Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/15 p. 29
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-Agbasonụ Ihe Nlereanya Jisọs Nke Nsọpụrụ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Na-Agbasonụ Nsọpụrụ Chineke Dị Ka Ndị Kraịst Meworo Baptism
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Tụkwasịnụ Nsọpụrụ Chineke ná Ntachi Obi Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Nyezuokwanụ Ntachi Obi Unu Nsọpụrụ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/15 p. 29

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ chọpụtawo mbipụta ndị na-adịghị anya gara aga nke Ụlọ Nche dị ka ndị baara gi ezi uru? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere na i jighị ihe ndị a sonụ nwalee ikike ncheta ihe gị?

◻ Gịnị ka anyị na-aghaghị ime ka anyị wee nweta nkwekọrịta na udo nke ndị si n’agbụrụ nile bu nke e buru amuma ya n’Aịsaịa 2:4?

Nke mbụ, anyị aghaghị ịnakwere na Onye Okike anyị bụ́ Jehova nwere ikike izi anyị ihe banyere “ụzọ ya ụfọdụ.” Nke abụọ, anyị aghaghị inwe ọchịchọ siri ike ime ihe kwekọrọ n’iwu nile nke Chineke site n’ịsị: “Anyị ga-ejekwa ije n’okporo uzọ ya nile.” (Aịsaịa 2: 2, 3)—12/15, peji 5, 6.

◻ N’ihi gịnị ka a na-adịghị akụda Ndịàmà Jehova aka, meekwa ka obi ha daa mbà site n’ịkpọasị na mmegide zuru ụwa ọnụ?

Jisọs buru amuma na mmegide na ịkpọasị dị otú ahu ga-abụ ahụmahụ e ji mara ndị na-efe ezi ofufe. (Jọn 15:20, 21; 2 Timoti 3:12) A na-esi otú a na-emesi ndị na-ekwusa ozi ọma ahụ obi ike na ha nwere nnwaputa nke Chineke. Tụkwasị na nke a, Ndịàmà Jehova maara na ha nwere nkwado nke Chineke Onye Kasi Elu bú Jehova.—1/1, peji 12.

◻ Olee ụfọdụ ihe ndị a chọrọ anyị n’aka ka e wee zaa ekpere anyị?

Anyị aghaghị iji obi anyi nile kwere na Chineke dị adị. Anyi aghaghị ịdị ‘na-achọsi ya ike’ na-enwe obi ike na ọ ga-akwụghachi ndị na-eme otú ahụ ụgwọ ọrụ. (Ndị Hibru 11:6) Ọzọkwa, anyị aghaghị ịbịakwute Jehova site nanị na Jisọs Kraịst. (Jọn 14:6, 14)—1/15, peji 4, 6.

◻ Gịnị bụ “Nsọpụrụ Chineke”? (1 Timoti 3:16)

Nsọpụrụ Chineke bụ nsọpụrụ di omimi, ofufe, na ijere Chineke ozi, na-ekwesị ntụkwasị obi nye ịbụ ọkaaka eluigwe na ala ya.—1/15, peji 11.

◻ Ònye bụ “onye ahụ na-emebi iwu” nke Pọl kwuru okwu ya ná 2 Ndị Tesalonaịka 2:3?

Pọl adịghị ekwu okwu banyere otu onye, n’ihi na o kwuru na “onye” nke a putara ìhè n’oge Pọl, na ọ gajekwa ịnọgide na-adị ruo mgbe Jehova ga-ebibi ya n’ọgwụgwụ usoro ihe nke a. Ya mere, “onye ahụ na-emebi iwu” bu okwu ihe atụ. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ òtù ndị ụkọchukwu Krisendọm ndị dị mpako, na-enwekwa oké ọchịchọ, ndị guzobeworo onwe ha dị ka iwu nye onwe ha ruo ọtụtụ narị afọ ugbu a.—2/1, peji 11.

◻ Olee ụzọ a pụrụ isi wepụchasịa anyaukwu?

