Ijere Jehova Ozi N’oge Dị Mma na N’oge Nsogbu
Dị ka Hal Bentley si kọọ
E MEWO ndokwa inwe otu mgbakọ sekit nke Ndịàmà Jehova n’otu ime obodo nta dị na Nyasaland (nke a na-akpọ Malawi ugbu a). Ndị nlekọta sekit na distrikti nọ na-eme nleta ikpeazụ n’ikpó okwu ahụ e ji ahịhịa na osisi achara wuo, nakwa ụlọ ntú ndị ahụ e ji ahịhịa wuo, bụ ebe ihi ụra. Na mberede, otu ìgwè ndị na-eme ihe ike gbara ha gburugburu, bụ́ ndị zoburu n’ime ọhịa dị nso. Ìgwè ndị ahụ na-eme ihe ike sunyere ụlọ ntú ndị ahụ na ikpó okwu ahụ ọkụ ma manye ụmụnna abụọ ahụ ije n’ụlọ ebe ha bi.
Nwunye onye nlekọta distrikti, bụ́ Joyce Bentley, gbapụtara ka ọ hụ ihe na-emenụ. A chụghachikwara ya azụ. Onye na-edu ìgwè ndị ahụ na-eme ihe ike tiri mkpu na mzungu (onye ọcha) ahụ aghaghị ịla ozugbo. Ìgwè mmadụ ahụ ekweghị ka anyị kwakọrọ ngwongwo anyị, ha wee manye anyị ịbanye n’ime moto Land-Rover anyị. Ha gbara moto ahụ gburugburu—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị—na-eti mkpu, sị, “Pitani mzungu” (Laa, onye ọcha) na “Kwacha” (Nnwere onwe). Anyị tụrụ anya na ha ga-akwatu Land-Rover ahụ, anyị wee kpekuo Jehova ekpere n’ime obi anyị. Ma ìgwè mmadụ ahụ talatara, anyị wee gbara jee n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii kasị dịrị nso, nke dị na Mzimba, ihe dị ka 30 maịlụ [50 kilomita] site n’ebe ahụ.
Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, anyị na otu onye uwe ojii sooro lọghachi. N’ihi nsogbu e nwere n’ebe ndị ọzọ, ọ bụ nanị ya ka ha pụrụ ịkpọnye anyị. Mgbe anyị rutere n’ebe ahụ ìgwè mmadụ ahụ wakwasịrị anyị, anyị hụrụ ka e guzobere ọkọlọtọ ndị òtù Malawi Congress Party n’èzí, deekwa mkpụrụ okwu ndị ahụ bụ M.C.P. n’ahụ ụlọ ndị ahụ e ji ájá wuo. Otú ọ dị, mgbe onye uwe ojii ahụ sooro ndị ebe ahụ kwurịtasịa okwu, ha kwere ka anyị jee kwabajuo ngwongwo anyị n’ime Land-Rover ahụ.
Anyị chọtakwara onye nlekọta sekit ahụ, bụ́ Rightwell Moses, na nwunye ya. Nwunye ya gbabara n’ime ọhịa n’oge ìgwè mmadụ ahụ na-awakwasị anyị. Ma ọ fọrọ nke nta ka a gbagbuo Rightwell n’osimiri dị nso ebe ahụ. Ìgwè mmadụ ahụ bukọrọkwara nri nile a chọrọ iji mee mgbakọ ahụ. Mgbe ahụ, ha mere ka ụmụnna ndị nwoke zọrọ ije gaa n’otu akụkụ, meekwa ka ndị nwanyị na ụmụntakịrị zọrọ ije gaa n’akụkụ nke ọzọ ruo ọtụtụ maịlụ, ruo mgbe ike gwụrụ ìgwè ndị ahụ na-eme ihe ike, e wee hapụ ha.
Ihe omume nke a bụ otu n’ime ihe ndị dujere n’ịmachibido ọrụ anyị iwu na Malawi, bụ́ nke dujere n’oké mkpagbu a kpagburu Ndịàmà Jehova, nke gụnyere ogbugbu, oké iti ihe, idina ndị inyom n’ike, na ịtụ mkpọrọ.
Gịnị Mere Anyị Ji Nọrọ na Malawi?
Na June 28, 1916, a mụrụ m n’obodo Leeds, nke dị na Yorkshire, England, abụ m nwa ikpeazụ n’otu ezinụlọ nwere ụmụ ise. Anyị abụghị ezinụlọ ji okpukpe kpọrọ ihe, anyị adịghị ejekwa chọọchị.
Ka ọ na-erule 1939, mgbe Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ, ma nne ma nna m anwụworị. Na June 1940, mgbe m dị nanị 24 afọ, eyiriwo m rịị uwe agha, ruokwa afọ ise na-esonụ, ejere m ozi ná ngalaba dị iche iche nke ndị na-eji ụgbọ agha eje agha. N’ime afọ ndị ahụ, ka m na-anọdụ n’ebe ndị e gwunyere égbè ọwụ mgbọ n’ụsọ mmiri nke dị n’ọwụwa anyanwụ ebe ugwu England, ma na-elepụ anya na mbara igwe nke jupụtara na kpakpando, e nwere ọtụtụ mgbe m chere echiche banyere Chineke wee cheekwa echiche ihe mere na Onye Okike nke ihe magburu onwe ya otú a ga-eji kwere ka e nwee ime ihe ike di otú a, mwụfu ọbara, na ịta ahụhụ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụ nanị mgbe a tọhapụrụ m site n’ọrụ agha ka m chọtara azịza nye ọtụtụ ajụjụ ndị ahụ nyeworo m nsogbu eri ogologo oge.
N’otu uhuruchi nke oge oyi n’afọ ahụ, otu onye kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m. Mgbe m meghere ụzọ ahụ, ahụrụ m na ọ bụ otu nwoke metụworo okenye, onye malitere ikwu okwu banyere Bible. Nke a dujere n’ọmụmụ Bible, n’oge na-adịghị anya o dujekwara m n’ime baptism n’April 1946. Na 1949, ahapụrụ m ọrụ m wee ghọọ onye ozi ọsụ ụzọ nke Ndịàmà Jehova.
E mesịa, ejere m ozi n’ụlọ ọrụ Betel nke dị na London ruo ihe karịrị afọ atọ, na 1953 akpọkwara m òkù ije klasị nke 23 nke Watchtower Bible School of Gilead nke dị na South Lansing, New York, ịbụ onye a zụrụ dị ka onyeozi ala ọzọ. Mgbe nke a gasịrị, anaara m ọrụ ozi ala ọzọ n’ebe a na-akpọ Nyasaland n’oge ahụ. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, e dupụrụ m jee n’ọrụ distrikti. Ruo afọ ise, ejegharịrị m gburugburu mba ahụ mara mma dị ka nwa okorobịa na-alụbeghị nwunye. Ewulitere m ịhụnanya n’ebe ndị ahụ nọ, bụ́ ndị nwere nnọọ obi ụtọ, na-elekwa ọbịa nke ọma, ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime ha enweghị ihe onwunwe dị ukwuu karịa ibé ala ebe ha kụrụ ọka, ọkụkọ ole na ole, na ewu ma ọ bụ ézì ole na ole. Ụfọdụ n’ime ha bụ ezi ndị na-akụ ọkụ azụ. Esooro m ha biri n’ụlọ nta ha dị iche iche ndị e ji ájá na osisi wuo, sorokwa ha jegharịa n’ọrụ nkwusa ahụ site n’otu obodo nta gaa n’obodo nta ọzọ. Enwekwara m ọṅụ n’iso ha kpakọrịta ná mgbakọ ndị ha na-eme na mbara èzí, bụ́ mgbe ha na ezinụlọ ha dị iche iche na-anọkọta, na-ege ntị nke ọma n’ihe ndị ọkàokwu na-ekwu, ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ, oké mmiri na-ezo!
Mgbe m nọrọ n’otu obodo nta, mmadụ nile, ma ụmụntakịrị ma ndị okenye, na-abịa n’otu n’otu ikele m, na-asị: “Moni, muli bwanji?” (Kedụ, ị̀ dịkwa mma?) Ọbụna mgbe m ji ụkwụ na-eje site n’otu obodo nta gaa n’obodo nta ọzọ, ndị mmadụ na-akwụsị ịkọ ihe n’ubi ha wee kelee m.
Ọgbakọ ọ bụla nke mụ na onye nlekọta sekit jere ileta na-ewuru m ụlọ pụrụ iche. Mgbe ụfọdụ ọ na-abụ ụlọ e wusiri ike nke e ji osisi wuo ma jiri akịrịka kpuchie elu ya, bụ́ ndị na-amasị m nke ukwuu. Ma achọpụtara m na ọ na-ewetụ oge tupu ụlọ e ji akịrịka kpuchie ọhụrụ akwụsị ihi mmiri!
N’otu oge, ụmụnna ahụ wuuru m ụlọ e ji ahịhịa acharaike wuo. O nwere akụkụ atọ, e jikwa moto Land-Rover m mere akụkụ ya nke anọ. Nke a bụ na ndagwurugwu Osimiri Shire, ebe a na-enwe okpomọkụ n’ogologo afọ dum, anwụnta dị ebe ahụ anaghị ezukwa ike ọrụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, wee na-eme ka mmadụ ghara inwe ohere izu ike ọ bụla ma n’ehihie ma n’abalị! Ebe m na-enweghị ákwà e ji achụ anwụnta ma ọ bụ ọgwụ na-achụ anwụnta, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe siri ike ịnọgide na-aga.
Onye Mụ Na Ya Ga-anọ Ogologo Ndụ M Nile Esonyere M
Na 1960, nwunye m, bụ́ Joyce Shaw, sonyeere m, bụ́ onye nọwororịị na-eje ozi dị ka onyeozi ala ọzọ n’Ecuador. Ee, mgbe m nwesịrị ọṅụ n’onyinye nke ịnọ n’alụghị nwunye ruo afọ ole na ole, e jikwara onyinye ọzọ wee gọzie m—ịlụ nwunye—bụ́ nke m ka nwere obi ụtọ banyere ya mgbe 30 afọ gasịworo. E jiwo ọtụtụ ahụmahụ na-akpali akpali gọzie mụ na Joyce.
N’otu oge, site n’iji osisi na ahịhịa mee ihe, ụmụnna rụrụ otu àkwà e ji agafe otu mmiri nta. E mere nke a ka m wee nwee ike ịgafe jee n’otu obodo nta ebe ha chọrọ ka m gosi sinima Society nke isiokwu ya bụ “Òtù Ụwa Ọhụrụ Nọ n’Ọrụ.” Ma ihe ahụ a gbakwụnyere na moto Land-Rover ahụ konyere n’otu osisi dị n’àkwà mmiri ahụ. N’alaghị azụ ọ bụla, ụmụnna ahụ kopụrụ ihe mgbakwụnye ahụ, wee mee ka m nwee ike ịkwọrọ moto gafee àkwà mmiri ahụ, mgbe nke a gasịrị, ha nuuru ihe mgbakwụnye ahụ n’aka gafeta. Anyị nwere ihe ịga nke ọma n’igosi ihe nkiri ahụ.
Mgbe ụfọdụ, osimiri ndị e nwere na-asa mbara nke ukwuu nke na a pụghị ịrụ àkwà e ji agafe ha. Mgbe ahụ, ụmụnna ahụ ga-ebupụsị ihe nile dị na Land-Rover ahụ—ígwè generator nta na-enye ọkụ, ígwè e ji egosi ihe nkiri ahụ, film, àkwà—wee jiri ụkwụ gafee osimiri ahụ, ebe otu n’ime ụmụnna ahụ ga-eburu m n’ubu ya gbasiri ike wee gafee. Ụmụnna nwanyị abụọ na-akwọfeta Joyce. Osimiri ụfọdụ miri emi nke ukwuu. A na-agafe ndị a site n’iji ụgbọ mmiri bụ plankị a kụkọtara akụkọta nke a tụkwasịrị n’elu ihe dị ka nnukwute drọnụ asatọ ma ọ bụ iri na-arụ. Mgbe ahụ, ndị ọkwọ ụgbọ abụọ ga-eji eriri dọfeta anyị.
Ụmụnna ndị Malawi nyeere anyị aka nke ukwuu, gosikwa anyị obi ọma, na-ejikwa nsọpụrụ dị omimi na-emeso anyị. N’otu mgbe, mgbe ndị obodo yiri egwu na ha ga-esu ụlọ ebe anyị nọ ọkụ, ụmụnna ahụ mụrụ anya n’anyasị nile iji hụ na anyị nọrọ ná nchebe. Ọbụna tupu a machibido Ndịàmà Jehova iwu na 1967, e nwere ọnọdụ ihe ize ndụ dị iche iche, gụnyere nke ahụ a kọwara ná mmalite akụkọ nke a. Ọtụtụ n’ime ụmụnna nwoke na ndị nwanyị nọ na Malawi gaara adịworị njikere ịtụfu ndụ ha n’ihi anyị.
