Ịṅụrị Ọṅụ n’Owuwe Ihe Ubi ahụ n’India
Dị ka F. E. Skinner si kọọ
NYE M, ọ bụ nnọọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-apụghị ikwe ekwe—21 mgbakọ dị iche iche n’asụsụ iri, ihe karịrị 15,000 mmadụ ndị bịara ịmụta ihe ikpe ziri ezi nke Chineke pụtara, na 545 ndị mere baptism iji gosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke ukwu ahụ nke ikpe ziri ezi, bụ́ Jehova, nọ! Nye 9,000 Ndịàmà Jehova nọ n’India, nke a bụ isi ihe nke afọ 1989. Nye m, ọ bụ ihe pụrụ iche nke na-akpata ịṅụrị ọṅụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na apụghị m nnọọ iche na oké iche omume dị otú a pụrụ ime eme mgbe m zọrọ ụkwụ nke mbụ n’ala India na July 1926. N’oge ahụ, e nwere ihe na-erughị 70 ndị nkwusa nke ozi Alaeze ahụ ná mba ahụ dum. Lee nnọọ ọrụ dị ukwuu mụ na onye ozi ibe m natara n’ihe karịrị 63 afọ gara aga!
Otú M Si Bịa India
Na May 1926, ejere m otu mgbakọ ukwu e nwere na London, England, ozugbo e mechara ya, alaghachikwara m n’obodo m bụ Sheffield. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, mgbe m batara site n’ozi ubi, ahụrụ m otu akwụkwọ telegram nke na-echere m. Ihe e dere na ya bụ: “Judge Rutherford chọrọ ịhụ gị.”
Nwanna Rutherford, bụ́ onyeisi oche nke abụọ nke Watch Tower Society, si New York bịa maka mgbakọ ahụ e nwere n’oge na-adịghị anya gara aga, ọ ka nọkwa na London. N’ụtụtụ echị ya, mgbe m nọ n’ụgbọ okporo igwe nke m ji na-alaghachi London, anọ m na-eche, sị, ‘Gịnị ka nke a pụtara?’ N’alaka ụlọ ọrụ ahụ, a kpọjeere m Nwanna Rutherford, o wee jụọ m, sị: “Ọ̀ dị akụkụ ụwa nke ị na-agaghị achọ ịnọ na ya rụọ ọrụ?”
“Ee e,” ka m zaghachiri.
“Ọ̀ ga-amasị gị ije India?”
“Olee mgbe ị chọrọ ka m jee?” ka m zaghachiri ozugbo ahụ. Otú a, mgbe izu atọ gasịrị, mụ na George Wright nọ n’ụgbọ mmiri na-eje India. Adị m 31 afọ, ọ dịghịkwa ajụjụ ọ bụla dị n’uche na n’obi m banyere ihe m chọrọ iji ndụ m mee.
Ime Mkpebi Banyere Ihe M Ga-eji Ndụ M Mee
Na 1918, agha ụwa nke mbụ agwụsịwo, anọsịwokwa m nnọọ afọ anọ n’usuu ndị agha Britain. Enwere m mmasị n’ihe banyere ise foto na iji redio na-ezipụ ozi, e nwekwara ohere ọrụ ndị mara mma ndị ghere oghe nye m. Ọzọkwa, ana m eche echiche banyere ịlụ nwunye. Ma, n’otu mgbe ahụ, anọ m na-aghọta ihe ndị gaje ịgbanwe ụzọ dum m si ele ihe anya ná ndụ m. Nna m anatawo usoro akwụkwọ ndị ahụ aha ha bụ Studies in the Scriptures, otu onye colporteur, dị ka a na-akpọ ndị ọsụ ụzọ n’oge ahụ, malitekwara iduziri ezinụlọ anyị ọmụmụ Bible. Nwanyị ahụ bụbu onye nkuzi ụlọ akwụkwọ. Mgbe oge na-aga, ìgwè ụmụ okorobịa ndị bụ ọgbọ m na-aga n’ụlọ ya na Saturday ọ bụla ịṅụ tea na ịmụ Bible. Ọ na-agwa anyị mgbe mgbe ka anyị wepụtara Jehova onwe anyị, na-asị: “Unu ajụla ọrụ ọ bụla e kenyere unu.” Ọ gbakwara m ume ka m nọgide n’alụghị nwunye.
