Ịgba Àmà n’Ógbè Azụmahịa—Ụzọ Ndị Japan Si Eme Ya
IWU ahụ Jisọs Kraịst nyere ka e buru ọrụ ịgba àmà ahụ jeruo “ebe ụwa sọtụrụ” aghaghị ịgụnye ógbè azụmahịa. (Orụ 1:8) Na Japan, ịgba àmà Alaeze ahụ nye ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ọha na eze na ọfịs nnukwute ụlọ ọrụ dị iche iche na-abụ nnọọ ihe ịma aka. Ndị nkwusa Alaeze nọ n’otu ọgbakọ natara ikike iji magazin jee gbaa àmà n’otu ụlọ ọfịs dị n’otu nnukwu obodo n’oge e nwere nkwụsị ọrụ maka ntụrụ ndụ ehihie. Ọ bụghị nanị na ndị nkwusa ahụ kpekuru Jehova ekpere inye ha obi ike, kama ha leziri nnọọ anya banyere ụdị uwe ha yi na akparamagwa ha ọbụna kwadebe kaadị uwe ndị na-egosi aha ha, na-emekwa ka a mara ha dị ka Ndịàmà Jehova.
Onyeàmà na-abịakwute onye ọrụ, wee sị: “Biko ewela iwe, anatara m ikike ịgwa ndị nọ ebe a okwu. Ọ̀ ga-amasị gị ige m ntị mgbe ị na-eri nri?” Ọ dịrị mkpa Ndịàmà ahụ iji ezi echiche mee ihe, na-ejikwa okwu ndị “e ji nnú mee ka [ha] dị ụtọ” na-eme ihe. (Ndị Kọlọsị 4:6) N’ọbịbịa nke mbụ ha, ha tinyere 39 magazin, ma o were ọbịbịa anọ dị iche iche iji rụzuo ọrụ n’ụlọ ahụ nke nwere okpukpu asatọ ebe 1,500 mmadụ na-arụ ọrụ. Ha tinyere ngụkọta nke ihe karịrị otu narị magazin, nwetakwa ndị ha ga na-ewejere magazin mgbe mgbe, na-emekwa nletaghachi.
Otu n’ime ndị nkwusa ahụ jere nletaghachi na nke otu onye maneja. Mgbe ọ nụrụ ka a gụpụtara otu akụkụ akwụkwọ nsọ site na New World Translation, ọ sịrị: “Bible nke a dị mfe nghọta. Nke m na-agụbu bụ nke e ji asụsụ Japanese ochie dee, ọ bụkwa ihe siri ike nke ukwuu ịgụ ya.” e wejeere ya otu New World Translation n’izu na-eso ya.
Ùnu pụrụ imekwu ihe n’ókèala ọgbakọ unu iji kwusaara ‘ụdị mmadụ nile’ ozi ọma ahụ, gụnyere ndị nọ n’ógbè azụmahịa?—Tụlee 1 Timoti 2:4.