N’otu mgbe, mụ na otu nwanna nwoke bu otu nnukwu akpụ̀ n’egedege ihu ya so jee ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ. E tiri ya ajọ ihe n’ụbọchị ole na ole tupu mgbe ahụ. N’otu ụlọ, o jiri nnọọ nwayọọ gbaa ezi àmà nye onyenwe ụlọ ahụ.
Mgbe anyị hapụrụ ụlọ ahụ, nwanna nwoke ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ nwoke ahụ tiri m ajọ ihe nke a!” Echetara m okwu Pọl: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ . . . were ezi ihe merie ihe ọjọọ.”—Ndị Rom 12:17-21.
Ịgbasapụ Ije Ozi Anyị
Mgbe anyị ka nọ na Malawi, mụ na Joyce gara ọtụtụ njem na Mozambique nke dị nso. Ọmụma ọ maara asụsụ Spanish, bụ́ nke ọ mụtara mgbe ọ na-eje ozi n’Ecuador, nyeere anyị aka, ebe ọ bụ na ndị na-asụ asụsụ Portuguese pụrụ ịghọta ihe ọ na-ekwu. N’oge na-adịghị anya, anyị abụọ nwechara ike iji asụsụ Portuguese kwurịta okwu. Anyị nọgidere na-eje Mozambique site n’ebe ọzọ e kenyere anyị ọrụ, bụ́ Zimbabwe. Chọọchị Katọlik nwere mmegide dị ilu n’ebe ọrụ nkwusa ahụ dị, ha kpalikwara nsogbu. Ma n’ime afọ iri sochirinụ, e nwere ọtụtụ mgbe anyị nwetara nlekọta ịhụnanya nke Jehova na nchebe ya ka anyị nọ na-achọgharị ndị yiri atụrụ nọ n’ebe ahụ.
N’otu oge anyị jere Mozambique, anyị jere leta otu nwanyị nwere mmasị n’ebe ugwu nke ọdụ ụgbọ mmiri ahụ bụ Beira. Nwanne ya nwanyị bi na Portugal edeworo ya akwụkwọ wee kọọrọ ya ụfọdụ n’ime ihe ndị dị ebube ọ mụtaworo site n’iso Ndịàmà Jehova na-amụ ihe. Nwanyị ahụ achọpụtawo na ihe ndị a bụ eziokwu site na Bible nke ya, ọbụna malite ịdị na-agwa ndị agbata obi ya banyere ha. Ma, nanị address anyị nwere bụ aha ụlọ ọrụ ndị mekanik ebe di ya na-arụ ọrụ.
Ka anyị na-abịa nso ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ọrụ ahụ, otu nwoke jụrụ anyị ma ọ̀ dị ihe ya pụrụ imere anyị. Anyị gwara ya na anyị chọrọ ịhụ di nwanyị ahụ. O gosiri anyị otu onye mekanik na-arụ ọrụ n’otu moto, wee hapụ anyị ozugbo ahụ. Anyị kọwaara onye mekanik ahụ onwe anyị wee gwa ya na anyị chọrọ ije leta nwunye ya. Ahụ erughị ya ala ma ọlị. Mgbe o du anyị na-eje n’ụlọ ya, ọ kọwaara anyị na nwoke ahụ anyị bu ụzọ gwa okwu ejewela ịkọrọ onyeisi ndị P.I.D.E. (ndị uwe ojii nzuzo) nọ n’obodo ahụ banyere ọbịbịa anyị. Anyị azọnyewo ụkwụ n’ọnyà! Ọ kọwakwara na nwunye ya, n’ihi ọrụ nkwusa ya, bụzi onye ndị uwe ojii na-enyo enyo ruo oge ụfọdụ ugbu a, na ha nwetakwara akwụkwọ ozi ahụ anyị dere iji gwa ya na anyị na-abịa ileta ya. Ha bịara were Bible ya, ma o ji amamihe mee ihe wee zopụ otu Bible ọzọ! Ha kpọtakwara onye bishọp ndị Katọlik ka ọ nwaa ịrụgide ya ịkwụsị ikwu okwu banyere Jehova na Alaeze ahụ!
