‘Ịtụle Onwe Anyị’ n’Oge Ememe Ncheta
“Ọ bụrụ na anyị atụlee onwe anyị, a gaghị ekpe anyị ikpe . . . ka e wee ghara (ịma anyị) ikpe.”—1 NDỊ KỌRINT 11:31, 32.
1. Gịnị ka o doro anya na ezi ndị Kraịst ga-achọ izere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
IHE ikpeazụ onye Kraịst ga-achọ bụ ka Jehova maa ya ikpe. Ime ihe na-amasịghị “Onyeikpe ụwa nile” pụrụ iduje n’anyị ịbụ ndị ‘a makọrọ ha na ụwa ikpe,’ bụrụkwa ndị nzọpụta funahụrụ. Nke a bụ eziokwu ma ànyị nwere olileanya iso Jisọs nweta ndụ n’eluigwe ma ọ bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala.—Jenesis 18:25; 1 Ndị Kọrint 11:32.
2, 3. N’okwu dị aṅaa ka a pụrụ ịma anyị ikpe, gịnịkwa ka Pọl kwuru banyere nke a?
2 Ná 1 Ndị Kọrint isi 11, Pọl onyeozi lebara anya n’otu okwu nke pụrụ ime ka anyị banye n’ikpe. Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị Kraịst e tere mmanụ ka ọ gwara okwu ahụ, ndụmọdụ ya dị mkpa nye mmadụ nile, karịsịa n’oge nke a n’afọ. Anyị ịtụle onwe anyị pụrụ inyere anyị aka inweta nkwado Chineke, bụrụkwa ndị a na-agaghị ekpe ikpe. N’ịtụle ememe Nri Anyasị Onyenwe Anyị ahụ a na-eme kwa afọ, Pọl dere, sị:
3 “Onyenwe anyị Jisọs n’abalị ahụ nke a raara ya nye n’aka mmadụ, ọ naara ógbè achịcha, keleekwa, wee nyawaa ha, sị, Nke a [pụtara, NW] ahụ m, nke a na-enye n’ihi unu: na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m. Mgbe ha risịrị nri anyasị, ọ narakwa iko otú ahụ, sị, Iko a [pụtara, NW] ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m: na-emenụ nke a, mgbe ọ bụla unu ga-aṅụ ya, ka unu wee na-echeta m. N’ihi na mgbe ọ bụla unu na-eri achịcha nke a, na-aṅụkwa iko ahụ, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa.”—1 Ndị Kọrint 11:23-26.a
4. Gịnị ga-ewere ọnọdụ n’anyasị nke April 10, 1990?
4 Mgbe anyanwụ dasịrị n’April 10, 1990, Ndịàmà Jehova ga-eme Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst. Otú ọ na-esikarị adị bụ na ìgwè ndị ga-ezukọta bụ otu ọgbakọ; n’ihi ya, a ga-enwe ohere maka ndị na-abụbeghị Ndịàmà. Gịnị ka nnọkọ ahụ ga-adị ka ya? A ga-enwe okwu dabeere na Bible. Mgbe ahụ, mgbe e kpesịrị ekpere, a ga-ebugharị ógbè achịcha ahụ. Ekpere ọzọ na-eduje n’ibugharị iko ahụ. Kama nke a ịgbaso ụkpụrụ ma ọ bụ usoro ihe omume a na-apụghị ịgbanwe agbanwe, ọnụ ọgụgụ achịcha ma ọ bụ iko ole e nwere na ụzọ a na-esi ebugharị ya bụ nke a na-edokwa dị ka ọnọdụ dị n’ebe ahụ si dị. Isi ihe dị mkpa bụ ka a hụ na e mere ka ihe nnọchianya ndị ahụ rute n’ihu mmadụ nile bịaranụ, ọ bụ ezie na ihe ihe ka ọtụtụ n’ime ha ga-eme bụ nanị ibufere ya onye ọzọ n’ekereghị òkè. Ma ọ̀ bụ gịnị ka a na-ebugharị, gịnịkwa ka ha pụtara? Ọzọkwa, gịnị ka anyị kwesịrị iburu ụzọ chebara echiche ka anyị wee tụlee onwe anyị?
