Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 1/15 p. 7
  • Ntọgha Constantine Ọ̀ Bụ Gaa na Gịnị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ntọgha Constantine Ọ̀ Bụ Gaa na Gịnị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Constantine Onye Ukwu—Ọ̀ Bụ Onye Nkwado nke Iso Ụzọ Kraịst?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Otú Krisendọm Si Ghọọ Akụkụ Ụwa Nke A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 1/15 p. 7

Ntọgha Constantine Ọ̀ Bụ Gaa na Gịnị?

IIHE ahụ a sịrị na ọ bụ ntọgha nke onyeeze Rom bụ́ Constantine abụwo ihe na-akpali mmasị ndị ọkà mmụta okpukpe ruo ogologo oge. Dị ka ihe ndekọ ndị o mere n’onwe ya na-egosi, n’ụbọchị gasịrị tupu a lụọ agha nke o nwere mmeri na ya n’afọ 312 O.A., Constantine ahụ na-ekpere arụsị hụrụ ọhụụ nke otu obé nke ihe e dekwasịrị ya bụ: “Site [n’ihe ịrịba ama] nke a, nwee mmeri.” A “tọghatara” ya nwa mgbe nta mgbe nke a gasịrị, (n’afọ 313 O.A.) wee weta mkpagbu a na-akpagbu ndị Kraịst n’alaeze Rom ná njedebe. Constantine gbara ụdị Iso Ụzọ Kraịst e nwere mgbe ahụ ume dị ka okpukpe nke Ọchịchị kwadoro, ọbụna na-etinye ọnụ n’esemokwu ndị dị n’ime chọọchị dị iche iche. Otú ọ dị o mekwara omume ndị mere na a na-enyo ya enyo ma ntọgha ya ò zikwara ezi, e meghịkwa ya baptism ruokwa nwa mgbe nta tupu ọ nwụọ mgbe 24 afọ gasịrị.

N’otu ihe odide dị n’akwụkwọ Bible Review, onyeọkà mmụta mkpụrụ ego, onye bụkwa onye na-amụ ihe e ji enweta akara mmụta doctorate n’ọkà mmụta okpukpe, bụ́ Stanley A. Hudson kpughere otú ụdị mkpụrụ ego ndị e mepụtara n’oge ọchịchị Constantine si mee ka e nweta ihe ọmụma ụfọdụ na-akpali mmasị banyere isiokwu a. Ruo oge Constantine, ọ bụ ihe a na-ahụkarị, bụ́ mkpụrụ ego ndị Rom igosipụta chi ndị Rom dị iche iche a ma ama. Ma Hudson kọrọ na mgbe ntọgha Constantine gasịrị, isiokwu ndị metụtara ikpere arụsị malitere ibelata—e wepụkwa otu. A malitere ibipụta mkpụrụ ego ndị na-egosi Sol, bụ́ chi nke anyanwụ—nke bụbu nke kasị na-amasị Constantine—n’ebe ọ dị ukwuu. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

Hudson tụrụ aro ihe abụọ pụrụ ịkpataworị nke a. Nke mbụ, ọ pụrụ ịbụ na ntọgha Constantine ji nwayọọ nwayọọ bịa—n’agbanyeghị oké ọhụụ ahụ ọ hụrụ. Ma ọ̀ bụkwanụ na Constantine chere na Sol bụ Jisọs. Usoro ngwakọta ụdị nkwenkwe abụọ bụ ihe a na-ahụkwa ọbụna taa. Dị ka ihe atụ, na Latin America, chi nwanyị ndị ahụ e nwere tupu Columbus ejee ebe ahụ, bụ́ Pacha-Mama na Tonantzin ka bụkwa ndị a na-efe ofufe n’okpuru aha bụ́ Meri Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke. N’otu ụzọ ahụ, ọ pụrụ ịbụworị na Constantine fere Sol ofufe n’okpuru aha Jisọs.

Ụdị ngwakọta nkwenkwe dị otú a ga-akọwa ihe mere e ji họrọ December 25th, bụ́ ‘ụbọchị ọmụmụ nke anyanwụ ahụ a na-emerighị emeri,’ ịbụ ụbọchị a ga-eme ememe ncheta ọmụmụ Jisọs. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịghọta ihe mere e ji dee ná mkpụrụ ego e mepụtara iji na-echeta ọnwụ Constantine, DV Constantinus” (“Constantine Onye Bụ Chi”). Nke a na-egosi na, n’agbanyeghị ntọgha ya na baptism e mesịrị mee ya, a nọgidere na-ele Constantine anya dị ka onye bụ chị mgbe ọ nwụsịrị, dịkwa ka ndị eze ndị bu ya ụzọ, ndị bụ́ ndị ọgọ mmụọ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 7]

The Metropolitan Museum of Art. Bequest of Mrs. F. F. Thompson, 1926 (26.229)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya