Ọtụtụ Nde Ndị Nwụrụ Anwụ Ugbu a Ga-adị Ndụ Ọzọ
ỌTỤTỤ nde ndị nwụrụ anwụ ugbu a ga-adị ndụ ọzọ—lee ka nke a si bụrụ olileanya na-akpali ọṅụ! Ma ọ̀ bụ ihe ga-eme eme? Olee ihe a pụrụ ime iji mee ka i kwenye? Iji kwenye ná nkwa e kwere, ọ ga-adị gị mkpa ijide n’aka na onye na-ekwe nkwa ahụ dị njikere, nweekwa ikike nke imezu ya. Mgbe ahụ, ònye bụ onye na-ekwe nkwa na ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ ugbu a ga-adị ndụ ọzọ?
N’oge opupu ihe ubi nke afọ 31 O.A., Jisọs Kraịst kwusiri ya ike na Jehova Chineke enyewo ya ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Jisọs kwere nkwa, sị: “N’ihi na dị ka Nna m na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, dị ka ọ na-emekwa ka ha dị ndụ, otú a ka Ọkpara ya na-emekwa ka ndị ọ na-achọ dị ndụ. Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị nịle dị n’ili ga-anụ olu [Jisọs], ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:21, 28, 29) Ee, Jisọs Kraịst kwere nkwa na ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ ugbu a ga-adị ndụ ọzọ n’elu ala nke a, nweekwa olileanya nke ịnọgide n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi. (Jọn 3:16; 17:3; tụlee Abụ Ọma 37:29 na Matiu 5:5.)a Ebe ọ bụ Jisọs kwere nkwa ahụ, ọ dị mma iche na ọ dị njikere imezu ya. Ma ò nwere ike ime otú ahụ?
Dị ka ihe ndekọ Bible si dị, ruo mgbe Jisọs kwere nkwa ahụ, ọ dịbeghị onye ọ bụla o mere ka o si n’ọnwụ bilie. Ma tupu o ruo afọ abụọ mgbe nke a gasịrị, o gosipụtara n’ụzọ dị ukwuu na ya dị njikere, nweekwa ikike ime ka mmadụ si n’ọnwụ bilie.
“Lazarọs, Pụta n’Èzí!”
Ọ bụ ihe dị mwute ikiri. Ọrịa jisiri Lazarọs ike. Ụmụnne ya nwanyị abụọ, Meri na Mata, zigaara Jisọs ozi, bụ́ onye nọ n’akụkụ nke ọzọ nke Osimiri Jọdan, na-asị: “Onyenwe anyị, lee, ahụ nke onye ahụ ị hụrụ n’anya adịghị ike.” (Jọn 11:3) Ee, Jisọs hụrụ ezinụlọ nke a n’anya nke ukwuu. Ọ dịwo mgbe ọ gara leta ha n’ụlọ ha na Betani, ma eleghị anya site na mgbe ruo na mgbe. (Luk 10:38-42; tụlee Luk 9:58.) Ma ugbu a ezi enyi Jisọs nọ n’oké ọrịa.
Otú ọ dị, olee ihe Meri na Mata lere Jisọs anya ka o mee? Ha asịghị ya ka ọ bịa na Betani. Ma ha matara na Jisọs hụrụ Lazarọs n’anya. Ọ̀ bụ na Jisọs agaghị achọ ịhụ enyi ya nke na-arịa ọrịa? Obi abụọ adịghị ya na ha lere anya na Jịsọs ga-agwọ ya n’ụzọ ọrụ ebube. E kwuwerị, n’oge a n’ije ozi ya, Jisọs agwọwo ọtụtụ ndị ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube, ọbụnadị ịdị anya nke ebe ndị ọrịa ahụ nọ abụghị ihe mgbochi nye ya. (Tụlee Matiu 8:5-13.) Ọ̀ ga-eme ihe dị ala n’ebe ezi enyi ya dị otú a nọ? N’ụzọ dị ịtụnanya, kama ịga Betani ozugbo ahụ, Jisọs nọgidere n’ebe ọ nọ ruo ụbọchị abụọ na-esonụ.—Jọn 11:5, 6.
Lazarọs nwụrụ ka nwa oge gasịrị mgbe e zitesịịrị ya ozi ahụ, eleghị anya ọ bụrụ na mgbe ahụ Jisọs natara ozi ahụ. (Tụlee Jọn 11:3, 6, 17.) Ma izitekwara ya ozi ọzọ adịghị mkpa. Jisọs maara mgbe Lazarọs nwụrụ, o bukwa n’uche ime ihe banyere ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere ọnwụ Lazarọs, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Enyi anyị Lazarọs adawo n’ụra; ma ana m aga, ka m wee kpọtee ya n’ụra.” (Jọn 11:11) Jisọs akpọliteworị mmadụ abụọ n’ọnwụ tupu mgbe ahụ, na nke ọ bụla n’ime ha ka nwa oge gasịrị mgbe onye ahụ nwụsịrị.b Otú ọ dị, oge nke a ga-adị iche. Na mgbe Jisọs mesịrị rute na Betani, ọ dịwo ụbọchị anọ ezi enyi ya ji nwụọ. (Jọn 11:17, 39) Jisọs ọ̀ pụrụ ime ka onye nwụrụ eri ogologo oge dị otú ahụ, nke ahụ ya maliteworo ire ure dịghachi ndụ ọzọ?
Mgbe ọ nụrụ na Jisọs na-abịa, Mata, nwanyị dị gara gara n’ime ihe, gbapụtara izute ya. (Tụlee Luk 10:38-42.) Ngwa ngwa o zutere Jisọs, obi ya kpaliri ya ikwu, sị: “Ọ bụrụ na i nọrịị n’ebe a, nwanne m nwoke agaghị anwụworị.” N’agbanyeghị nke ahụ, o gosipụtara okwukwe ya, sị: “Amatara m na, ka ihe ị ga-arịọ n’aka Chineke hà, Chineke ga-enye gị.” N’ihi mmetụta o nwere banyere iru ùjú ya, Jisọs kwere ya nkwa, sị: “Nwanne gị nwoke ga-esi n’ọnwụ bilie.” Mgbe o gosipụtara okwukwe ya ná mbilite n’ọnwụ nke ọdịnihu, Jisọs gwara ya n’ụzọ doro anya, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na m, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.”—Jọn 11: 20-25.
Mgbe o rutere n’ili ahụ, Jisọs kwuru ka e wezụga nkume nke e ji kpuchie ọnụ ya. Na mbụ Mata jụrụ, sị: “Onyenwe anyị [ọ ga-amaliteworị isi, NW] ísì ugbu a: n’ihi na nke a mere ya ụbọchị anọ ọ nwụrụ.” Ma Jisọs mesiri ya obi ike, sị: “Àsịghị m gị na, ọ bụrụ na i kwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?” Mgbe ahụ, mgbe o kpesịrị ekpere n’olu dara ụda, o nyere iwu, sị: “Lazarọs, pụta n’èzí!” Mgbe Jisọs nyere iwu Lazarọs pụtara, ọ bụ ezie na o ruwo ụbọchị anọ ọ nwụrụ!—Jọn 11:38-44.
Ò Mere Eme n’Ezie?
E depụtara akụkọ nke a banyere ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ n’Oziọma nke Jọn dị ka akụkọ ihe mere eme n’ezie. Ihe ndị a kọrọ banyere ya pụtara ìhè nke ukwuu nke na ọ gaghị abụ akụkọ ifo nkịtị. Ịrụ ụka na ọ gaghị abụ akụkọ ihe mere eme ga-apụta ịrụ ụka banyere ịbụ eziokwu nke ọrụ ebube nile nke Bible, tinyere mbilite n’ọnwụ nke Jisọs Kraịst n’onwe ya.c Ịgọnarịkwa mbilite n’ọnwụ nke Jisọs pụtara ịgọnarị okwukwe ndị Kraịst n’ozuzu ya.—1 Ndị Kọrint 15:13-15.
N’ezie, ọ bụrụ na ị nakweere ịdị adị nke Chineke, ọ gaghị esiri gị ike inwe okwukwe ná mbilite n’ọnwụ. Were dị ka ihe atụ: Mmadụ pụrụ ichekwa ikè ékpé na okwu ikpeazụ ya n’ígwè ọrụ videotape, mgbe ọ nwụsịkwara ndị ikwu na ndị enyi ya pụrụ ịhụ ma nụ ihe ọ na-ekwu, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mgbe ọ na-akọwa otú a ga-esi kee ihe ndị o nwere. Na narị afọ gara aga, ihe dị otú ahụ abatabeghị n’echiche. Nyekwa ụfọdụ mmadụ ndị bi n’akụkụ ụwa ndị na-asabeghị anya, “ọrụ ebube” nke iji ígwè video echekwa ihe bụ ihe a na-apụghị ịghọta aghọta. Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ pụrụ iji ụkpụrụ sayensi ndị Onye Okike guzobere wee mee ihe iji wee rụpụta ihe a na-ahụ anya nke na-ekwukwa okwu dị otú ahụ, ọ̀ bụ na Onye Okike ahụ agaghị enwe ike ime ihe karịrị nke ahụ? Mgbe ahụ, ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe ezi uche dị n’ime ya, na Onye kere ndụ nwere ike ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ site n’iwughachi ụdị mmadụ ya n’ime ahụ nke e wuru ọhụrụ?
Ọrụ ebube nke ime ka Lazarọs dịghachi ndụ na-enye aka iwulite okwukwe n’ebe Jisọs na mbilite n’ọnwụ dị. (Jọn 11:41, 42; 12:9-11, 17-19) N’ụzọ na-emetụ n’ahụ, ọ na-ekpughekwa ịdị njikere na ọchịchọ nke Jehova na Ọkpara ya ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ.
‘Chineke Ga-enwe Agụụ’
Mmeghachi omume nke Jisọs banyere ọnwụ Lazarọs na-egosipụta akụkụ inwe obi ebere nke Ọkpara Chineke. Nchegbu miri emi ndị o nwere n’ihe nke a merenụ na-egosipụta n’ụzọ doro anya ọchịchọ dị ukwuu o nwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Anyị na-agụ, sị: “Meri, mgbe ọ bịara n’ebe Jisọs nọ, mgbe ọ hụrụ ya, ọ daa n’ala n’ụkwụ ya, na-asị ya, Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ị nọrịị n’ebe a, nwanne m nwoke agaghị anwụworị. Ya mere mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-akwa ákwá, na ndị Juu ndị soro ya bịa ka ha na-akwakwa ákwá, ọ sụọ ude n’ime mmụọ ya, meekwa ka obi lọọ ya mmiri, o wee sị, Olee ebe unu tọgbọrọ ya? Ha sị ya, Onyenwe anyị, bịa, leekwa. Anya mmiri pụrụ n’anya Jisọs. Ya mere ndị Juu na-asị, Lee otú ọ hụrụ ya n’anya!”—Jọn 11:32-36.
Obi ebere ruru ala ala obi nke Jisọs bụ nke e gosipụtara n’ebe a site n’okwu atọ ndị bụ: “sụọ ude,” “obi lọọ ya mmiri,” na “anya mmiri pụrụ n’anya.” Okwu asụsụ mbụ ndị onyeozi bụ́ Jọn ji mee ihe n’idekọ ihe nkiri nke a na-emetụta n’obi na-egosi ókè Jisọs nweruru ná mmetụta.
Okwu Grik a sụgharịrị “sụọ ude” bụ site ná ngwaa okwu (em-bri-ma’o-mai) nke na-egosi ịbụ onye a kpaliri n’ụzọ di mwute, ma ọ bụ n’ụzọ miri emi. Onye na-akọwa okwu Bible bụ William Barclay kwuru, sị: “N’ime usoro edemede nkịtị nke asụsụ Grik mgbe a na-ejikarị okwu ahụ bụ [em-bri-ma’o-mai] eme ihe bụ banyere ịnyịnya ikupụ ume n’ike site n’ime. N’ebe a ọ pụrụ nanị ịpụta na mmetụta miri emi di otú ahụ jidere Jisọs na ịsụ ude a na-elezighị anya mapụtara n’obi Ya.”
Okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “obi lọọ ya mmiri” sitere n’okwu Grik bụ (ta-ras’so) nke na-egosi ịma jijiji. Dị ka akwụkwọ ahụ bụ The New Thayer’s Greek-English Lexicon of the New Testament si kwuo, ọ pụtara “ime ka mmadụ mee mkpatụ n’ime, . . . iji oké ihe mgbu ma ọ bụ mwute nwee mmetụta.” Okwu ahụ bụ “anya mmiri pụrụ n’anya” sitere ná ngwaa okwu Grik bụ (da-kry’o) nke pụtara “anya mmiri ịgba mmadụ, irusị anya mmiri n’ebeghị ákwá.” Nke a dị iche ‘n’ịkwa ákwá’ nke Meri na ndị Juu so ya, nke e kwuru na Jọn 11:33. N’ebe ahụ okwu Grik (sitere na klai’o) e ji mee ihe pụtara ịkwa ákwá n’ụzọ ndị ọzọ ga-anụ ma ọ bụ n’ụzọ dara ụda.d
Mgbe ahụ, Jisọs bụ onye ọnwụ nke ezi enyi ya bụ Lazarọs na ile nwanne nwanyị nke Lazarọs ka ọ na-akwa ákwá kpaliri nke ukwuu. Obi Jisọs jupụtara n’inwe mmetụta nke mere na anya mmiri pụtara ya n’anya. Ihe dị oké ịtụnanya bụ na Jisọs emeworị ka mmadụ abụọ ọzọ dịghachi ndụ n’oge gara aga. N’oge a kwa o zubesiri ike ime otu ihe ahụ n’ebe Lazarọs nọ. (Jọn 11:11, 23, 25) Ma, “anya mmiri pụrụ [ya] n’anya.” Mgbe ahụ, imeghachi ka ndị mmadụ dị ndụ, abụghịrị Jịsọs nanị ụkpụrụ efu a pụrụ ịgbaso. Obi ebere na mmetụta miri emi o nwere dị ka e mere ka ọ pụta ìhè n’ihe a merenụ na-egosi n’ụzọ doro anya oké ọchịchọ o nwere imezi ihe nile ọnwụ mebiri.