‘Nke a Pụtara Ahụ M’
5, 6. (a) Gịnị ka Jisọs jiri ógbè achịcha ahụ mee? (b) Ụdị achịcha dị aṅaa ka o jiri mee ihe?
5 Anyị agụwo ihe Pọl “natara n’aka Onyenwe anyị” n’ihe banyere Ememe Ncheta ahụ. E nwekwara ihe ndekọ nke mmadụ atọ ndị dere Oziọma ahụ, nke otu n’ime ha nọ mgbe Jisọs Kraịst guzobere ememe nke a. (1 Ndị Korint 11:23; Matiu 26:26-29; Mak 14:22-25; Luk 22:19, 20) Ihe ndekọ ndị a na-ekwu na Jisọs bu ụzọ were ógbè achịcha, kpee ekpere, wee nyawaa ma kesaa ya. Gịnị bụ ógbè achịcha ahụ? N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, ọ̀ bụ gịnị ka a na-eji eme ihe taa? Gịnị ka ọ pụtara, ma ọ bụ nọchie anya ya?
6 Ụfọdụ n’ime ihe ndị e nwere n’ebe ahụ bụ ihe ndị sitere n’oriri Ememe Ngabiga ndị Juu ahụ, nke otu n’ime ha bụ achịcha na-ekoghị eko, bụ nke Moses kpọrọ ‘achịcha ekoghị eko, bụ́ achịcha mweda n’ala.’ (Deuterọnọmi 16:3; Ọpụpụ 12:8) A na-eji ntụ ọka wheat na-eme achịcha nke a n’etinyeghị ya ihe iko achịcha, nnú, ma ọ bụ ihe ụtọ dị iche iche. Ebe ọ bụ ihe na-ekoghị eko (Hibru, mats-tsah’), ọ na-adị mbadamba, na-agbajikwa agbaji; ọ ga-adị mkpa ịnyawasị ya anyawasi ka o wee kwe oriri.—Mak 6:41; 8:6; Ọrụ 27:35.
7. Gịnị ka Ndịàmà Jehova na-eji emere achịcha n’oge Ememe Ncheta ahụ?
7 Jisọs jiri achịcha na-ekoghị eko mee ihe ná Nri Anyasị Onyenwe Anyị, otú ahụ ka Ndịàmà na-emekwa taa. Matzoth nkịtị nke ndị Juu na-emezu nzube nke a ma ọ bụrụ na e tinyeghị ya ihe dị iche iche dị ka malt, yabasị, ma ọ bụ àkwá. (Matzoth nke ihe ndị ahụ dị n’ime ya agaghị ekwekọ nnọọ ekwekọ ná nkọwa ahụ bụ “achịcha mweda n’ala.”) Ma ọ bụkwanụ ndị okenye ọgbakọ pụrụ ịgwa otu onye ka o meta achịcha na-ekoghị eko site ná ngwakọta nke ntụ ọka wheat na mmiri. Ọ bụrụ na e nweghị ntụ ọka wheat, a pụrụ imeta achịcha na-ekoghị eko site ná ntụ ọka barley, osikapa, ọka nkịtị, ma ọ bụ ụdị mkpụrụ ọkụkụ ndị ọzọ. A na-agbatị ngwakọta ntụ ọka ahụ ka ọ dị mbadamba, wee sie ya n’elu ebe isi ihe nke e tere mmanụ nke nta.
8. N’ihi gịnị ka achịcha na-ekoghị eko ji bụrụ ihe nnọchianya kwesịri ekwesi, gịnịkwa ka ikere òkè na ya na-egosipụta? (Ndị Hibru 10:5-7; 1 Pita 4:1)
8 Achịcha dị otú ahụ kwesịrị ekwesị n’ihi na o nweghị ihe iko achịcha (yeast) ọ bụla dị n’ime ya, bụ́ nke Bible ji mee ihe ịnọchite anya mmetọ ma ọ bụ mmehie. Pọl nyere ndụmọdụ nke a banyere nwoke nke na-akpa àgwà rụrụ arụ nọ n’ime ọgbakọ: ‘lhe iko achịcha dị nta na-eko ógbè ụtụ ọka a gwọrọ agwọ dum. Sachapụnụ ihe iko achịcha ochie, ka unu wee ghara inwe ihe iko achịcha. A chụwo àjà ngabiga anyị, bụ́ Kraịst. Ka anyị na-eme ememe ahụ, ọ bụghị n’ihe iko achịcha ochie nke obi ọjọọ na ajọ ọrụ, kama n’achịcha ekoghị eko nke bụ ịdị ọcha na eziokwu.’ (1 Ndị Kọrint 5:6-8; tụlee Matiu 13:33; 16:6, 12.) Achịcha na-ekoghị eko bụ ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị maka anụ ahụ mmadụ nke Jisọs, n’ihi na ọ bụ “onye dị ọcha n’obi, onye na-enweghị obi ọjọọ, onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụworo n’etiti ndị mmehie.” (Ndị Hibru 7:26) N’ebe ahụ a na-egosipụta Jisọs n’anụ ahụ mmadụ ya zuru okè mgbe ọ gwara ndị ozi ya, sị: “Naranụ ma rie [achịcha] nke a, ọ pụtara anụ ahụ m.” (Matiu 26:26, A New Translation of the Bible, nke James Moffatt) Ikere òkè n’achịcha ahụ pụtara na mmadụ kwenyere n’abamuru nke àjà Jisọs chụrụ n’ihi ya, na-anakwerekwa ya. Ma, o metụtara ihe karịrị nke ahụ.
Mmanya nke Nwere Ihe Ọ Pụtara
9. Olee ihe nnọchianya ọzọ Jisọs kwuru na e kwesịrị iji mee ihe?
9 Jisọs jikwara ihe nnọchianya ọzọ mee ihe: “Ọ narakwa iko, mgbe o kelesịkwara Chineke o wee nye ha ya na-asị, ‘Ṅụọnụ n’ime ya, unu nile; nke a pụtara ọbara m, bụ́ ọbara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nke a wụfuru n’ọnọdụ ọtụtụ ndị, iji nweta mgbaghara mmehie.’” (Matiu 26: 27, 28, Moffatt) Gịnị dị n’ime iko ahụ nke o kesaara mmadụ nile, ọ̀ bụkwa gịnị ka ọ pụtara nye anyị mgbe anyị na-agbalị ịtụle onwe anyị?
10. Olee ụzọ e si malite iji mmanya na-eme ihe n’Ememe Ngabiga ndị Juu?
10 Mgbe mbụ Moses setịpụrụ ụkpụrụ maka oriri Ememe Ngabiga ahụ, o kwughị ihe ọ bụla banyere ihe ọnụṅụ. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwenyere na e webatara mmanya n’Ememe Ngabiga ahụ mgbe ogologo oge gasịrị, ma eleghị anya n’ime narị afọ nke abụọ T.O.A.b Otú o sina dị, iji mmanya eme ihe n’oriri nke a bụ ihe a na-ahụkarị n’ime narị afọ mbụ ahụ, Jisọs emegideghịkwa ya. O jiri mmanya Ememe Ngabiga ahụ mee ihe mgbe ọ na-eguzobe Ememe Ncheta ahụ.
11. Olee ụdị mmanya kwesịrị ekwesị iji mee ihe n’oge Nri Anyasị Onyenwe Anyị?
11 Ebe ọ bụ na Ememe Ngabiga ndị Juu ahụ na-ewere ọnọdụ ogologo oge mgbe a ghọsịrị mkpụrụ vine, ihe Jisọs ji na-eme ihe agaghị abụworị mmanya a ka zọchapụtara ọhụrụ, kama ọ ga-abụ mmanya na-acha uhie uhie nke ọ ga-adịworị mfe iji mee ihe nnọchianya nke ọbara ya. (Tụlee Mkpughe 14:20.) Ọ dịghị mkpa iji ihe ọ bụla kpọnyere ọbara Kraịst aka, ya mere mmanya a na-etinyeghị ihe ọ bụla kwesịrị nnọọ ekwesị, kama ịbụ mmanya ndị e ji brandy mee ka ha siwanye ike (dị ka port, sherry, ma ọ bụ muscatel) ma ọ bụ itinye ha ihe ụtọ ma ọ bụ mkpọrọgwụ dị iche iche (vermouth, Dubonnet, ma ọ bụ ọtụtụ mmanya aperitif). Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ịmalite ichegbu onwe anyị banyere ụzọ e si kwadebe mmanya ahụ, ma è tinyetụrụ ya shuga mgbe a na-emepụta ya ka o wee nwee ụtọ dị nta ma ọ bụkwanụ ma ò nwere ihe na-aba n’anya n’ime ya ma ọ bụ na è tinyetụrụ ya sulfur iji mee ka ọ ghara imebi.c Ọtụtụ ọgbakọ na-eji mmanya na-acha uhie uhie a zụtara n’ahịa (dị ka Chianti, Burgundy, Beaujolais, ma ọ bụ claret) ma ọ bụ mmanya na-acha uhie uhie a nọ n’ụlọ mee na-eme ihe. Mmanya na achịcha ahụ bụ ihe nnọchianya nkịtị; ya mere, a pụrụ iwere nke ọ bụla a na-ejighị mee ihe laa ma jiri ya mee ihe mgbe oge gasịrị dị ka ihe oriri ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ efu.
12. Gịnị ka Jisos kọwara na mmanya ahụ pụtara?
12 Eziokwu ahụ bụ na Jisọs kwuru okwu banyere ọbara ya n’anyasị Ememe Ngabiga ahụ pụrụ imeworị ka e cheta ọbara nwa atụrụ ahụ e ji mee ihe n’Ijipt. Ma, rịba ama otú Jisọs si mee ihe atụ nke dị iche n’ezie, na-asị: “Iko a [pụtara, NW] ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m, bụ́ nke a na-awụsi n’ihi unu.” (Luk 22:20) Chineke adịworị mbụ soro mba Israel anụ ahụ banye n’ọgbụgba ndụ, e mekwara ka ọ dị irè site n’ọbara àjà ụmụ anụmanụ. E nwere ihe nkwekọ dị n’etiti ọbara nke ihe àjà ndị ahụ na ọbara nke Jisọs. E jicha ha abụọ mee ihe na Chineke ime ka ọgbụgba ndụ dị irè, bụ́ nke dị n’etiti ya na mba ndị ya. (Ọpụpụ 24:3-8; Ndị Hibru 9:17-20) Otu akụkụ nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ bụ na Israel anụ ahụ nwere olileanya nke ịghọ mba bụ ndị eze na ndị nchụàjà. (Ọpụpụ 19:5, 6) Otú ọ dị, mgbe Israel dasịrị n’idebe ọgbụgba ndụ Jehova, o kwuru na ya gaje iji “ọgbụgba ndụ ọhụrụ” dochie anya “ọgbụgba ndụ mbụ” ahụ. (Ndị Hibru 9:1, 15; Jeremaịa 31:31-34) Iko mmanya ahụ nke Jisọs bugharịrị ugbu a n’etiti ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi nọchiri anya ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke a.
13, 14. (a) Gịnị ka ịnọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ pụtara? (b) Gịnị ka mmadụ ikere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ na-egosipụta?
13 Ndị Kraịst ndị a kpọbatara n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke a bịara mejupụta mba ime mmụọ nke ndị eze bụkwa ndị nchụàjà. (Ndị Galetia 6:16) Pita onyeozi dere, sị: “Unu onwe unu bụ ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara, ka unu wee kwusaa ịdị mma nile nke onye ahụ onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) Ụdị nzọpụta nke ha nwetara bụ ihe doro anya—ndụ n’eluigwe dị ka ndị ha na Jisọs ga-achị achị. Mkpughe 20:6 mesiri nke a ike, sị: “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị ya, ọ dịkwa nsọ, bụ́ onye nwere òkè n’ime mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ: . . . ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya bụrụ eze [otu puku afọ] ahụ.”
14 N’eziokwu, mgbe Jisọs nyesịrị ndị ozi ya ntụziaka ka ha kere òkè n’achịcha na mmanya ndị ahụ bụ́ ihe nnọchianya, ọ gwara ha na ha ‘ga-eri, ṅụọkwa na table nke ya n’alaeze ya; nọkwasịkwa n’ocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.’ (Luk 22:28-30) Ya mere, ikere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ndị ahụ pụtara ihe karịrị nanị ikwere n’àjà Jisọs. Onye Kraịst ọ bụla aghaghị ịnakwere àjà mgbapụta ahụ, gosipụtakwa okwukwe ka o wee keta ndụ ebighị ebi n’ebe ọ bụla. (Matiu 20:28; Jọn 6:51) Ma ikere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ na-egosi na mmadụ so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, na ọ bụ onye a họpụtara iso Jisọs nọrọ n’Alaeze ya.
Mkpa Ọ Dị Ime Nnyocha n’Oge Ememe Ncheta
15. Olee ụzọ Jisọs si webata olileanya ọhụrụ maka ndị ohu Chineke?
15 Dị ka isiokwu bu nke a ụzọ kọwara, tupu oge Jisọs, ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi enweghị olileanya ọ bụla nke ije eluigwe. Ha nwere olileanya nke inweta ndụ ebighị ebi n’elu ala, bụ́ ebe obibi mbụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Jisọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ dị ka mmụọ, o wee ghọọ onye mbụ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ nke a kpọgoro n’eluigwe. (Ndị Efesọs 1: 20-22; 1 Pita 3:18, 22) Pọl kwadoro nke a, na-ede, sị: “Anyị nwere nkwuwa okwu ịba n’ebe nsọ ahụ site n’ọbara Jisọs, bụ́ ụzọ o mere ọhụrụ nye anyị, nke dị ọhụrụ dịkwa ndụ.” (Ndị Hibru 10:19, 20) Ònye ga-esochi, mgbe Jisọs meghesịworo ụzọ ahụ?
16. Gịnị bụ ọdịnihu nke ndị ahụ na-ekere òkè n’achịcha na mmanya ahụ?
16 N’anyasị ahụ Jisọs guzobere Nri Anyasị Onyenwe Anyị, ọ gwara ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi na ya na-edoziri ha ebe n’eluigwe. (Jọn 14:2, 3) Ma, cheta na Jisọs kwukwara na ndị na-ekere òkè n’achịcha na iko ahụ ga-anọ n’Alaeze ya, nọkwasịkwa n’ocheeze dị iche iche ikpe ikpe. Nke ahụ ọ̀ ga-abụ nanị ndị ozi ahụ? Ee e, n’ihi na mgbe oge gasịrị, Jọn onyeozi matara na ndị Kraịst ndị ọzọ ga-enwekwa mmeri, ‘sorokwa Jisọs nọdụ ala n’ocheeze ya,’ ha ga-esokwa bụrụ ‘alaeze na ndị nchụàjà ndị ga-achị achị n’elu ụwa.’ (Mkpughe 3:21; 5:10) Jọn matakwara ngụkọta nke ndị Kraịst “ndị a gbatararịị n’ụwa”—144,000. (Mkpughe 14:1-3) N’ihi na nke a bụ ìgwè mmadụ dị nnọọ nta, bụ́ “ìgwè atụrụ nta” ma ọ bụrụ na e jiri ya tụnyere ndị nile feworo Chineke n’ọgbọ nile, ọ dị mkpa ime ntụle pụrụ iche n’oge Ememe Ncheta. —Luk 12:32.