Mgbe anyị zutere nwanyị ahụ nwere mmasị, o nwere mmetụta dị ukwuu nke na ọ makụrụ Joyce. Ọ rịọrọ di ya ka o kwere ka anyị nọrọ n’ụlọ ha, ma nwoke ahụ jụrụ ajụ wee laghachi n’ụlọ ọrụ ya. Anyị ji nwa ohere nta ahụ anyị nwere mee ihe kachasị mma, na-enye ya agbamume sitere na Bible, na-ajakwa ya mma maka iguzosi ike otú ahụ. Iji wee zere ịkpatakwuru ya nsogbu, anyị hapụrụ ya ma kwe nkwa ịlaghachi mgbe ọnọdụ dịtụrụ mma. Mgbe anyị hapụrụ ụlọ ahụ wee jee gbajuo tankị mmanụ ụgbọ ala anyị n’ụlọ ọrụ ndị mekanik ahụ, anyị chọpụtara na e nwere ndị guzo na-ele anyị anya, ma ọ dịghị ndị jidere anyị. Anyị wee jee Beira, letakwa ọgbakọ nta dị n’ebe ahụ tupu anyị alaghachi Zimbabwe. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, anyị laghachiri, anyị nwekwara ike isoro nwanyị ahụ nwere mmasị na di ya, na nwa ha nwanyị rikọọ nri. E mesịa, o mere baptism n’oge o jere Portugal, wee ghọọ onye nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi.
N’ebe dịtụkwu n’ebe ugwu, anyị jere ọtụtụ ugbo ileta ebe ndị dị ka Quelimane, Nampula, na Nacala, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri nta. Na Nacala, anyị na-ejekarị ileta ezinụlọ Soares. Mazị Soares nụrụ banyere eziokwu ahụ nke mbụ ya na Portugal. Ma mgbe ọ kwaara bịa Mozambique, ụmụnna ndị nọ na Lourengo Marques (nke a na-akpọ Maputo ugbu a), bụ́ isi obodo nke Mozambique, sooro ya na ezinụlọ ya mụọ ihe. O metụrụ ha n’obi nke ukwuu na anyị dị njikere ịga njem ọtụtụ narị maịlụ ije leta ezinụlọ bipụrụ ebipụ. Ha nwere ezi ọganihu. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ha kwagakwara South Africa, bụ́ ebe nwa ha nwanyị, bụ́ Manuela, nọ na-eje ozi na Betel dị ka onye nsụgharị asụsụ Portuguese.
Anyị jere leta ọgbakọ ahụ dị na Lourenco Marques ọtụtụ mgbe. Nke a pụtara ịga njem ihe karịrị 700 maịlụ [1,100 kilomita] site na Blantyre n’okporo ụzọ ndị na-adịghị mma ma ọlị. Anyị nwere nnukwute nsogbu ụgbọ ala ugbo abụọ, ọ dịkwara mkpa ka moto ọzọ dọkpụrụ nke anyị jee Salisbury (nke a na-akpọ Harare ugbu a). Ma ọ bụ ihe oké ọṅụ ịhụ ìgwè nta ahụ nọ na Lourenco Marques ka ha tolitere wee ghọọ ọgbakọ dị nnọọ mma n’agbanyeghị na ha na-arụ ọrụ n’okpuru mmachibido iwu. A na-enwe obere mgbakọ sekit dị iche iche site n’oge ruo n’oge. Ma a ghaghị ime ha n’ime ọhịa, dị ka à ga-asị na ụmụnna ahụ bụ nnọọ ìgwè mmadụ buru ibu ndị na-enwe ntụrụ ndụ. Ọtụtụ ugbo, e mere ndokwa inwe mgbakọ n’ofe nke ọzọ nke ókèala ahụ na Nelspruit nke dị na South Africa. Nke a nyeere ụmụnna nọ na Maputo aka ịghọta nzukọ Jehova nke ọma, nakwa ito uto n’ime mmụọ.
Ọgbakọ ahụ dị na Beira guzosikwara ike. N’ihi ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị e nwere na Mozambique, ụmụnna ndị si ná mba ahụ nọsasịrị ugbu a na Portugal, South Africa, Canada, Brazil, United States, nakwa n’ebe ndị ọzọ. Otuto nile na-agara Jehova, bụ́ onye ‘mere ka mkpụrụ ahụ baa ụba.’ (1 Ndị Kọrint 3:6, 7) Ee, ruo afọ iri, anyị nwere ihe ùgwù nke inyere ụmụnna anyị ndị nọ na Mozambique aka n’okpuru ọchịchị ndị Portugal. N’ileghachi anya azụ, ọ na-atụ anyị n’anya bụ ụzọ Jehova si meghee ohere ka anyị wee nwee ike ime nke a.
