Akụ Anyị, Ije Ọzi Nke Dị Ebube n’Oge A
‘Anyị nwere akụ a n’ite ájá, ka ọkịka nke ike ahụ wee bụrụ nke Chineke, gharakwa isite n’anyị onwe anyị.”—2 NDỊ KỌRINT 4:7
1. (a) Akụ dị aṅaa nke dị ebube ka anyị pụrụ inwe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee otú Bible si kọwaa onyinye nke Iwu Moses ahụ?
IJE ozi nke ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” n’ime oge ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a bụ n’ezie akụ, ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu. N’ihi na Jehova bụ Chineke nke dị ebube, ozi a na-ejere Chineke bụ ije ozi nke dị ebube, wee si otú a bụrụ akụ. (Matiu 24:14; 2 Ndị Kọrint 3:18-4:1) Banyere onyinye e nyere Iwu Moses ahụ n’ụzọ dị ebube, e dere n’Ọpụpụ 34:29, 30, sị: “O ruo, mgbe Moses siri n’ugwu Saịnaị rịda (mbadamba nkume abụọ nke ihe àmà ahụ dịkwa n’aka Moses mgbe o siri n’ugwu ahụ rịda), na Moses amaghị na akpụkpọ ihu ya na-enwupụta ìhè mgbe ọ kpanyeere [Jehova] ụka. Erọn na ụmụ Israel nile wee hụ Moses, ma, lee, akpụkpọ ihu ya nwupụtara ìhè; ha wee tụọ egwu ịbịaru ya nso.”
2. Gịnị ka ije ozi nke Iwu Moses ahụ sere onyinyo ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ije ozi nke abụọ ahụ ji bụrụ ihe dị ebube karị?
2 Ọpụ. 34 Amaokwu 32 ruo 34 na-ekwukwa, sị: “E mesịakwa ụmụ Israel nile bịaruru nso, o wee nye ha n’iwu ụka nile nke Jehova kpanyeere ya n’ugwu Saịnaị. Moses wee gwabie ha okwu, kpudo ihe mkpudo n’ihu ya. Ma mgbe ọ bụla Moses bara n’ime n’ihu Jehova ịkpanyere ya ụka, o wezụga ihe mkpudo ahụ ruo mgbe ọ pụtara.” Ije ozi nke Iwu Moses ahụ sere onyinyo ije ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ site n’aka Onye Ogbugbo ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Ya mere, ọ bụrụ na ije ozi nke mbụ ahụ bụ ihe dị ebube, lee nnọọ ka nke abụọ ahụ ga-esi dịrị ebube karị, bụ́ “ije ozi nke mmụọ nsọ”! (2 Ndị Kọrint 3:7-11) Ọ dị ebube karị n’ihi na o nwere ebube nke na-adịgide adịgide, ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst na-ekerekwa òkè na ya.—Ndị Rom 12:11.
3. (a) Olee ihe na-aghaghị ịbụ eziokwu banyere ije ozi nke Ndịàmà Jehova, ma n’ihi gịnị ka o ji bụrụ na ọtụtụ ndị adịghị ahụta nke a? (b) Gịnị nwapụtara na Moses anọwo n’ihu dị ebube nke Jehova?
3 Ya mere, nke a gosiri na ije ozi nke Ndịàmà Jehova bụ ihe dị ebube. Otú ọ dị, nke a adịghị apụta ìhè nye ọtụtụ ndị, bụ́ ndị okpukpe ụgha meworo ka ha kpuo ìsì. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ n’ime ha nwere Bible, ha pụkwara ịgụ ya, ha enweghị ‘anya na-ahụ ụzọ.’ (2 Pita 1:5-9) Iji wee bụrụ ndị e wepụrụ ihe mkpudo ahụ n’anya ha, ha aghaghị ichigharịkwuru Jehova Chineke n’okwukwe, n’ihi na mgbe Moses jere n’ihu Jehova, o wepụrụ ihe mkpudo ahụ nke mere ka ndị Juu ghara ịhụ ihu ya. (2 Ndị Kọrint 3:16) Egwu tụrụ ụmụ Israel ịhụ ebube nke Chineke n’ihu onye ogbugbo ha, ha wee rịọ ka e kpuchie ya ka ha ghara ịhụ ya anya. Dị ka ihe na-adọta ìhè nke e debeworo n’ebe ìhè dị na-egosipụta ìhè nke na-egbuke egbuke mgbe e debere ya n’ebe gbara ọchịchịrị, otú ahụ ka Moses, onye na-agabitara ha, gosipụtara ebube Jehova, na-anwapụta n’ezie na ọ nọwo n’ihu Jehova.