17, 18. (a) Àgwà dị aṅaa ka ụfọdụ ndị Kraịst nọ na Kọrint dabara n’ime ya? (b) N’ihi gịnị ka iribiga nri na ịṅụbiga mmanya ókè ji bụrụ ihe siri ike otú a? (Ndị Hibru 10:28-31)
17 Pọl welitere okwu a n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrint n’oge mgbe ụfọdụ n’ime ndị ozi ahụ ka dị ndụ, mgbe Chineke nọkwa na-akpọ ndị Kraịst “ịbụ ndị nsọ.” Pọl kwuru na otu àgwà ọjọọ ebilitewo n’etiti ndị nọ n’ebe ahụ, bụ́ ndị ọ dị mkpa ka ha kere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ. Ufọdụ n’ime ha na-ebu ụzọ rie nri, bụ́ mgbe ha na-eribiga ihe ma ọ bụ ṅụbiga ihe ọṅụṅụ ókè, nke na-eme ka ha na-ero ụra, bụrụ ndị na-amụghị anya n’echiche ha. N’ihi nke a, ha apụghị ‘ịtụle ahụ ahụ,’ bụ́ anụ ahụ nke Jisọs, nke achịcha ahụ nọchiri anya ya. Nke ahụ ò siruchara ike otú ahụ? Ee! Site n’ikere òkè n’ekwesịghị ekwesị, ‘ikpe ahụ na ọbara nke Onyenwe anyị na-ama ha.’ Ọ bụrụ na ha mụ anya n’ụzọ echiche na n’ụzọ ime mmụọ, ‘ha ga-atụle onwe ha ka e wee ghara ikpe ha ikpe.’ —1 Ndị Kọrint 1:2; 11:20-22, 27-31.
18 Ọ̀ bụ gịnị ka ndị Kraịst ndị ahụ kwesịrị ịtụle, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa? N’ụzọ bụ isi, ha aghaghị iji obi na uche ha mata mkpa nke ọkpụkpọ a kpọrọ ha iso na 144,000 ndị ahụ ga-eketa ndụ eluigwe. Olee ụzọ ha na-esi aghọta nke a, ọtụtụ ndị taa hà kwesịkwara iche na ha bụ akụkụ nke ìgwè nta nke a ndị Chineke nọworo na-ahọpụta eri oge ndị ozi?
19. Ọnọdụ dị aṅaa nke na-egosipụta ọtụtụ ihe ka e nwere n’Ememe Ncheta nke 1989?
19 N’eziokwu, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole n’etiti ezi ndị Kraịst taa na-aghọta nke a banyere onwe ha. Mgbe e mere ememe Nri Anyasị Onyenwe Anyị na 1989, ihe karịrị 9,479,000 ndị mmadụ zukọtara n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa. Ihe dị ka 8,700 gosipụtara na ha nwere olileanya nke ịbụ ndị ‘a zọpụtara maka alaeze eluigwe.’ (2 Timoti 4:18) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ—ee, ọtụtụ nde ndị Kraịst ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, ndị a gọzikwara agọzi, bụ́ ndị zukọtaranụ—ghọtara na olileanya bụ ezie ha nwere bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala.
20. Olee otú a na-esi eme ka ndị so na 144,000 ahụ mara na a kpọwo ha? (1 Jọn 2:27)
20 Na Pentikọst nke 33 O.A., Chineke malitere ịhọpụta 144,000 mmadụ maka ndụ eluigwe. Ebe ọ bụ na olileanya nke a dị ọhụrụ, bụ́ nke ndị ohu Chineke ndị dịrị ndụ tupu oge Jisọs na-enweghị, olee ụzọ ndị ahụ a họpụtara ga-esi mara, ma ọ bụ nwee obi ike banyere olileanya nke a? Ha na-aghọta nke a site n’ịnata ọgbụgba àmà banyere ya site ná mmụọ nsọ Chineke. Nke a apụtaghị na ha na-ahụ mmụọ ahụ anya n’ezie (ọ bụghị onye) ma ọ bụkwanụ jiri anya nke uche ha hụ ka mmụọ nke a na-akpanyere ha ụka, ha adịghị anụkwa olu sitere n’ebe ndị bụ mmụọ. Pọl kọwara, sị: “Mmụọ nsọ onwe ya soro mmụọ anyị na-agba àmà, na anyị bụ ụmụ Chineke: . . . anyị bụkwa ndị nketa; ndị nketa nke Chineke, na ndị ha na Kraịst na-ekekọ; ma ọ bụrụ na ọ bụ ezie na anyị na ya na-ahụkọ ahụhụ, ka e wee nyekọọkwa anyi na ya otuto.”—Ndị Rom 8: 16, 17.
21. (a) Olee ụzọ ndị ahụ e tere mmanụ na-esi amara na ha nwere olileanya eluigwe ahụ? (1 Ndị Kọrint 10:15-17) (b) Ụdị mmadụ dịgasị aṅaa ka ndị ahụ e tere mmanụ bụ, oleekwa ụzọ ha na-esi eji obi umeala egosipụta olileanya ha?
21 Ọgbụgba àmà, ma ọ bụ nghọta nke a, na-agbanwegharị echiche na olileanya ha nwere. Ha ka bụ ụmụ mmadụ, na-enweta ọṅụ site n’ihe ọma ndị Jehova kere n’elu ala, ma ihe bụ isi nke na-eduzi ndụ ha na isi nchegbu ha bụ ịbụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe. Ọ bụghị oké mkpali efu dutere ha n’inwe echiche nke a. Ha bụ ụmụ mmadụ ndị dị ka ibe ha, ndị nwere ezi echiche n’ụzọ ha si ele ihe anya na n’akparamagwa ha. Ma ebe mmụọ Chineke doro ha nsọ, ọkpụkpọ òkù ha na-edo ha anya, ha adịghị anọgidekwa na-enwe obi abụọ banyere ya. Ha na-aghọta na nzọpụta ha ga-abụ gaa n’eluigwe ma ọ bụrụ na ha anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:13; 2 Timoti 2:10-12) N’ịghọta ihe àjà Jisọs pụtara nye ha nakwa n’ịghọta na ha bụ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ha na-eji obi umeala kere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ndị ahụ.
22. Gịnị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị ga-abịa Nri Anyasị Onyenwe Anyị ga-aghọta?
22 Ihe ka ọtụtụ ná ndị ahụ ga-eji nrubeisi zukọọ n’April 10 enweghị olileanya ahụ, n’ihi na Chineke ejibeghị mmụọ tee ha mmanụ, na-akpọ ha òkù maka ndụ eluigwe. Dị ka anyị hụtaworo, Chineke malitere ịhọpụta 144,000 ndị ahụ laa azụ n’oge ndị ozi. Ma mgbe ọkpụkpọ òkù ahụ zuru, a ga-atụ anya na ndị na-abịa ife ya ofufe ga-enwe olileanya ahụ nke Moses, Devid, Jọn Onye na-eme baptism, na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, nwere, bụ́ ndị nwụrụ tupu Jisọs emeghee ụzọ gaa ná ndụ eluigwe. Otú a, ọtụtụ nde ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-anụkwa ọkụ n’obi taa adịghị ekere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ndị ahụ. Ndị Kraịst dị otú ahụ na-atụle onwe ha n’ihu Chineke n’echiche nke bụ na ha na-ahụta olileanya nke bụ ezie ha nwere. Ha na-erite uru site n’ọbara na anụ ahụ Jisọs site n’ịbụ ndị a gbaghaara mmehie ha nakwa inweta ndụ ebighị ebi n’elu ala.—1 Pita 1:19; 2:24; Mkpughe 7:9, 15.