N’otu oge, mgbe anyị jere ileta Nampula nke dị n’ebe ugwu, otu onye òtù P.I.D.E. jidere anyị. A napụrụ anyị akwụkwọ nile anyị ji, gụnyere Bible, gwakwa anyị na ọ dịghị mgbe ọ bụla a ga-ekwe ka anyị banyeghachi Mozambique. N’agbanyeghị nke ahụ, site n’enyemaka Jehova, anyị nwere ike ije mba ahụ ọtụtụ ugbo ọzọ. Mgbe ọ bụla anyị ruru n’ókèala ahụ, anyị na-arịọ enyemaka na nduzi ya ka anyị wee nwee ike imezu uche ya, nweekwa ike inye ụmụnna anyị ndị nọ ná mba ahụ agbamume na ọzụzụ nke dị ha oké mkpa.
Na 1979, e zigara anyị Botswana. O nwere mbara ala buru ibu, nke hà ka ọkara South Africa. Ebe ọ bụ na akụkụ dị ukwu bụ ọzara, bụ́ Kalahari, e nwere ihe na-erughị otu nde mmadụ bi na ya. N’ebe a, anyị enwewo ihe ùgwù ndị dị ka inye aka iwu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze na ụlọ obibi ndị ozi ala ọzọ na Gaborone, bụ́ isi obodo ya. Ihe ùgwù ọzọ anyị nwere abụwo inyere ndị na-asụ asụsụ Portuguese aka, bụ́ ndị si Angola gbata ọsọ ndụ, na isoro ha mụọ Bible.
Anyị nwekwara ike inyere ndị na-eto eto abụọ si Zimbabwe aka. Ná mba agbata obi nke a, o yiri ka è sitere n’otu ndokwa pụrụ iche nye Ndịàmà Jehova ohere ịkuzi Akwụkwọ nsọ n’ụlọ akwụkwọ ụfọdụ. Nke a kpaliri mmasị nke ndị a na-eto eto. Mgbe ha mesịrị bịa biri na Botswana, anyị na ha zutere, ha wee rịọ ka a malitere ha ọmụmụ Bible. Otú ọ dị, ndị mụrụ ha megidere nke a, ya mere, ọ dịrị mkpa na ha ga na-abịa n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ ahụ maka ọmụmụ ihe ha. Ha nwere ezi ọganihu wee ghọọ Ndịàmà mere baptism.
Ka m na-eleghachi anya na 41 afọ nke ije ozi ala ọzọ ná mba asatọ dị iche iche, enwere m ekele dị omimi nye Jehova maka ọtụtụ ngọzi ndị m nwetaworo. Ọ bụghị ihe dị nnọọ mfe, ma ọ bụwo ihe oké ọṅụ nye mụ na Joyce inyere ọtụtụ ndị aka iwere ọnọdụ siri ike n’akụkụ Alaeze ahụ, ịhụkwa ezi ọganihu ha na-enwe n’agbanyeghị ọtụtụ ihe isi ike na mmegide siri ike. Ọ bụwo n’ezie ‘ikwusa okwu ahụ, imekwa ya ngwa ngwa ma n’oge dị mma ma n’oge ihe isi ike.’ Ee, ije ozi oge nile bụ ahụmahụ magburu onwe ya, bụrụkwa oké ihe ùgwù nke anyị ji obi anyị nile na-atụrụ ndị nile pụrụ ịhazigharị ọnọdụ ha iji nwee ike ime nke a, aro ka ha mee ya.—2 Timoti 4:2.
[Map dị na peeji nke 21]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
ANGOLA
ZAMBIA
MALAWI
Mzimba
Blantyre
MOZAMBIQUE
Nacala
Beira
Maputo
ZIMBABWE
Harare
NAMIBIA
BOTSWANA
Gabarone
SOUTH AFRICA
INDIAN OCEAN
600 km
400 mi
[Foto dị na peeji nke 24, 25]
Mgbe osimiri ndị ahụ di omimi hie nne, ndị ụgbọ mmiri abụọ ga-eji eriri dọfeta anyị