Ruo ogologo oge ụfọdụ, enwere m obi abụọ banyere ihe m ga-eme. Okwu ahụ Jisọs gwara nwa okoro ahụ bụ́ onye ọchịchị na Matiu 19:21 nyeere m aka: “O bụrụ na ị na-achọ ka i zuo okè, laba, ree ihe nile i nwere, nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ n’eluigwe: bịakwa, soo m.” Etinyere m akwụkwọ ịgba arụkwaghị m n’ụlọ ọrụ ahụ m na-arụrụ ọrụ, n’ime ọnwa atọ, aghọkwara m onye colporteur. Nke a, tinyere mkpebi ahụ m mere ịnọgide n’alụghị nwunye, mere ka m ruo eru ịnata ọrụ ahụ dị oké ọnụ ahịa n’India mgbe ihe dị ka afọ anọ gasịrị.
Ubi Ọhụrụ Buru Oké Ibu
E kenyere mụ na George Wright ilekọta ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, ọ bụghị nanị n’India, kamakwa na Burma (nke a na-akpọ Myanmar ugbu a) na Ceylon (nke a na-akpọ Sri Lanka ugbu a). Mgbe e mesịrị, e tinyekwara Persia (nke a na-akpọ Iran ugbu a) na Afghanistan. Mbara ala India dịtụ nta karịa nke United States, ma ọnụ ọgụgụ mmadụ bi na ya ji ọtụtụ okpukpu karịa ya. Ọ bụ mba nke nwere ụdị ihe oriri dị iche, omenala, na asụsụ dị iche iche, nwee ndị nwere nkwenkwe okpukpe dị iche iche—ndị Hindu, ndị Alakụba, ndị Parsi, ndị Jain, ndị Sikh, na ndị okpukpe Buddha, tinyekwara ndị Katọlik na ndị Protestant.
Ọrụ nkwusa ahụ malitere n’India na 1905, ọ natakwara ezi nkwado mgbe Charles T. Russell, bụ́ onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society, bịara leta ebe ahụ na 1912. Mkparịta ụka Russell na A. J. Joseph, bụ́ nwa okorobịa na-amụsi Bible ike nwere, dujere ná ndokwa na-adịgide adịgide maka ịga n’ihu nke ọrụ nkwusa ahụ. Joseph sụgharịrị akwụkwọ ndị e ji amụ Bible gaa n’asụsụ ya bụ Malayalam, gaakwa njem ikwu okwu ihu ọha n’ọtụtụ ebe dị iche iche, karịsịa n’ebe ndịda India. Taa, ihe dị ka ọkara ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa dị n’India bi n’akụkụ nke a ebe a na-asụ asụsụ Malayalam, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị ihe dị ka 3 pasenti nke ọnụ ọgụgụ ndị bi n’India nile bi n’ebe ahụ. Akụkụ nke a, bụ́ nke a na-akpọbu Travancore na Cochin, ghọrọ Kerala State na 1956.
Mụ na George Wright na-eme mgbanwerịta n’etiti ilekọta ọfis ahụ dị na Bombay na ịpụ apụ ịga njem nkwusa ozi ọma n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ. Anyị jiri usoro ụgbọ okporo ígwè ndị India, ịnyịnya, na ụgbọ ala ndị ehi na-adọkpụ wee mee ihe nke ọma. Mgbe e mesịrị, anyị jiri ụgbọ ala mee ihe. Otú e si eme ihe mgbe ahụ bụ nanị ịhapụrụ ndị mmadụ akwụkwọ wee kpọọ ha òkù ka ha bịa otu ebe maka ọmụmụ ihe ìgwè. Anyị lekwasịrị anya nanị ná ndị ahụ na-asụ Bekee, ndị na-aza ndị Kristian n’aha.
Ná mmalite, anatara m aha na address nke ndị nile tụrụ ụtụ ỤIọ Nche. Ihe ka ọtụtụ ná ndị a bụ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè ma ọ bụkwanụ n’ụlọ nzipụ ozi. Ejekwuuru m nke ọ bụla n’ime ha ịchọta ndị nwere ezi mmasị. Ruo ọtụtụ afọ, ana m aga na Punjab ahụ nke dị n’ebe ugwu India na January, wee mee njegharị site Lahore ruo Karachi. Ebe ọ bụ na ọha mmadụ n’ebe ahụ enweghị mmasị na Bible, obodo nta ebe ndị e nwere ndị na-aza ndị Kraịst n’aha dị ole na ole, dịkwa anya otu site n’ibe ya.
Otu nwanna na-esoro m na-aga njem dị ka onye nsụgharị okwu, anyị bikwara n’etiti ndị ebe ahụ, sorokwa ha rikọọ nri. Ndị bi n’obodo ndị ahụ bi n’ụlọ nta ndị e ji ájá ụrọ a gbara n’anwụ wee wuo, ndị e ji akịrịka ma ọ bụ osisi kpuchite elu ha. Ha na-ehi ụra n’elu charpoy, bụ́ àkwà nta ndị nwere ụkwụ anọ e ji osisi na eriri kekọta. Mgbe mgbe, ndị ọrụ ubi ahụ na-anọdụ n’elu charpoy ha, na-ejide Bible n’aka, na-ese anwụrụ site n’otu ọkpọkọ e ji mmiri na-eme ka ọ jụọ oyi, nke ogologo ya dị ihe dị ka amaụkwụ abụọ ma ọ bụ atọ [0.5 ruo 1 mita], na-asata site n’otu akụkụ akwụkwọ nsọ gaa n’ọzọ ka anyị nọ na-akọwara ha eziokwu nile nke okwu Chineke. Ịnọ n’èzí na-eme nzukọ ghọrọ nnọọ ihe dị mma ebe ọ bụ na akụkụ ka ukwuu n’afọ adịghị enwe mmiri ozuzo. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị Europe na-eleda ịbịa ụdị nzukọ ndị ahụ anya, ndị India ahụ na-ezukọta n’ebe ọ bụla.
Anyị gbalịrị ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ ihe n’ọtụtụ asụsụ ruo ókè o kwere mee. Akwụkwọ nta ahụ bụ́ World Distress n’asụsụ Kanarese nwere nnọọ ihe ịga nke ọma pụtara ìhè. Ọ kpaliri onye editọ nke otu akwụkwọ okpukpe a na-ebipụta site na mgbe ruo na mgbe n’asụsụ Kanarese ịkpọ anyị ka anyị na-eweta isiokwu ndị a ga na-ebipụta n’akwụkwọ ya, ruokwa ogologo oge ụfọdụ, anyị bipụtara akwụkwọ ahụ bụ́ Deliverance dị ka usoro isiokwu a na-ebipụta n’izu abụọ ọ bụla.
N’ime afọ ndị ahụ dị site na 1926 ruo 1938, ndị ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi rụrụ ọrụ nkwusa dị ukwuu. Anyị gara njem ọtụtụ puku maịlụ, kesaakwa akwụkwọ hiri nne nke ukwuu, ma ito uto e nwere ehighị nne nke ukwuu. Na 1938, e nwere nanị 18 ndị ọsụ ụzọ na 273 ndị nkwusa n’ime 24 ọgbakọ ndị dịsasịrị n’India nile.
N’Oge Agha Ụwa nke Abụọ
Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ na 1939, ma n’agbanyeghị nke ahụ, anyị nọgidere ná nkwusa anyị. N’eziokwu, ná mmalite afọ 1940, anyị malitere ọrụ ịgba àmà okporo ụzọ. Ọbụna ụmụnna anyị ndị nwanyị bụ́ ndị India keere òkè, nke bụ́ ihe kwesịrị ịrịba ama n’iburu omenala ndị ebe ahụ n’uche. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, otu onye mmụta Bible gwara otu Onyeàmà, onye gwara ya ka o kere òkè n’ọrụ dị otú ahụ, sị: “Abụ m nwanyị onye India, a pụghịkwa ịhụ m ka m nọ na-agwa nwoke okwu n’okporo ụzọ n’ihi na a ga-akwa m emo n’etiti ndị agbata obi anyị nile. Apụghị m ịgwa nwoke okwu n’okporo ụzọ ọbụna ma a sị na ọ bụ onye ikwu m.” Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ụmụnna anyị nwanyị bụ́ ndị Kraịst n’India aghọwo ndị ozi ihu ọha na-anụ ọkụ n’obi.
N’afọ ndị mbụ ndị ahụ, e mekwara ndokwa inwe mgbakọ dị iche iche. A na-eji oge ụtụtụ nile eme ihe n’ozi ubi, nke akụkụ ka ukwuu n’ihe a na-eme bụ ịga ije ọtụtụ maịlụ, na-agwa ndị bi n’ebe ahụ na ndị na-agafe n’okporo ụzọ banyere nzukọ ihu ọha ndị ahụ. Ihe karịrị 300 mmadụ bịara otu n’ime nnọkọ ndị a, bụ́ nke e mere n’okpuru ụlọ ndo e ji achara na igu nkwụ wuo. Ma ọ baghị uru ọ bụla ikwu kpọmkwem oge a ga-amalite, ebe ọ bụ nanị mmadụ ole na ole nwere klọkụ. Ihe ha na-eme bụ ịbịawa mgbe o metụrụ ha n’obi, nzukọ ndị ahụ na-amalitekwa mgbe e nweworo ọnụ ọgụgụ hituru nne nke ndị bịaranụ. Ndị mmadụ nọgidere na-abata mgbe nzukọ ahụ na-aga n’ihu.
Usoro ihe omume ahụ na-anọgidekarị na-aga n’ihu ruo elekere iri nke anyasị, mgbe ahụkwa ọtụtụ ndị na-aga ije ọtụtụ maịlụ iji laruo ụlọ ha. Ọ bụrụ na ọnwa na-agba, ọnọdụ na-aka mma; ebe nile na-ajụ oyi, dịkwa mma. Ọ bụrụ na ọnwa adịghị agba, ndị mmadụ na-ewere igu nkwụ, pịakọta ya iji mere ọwá. Ọ bụrụ na a mụnye ya ọkụ, ọwá ahụ ga na-amụke amụke. Mgbe a chọrọ ìhè karị, a na-efegharị ihe ọkụ ahụ n’ikuku ruo mgbe o nwupụtara ire ọkụ. Nke a na-enye ìhè zuru ezu iji chọta ụzọ n’ebe ala na-adịghị larịị.
N’ihe dị ka oge a, gọọmenti machibidoro ibubata akwụkwọ ndị Society na-ebipụta n’India na Ceylon. E bukọọrọ obere ígwè obibi akwụkwọ anyị dị na Travancore, gọọmenti etiti mba ahụ nyekwara iwu ka a kwụsị ibipụta akwụkwọ anyị nile. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, na 1944, otu n’ime ụmụnna anyị, onye bụ ọkà n’usoro ịgwọ ọrịa physiotherapy, nọ na-elekọta Sir Srivastava, bụ́ onye minista na Gọọmenti onye Viceroy ahụ, e wee welitere ya okwu metụtara mmachibido iwu ahụ.
A gwara nwanna anyị ahụ, sị, “Echegbula onwe gị.” Sir Srivastava kọwaara ya na Mazị Jenkins (onye minista ahụ ọrụ anyị na-adịghị amasị) gaje ịla ezumike nká n’oge na-adịghị anya, na otu ezi enyi Sir Srivastava gajekwa iwere ọnọdụ ya. “Gwa Mazị Skinner ka ọ bịa hụ m,” ka Sir Srivastava kwuru n’ụzọ agbamume, “m ga-edujekwa ya na nke Sir Francis Mudie,” bụ́ onye ahụ gaje iwere ọnọdụ Jenkins. E mesịrị kpọọ m; mụ na Mazị Mudie kwurịtara okwu, ọchịchị wee wepụ mmachibido iwu ahụ na December 9, 1944.
Ihe Ndị Na-enye Ọṅụ
E nwere otu oké ihe na-enye ọṅụ nke mere na 1947 mgbe ndị ozi ala ọzọ mbụ a zụrụ na Gilead bịarutere n’India. Ọbịbịa ha dabakọrọ n’otu oge dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke India, ebe ọ bụ na kpọmkwem n’afọ ahụ, n’August 15, ka ha nweere onwe ha pụọ n’ọchịchị ndị Britaịn. Mgbe mba ahụ kewara ịbụ India nke ndị Hindu na Pakistan nke ndị Alakụba, e nwere oké mgbukpọ mmadụ. N’agbanyeghị nke a, e zijere mmadụ abụọ a zụrụ na Gilead na Pakistan, bụ́ nke ghọworo mba guzooro onwe ya n’August 14. N’oge na-adịghị anya, ndị ozi ala ọzọ iri ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’India n’onwe ya, ọtụtụ ndị ọzọ bịakwara inye aka n’afọ ndị na-esonụ.
O wetakwuuru obi m ọṅụ mgbe a na-eguzobe usoro dị iche iche a hazigharịrị ahazigharị. A malitere ọrụ sekit na 1955 mgbe a họpụtara nwanna Dick Cotterill, bụ́ onye a zụrụ na Gilead, dị ka onye nlekọta sekit mbụ. O jere ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo mgbe ọ nwụrụ na 1988. Mgbe ahụ, na 1960, anyị nwere ndokwa mbụ na-adịgide adịgide nke onye nlekọta distrikti, nke mere ihe dị ukwuu iji nyere sekit ndị ahụ aka. Mgbe 1966 gasịrị, ọ dịkwaghị ndị ozi ala ọzọ si mba ọzọ e kwere ka ha bata ná mba ahụ. Ma n’oge na-adịghị anya, e meghere ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, e dupụkwara ndị ọsụ ụzọ ruru eru bụ ndị India ije n’ọtụtụ akụkụ nke India. Taa, e nwere ihe dị ka 300 mmadụ ndị nọ n’ọrụ a.
Ọ bụ nanị na 1958 ka anyị mesịrị ruo ọnụ ọgụgụ 1,000 ndị nkwusa Alaeze. Mgbe nke ahụ gasịrị, mmụba ahụ bịara ngwa ngwa. Ugbu a kwa, anyị nwere ihe karịrị 9,000. Karịsịa, ọnụ ọgụgụ dị 24,144 ndị bịara Ememe Ncheta na 1989 gosiri na ọtụtụ ndị ọzọ nwere mmasị na-achọ enyemaka. Ugbu a, Sri Lanka bụ alaka ụlọ ọrụ nke guzooro onwe ya. Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ na ha esitewo na nanị ndị nkwusa abụọ na 1944 mụbaa ruo ihe karịrị 1,000 taa, n’agbanyeghị agha ahụ a nọ na-ebu n’obodo ha.
Ito uto n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa emewokwa ka e nwee ito uto n’alaka ụlọ ọrụ anyị. Mgbe ọ nọsịrị 52 afọ n’obodo ukwu Bombay ahụ na-ekwo ekwo, isi ụlọ ọrụ anyị kwapụrụ na 1978 jee n’obodo ahụ dị nso bụ Lonavla. Ọ dịghị mgbe ọ bụla m chere na anyị gaje inwe ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ ndị dị ka ígwè kọmputa MEPS na nnukwute ígwè obibi akwụkwọ na-ebipụta akwụkwọ na kọlọ abụọ ndị anyị ji na-ebipụta akwụkwọ a na-eji amụ Bible n’ọtụtụ asụsụ ndị India. Taa, anyị na-ebipụta Ụlọ Nche n’asụsụ itoolu, nakwa akwụkwọ ndị ọzọ n’iri asụsụ abụọ dị iche iche.
Ọ dịghị mkpa ikwu ya ekwu na oge agafewo mgbe anyị nwere alaka ụlọ ọrụ nwere nanị mmadụ abụọ. Ugbu a, anyị nwere ezinụlọ Betel nke nwere ihe karịrị 60 ndị nọ na ya! N’ịbụ onye dị 95 afọ, enwere m obi ụtọ na m ka nọ n’ozi oge nile n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, na-ejekwa ozi dị ka otu n’ime ndị Kọmitii Alaka nke India. Karịsịa, ọ bụụrụ m nnọọ ihe ọṅụ ịhụ ọrụ owuwe ihe ubi ahụ n’ime mgbe ikpeazụ ndị a. N’ezie, ọ bụ ihe na-enye ọṅụ.