Ebe Jisọs bụ ‘onyinyo nke ụdị Jehova Chineke,’ anyị agaghị ele anya ihe dị ala n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ. (Ndị Hibru 1:3) Banyere njikere Jehova dị isi n’ọnwụ kpọlite ndị mmadụ, nwoke kwesịrị ntụkwasị bụ́ Job kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ? . . . Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị: agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.” (Job 14:14, 15) Okwu nke asụsụ mbụ a tụgharịrị ịbụ ‘agụụ ga-agụ gị’ na-apụta ọchịchọ na mmasị sịrị ike. (Jenesis 31:30; Abụ Ọma 84:2) N’ụzọ doro anya, Jehova aghaghị iji oké mmasị na-ele anya mbilite n’ọnwụ.
Ànyị pụrụ n’ezie ikwere ná nkwa nke mbilite n’ọnwụ? Otú ọ dị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova na Ọkpara ya dị njikere, nweekwa ikike imezu ya. Gịnị ka nke a pụtara nye gị? I nwere olileanya nke ịbụ onye e jikọtaghachiri ya na ndị ọ hụrụ n’anya nwụrụ anwụ kpọmkwem n’elu ala ebe a n’ọnọdụ udo!
Nke ahụ bụ olileanya Roberta (e hotara n’isiokwu bu nke a ụzọ) nwere ugbu a. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị ka nne ya nwụsịrị, Ndịàmà Jehova nyeere ya aka iji ezi nlezianya mụọ Bible. O chetaghachiri ihe mere, sị: “Mgbe m mụtasịrị ihe banyere olileanya mbilite n’ọnwụ, etiri m mkpu. Ọ bụ ihe dị ịtụnanya ịmata na m ga-ahụ nne m ọzọ.” Ọ bụrụ na ọ na-emetụ gị n’obi n’ụzọ dị otú a ịhụ onye ị hụrụ n’anya ọzọ, obi abụọ adịghị na ị ga-achọ ịmụkwu ihe banyere olileanya a dị ịtụnanya. A kọwara ụzọ olileanya nke a ji bụrụ ihe e ji n’aka n’ụzọ sara mbara karị na peji 18 ruo 28 nke magazin nke a.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ “Gosipụta Okwukwe maka Ndụ Ebighị Ebi,” na peji 23 ruo 28.
b N’agbata oge gafere mgbe Jisọs kwesịrị nkwa ahụ e dekọrọ na Jọn 5:28, 29 na ọnwụ nke Lazarọs, Jisọs kpọlitere nwa nwanyị onye Nain di ya nwụrụ na ada Jaịrọs.—Luk 7:11-17; 8:40-56.
c Lee isi 6, bụ́ “Ọrụ Ebube Ndị ahụ—Hà Mere Eme n’Ezie?” nke akwụkwọ ahụ bụ The Bible—God’s Word or Man’s? nke Watch Tower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
d Ọ dị mma ịmara, na okwu Grik maka ịkwa ákwá n’ụzọ a pụrụ ịnụ ya (klai’o) bụ nke e ji mee ihe banyere Jisọs mgbe ọ na-ebu amụma banyere mbibi Jerusalem nke na-abịa. Ihe ndekọ nke Luk kwuru, sị: “Mgbe ọ bịaruru Jerusalem nso, o wee hụ obodo ahụ [Jerusalem] wee kwaara ya ákwá.”—Luk 19:41.
[Foto dị na peeji nke 5]
Mkpọlite Jisọs kpọlitere ada Jaịrọs na-enye ihe ndabere maka inwe okwukwe ná mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu
[Foto dị na peeji nke 6]
Ọnwụ Lazarọs kpaliri Jisọs nke ukwuu
[Foto dị na peeji nke 7]
Ọṅụ nke ndị ga-ahụ mbilite n’ọnwụ ga-adị ka ọṅụ nke nwanyị onye Nain nke di ya nwụrụ anwụ mgbe Jisọs kpọlitere nwa ya nwoke n’ọnwụ