Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 5/1 p. 8-9
  • Ilu nke Talent

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ilu nke Talent
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Ejiri Ihe Atụ Talent Kụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Ịdị Uchu n’Ọrụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Mụta Ihe n’Ilu Jizọs Tụrụ Banyere Talent
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ịpịazi Ego n’Ihi Ego Kraịst E Ji Mee Ihe
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Ihe Ịrịba Àmà Mgbe Ikpeazụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 5/1 p. 8-9

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

Ilu nke Talent

JISỌS gara n’ihu ịgwa ndị ozi ya okwu n’Ugwu Olive site n’ịkọrọ ha banyere ilu ọzọ, nke bụ nke abụọ n’ime atọ ndị ọ kọọrọ ha. N’ụbọchị ole na ole gara aga, mgbe ọ ka nọ na Jeriko, ọ kọọrọ ha banyere ilu nke maịna iji gosi na Alaeze ahụ ka dị anya mgbe ọ ga-abịa n’ọdịnihu. Ilu nke ọ na-akọrọ ha ugbu a, ọ bụ ezie na o nwere ọtụtụ ihe o ji yie nke ahụ, na-akọwa ná mmezu ya ihe ndị na-eme n’oge ọnụnọ Kraịst n’ike Alaeze. Ọ na-akọwa na ndị na-eso ụzọ ya aghaghị ịrụ ọrụ mgbe ha ka nọ n’elu ala iji mụbaa “ihe nile o nwere.”

Jisọs malitere, sị: “N’ihi na ọ [ya bụ, ọnọdụ ndị metụtara Alaeze ahụ] dị ka mgbe mmadụ, mgbe ọ gaje ịnọdụ n’ala ndị ọzọ, ọ kpọrọ ndị ohu nke aka ya, rara ihe nile o nwere nye n’aka ha.” Jisọs bụ nwoke ahụ onye, tupu ọ gaa n’ala ọzọ n’elu-igwe, nyere ndị ohu ya—ndị na-eso ụzọ ya nwere olileanya ịga n’Alaeze eluigwe —ihe nile o nwere. Ihe ndị a o nwere abụghị ihe onwunwe efu kama ha nọchiri anya ubi a rụrụ ọrụ na ya, nke o wuliteworo n’ime ya ikike nke iwepụta ndị na-eso ụzọ karị.

Jisọs nyefere ndị ohu ya ihe nile o nwere na mkpirikpi oge tupu ọ rịgoo n’eluigwe. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’inye ha iwu ka ha nọgide na-arụ ọrụ n’ubi ahụ a rụrụ ọrụ na ya site n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ ruo ebe nile ụwa sọtụrụ. Dị ka Jisọs kwuru, sị: “Otu ka o nyere talent ise, nke ọzọ talent abụọ, nke ọzọ otu talent; o nye onye ọ bụla dị ka ike nke aka ya hà; o wee jee ịnọdụ n’ala ndị ọzọ.”

Talent asatọ ahụ—ihe nile Kraịst nwere—ka e si otú a kesaa dị ka ike mmadụ nwere hà, ma ọ bụ ikike ime mmụọ ohu ndị ahụ pụrụ inwe. Ndị ohu ahụ nọchiri anya òtù di iche iche nke ndị na-eso ụzọ ya. Na narị afọ nke mbụ, ọ pụtara ìhè na òtù ahụ nke natara talent ise ahụ gụnyere ndị ozi. Jisọs gara n’ihu ịkọ na ndị ohu ahụ natara talent ise na talent abụọ mụbara ha okpukpu abụọ site n’ikwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ nke ha mere. Otú ọ dị, ohu ahụ nke natara otu talent zobere ya n’ime ala.

“Ma mgbe ogologo oge gasịrị,” ka Jisọs gara n’ihu ikwu, “onyenwe ndị ohu ahụ [bịara], ya na ha wee pịazie.” Ọ bụghị mgbe ọzọ ma ọ bụghị na narị afọ nke iri abụọ, ihe dị ka 1,900 afọ n’ikpeazụ, ka Kraịst lọghachiri ime mpịazi, ya mere ọ bụ, n’ezie, “mgbe ogologo oge gasịrị.” Mgbe ahụ Jisọs kọwara, sị: “Onye ahụ nke naara talent ise wee bịakwute ya weta talent ise ọzọ, sị, Onyenwe anyị, ị raara talent ise nye m n’aka: lee, eritara m talent ise ọzọ n’uru. Onyenwe ya sịrị ya, I mere nke ọma, ezi ohu nke kwesịrị ka a tụkwasị gị obi: i kwesịrị ka a tụkwasị gị obi n’ụmụ ihe ole na ole, m ga-eme gị onyeisi ọtụtụ ihe: baa n’ọṅụ nke onyenwe gị.” Ohu ahụ nke natara talent abụọ n’otu aka ahụ mụbara talent ya okpukpu abụọ, ọ natakwara otu ịja mma na ụgwọ ọrụ ahụ.

Otú ọ dị, olee otú ndị ohu a kwesịrị ntụkwasị obi si na-aba n’ọṅụ nke Onyenwe ha? Leenụ, ọṅụ nke Onyenwe ha, Jisọs Kraịst, bụ nke ịnata Alaeze ahụ mgbe ọ gara njem n’ala ọzọ n’ebe Nna ya nọ n’eluigwe. Banyere ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge anyị, ha nwere oké ọṅụ n’ihi ịbụ ndị a mụbara ibu ọrụ dị iche iche nke ha nwere n’ebe Alaeze ahụ dị, mgbe ha na-ejesịkwa ozi ha n’elu ala, ha ga-enwe ọṅụ zuru ezu nke ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ ịba n’Alaeze eluigwe ahụ. Ma olee ihe banyere ohu nke atọ ahụ?

“Onyenwe anyị, amaara m gị na ị bụ mmadụ aka ike,” ka ohu nke a kpesara. “M wee tụọ egwu, wee jee zobe talent nke gị n’ala: lee, i nwere nke gị.” Ohu ahụ leziri anya jụ ịrụ ọrụ n’ubi ahụ a rụrụ ọrụ na ya site n’izi ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. Ya mere onyenwe ya kpọrọ ya “ajọ ohu nke dị ume ngwu” wee maa ya ikpe, sị: “Napụnụ ya talent ahụ. . . . Tụpụkwanụ ohu a na-abaghị n’ihe n’ọchịchịrị nke èzí: n’ebe ahụ ka ịkwa ákwá na ịta ikikere eze ahụ ga-adị.” Ndị mezuru òtù ajọ ohu nke a, n’ihi ịbụ ndị a chụpụrụ n’èzí, bụ́ ndị a napụrụ ọṅụ ime mmụọ nile.

Nke a bụ nnọọ ezi ihe mmụta nye ndị nile na-ekwupụta na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ha aghaghị ịrụ ọrụ maka mmụba nke ihe Onyenwe ha nke eluigwe nwere site n’ikere okè zuru ezu n’ọrụ nkwusa ahụ ma ọ bụrụ na ha ga-anata ịja mma na ụgwọ ọrụ ya, ma ọ bụrụkwa na ha ga-ezere ịbụ ndị a tụpụrụ n’ọchịchịrị nke èzí na mbibi n’ikpeazụ. Ì ji ịdị uchu na-eji ike ndị i nwere na-eme ihe n’akụkụ nke a? Matiu 25:14-30.

◆ Ihe di aṅaa ka ilu nke a na-esonụ na-ezi anyị?

◆ Olee ndị bụ ndị ohu ahụ, gịnị bụkwa ihe onwunwe ndị ahụ e nyefere ha?

◆ Olee mgbe onyenwe ahụ bịara maka ime mpịazi, oleekwa ihe ọ chọpụtara?

◆ Gịnị bụ ọṅụ ahụ nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi bara n’ime ya, oleekwa ihe mere ajọ ohu ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya