita] n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke Jerusalem na Betlehem. Ihe osise ahụ, (ma ọ bụrụ na e lee ya anya gaa n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ ya) na-egosi ngwụsị ndagwurugwu a nke dị n’ebe ugwu. N’azụ azụ ihe osise ahụ, ị na-ahụ usoro oké ugwu Judia ndị ahụ.a

N’ile foto a anya, chee nnọọ n’echiche na ndị Filistia agbagotewo na ndagwurugwu a dị larịị, na-eche ihu n’ebe oké ugwu ndị ahụ dị. Iji wee kwụsị ha, ndị Israel bịara site n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ site na Judia. N’ebe a, ha cherịtara ibe ha ihu n’enweghị onye mere ihe ọ bụla. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? “Ndị Filistia wee na-eguzo n’ugwu n’otu akụkụ, Israel na-eguzokwa n’ugwu n’akụkụ nke ọzọ: ndagwurugwu wee dị n’etiti ha.”—1 Samuel 17:3.

Ọ bụ ezie na anyị amaghị kpọmkwem ebe nke a mere n’ogologo ndagwurugwu ahụ, jiri anya nke uche gị lee ka ndị Filistia ndị ahụ nọ n’ugwu ahụ nke dị na ndịda ebe aka nri. Ọ pụrụ ịbụworị na usuu ndị agha nke Sọl nọ n’akụkụ nke ọzọ n’ugwu dị n’azụ ọhịa ahụ na-eji oji. Ọ dịghị usuu ndị agha nke ọ bụla ga-agbada, gabiga ndagwurugwu ahụ, wee busoo ndị iro ha agha n’ọnọdụ ya dị elu, nke nọ ná nchebe. Ncherịta ihu ahụ n’emeghị ihe ọ bụla nọruru ihe karịrị otu ọnwa. Gịnị gaje ịkwụsị ọnọdụ ahụ?

N’ụtụtụ na n’uhuruchi ọ bụla, Golaịat, bụ́ dike onye Filistia nke dị ihe karịrị 9 amaụkwụ [2.7 mita] n’ogologo, guzoro na ndagwurugwu ahụ na-akwa ọmụma ụlọ ikwuu Sọl emo ka ha kpebie okwu ahụ site n’ịkpọpụta otu onye ya na ya ga-alụ ọgụ. Ma ọ dịghị onye Israel ọ bụla nwara ịzaghachi ya okwu. N’ikpeazụ, otu nwa okorobịa na-azụ atụrụ aha ya bụ Devid si Betlehem wetara ụmụnne ya nọ n’ọmụma ụlọ ikwuu ahụ ihe oriri. Gịnị bụ mmeghachi omume ya n’ebe okwu ịma aka mkparị ahụ dị? “Ònye bụ onye Filistia nke a nke a na-ebighị úgwù, na ọ ga-ata usoro agha nile nke Chineke dị ndụ ụta?” (1 Samuel 17:4-30) O doro anya na Devid nwere echiche nke e gosipụtara n’isiokwu na-eduzi afọ 1990 nke Ndịàmà Jehova, bụ́: “Were obi ike sị, [Jehova, NW] bu onye na-enyere m aka.”—Ndị Hibru 13:6, Abụ Ọma 56:11; 118:6.

Mgbe Eze Sọl nụrụ na nwa okorobịa nke a, ọ bụ ezie na o jighị ngwá agha, ọ bụghịkwa onye a zụrụ azụ dị ka onye agha, gaje iche Golaịat ahụ gbara ajọ dimkpa ihu, o kwuru ka o jiri ihe agha

nke ya jee. Devid jụrụ ajụ, na-adị njikere ijekwuru oké dike ahụ, na-eji mkpanaka ya nke onye na-azụ atụrụ, otu ébé e ji akpụkpọ anụ mee, na nkume ise ọ tụtara na ndagwurugwu ahụ. Olee otú nkume ndị ahụ dị? O yighị ka ọ ga-abụ ụmụ obere kọnkịrị ndị ha ka mkpụrụ vine ma ọ bụ olive. A hụtawo ụdị nkume ndị a ndị dị ihe ha ka 2 ruo 3 inch [5 ruo 8 sentimita] n’obosara, bụ́ ihe ha ka obere oroma. Onye na-eji ébé atụ nkume pụrụ ịtụ nkume ndị ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ nke ihe dị ka site na 100 ruo 150 maịlụ n’otu awa ọ bụla [160 ruo 240 km/hr].

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị gụwo banyere ihe mere na ndagwurugwu ahụ, n’ebe usuu ndị agha abụọ ahụ ga-ahụ ya anya nke ọma. Devid kwupụtara, sị: “Gị onwe gị na-ewere mma agha, werekwa ube, werekwa mkpụmkpụ ube, bịakwute m: ma mụ onwe m na-ewere aha Jehova nke usuu nile nke ndị agha bịakwute gị, bụ́ Chineke nke usoro agha nile nke Israel, onye ị taworo ụta.” Mgbe ahụ, Jehova nyere ya mmeri. Nwa okorobịa ahụ gbapụsiri otu nkume ike nke ukwuu nke na ọ dakpuru n’egedege ihu Golaịat, na-eme ka ọ nwụọ. Mgbe ahụ, onye ahụ na-azụ atụrụ gbaara ọsọ gaa n’ebe ahụ ọ dara, mịpụta mma agha nke oké dike ahụ n’onwe ya wee gbubipụ isi ya.—1 Samuel 17:31-51.

N’ịbụ ndị okwukwe na ntụkwasị obi Devid nwere n’ebe Chineke nọ gbara ume, ndị Israel ahụ wakwasịrị ndị iro ha ahụ daworo mbà n’obi, na-achụrụ ha gbadaa gabiga Shephelah, laghachikwa na Filistia.—1 Samuel 17:52, 53.

Chee echiche banyere ụdị nṅụrị ọṅụ a ga-anụworị na Juda! Ndị Chineke, ndị nọ n’elu oké ugwu ahụ pụrụ ile anya gaa n’ebe ọdịda anyanwụ, gbadaa banye na Ndagwurugwu Ila na Shephelah ahụ, dị ka ọ dị n’ihe osise nke a nke ụzọ e si ahụ ya anya taa site n’ebe dị n’okpuru Hebrọn. Okooko osisi ọcha nke osisi almọnd bụ ihe mara mma ile anya, ma ịma mma nke mmeri e meriri ndị iro Chineke dị mma ọbụna karị. Ndị inyom Israel ahụ pụrụ itipụ mkpu kwuo n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Sọl etigbuwo ndị iro ya [otu puku, otu puku], Devid kwa ndị iro ya [puku iri, puku iri],” gụnyere oké dike ahụ o gburu na Ndagwurugwu Ila.—1 Samuel 18:7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Otu ihe osise a, nke e sepụtara n’ụzọ buru ibu, dị na 1990 Calendar of Jehovah’s Witnesses, bụ́ nke na-egosikwa ebe ọ dị na map dị n’ihu ya.

[Foto dị na peeji nke 17]

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 16]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya