Ahuwo M Ka Ọ Na-eto n’Ebe Ndịda Africa
Dị ka Robert Albert McLuckie si kọọ
ORỤ ikwusa Alaeze ahụ na South Africa na-aga n’ihu n’ụzọ dị ukwu. Site n’ihe dị ka otu narị ndị na-ekwsa ozi ọma ahụ ná ngwụsị afọ ndị 1920, e nwere ugbu a ihe dị ka 45,000 ndị na-akpọsa ozi ọma ahụ na South Africa. Ihe dịkwa ka 150,000 ndị ọzọ na-ekwusa ozi ọma ahụ ná mba ndị ọzọ ebe alaka ụlọ ọrụ anyị nke dị na South Africa na-elekọtabu anya.
Enwewo m ọṅụ ịhụ uto nke a dị ịtụnanya n’ebe ndịda Africa n’ime 60 afọ ndị ahụ gara aga! Ka m gwa gị ná mkpirikpi banyere ya na banyere òkè mụ na ezinụlọ m nweworo ihe ùgwù ikere na ya.
O Ji Ọdachi Wee Malite
Na June 22, 1927, nwunye m m hụrụ n’anya, bụ́ Edna, nwụrụ, na-ahapụ nwa anyị nwanyị, bụ́ Lyall, gbara afọ atọ na nwa anyị nwoke, bụ́ Donovan, gbara afọ abụọ. Adị m nanị 26 afọ. Onwụ ya mere ka m jupụta n’iru újú nakwa ná mgbagwoju anya. Ebee ka ọ nọ? N’ekweghị na ọ nọ na hell, enwetara m nkasi obi ụfọdu n’abalị site n’ịrọ nrọ na ọ nọ n’eluigwe.
N’ọnwa July obere nwa m bụ Donovan nyere m otu mpempe akwụkwọ nke e dere aha onye ọzọ, nke a tụnyere n’ebe anyị na-esi anata akwụkwọ ozi n’amaghị ama. Ihe dị n’ime ya bụ otu okwu ihu ọha Joseph Rutherford kwuru, bụ́ onyeisi oche nke abụọ nke Watch Tower Society. Ihe ndị dị n’ime ya masịrị m hie nne nke na m dere akwụkwọ ozugbo ka e zitere m akwụkwọ nile ndị e depụtara aha ha. O nweghị ka m si mata na nke a ga-agbanwe ndụ m.
N’ime akwụkwọ nta ndị ahụ bịaruterenụ, nke a kpọrọ Hell—What Is It? Who Are There? Can They Get Out? dọọrọ anya m. Lee aha obi ụtọ m nwere n’ezie ịhụ akwụkwọ nta ahụ! Mgbe m gụsịrị nanị peji abụọ ma ọ bụ atọ, eji m obi ụtọ chịa ọchị n’ezie.
N’ihi inwe ọchịchọ isoro ndị ọzọ kerịta ihe m mụtaworo, ana m edegara ndị mụrụ m ma ọ bụ ndị òtù ezinụlọ anyị ndị ọzọ akwụkwọ ma ọ bụ soro ha nwee mkparịta ụka. Dị ka ihe si n’ime ya pụta, ụmụnne m nwoke anọ, bụ́ Jack, Percy, William, na Sydney, ghọrọ ndị nwere mmasị n’oge na-adịghị anya, ha malitekwara ikwusara ndị ọzọ ozi ọma. Ka ọtụtụ afọ gasịrị, nna m, nne m, na ụmụnne m nwanyị abụọ, bụ́ Connie na Grace, natakwara eziokwu ahụ.
Apụghị m ịchọta Ndị Mmụta Bible ọzọ, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, n’akụkụ ebe anyị bi na South Africa. Akwagara m n’Ebe Ndịda Rhodesia, nke bụ Zimbabwe ugbu a, ma soro nwanne m bụ Jack rụọ ọrụ ruo ihe dị ka otu afọ n’otu ogige ebe a na-azụ ehi. Dị ka ihe si n’ịgụ akwụkwọ ndị Watch Tower Society bipụtara pụta, n’oge na-adịghị anya amalitere m inwe oké ọchịchọ ịbanye n’ozi oge nile.
Ka ọ dị n’oge ahụ ezutebeghị m ndị ọ bụla bụ́ ndị kwere ekwe e wezuga ndị ahụ m gbawooro àmà. Ya mere agara m njem ahụ dị 1,400 maịlụ [2,300 kilomita] n’ụgbọ okporo ígwè gaa n’alaka ụlọ ọrụ Society dị na Cape Town, South Africa. Lee aha nnabata kporo ọkụ m nwetara site n’aka George Phillips, bụ́ onye na-ahụ maka ọrụ ahụ n’ebe ndịda Africa! Na January 10, 1930, e mere m baptism.
Afọ Ndị Mbụ nke Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ
Ọ bụ ezie na agwawo m ọtụtụ narị ndị mmadụ okwu banyere Bible n’afọ atọ ndị ahụ gara aga, ekerebeghị m òkè n’ije ozi ụlọ ruo n’ụlọ. Otú o sina dị, e debara aha m n’ije ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ. E nweghị usoro ọzụzụ ọ bụla n’oge ndị ahụ. N’ezie, ndị nkwusa adịkebeghị agakọ n’otu ụlọ. Ebe ọ bụ na anyị nwere ndị nkwusa ole na ole, o yighị ihe ga-ekwe omume ime otú ahụ.
Dị ka ọ na-aghaghị ịdị, enwere m nchegbu banyere ọdịmma nke ụmụ m, bụ́ Lyall na Donovan, ndị nne na nna ha ochie na-elekọta. Ebe ọ bụ na ha na-enweta nlekọta dị mma, n’oge ahụ echere m na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịdọgbu onwe m n’ọrụ n’ịgbasa ozi Alaeze ahụ nye ndị ọzọ. Ya mere nke ahụ bụ ihe m mere.
N’afọ atọ na-esonụ nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, enwere m mmadụ ise mụ na ha na-arụkọ ọrụ, gụnyere nwanne m nwoke bụ Syd. O mesịrị bute ịba oké ahụ ọkụ ka ọ nọ n’ọrụ ọsụ ụzọ ma nwụọ. Ọrụ ọsụ ụzọ adịghị mfe n’oge gboo ahụ. Anyị na-eji bọs e ji ebu ndị njem na-eme ihe, bụ́ nke a rụnyere àkwà ndina n’ime ya, bụ́ ndị a pụrụ ịpịachi n’akụkụ ọ bụla nke bọs ahụ. Nke a mere ka anyị nwee ike ihi ụra, ịnọdụ ala, isi nri, na ịnọ n’ime ya rie nri.
Ihe omume kasị pụta ìhè n’oge mmalite nke ọrụ ọsụ ụzọ m bụ mgbe anyị natara aha ọhụrụ anyị, bụ́ Ndịàmà Jehova, na 1931, ya na akwụkwọ nta ahụ bụ́ The Kingdom—The Hope of the World. Echetara m nke ọma inwe mmetụta nke egwu dị ukwuu site n’iche banyere iji oké aha ahụ mee ihe, na-eche ma m̀ pụkwara iji ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
Ihe omume ọzọ kwesịrị ncheta n’afọ mmalite ndị ahụ bụ ime nwanne m nwoke bụ Jack na nwunye ya, bụ́ Dorrell, baptism n’ime mmiri agụiyi jupụtara n’ime ya nke Osimiri Nuanetsi n’Ebe Ndịda Rhodesia. Tupu e mikpuo ha na mmiri, anyị tụbara okwute n’ime osimiri ahụ iji chụpụ agụiyi ọ bụla zoro ezo. Mgbe e mesịrị, n’afọ ndị 1950, emere m nne m baptism n’ime ọkwá ịsa ahụ.
Ná Mba Ndị Ọzọ
Na 1933 e kenyere mụ na onye òtù m nke ise, bụ́ Robert Nisbet, ókèala ọhụrụ nke a na-akpabeghị aka—agwaetiti nke Mauritius na Madagascar nke dịpụrụ n’ụsọ osimiri ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Africa. Anyị tinyere akụkụ ka mma nke ọnwa anọ anyị nọrọ n’agwaetiti ndị ahụ n’ịkụ mkpụrụ nke eziokwu Bible. Lee aha ọṅụ ọ bụ ugbu a ịhụ na Mauritius nwere ihe dị ka 800 ndị nkwusa Alaeze, Madagascar nwekwara ihe dị ka 3,000! Mgbe anyị lọghachiri na South Africa, mụ na Robert kewara. O mesịrị soro nwanne m bụ Syd rụkọọ ọrụ ọsụ ụzọ, mesịakwa jee ozi dị ka onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ na Mauritius.
Tupu anyị alọghachi na South Africa, emere m ndokwa ije hụ Lyall na Donovan n’ụlọ nna m. Mgbe mụ na ha nọkọsịrị, nkewa a na-apụghị igbochi egbochi bịara, ákwá sochikwara. Agara m ije ịhụ onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ, bụ́ Nwanna Phillips, ịnata ebe ọzọ a ga-ekenye m ọrụ. Ọ bụ Nyasaland, nke bụ Malawi ugbu a. A zụtaara m otu ụgbọ ala Chevrolet a rụpụtara na 1929 ka m jiri mee ihe n’ebe ahụ.
Ya mere, na 1934, ebiliri m ịga njem ahụ dị 1,200 maịlụ [1,900 kilomita], na-agakarị n’ụzọ ruru unyi, site na Johannesburg, South Africa, ruo Zomba, bụ́ isi obodo Nyasaland. N’ikpeazụ erutere m n’ebe m na-aga, n’ụlọ otu nwanna bụ onye Africa, bụ́ Richard Kalinde. Ọ ghọrọ enyi m na-anọkarị m nso na onye nsụgharị okwu n’oge nile m nọ na Nyasaland. Ka oge na-aga, enwetara m ọnụ ụlọ abụọ n’otu ụlọ oriri meworo ochie nke a na-ejikwaghị eme ihe. Eji m otu mere ụlọ ọrụ nkwasa akwụkwọ, na nke ọzọ maka ebe obibi.
Ọrụ m na Nyasaland bụ kpọmkwem ime ka udo dị site n’ọnọdụ ọgba aghara ndị ahụ dapụtara site n’òtù ndị ahụ a kpọrọ Watchtower. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, otu onye Africa, bụ́ onye maara banyere ihe odide nke onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society, bụ́ Charles Taze Russell, anọwo na-ahụ maka mbilite nke òtù ndị a, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ya onwe ya ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova.—Lee 1976 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peji 71-74.
Eletara m ọgbakọ dị iche iche nke ndị ahụ na-eji akwụkwọ Watch Tower na-eme ihe ma gụpụta otu nkwupụta okwu banyere aha ọhụrụ anyị, bụ́ Ndịàmà Jehova. A gwara ndị nile kwadoro nkwupụta okwu ahụ ka ha gosipụta nke ahụ site n’iweli aka ha elu. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ gosipụtara otú ahụ, ọtụtụ aghọtachaghị ihe nke a gụnyere n’ezie. Otú a, ruo ọtụtụ afọ, ebe ụfọdụ na-enweghị ike inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, ndị ọzọ jụrụ inye onye ha leburu anya dị ka onyeisi nkwado ha kpam kpam ma ghọọ Ndịàmà Jehova n’ezie.
Mgbe m nọsịrị ihe dị ka ọnwa isii na Nyasaland, agafere m na Mozambique, bụ́ ebe a na-akpọsabeghị ozi Alaeze ahụ. N’ebe ahụ ezutere m otu nwa okorobịa bụ́ onye Portugal na-arụ ọrụ, onye mụ na Robert Nisbet zutere n’ụgbọ mmiri mgbe anyị na-aga Mauritius. Ọ kpọrọ m iso ya rikọọ nri, enwekwara m ike iso ya nwee nkwurịta okwu.