23. N’ihi gịnị ka Ememe Ncheta ahụ ga-eji bụrụ ememe na-enye ọṅụ? (Tụlee 2 Ihe Emere 30:21.)
23 Ya mere, ka anyị lepụ anya maka ememe obi ụtọ ahụ n’April 10. Ọ ga-abụ oge iji nghọta na-eme ihe, ọ ga-abụkwa oge ọṅụ. Ọṅụ maka ọnụ ọgụgụ ahụ dị nta, bụ́ ndị nwere olileanya eluigwe, ndị ga-ejikwa nrubeisi kere òkè n’ụzọ ziri ezi n’achịcha na iko ahụ. (Mkpughe 19:7) Ọṅụ maka ọtụtụ nde ndị Kraịst bụ́ ndị nwekwara obi ụtọ, ndị ga-abịa n’anyasị ahụ ikiri ihe na-emenụ, mụtakwa ihe, ndị nwekwara olileanya icheta ememe ahụ bara uru ruo mgbe ebighị ebi.—Jọn 3:29.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a “N’anyasị ahụ nke a raara Ya nye, Onyenwe anyị Jisọs naara ógbè achịcha; mgbe o nyesịri ekele, Ọ nyawaa ya wee sị: ‘Nke a bụ ahụ m nke dị n’ihi unu; na-emenụ nke a dị ka ihe ncheta nke m.’ N’otu aka ahụkwa, Ọ naara iko mgbe e risịrị nri anyasi, wee sị: ‘Iko nke a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nke e ji ọbara m kaa akara; mgbe ọ bụla unu na-aṅụ ya, na-emenụ ya dị ka ihe ncheta m.’” —An Expanded Paraphrase of the Epistles of Paul, nke F. F. Bruce dere.
b Otu onyeọkà mmụta kwupụtara echiche nke a banyere ihe mere e ji malite iji mmanya na-eme ihe: “[Ememe Ngabiga ahụ] agaghị na-abụzikwa mkpọkọta dị nsọ a na-akpọkọta ndị nwoke toruworo dimkpa kwa afọ; ọ ga-aghọ ihe omume dịịrị ezinụlọ nile, nke ịṅụ mmanya na ya ghọrọ ihe dabara nnọọ nke ọma.”—The Hebrew Passover—From the Earliest Times to A.D. 70, nke J. B. Segal dere.
c Sitekwarị n’oge ochie, a na-eji nnú, akụkụ àkwá nke dị ọcha, na ihe ndị ọzọ na-eme ihe iji mee ka ụcha na ụtọ mmanya pụta nke ọma, ọbụna na ndị Rom na-eji sulfur na-eme ihe dị ka ihe na-egbu njé n’usoro mmepụta mmanya.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ N’ihi gịnị ka a na-eji ebugharị achịcha na-ekoghị eko n’oge Ememe Ncheta, gịnịkwa ka ọ nọchiri anya ya?
◻ Gịnị bụ iko ahụ nke a na-ebugharị n’oge Nri Anyasị Onyenwe Anyị, gịnịkwa ka ọ nọchiri anya ya?
◻ N’ihi gịnị ka nghọta ji dị mkpa n’ihe banyere Ememe Ncheta?
◻ Gịnị mere i ji na-elepụ anya maka Ememe Ncheta ahụ nke na-abịanụ?