Gịnị “Dị Mkpa”?
IHE odide W Codex nke a nke Oziọma ahụ enyewo aka ná nsụgharị nke okwu ahụ Jisọs gwara Mata, bụ́ nwanne nwanyị nke ezi enyi ya bụ Lazarọs. Mgbe Jisọs letara ezinụlọ ahụ, Mata chere na iwetara Jisọs ezi nri bụ ihe kasị mkpa, ma o jiri obi ọma tụọrọ ya aro ka ọ gbasoo ihe nlereanya nke nwanne ya nwanyị bụ Meri, bụ́ onye nọdụrụ ala n’ụkwụ ya ige ya ntị. O kwuru, sị: “Otú ọ dị, ihe dị mkpa bụ nanị ihe ole na ole, ma ọ bụ nanị otu. N’akụkụ nke ya, Meri họọrọ akụkụ nke dị mma, ya ka a na-agaghị anapụkwa ya.”—Luk 10: 42, NW.
Okwu ndị a na-asụgharị ihe odide Grik nke 1881, nke ndị dere ya bụ Westcott and Hort, nke bụ ihe ndabere nke New World Translation. Nkọwa ala ala peji nke Mbipụta 1984 Reference Bible nke a na-egosi na ihe ọgụgụ nke a sitere n’ihe odide ochie nke Sinai (א) na Vatican (B), ha abụọ wee na-anọchi anya otu ụdị ihe odide ahụ. Ma ihe odide ochie nke Alexandria (A) na-agụ, sị: “otú ọ dị, otu ihe dị mkpa. N’akụkụ nke ya . . . “ Dị ka nkọwa ala ala peji ahụ na-eme ka ọ pụta ìhè, ihe odide Codex W, dịkwa ka ihe odide Chester Beatty papyrus (P45) na ihe odide Bodmer papyrus (P75), bụ́cha ndị nke narị afọ nke atọ O.A., na-ekwekọ n’ụdị nsụgharị nke ikpeazụ a. Ma ihe odide ochie ndị a nile apụtawo ìhè ogologo oge mgbe Westcott na Hort bipụtasịrị akwụkwọ ha n’afọ 1881, nke mere na ha enweghị ohere ịtụle nsụgharị ọzọ nke a pụkwara iji mee ihe. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nsụgharị nke ihe odide anyị na-ahọrọ iji mee ihe taa, Jisọs na-agwa anyị n’ụzọ doro anya idote ihe ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị—bụ́ ndụmọdụ nke ọ ga-adị mma ma anyị gbasoo.