N’oge ọzọ, ka m nọ n’otu ime obodo dị n’ebe ugwu Mozambique, otu ụgbọ ala kwụsịrị n’akụkụ m. Onye nọ n’ime ya wee bụrụ onye na-achị ógbè ahụ. Ọ jụrụ ma ya pụrụ inyere m aka, ọ kpọkwara ka m bịa n’ụlọ ya, bụ́ ebe ọ nọ nata ọtụtụ n’ime akwụkwọ nke Watch Tower. Ọ bụ ezie na a machibidoro ọrụ ime nkwusa iwu ugbu a na Mozambique na Nyasaland (Malawi), ọ bụ ihe obi ụtọ nye m ịmara na ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị ndị na-ekwesị ntụkwasị obi na-arụsi ọrụ ike n’ebe ahụ.
Ihe Ùgwù Dị Iche Iche nke Betel
Mgbe m lọghachitere na Nyasaland, lee aha ihe ijuanya m natara! A kpọrọ m òkù isonyere ndị ọrụ nọ n’alaka ụlọ ọrụ South Africa nke dị na Cape Town, e zigara nwanne m nke m tọrọ na Nyasaland ka ọ nọchie anya m. Ya mere ebiliri m ịga njem dị 2,200 maịlụ [3,500 kilomita] n’ụgbọ ala Chevrolet ahụ. Mgbe m na-aga, eletara m Donovan na Lyall. Ha dị 11 na 12 afọ ugbu a, ọ ga-ewekwa otu afọ ọzọ tupu m hụ ha anya ọzọ.
E kenyere m ọrụ ilekọta alaka ụlọ ọrụ ahụ mgbe ọ bụla Nwanna Phillips, bụ́ onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ ahụ, na-anọghị. Ọ bụ ezie na ọ dịbeghị mgbe ọ bụla m sooro otu ọgbakọ ọ bụla nke Ndịàmà Jehova kpakọrịta ruo ogologo oge kemgbe m natara eziokwu ahụ n’afọ itoolu gara aga, na 1936 a họpụtara m ịbụ onyeisi oche ndị nlekọta nke Ogbakọ Cape Town, nke ihe dị ka 20 ndị nkwusa mejupụtara.
Ịlụ Nwunye
Achọghị m ịhapụ ihe ùgwù ije ozi ndị m nwere, ma Lyall na Donovan abanyewela n’afọ iri na ụma ha, enwekwara m nchegbu banyere ọdịmma ha, tinyere ọdịmma ime mmụọ ha. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ihe ngwọta dịrị nsogbu ahụ dị nso.
Na June 6, 1936, Nwanna Phillips mere ka m mara ndị ọhụrụ sitere Australia, bụ́ Nwanna Nwanyị Seidel na nwa ya nwanyị mara mma dị 18 afọ, bụ́ Carmen. N’ime afọ ahụ mụ na Carmen lụrụ di na nwunye. Ya mere enwetara m ọrụ ego ma nweekwa ebe obibi.
Ruo otu afọ enwere m ọrụ m na-arụ na South Africa, ma mgbe ahụ mụ na Carmen na nwa nwoke ọhụrụ anyị, bụ́ Peter, kwagara na n’Ebe Ndịda Rhodesia, bụ́ ebe nwanne m nwoke bụ Jack kpọrọ m ka m sonyere ya n’ebe ahụ n’ọrụ igwu ọlaedo. Mgbe anyị haziri ihe nile, Lyall na Donovan, bụ́ ndị anyị hapụụrụ nne Carmen sonyeere anyị.
Iche Mkpagbu Oge Agha Ihu
Na September 1939, Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ, n’afọ na-esokwa ya, a machibidoro akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible iwu. Anyị kpebiri ịnwale otú iwu ahụ si sie ike site n’ikesa akwụkwọ ndị ahụ n’agbanyeghị ihe ga-esi na ya pụta. A nwụdere ma maa anyị ikpe, a chịkọkwaara ma suo akwụkwọ na Bible anyị ọkụ.
N’otu ụtụtụ mgbe anyị jesịrị ozi ọma, otu onye ọrụ nchọpụta kpọrọ anyị ka anyị bịa kpọrọ ụmụaka anyị n’ogige ndị uwe ojii ebe a kpọjere ha. Anyị jụrụ, na-ekwu na ebe ọ bụ na ụmụaka ndị ahụ bụ ndị e ji eji n’ezie, ọ bụ ọrụ dịịrị ndị uwe ojii ilekọta ha anya. N’ehihie ahụ, mgbe anyị si n’ozi ubi lata, anyị hụrụ ụmụ anyị ka ha nọ n’ụlọ n’enweghị nsogbu ọ bụla ma ọ dịghị onye uwe ojii ọ bụla anyị hụrụ!
N’oge ọzọ, na 1941, a tụrụ Carmen mkpọrọ ọnwa atọ ọ bụ ezie na ọ dị ime. Otú ọ dị, a mụrụ Estrella tupu Carmen agawa mkpọrọ ya. Kama ịhapụrụ m nwa ọhụrụ ahụ n’ụlọ, Carmen họọrọ iku ya gaa n’ụlọ mkpọrọ. Otú a, Estrella nwetara onye na-eku ya, bụ nwanyị onye Africa nke gbuworo di ya. Mgbe a tọhapụrụ Carmen, nwanyị ahụ gburu di ya nwere nkụda mmụọ hie nne nke na o bere ákwá dị ilu. Dị ka o si daba, Estrella malitere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ na 1958 n’oge ọ dị 15 afọ. Mgbe e mesịrị, ọ lụrụ Jack Jones, ruokwa ihe karịrị 20 afọ ugbu a o sorowo di ya jee ozi na South Africa, ugbu a ha nọkwa n’isi ụlọ ọrụ Watch Tower Society nke dị na Brooklyn, New York.
N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị anọkwara m ọtụtụ ọnwa n’ime ụlọ mkpọrọ n’ihi izisa ozi ọma. N’oge m nọ n’ebe ahụ, na January 1942, Joseph Rutherford nwụrụ. Apụghị m igbochi onwe m ibepụta anya mmiri n’abalị ahụ ka m nọ nanị m n’ọnụ ụlọ mkpọrọ nke m. Enwere m ohere dị iche iche iji gbaa àmà, n’otu ụtụtụ Sunday, ka onye ọ bụla nọ n’èzí ogige ahụ maka imesa ahụ, emere m onye mụ na ya nọ n’ụlọ mkpọrọ baptism bụ́ onye nataworo ozi Alaeze ahụ.
Alaka Ụlọ Ọrụ Ọhụrụ
Mgbe a tọhapụsịrị m n’ụlọ mkpọrọ, enwetara m ọrụ n’ụlọ ọrụ okporo ígwè dị na Bulawayo. Carmen amụwo ka e si akwa ákwà n’ụlọ mkpọrọ, o jikwa nke ahụ nye aka n’ịkwado ezinụlọ. Lyall si South Africa lọghachi, bụ́ ebe ọ nọworo na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ, o nyekwara aka maka mmefu dị iche iche. Dị ka ihe si na ya pụta, n’oge na-adịghị anya anyị nwetara ego dị ukwuu karịa nke dị anyị mkpa, ya mere anyị kpara ya na nkata, e wee kwekọrịta na m pụrụ ịmaliteghachi ozi oge nile.
N’ihi inwe akwụkwọ ikike ịbanye ụgbọ okporo ígwè n’akwụghị ụgwọ, na 1947 eji m ụgbọ okporo ígwè gaa Cape Town ije hụ Nwanna Phillips. N’ụzọ tụrụ m n’anya, e nyere m ọrụ imepe ebe nkwasa akwụkwọ maka ilekọta akwụkwọ Society na Bulawayo. Mgbe ahụ, n’afọ na-eso ya, Nathan H. Knorr, bụ́ onyeisi oche nke atọ nke Watch Tower Society, letara ma mee ndokwa ka ebe nkwasa akwụkwọ ahụ bụrụ alaka ụlọ ọrụ na September 1, 1948, na-enwe Eric Cooke dị ka onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ nke Ebe Ndịda Rhodesia. Ruo 14 afọ na-eso ya, enwere m ihe ùgwù nke ịrụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ ma, n’ezie, soro ezinụlọ m na-amụba amụba biri n’ụlọ. Enwere m obi ekele hie nne maka nkwado n’ụzọ ihe onwunwe nke Carmen na ụmụ anyị ndị nke ka okenye nyere, na-eme ka o kwe m omume ịnọgide na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ.
Ọrụ Ọzọ nke Ime Nkwusa
Na 1962, mụ na Carmen nwere ọchịchọ ije n’ubi n’ụzọ ka buo ibu ma rụọ ọrụ n’ebe e nwere mkpa ka ukwu. Ya mere anyị rere ụlọ anyị ma kpọrọ Lindsay na Jeremy, bụ́ ụmụ anyị abụọ ndị kasị dị nta—ise ndị ọzọ etoputawo ma hapụ ụlọ—ma tinye isi na Seychelle Islands.
Na mbụ, anyị ji ụgbọ ala na-aga, karịsịa n’ụzọ ndị ruru unyi, ruo ihe dị ka 1,800 maịlụ [2,900 kilomita], na-erute na Mombasa, Kenya. Anyị hapụrụ ụgbọ ala ahụ n’aka otu nwanna nwoke ma banye n’ụgbọ mmiri ịga Seychelles. Otu onye nwere mmasị mere ka anyị mara ndị ọzọ, n’oge na-adịghị anya anyị malitekwara nzukọ dị iche iche n’ebe dị nnọọ nso n’ụlọ onye bishọp. Anyị nwekwara nzukọ ndị ọzọ n’agwaetiti dịdebere anyị nsọ n’ime otu ụlọ ụgbọ mmiri mmadụ nwe nke úkwù nkwu ndị toro ogologo gbara gburugburu, a na-anụkwa ụda ebili mmiri ka ha na-etipụta n’ụsọ osimiri.
N’oge na-adịghị anya ọrụ anyị pụtara ìhè, ndị na-achị isi mesịkwara nye anyị iwu ịkwụsi ikwusa ozi ọma, nke bụ nnọọ ihe anyị na-apụghị ikweta ime. (Ọrụ 4:19, 20) Ya mere anyị bụ, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị a chụpụrụ achụpụ, ma ka ọ dị mgbe ahụ, anyị emewo mmadụ ise baptism. N’ọnụnọ ọnwa ise anyị nọrọ na Seychelles, Carmen dịrị ime Andrew, bụ́ nwa ikpeazụ anyị. Mgbe anyị lọghachitere n’Ebe Ndịda Rhodesia, nwa anyị nwanyị bụ Pauline kpọrọ anyị ka anyị nọnyere ya na di ya ruo mgbe a ga-amụ Andrew.
Ngọzi na Afọ Ojuju Dị Iche Iche
Enwere m obi ụtọ ikwu na ụmụ asatọ nile anyị mụrụ, tinyere Lyall na Donovan, arụwo ọrụ ọsụ ụzọ n’otu oge ma ọ bụ n’oge ọzọ. N’ezie, anọ n’ime ụmụ anyị ndị nwoke na ndị ọgọ anyị nwoke bụ ndị okenye ugbu a, abụọ bụkwa ndị ohu na-eje ozi. Tụkwasị na nke a, lee aha obi ụtọ anyị nwere na ọtụtụ n’ime ụmụ ụmụ anyị na ndị ụmụ ụmụ anyị mụtara, tinyekwara ndị mụrụ ha na-akpọsa ozi ọma ahụ ná mba anọ ma ọ dịkarịa ala, na ọtụtụ n’ime ndị ọzọ so n’ezinụlọ McLuckie na-ejekwara Jehova ozi. O doro m anya na ihe ndị dị otú ahụ si na ya pụta bụ n’ihi ọbịbịa ezinụlọ anyị na-abịachi nzukọ nile anya ma na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ n’oge nile.
Ugbu a n’afọ ndụ nke 89, aka m nwere ihe ùgwù nke ịbụ onye okenye n’ọgbakọ anyị dị na Pietermaritzburg, South Africa. Ọ na-ewetara m ezi afọ ojuju ma m leghachi anya azụ n’ihe karịrị 60 afọ n’ozi a gọziri agọzi nke Jehova. Ọ bụ ngọzi karịsịa, ịhụworị ọgbọ ise nke ezinụlọ anyị, tinyere ndị mụrụ m, ka ha na-eto Jehova, bụ́ Chineke ukwu ahụ nke eluigwe na ala nile.