4. Olee ụzọ ndị na-ekweghị ekwe nke oge a si na-eṅomi ndị Juu oge ochie, ma gịnị ka ndị na-eso ụzọ Moses ahụ Ka Ukwuu na-adịghị atụ egwu ya?
4 Moses sere onyinyo Onye Amụma dị ukwuu nke Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst. Dị ka onye ahụ sere onyinyo ya, Moses nke a Ka Ukwuu adịghị atụ egwu ikiri ebube Jehova kpọmkwem. Otú ọ dị, ruokwa taa, ndị na-ekweghị ekwe, bụ́ ndị Ekwensu na okpukpe Babilọn ya meworo ka ha kpuo ìsì, na-eṅomi ndị Juu oge ochie ahụ wee na-ajụ ịhụ, ma ọ bụ ịghọta, ebube nke Moses ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst. (2 Ndị Kọrint 3:12-15) Ma, ezi ndị na-eso ụzọ ya adịghị atụ egwu ilekwasị mgbukepụ nke ebube Jehova anya, bụ́ nke na-egbukepụ site n’ihu Jisọs Kraịst. N’ịbụ ndị a tọpụworo site ná mmetụta nke Babilọn, ha na-enwe anya ike igosipụta ebube nke Chineke. Pọl dere, sị, “Ya mere ebe anyị nwere olileanya dị otú a, anyị na-ekwuwa okwu nke ukwuu.”—2 Ndị Kọrint 3:12.
Ndị Na-egosipụta Ebube nke Chineke
5. Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta ebube nke Chineke wee dị ka Moses mgbe ọ nọ n’elu ugwu ahụ n’ihu Jehova?
5 Jisọs Kraịst ewepụwo ihe mkpudo ahụ site n’ikpughere anyị Jehova Chineke, kọwaakwara anyị ya. (Jọn 1:14, 17, 18) Ya mere, anyị aghaghị ịdị na-enwupụ enwupụ, ebube Chineke sikwa otú a na-enwupụ site ‘n’inye ìhè nke ozi ọma nke ebube nke Kraịst, onye bụ onyinyo Chineke,’ bụ́ nke anyị na-aghaghị ịkpọsa. Mgbukepụ ya bụ “inye ìhè nke ọmụma nke ebube nke Chineke n’ihu nke Jisọs Kraịst.” Anyị aghaghị igosipụta ebube nke a site n’ikwu okwu banyere ịdị ebube nke Jehova na ịdị ebube nke Alaeze ya site n’aka Ọkpara ya. (2 Ndị Kọrint 4:4-6) Dị ka Moses n’elu ugwu ahụ n’ihu Jehova, Ndịàmà Ya ndị nọ n’elu ala adịghị ekpuchi obi ha ka ọ ghara ịhụ ebube Jebova. Ha ji ọṅụ na-ekiri ebube nke e gosipụtara n’ihu Ọkpara na Eze Jehova, bụ́ Jisọs Kraịst. Otú a, ha aghaghị igosipụta ìhè nye ndị ọzọ banyere ịdị ebube nke Chineke.
6. Olee otú Pọl si kọwaa ije ozi anyị dị ebube ná 2 Ndị Kọrint 3:18, è sikwa n’ụzọ dị aṅaa ‘na-enwogha’ anyị n’ụzọ dị otú ahụ?
6 Nye ndịàmà nile ọzọ nke ebube Jehova, Pọl onyeozi kọwara ya n’okwu ndị a: “Ma anyị onwe anyị nile ebe anyị weere ihu nke e kpupụworo ihe mkpudo na-egosi ebube nke [Jehova, NW] dị ka enyo, a na-enwogha anyị ruo n’otu onyinyo ahụ site n’ebube ruo ebube, ọbụna dị ka a na-enye ya site [na Jehova, bụ́ Mmụọ ahụ, NW].” (2 Ndị Kọrint 3:18) Ka anyị na-enwetakwu ebube nke ìhè nke a karị, otú a ka anyị ga na-egbukepụta ya karị, otú ahụkwa ka a ga na-enwogha anyị karị. A na-eme ka echiche dị ọhụrụ, na-emezigharịkwa ya, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na a gaghị ahụta mgbanwe nke ọdịdị elu ahụ ma ọ bụ nke ihu. Ọ bụ ìhè nke ozi ahụ dị ebube nke anyị na-egosipụta na-akpata mgbanwe ahụ dị n’ime anyị. A na-agbanwe ndụ anyị iyi nke Kraịst, ka anyị na-akwadebe onwe anyị imezu ihe ùgwù nke ije ozi ahụ nke ịgbasara ndị ọzọ ìhè nke a dị ebube.—Ndị Hibru 13:15.
7. Olee ebe ezi ebube na-esi abịa, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosịpụta ebube dị otú ahụ?
7 Mgbanwe nile dị otú ahụ bụ site ná mmụọ, ma ọ bụ ike ọrụ nke Chineke. Ndị ụkọchukwu Krisendọm adịghị egosipụta ebube nke Jehova Chineke, kama ihe ha na-eme bụ nanị iyikwasị ihe ngosi nke na-abụghị ezie iji wee mee ihe ọha ga-ekiri. Ebube ahụ abụghị ebube nke anyị, ọ dịghịkwa anyị mkpa iyikwasị onwe anyị uwe echichi ndị ụkọchukwu ndị dị ebube nke ákwà silk, ọlaedo, na ọla ndị na-egbukepụ egbukepụ. Ezi ebube bụ nke a na-enweta site ná mmụọ Chineke, a na-egosipụtakwa nke a site n’ịgba àmà dị ebube banyere Jehova, bụ́ Mmụọ ahụ.
Ndị Nile Nwere Ihe Ùgwù nke Inye Ìhè
8, 9. Agbamume dị aṅaa ka Pọl na-enye anyị ná 2 Ndị Kọrint 4:1, 2, mkpebisi ike dịkwa aṅaa ka ọ chọrọ anyị n’aka?
8 Ná 2 Ndị Kọrint 4:1, 2, anyị na-agụ, sị: “N’ihi nke a, ebe anyị nwere ije ozi a, dị ka e meere anyị ebere, ike agwụghị anyị n’obi: kama anyị jụrụ ihe nzuzo nile nke na-eweta ihere, anyị adịghị ejegharị n’aghụghọ, anyị adịghị emesokwa okwu Chineke n’ụzọ ịtụ ntụ; kama anyị ji ngosi nke eziokwu na-eme ka akọ na uche nke mmadụ nile n’otu n’otu mara anyị n’ihu Chineke.” Chineke emeworo anyị ebere ikenye anyị ije ozi nke a. Nke a bụ okwu ndụmọdụ iji gbaa anyị ume ka anyị were obi ike na-aga n’ihu, nke a ka anyị ga-emekwa! Ebe e mewooro anyị amara site n’inye anyị ìhè nke sitere n’Okwu Chineke, anyị nwere ibu ọrụ nke ime ka ndị ọzọ hụ ya.—Tụlee Matiu 5:14-16.
