Washington Codex nke Oziọma ahụ
NA DECEMBER 1906, Charles L. Freer, onye America bụ aka ji akụ nke nwere ụlọ ọrụ na-emepụta ngwa ahịa na onye na-achịkọta ihe nkà dị iche iche, zụtara ụfọdụ ihe odide ochie site n’aka onye Arab na-ere ahịa aha ya bụ Ali, na Giza, Egypt. Ali sịrị na ya wetara ha site na White Monastery nke dị nso na Sohâg, ma o yikarịrị ka a chọtara ha ná mkpọmkpọ ebe nke Monastery of the Vinedresser, nke dị nso na pyramid nke atọ nke Giza na ngwụsị nke Osimiri Nile.
E nyefere Freer ihe odide ochie atọ na “ùkwù parchment dị ojii, ma retọọ eretọ, nke siri ike ma na-agbari agbari n’elu ya dị ka gọm.” N’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, nke a dị 6.5 inch [17 sentimita] n’ogologo, 4.5 inch [11 sentimita] n’obosara, na 1.5 inch [4 sentimita] n’ibu, e rekọtakwara ya na ihe odide ochie ndị ahụ nanị n’ihi na ha dịkọtara ọnụ, ọ bụghị] n’ihi uru ọ bụla e chere na ọ bara n’onwe ya. Ọ bụ ọrụ siri ike, nke na-achọ mkpachara anya ikewa ibe akwụkwọ ndị ahụ kpụkọtaworo ọnụ, ma n’ikpeazụ e kpughere 84 n’ime ha, ha nile si na codex nke akwụkwọ ozi Pọl nke narị afọ nke ise ma ọ bụ nke isii O.A.
Otu n’ime ihe odide ochie atọ ndị fọdụrụnụ bụ nke akwụkwọ Deuterọnọmị na Joshua. Nke ọzọ bụ Abụ Ọma, nke sitere na nsụgharị Greek Septuagint. Otú ọ dị, nke atọ na nke kasị dị mkpa na ha nile bụ ihe odide ochie nke Oziọma anọ ahụ.
Ihe mejupụtara ihe odide ochie nke ikpeazụ a bụ 187 ibe akwụkwọ nke ezi parchment nke ihe kasị n’ime ya bụ akpụkpọ atụrụ, bụ́ nke e dere n’aka akwụkwọ uncial (mkpụrụ akwụkwọ ukwu) n’akwụghị ọtọ nke ndị Grik. E nwekebeghị ebe e dere ihe ga-egosi ebe a ga-akwụsịtụ wee kuru ume, ma e nwekarịrị ebe oghere di n’agbata ahịrịokwu dị iche iche. Ọnụ ọnụ nke ihe odide ochie ahụ rekasịrị nnọọ nke ukwuu, ma e chekwawo ihe kasị ukwuu n’ihe odide ya. E mesịrị nyefee ya n’aka Freer Gallery of Art nke Smithsonian Institution, na Washington, D.C. Ebe a kpọrọ ya Washington Codex nke Oziọma ahụ, a kpọkwasịrị ya mkpụrụ akwụkwọ ahụ bụ “W” iji wee na-amata ya.
Mgbe e ji dee parchment ahụ bụ ná ngwụsị nke narị afọ nke anọ ma ọ bụ mmalite nke narị afọ nke ise O.A., nke mere na ọ dịghị anya laa azụ n’ebe atọ ndị ahụ dị mkpa nọ, bụ́ ihe odide ochie nke Sinai, Vatican, na Alexandria. Oziọma ahụ (nke zuru ezu ma e wezụga ibe akwụkwọ abụọ furu efu) nọ n’usoro nhazi a sị na ọ bụ nke ndị ebe Ọdịda Anyanwụ bụ Matiu, Jọn, Luk, na Mak.
Ịgụ ihe odide ochie ahụ na-ekpughe ngwakọta nke ụzọ ide ihe dịgasị iche iche ndị a na-adịghị ahụbu, nke ọ bụla wee bụrụ nke e ji akụkụ ndị buru ibu ma too ogologo nochite anya ya. O yiri ka e sitere n’ihe odide ochie dị iche iche ndị lanarịrị alanarị depụta ha, nke ọ bụla nwere ụdị ide ihe dị iche. Professor H. A. Sanders tụrụ aro na e nwere ike iwere nke a laghachi azụ n’oge nsogbu mberede ahụ e sogburu ndị Kraịst site n’aka Emperor Diocletian n’afọ 303 O.A., onye e ji n’ihi iwu o tiri nye iwu ka e rechapụ Akwụkwọ nsọ nile n’ọkụ n’ihu ọha. Anyị matara site n’ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme na e zopụrụ ihe odide ochie ụfọdụ n’oge ahụ. N’afọ iri ndị ikpeazụ, o yiri ka onye a na-amaghị ama detara akụkụ dị ịche ịche nke ihe odide ochie ahụ na-alanarị alanarị e ji mepụta Washington Codex. N’ikpeazụ, ibe akwụkwọ iri abụọ na anọ nke mbụ nke Jọn (Jọn 1:1 ruo 5:11) furu n’otu oge, wee bụrụ nke e degharịrị na narị afọ nke asaa O.A.
E nwere ọdịiche ụfọdụ na-adọrọ mmasị n’ihe odide ahụ na mgbakwunye a na-adịghị ahụkebe ma bụrụ nke a gụpụrụ agụpụ, nke e mere na Mak 16 bụ́ nke ma eleghị anya malitere dị ka ntụaka etiti peji. Abamuru pụrụ iche nke ihe odide ochie ahụ dị na njikọta dị n’etiti ya na nsụgharị nke asụsụ Latin ochie na Syriac. Akara ndị ihe kpatara ha bụ kandụlụ gbazere agbaze tasara n’elu parchment ahụ na-egosi na e jiri ya mee ihe nke ọma.
N’agbanyeghị nsogbu na mmegide na ọnọdụ ọjọọ dị iche nke oge a, e chekwawo Bible n’ụzọ dị ebube maka anyị n’ime ọtụtụ ụdị ihe odide ochie. N’ezie, “okwu Jehova na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Pita 1:25, NW; Aịsaịa 40:8.
[Ebe E Si Nweta Foto 15]
Courtesy of Freer Gallery of Art, Smithsonian Institution