A pụrụ iwepụchasị anyaukwu n’etiti ụmụ mmadụ nanị site n’inye ezi ọzụzụ, na-enwe ntụziaka ndị siri ike, ma ọ bụ ụkpụrụ omume, ndị a na-agbaso. Ọzụzụ di otú ahụ aghaghị isite n’ebe anyaukwu na-adịghị ma ọlị wee bịa. Ọ bu nanị Chineke nke eluigwe pụrụ inye ụdị ọzụzụ nke a, a na-achọtakwa ya n’akwụkwo ya e dere ede, bụ́ Bible Nsọ.—2/15, peji 5.

◻ Ka ọmụmụ Bible onwe onye we rụpụta mwulite nke nsọpụrụ Chineke, gịnị ka ọmụmụ ihe ahu kwesịrị ịgunye?

Nzube nke ọmumụ ihe onwe onye apụghị ịbụ nanị ịguzu ọtụtụ peji nke ihe ọgụgụ wee si otú ahu jiri ihe ọmụma mejupụta uche mmadụ. Kama nke ahu, mgbe a na-agụ otu akụkụ nke Okwu Chineke, a ghaghị iwepụta oge iji tụgharịa uche n’ihe a na-agụ ka e wee chọpụta ihe ọ na-ezi banyere àgwà na ụzọ nile nke Jehova ka onye ahụ na-amụ ihe wee nwee ike ịdị ka Jehova karị n’akụkụ ndị a.—3/1, peji 13.

◻ N’ihi gịnị ka usoro ọmụmụ ihe onwe onye kwesịrị iji gunye ọgụgụ a na-agu ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ nke Jisọs mgbe nile?

Ihe nlereanya nke Jisọs na-enyere anyị aka ịzụlite nsọpụrụ Chineke. Jisọs maara Nna ya karia onye Ọ bụla ọzọ, ya mere ọ pụrụ iṅomi ụzọ na àgwà nile nke Jehova n’ụzọ chiri anya karị. Ya mere o setịpụụrụ anyị ihe nlereanya zuru okè nke nsọpụrụ Chineke. (Jọn 1: 18; 14:9; Ndị Rom 13:14)—3/1, peji 18.

◻ N’ilu Jisọs nke talent ndị ahụ, gịnị ka ọ pụtara itinye talent ndị ahụ n’ọrụ? (Matiu 25:19-23)

Itinye talent ndị ahụ n’ọrụ pụtara iji ikwesi ntụkwasi obi rụọ ọrụ dị ka ndị nnọchianya nke Chineke, na-eme ndị na-eso ụzọ, na-ekesakwa eziokwu ime mmụọ nye ezinụlọ nke Chineke. (Matiu 24:45; 28: 19, 20; 2 Ndị Kọrint 5:20)—3/15, peji 13.

◻ N’akuku atọ dị aṅaa ka Bible bụ ihe pụrụ iche ma e jiri ya tunyere ebe ndị ọzọ nile e si enweta ndụmọdụ?

Nke mbụ, ndụmọdụ ya na-abụ ihe na-aba uru mgbe nile. (Abụ Ọma 93:5) Nke abụọ, Bible anọwo ogologo oge. (Aịsaịa 40:8; 1 Pita 1:25) Nke atọ, ọ dịghị ihe ọ bụla e ji atụnyere eziokwu ahụ nke bu na ndụmọdụ Bible metụtara ọtụtụ ihe dị iche iche. N’agbanyeghi nsogbu ma ọ bu mkpebi ndị anyị na-eche ihu, e nwere amamihe dị na Bible nke pụrụ inyere anyi aka.—4/1, peji 13.

◻ Gịnị bụ usoro ihe àmà abụọ na-egosi na Bible bụ Okwu Chineke, Ọ bụghị nke mmadụ?

Amamihe na-enweghị atụ nke dị na Bible na ike o nwere ịgbanwe ụmụ mmadụ. (Ilu 2:1, 5, 6; Ndị Hibru 4:12)—4/1, peji 21.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya