Ihe Ndị A Hụrụ n’Ala Nkwa ahụ
Site Na Teboa Ruo Mmeri!
CHEEDI echiche ịbụ onye guzoro n’ebe dị elu ma na-eleda anya n’ebe a nọ mee ihe ụfọdụ nke akụkọ ihe mere eme! Ị pụrụ n’ezie ịhụ ka akụkọ ihe mere eme na-ewere ọnọdụ. Ala Megido dị ka ọ dị na Bible pụrụ ikwesị ekwesị karịsịa maka nkọwa ahụ, n’ihi na ọ dị n’etiti abụọ nke ụzọ ndị dị mkpa maka azụmahịa na ibu agha. Ma, Ugwu Teboa selitere elu ná ngabiga nke Ndagwurugwu Jezreel, bụrụkwa nke nọ ná ncherịta ihu nke Via Maris, bụ́ ụzọ a ma ama e si aga obodo nile nke Fertile Crescent.a
Ọ bụrụ na i lee Teboa anya site n’ebe ọ bụla n’ógbè ahụ, ọ ghaghị nnọọ ịmasị gị. (Tụlee Jeremaịa 46:18.) Teboa seliteere onwe ya isi n’ókèala ahụ nile, a na-ahụ ọnụ ọnụ ya dị ka okpu elu ya kara ọnụ site n’akụkụ nile. Ọ dị nnọọ elu karịa ala dị larịị gbasapụrụ ná ncherịta ihu ya n’akụkụ ndịda, bụ́ ala na-eme nri nke Ndagwurugwu Jezreel nke na-ejikọ ụsọ oké osimiri ahụ na Ndagwurugwu Jọdan.
Site n’ọnụ ọnụ dịtụ okirikiri nke Teboa, ị pụrụ ilega anya n’ebe ndịda gaa n’obodo Jezreel, bụ́ nke pụrụ ichetara mmadụ iwe Jihu ji gbara ịnyịnya gaa n’obì eze Ehab na ọgwụgwụ ihere nke Jezebel. (1 Ndị Eze 21:1; 2 Ndị Eze 9:16-33) Megido dị ya nso. Ị pụrụ ịhụ Ugwu Kamel n’akụkụ ọdịda anyanwụ, bụ́ ebe Elaịja nọ lee ule nke ọkụ. (1 Ndị Eze, isi 18) Site na Teboa ị pụkwara ịhụ ebe osimiri Kaịshọn na-eruga n’oké osimiri, ihe dịkwa ka maịlụ ise [8 kilomita] n’ebe ugwu nke akụkụ ebe ọdịda anyanwụ n’ugwu nile nke ndịda Galili ka e nwere Nazaret.
Ma olee ihe ndekọ Bible nke ịkpọtụ Teboa aha na-echetara gị? Ma eleghị anya ọ bụ banyere Debora na Berak. N’oge ha, ndị Kenean n’okpuru Eze Jebin nke Hezoa kpagburu Israel ruo 20 afọ. Mgbe ahụ onye amụma nwanyị bụ Debora kpaliri Berak ime ihe. Ya onwe ya n’akụkụ nke ya, kpaliri puku ndị Israel iri, karịsịa site n’ebo Naftali na Zebulọn ndị nọ na Galili, ma mee ka ha zukọọ na Teboa. Ha enweghị ezigbo ngwá agha, n’ihi na e nweghị ọtá ma ọ bụ ube n’Israel.—Ndị Ikpe 5:7-17.
E ji oké ngwá agha ndị dị egwu wakwasị ha. Onyeisi ndị agha Jebin bụ́ Sisera chị ndị agha Kenean a kwadebere nke ọma bịa na Ndagwurugwu Jezreel. Ha aghaghị ịdịworị ka ndị ikom ahụ kere ekike agha e gosipụtara n’ihe a tụrụ n’elu ájá e nwetara n’Ijipt, nke e sere foto ya na peji na-esonụ, n’elu ebe aka nri. E mere ka ngwá agha e ji mee ihe na Kenean dị ka nke e nwere n’Ijipt, tinyere ndị nke kasị na-akpata ụjọ ná ngwá agha nile nke Sisera—bụ́ 900 ụgbọ agha ịnyịnya na-adọkpụ!
Ụgbọ agha ndị ahụ nke ndị Kenean aghaghị ịbụworị ebe dị mma a ga-esi na-atụpụ ngwá agha nke na-adịghị akwụ otu ebe. Onye na-anya ya pụrụ ikeworị eriri ndị e ji anya ya gburugburu úkwù ya ka o wee jiri aka ya abụọ na-atụpụ ngwá agha. Ma ọ bụ ọ pụrụ itinye uche iduzi ịnyịnya ndị ahụ mgbe onye agha ibe ya na-agbapụsị ngwá agha. Ụgbọ ala ndị ahụ nwere ígwè ndị ọnụ ha rọrọ arọ mịpụtasịrị ọnụ site n’azụ ha. Nye ndị ikom Berak ndị si na Teboa na-eleda anya, ụgbọ agha ndị a nile aghaghị ịdị ka ihe egwu nke a na-apụghị ịkwụsị akwụsị, ndị a na-apụghị imeri emeri.
Ma, Jehova ekwewo Berak nkwa, sị: M ga-adọkwa Sisera, . . . ruo gị ahụ, ruo mmiri iyi Kaịshọn, ya na ụgbọ ala ya na ìgwè ndị ya.” N’oge kwesịrị ekwesị, ndị Israel ahụ obi siri ike wụdara n’akụkụ Teboa.—Ndị Ikpe 4:1-14.
Ihe dị mkpa karịa nanị uru nke ime ihe na mberede bụ enyemaka ndị Israel nwetara site n’aka Chineke ha dị ike bi n’eluigwe. Debora mesịrị bụọ abụ, sị: “N’eluigwe ka ha si buo agha, kpakpando si n’ụzọ nile ha a tụliri atụli buso Sisera agha. Mmiri iyi Kaịshọn bupụrụ ha . . . Mkpụrụ obi m, ị na-azọda ike.” (Ndị Ikpe 5:20, 21) Ee, ọ bụ ezie na ndị Israel na-enweghị ngwá agha ndị dị mma, ma bụrụ ndị nwere obi ike, chụlagara ndị Kenean kere ekike agha, ọ bụ Chineke kpebiri ihe siri na ya pụta n’ezie. O mere ka e nwee oké idei mmiri na mberede n’okpo mmiri ahụ takọrọ atakọ, na-eme ka ụgbọ agha ndị ahụ dị egwu ghara inwe ike ịgbagharị agbagharị.
N’okpuru ebe a i na-ahụ osimiri Kaịshọn. N’udu mmiri, ọ pụrụ itojupụta akụkụ ya nile ma mee ka ala ahụ bụrụ pọtọpọtọ. Jiri anya nke uche lee ụgbọ agha ndị Kenean ndị ahụ ka ha na-agbalị ịgbalaga site na pọtọpọtọ dị otú ahụ. Oké mmiri ndị ahụ na-asọ ike ike buuru ndị agha na ụgbọ agha ụfọdụ na-ewe ọsọ, ma ọ bụ ha abụọ. Mmeri Israel nwetara metụtakwara ọbụna Onyeisi ndị agha Sisera, bụ́ onye gbahapụrụ ụgbọ agha ya, jiri ụkwụ si n’ọgbọ agha ahụ gbalaga. Mgbe ọ gbabara n’ụlọ nwanyị ahụ bụ Jael, ọ họọrọ oge dị mma ma mee ka onyeiro nke a nwụọ.—Ndị Ikpe 4:17-22.
Otú a, e gosipụtara otu akụkụ dị mkpa na nke inwe mmeri n’akụkọ ihe mere eme nke ndị Israel nye Debora na ndị ọzọ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha si n’ebe dị elu nke Ugwu Teboa na-ekiri ihe na-emenụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee map na foto buru ibu, pụtara ìhè nke Teboa dị na 1990 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 16]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 17]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.