9 Ihe na-eme ndị mmadụ ihere, dị ka igwu wayo, ka ha na-ezochi site ná nrafu na aghụghọ. Ma anyị enweghị ihe ọ bụla ihere ga-eme anyị n’ihi ya n’ihi na ozi anyị na ọrụ anyị abụghị nke wayo kama ha bụ nke ezi omume na nke eziokwu. Ya mere, anyị pụrụ igbukepụta ebube nke ìhè ahụ n’ụzọ zuru ezu. Anyị adịghị emeso Okwu Chineke n’ụzọ nrafu. Ime nke ahụ ga-apụta iji ya eme ihe n’ụzọ ịchọ ọdịmma onwe onye iji nweta uru, ebube, ihe ịga nke ọma, na ike nke ụwa, nakwa iji gbanarị mmegide na mkpagbu sitere n’aka ụwa. Ndị ahụ egwu na-adịghị atụ iji ihu a na-ekpuchighị ekpuchi bịakwute Jehova nakwa ileba anya n’ìhè dị ebube nke eziokwu, agaghị atụkwa egwu iche ibu ọrụ dịịrị ha ihu. Ha ga-ekwe ka ìhè ahụ si n’ahụ ha nwupụta.
10. N’ihi gịnị ka ụta na-adịrịghị Ndịàmà Jehova ma ọ bụrụ na ozi ọma Alaeze ahụ bụ ihe e kpuchiri ekpuchi n’anya ụfọdụ ndị?
10 Ọ bụrụ na ọ dị ndị ọ bụla ozi ọma Alaeze ahụ bụ ihe e kpuchiri ekpuchi n’anya ha, ọ bụghị Ndịàmà Jehova ka ụta dịịrị maka nke ahụ kama ọ bụ ha onwe ha ka ụta dịịrị. A naghị ezo ozi ọma Alaeze ahụ ezo. Ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova bụ ihe a maara nke ọma. Otú a, ha pụrụ ikwu, dị ka Pọl onyeozi kwuru, sị: “E meghị ihe a na nkuku.” N’ezie, dị ka o dere, ozi ọma ahụ abụwo “nke e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.”—Ọrụ 26:26; Ndị Kọlọsi 1:23.
11. N’ihi gịnị ka ozi ọma ahụ dị ebube ji bụrụ ihe e kpuchiri ekpuchi nye ọtụtụ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ?
11 Ndị ozi ọma nke Alaeze Chineke bụ ihe e zoro ezo n’ebe ha nọ bụ ndị mmegide, ndị ahụ Ekwensu mere ka ha kpuo ìsì. (Tụlee Matiu 12:30.) Ọ gwụlakwa ma ha wepụgara onwe ha site n’okpukpe ụgha, sitekwa n’ọnyà nile nke Ekwensu, ha na-echere mbibi. N’okpuru ike mmụọ ọjọọ, ndị dị otú ahụ na-eji ihe mkpudo kpuchie anya nke onwe ha, n’ihi na Pọl onyeozi kwuru ná 2 Ndị Kọrint 4:3-5, sị: “Ma a sịkwa na e kpudoworo ozi ọma anyị ihe, ọ bụ n’etiti ndị na-ala n’iyi ka e kpudoworo ya: ndị chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì n’etiti ha, ka inye ìhè nke ozi oma nke ebube Kraịst, onye bụ onyinyo Chineke, wee ghara ịwakwasị ha. N’ihi na ọ bụghị anyị onwe anyị ka anyị na-ekwusa, kama ọ bụ Kraịst Jisọs, na ọ bụ Onyenwe anyị, anyị na-asịkwa na anyị onwe anyị bụ ndị ohu unu n’ihi Jisọs.”
12. N’ụzọ na-eyighị nke ndị ahụ e mere ka ha kpuo ìsì n’uche ha, olee otú ndị Jehova na-esi azaghachi n’okwu ahụ dị ná 2 Ndị Kọrint 4:6?
12 Ndị e meworo ka ha kpuo ìsì n’uche ha achọghị ikwere. Ekweghị ekwe ha na-emeghe uche ha nye mwabata nke ndị mmụọ ọjọọ. (1 Timoti 4:1) Ha apụghị ịhụta ebube Jehova ma ọ bụ ngosipụta ya site n’ihu Jisọs, bụ́ Moses ahụ Ka Ukwuu. Ndị Jehova na-enweta ìhè ahụ dị ebube site na Bible, na-egosipụtakwa ya nye ndị ọzọ. Ya mere, ndị ohu Chineke nile bụ ndị na-enye ìhè, Chineke nyekwara iwu ka e mee ka ìhè ahụ nwuo. Ihè ahụ aghaghị isite n’ebe ndị Chineke nọ na-enwu, nwukwasịkwa ndị ọzọ, bụ́ ndị nọ n’ọchịchịrị nakwa n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e bibiri. Nke a bụ nnọọ dị ka 2 Ndị Kọrint 4:6 si kwuo ya: “N’ihi na ọ bụ Chineke, onye sịrị, Ìhè ga-esi n’ime ọchịchịrị nwupụta, bụ́ onye nwubara n’ime obi anyị, iweta inye ìhè nke ọmụma nke ebube nke Chineke n’ihu nke Jisọs Kraịst.” N’iburu nke a n’ucbe, Ndịàmà Jehova na-emezu iwu Chineke ahụ wee na-ekwe ka ìhè ha na-enwuru ndị ọzọ, iji nye Chineke otuto.
Akụ nke Di Ebube n’Ime Ite ndị Na-esighị Ike
13. Iji ihe e kere eke bụ anụ ahụ mee ihe n’ije ozi ahụ a gọziri agọzi nke ịbụ ndị na-enye ìhè na-arụpụta gịnị?
13 N’ihe ùgwù ije ozi nke a na-enweghi atụ, ọ dị oké mkpa ka ndị ahụ na-enye ìhè gosipụta onwe ha ịbụ ndị ruru eru iji ìhè ahụ site n’ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi ha nye Chineke. Iji mezuo ihe ùgwù ije ozi nke a, Chineke ejighị ndị mmụọ ozi dị nsọ mee ihe, bụ́ ndị ọ gụrụ agụụ ileba anya n’ime ihe ndị a, ma o nyewo ihe ndị e kere eke bụ anụ ahụ ije ozi nke a a gọziri agọzi. (1 Pita 1:12) O mewo nke a iji gosipụta ịdị ukwuu nke ike ya n’etiti adịghị ike nke mmadụ. Dị ka 2 Ndị Kọrint 4:7 si kwuo ya: “Ma anyị nwere akụ a n’ite ájá, ka ọkịka nke ike ahụ wee bụrụ nke Chineke, gharakwa isite n’anyị onwe anyị.”
14. (a) Gịnị bụ ‘akụ a dị n’ite ájá’? (b) N’ihi gịnị ka Moses na Jisọs Kraịst ji bụrụ ezi ihe nlereanya nye anyi n’ihe banyere akụ?
14 N’oge ochie, a na-ejikarị ite eme ihe dị ka ihe a na-eji etinye ihe ndị bara uru. Gịnị bụ akụ nke a dị ebube nke Ndịàmà Jehova nwere n’ime ite na-esighị ike, bụ́ ite ájá—ha onwe ha, dị ka ihe e kere eke ndị na-esighị ike, ndị sitere n’ájá nke ala? Akụ nke a abụghị nanị ìhè ahụ nke nwubaworo n’ime obi ha. Ọ bụ ije ozi nke ìhè ahụ, bụ́ ozi nke ha na-aghaghị ijezu n’anụ ahụ ha nke elu ala. Ije ozi ahụ bụ mwupụ nke ìhè ahụ nke Chineke meworo ka o nwukwasị obi ha. Ije ozi nke a bụ akụ dị mma n’ihi na ọ bụ ihe ùgwù ije ozi bara uru nke ọ na-abụghị nanị ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ nke “ìgwè atụrụ nta” ahụ na-ekere òkè na ya taa, kama “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” nke Onye ọzụzụ atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, na-ekerekwa òkè na ya. (Luk 12:32; Jọn 10:14-16; Mkpughe 7:9) Moses na onye ahụ o sere onyinyo ya, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ ezi ihe nlereanya dịịrị anyị, idebe obi anyị n’akụ nke a nke ijere Chineke ozi, “n’ihi na ebe akụ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.”—Matiu 6:19-21; Ndị Hibru 11:26.
15, 16. (a) E si aṅaa egosi na ọkịka nke ike sitere n’aka Chineke, ọ bụghị nke anyị onwe anyị? (b) N’ihi gịnị ka mmegide nile ụwa na-eweta ga-eji kụọ afọ n’ala ná mgbali ya itiwasi ite ájá nke Chineke?
15 Ya mere, olee otú a na-esi egosipụta na ọkịka nke ike sitere n’ebe Chineke nọ, na ọ bụghị nke anyị onwe anyị? Ọ bụ n’ụzọ dị otú a: Ite ájá na-esighị ike dị ka anyị, bú ndị na-eji akụ ije ozi na ọrụ nke a bụ ndị na-erughị eru, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla anyị pụrụ inwe ihe ùgwù dị otú ahụ n’ike nke onwe anyị. Ọzọkwa, a na-eji ụdị nrụgide nile na-awakwasị anyị bụ Ndịàmà Jehova iji nwaa ime ka anyị daa mbà ma ọ bụ dakpọọ, wee bụrụ ndị na-ekwesịghị ekwesị ịrụ ọrụ ahụ Chineke kenyere anyị. Ya mere, ọ ghaghị ịbụ ike nke Onye Ukwu ahụ Na-enye ọrụ na-enyere anyị aka ịnagide oké mmegbu ụwa nke a na-emegbu anyị, ijikwa jigidesie ọrụ ahụ e kenyere anyị ike, gosipụtakwa onwe anyị ịbụ ndị kwesịrị ka anyị nọgide n’ije ozi ya. Otú a, mmegbu nile ụwa na-eweta ga-akụ afọ n’ala ná mgbalị ya itiwa ite ájá nile nke Chineke wee napụ ha akụ ha dị oké ọnụ ahịa, n’ihi na e dere ná 2 Ndị Kọrint 4: 8-12, sị:
16 “A na-akpagbu anyị n’akụkụ nile, ma a dịghị akpagbubiga anyị ókè; anyị nwere obi abụọ, ma anyị adịghị enwebiga obi abụọ ókè; a na-esogbu anyị, ma a dịghị ahapụ nanị anyị; a na-atụda anyị n’ala, ma a dịghị ala anyị n’iyi; anyị na-ebugharị n’ahụ anyị mgbe nile ogbugbu nke Jisọs, ka e wee meekwa ka ndụ nke Jisọs pụta ìhè n’ahụ anyị. N’ihi na a raara anyị onwe anyị, bụ́ ndị dị ndụ, nye n’aka ọnwụ mgbe nile n’ihi Jisọs, ka e wee meekwa ka ndụ nke Jisọs pụta ìhè n’anụ ahụ anyị nke pụrụ ịnwụ anwụ. Ya mere ọnwụ na-arụsi ọrụ ike n’ime anyị, ma ndụ [site n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ] na-arụsi ọrụ ike n’ime unu.”
Oké Ìgwè Mmadụ Ji “Akụ A” Kpọrọ Ihe Nke Ukwuu
17. Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ si ele “akụ a” nke ije ozi dị ebube anya?
17 “Ọnwụ na-arụsi ọrụ ike n’ime anyị, ma ndụ na-arụsi ọrụ ike n’ime unu.” Okwu a metụtara ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ma, ọ pụkwara ime ka anyị chee echiche banyere mmekọrịta dị n’etiti ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ nke Chineke na oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ. Ndị e tere mmanụ maara na ha aghaghị imesịa jezuo ozi elu ala ha n’ọnwụ dị ka Jisọs mere, ma ha nwere ndị enyi ha na ha ga-ekerịta akụ ahụ dị ebube nke ije ozi, ndị ga-enyere ha aka site n’ịrụ akụkụ ka ukwuu nke ọrụ nkwusa ozi ọma Alaeze ahụ. Dị ka ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ, oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ taa na-amata na nanị akụ nke ga-agabiga agha Amagedọn nke yiri ọkụ ma nọgide bụrụ nke ọkụ na-emetụtaghị, nke a na-erepịaghịkwa, n’ime ụwa ọhụrụ ahụ bụ akụ nke a nke ije ozi a gọziri agọzi, bụ́ ozi a na-ejere Jehova Chineke na Eze ya dị ebube, bụ́ Jisọs Kraịst. Oké ìgwè mmadụ ahụ ga-ejidesi ya ike, ‘na-ejere [Chineke] ozi dị nsọ ehihie na abalị n’ụlọ nsọ ya.’—Mkpughe 7:15.
18. (a) Gịnị gaje ime ebube na-abụghị ezie nke ụwa nke a n’oge na-adịghị anya? (b) “Ebube” dị aṅaa ka Jisọs jụrụ ịnara, ọ̀ bụkwa site n’ime gịnị ka o nwetara ebube nke dị elu karị?
18 N’oge na-adịghị anya, Chineke gaje iweta ebube na-abụghị ezie nke ajọ usoro ihe dị ugbu a ná njedebe—bụ́ “ebube” nke dịworo eri mgbe ahụ Ekwensu kpọọrọ Jisọs jee n’otu ugwu dị oké elu wee gosi ya alaeze nile nke ụwa “na ebube ha.” (Luk 4:5, 6) Jisọs jụrụ ịnara ebube site n’aka onye dị otú ahụ ma nọgidekwa na-agbaso ihe omume nke Chineke kwadoro n’elu ala. N’ihi ime nke a, a ga-eji ebube kpube ya okpueze, bụ́ nke dị elu ọbụna karịa ebube o nweburu n’eluigwe dị ka Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, tupu ọ malite ọrụ ya n’elu ala dị ka Jehova setịpụụrụ ya.—Jọn 5:36; 17:5; Ndị Filipaị 2:9-11.
19. Ihe ùgwù ije ozi dị aṅaa na-abịaru nso mmezu ya zuru ezu, gịnị bụkwa mkpebi anyị banyere nke a?
19 Ọgwụgwụ ahụ e buru n’amụma nke ajọ usoro ihe nke a agaghị abịa tupu a gbaa àmà Alaeze ahụ n’elu ala dum dị ka oké ihe omume ikpeazụ nke ọrụ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst, bụ́ Ndịàmà nke Jehova. (Matiu 24:14) A nọwo na-agba àmà Alaeze ahụ ugbu a ruo iri afọ asaa na ise, dịkwa ka ihe ndị na-eme n’ụwa n’oge anyị a na-egosi, ọgwụgwụ ahụ e buru n’amụma aghaghị ịdị nso. N’ihi nke a, ihe ùgwù ahụ nke ikere òkè n’ije ozi nke ọchịchị eze ahụ dị nsọ kwesịrị ịnọ na-abịaru nso mmezu ya zuru ezu. (Matiu, isi 24, 25; Mak, isi 13; Luke, isi 21) Ihe ùgwù anyị nke ikere ọ̀kè n’ịgba àmà ahụ zuru ụwa ọnụ nye Alaeze ahụ e guzobeworo bụ n’ezie akụ dị ebube nke Ndịàmà Jehova, dị ka ndị na-eso ụzọ nke Ọkpara ya e meworo ka ọ nọkwasị n’ocheeze, bụ́ Jisọs Kraịst, ji kpọrọ ihe nke ukwuu. Ha na-agbalị ijigidesi ya ike ruo mgbe a gbazuru àmà Alaeze ahụ, mgbe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, ga-ejikwa ịgba àmà nke onwe ya weta ọnọdụ ahụ dị n’eluigwe na ala ná njedebe, n’ịkwado ịbụ ọkaaka eluigwe na ala ya.—Zefanaịa 3:8.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ N’ihi gịnị ka ije ozi Ndịàmà Jehova ji bụrụ nke dị ebube?
◻ N’ihi gịnị ka ozi ọma ahụ ji bụrụ ihe e kpuchiri ekpuchi nye ọtụtụ ndị taa?
◻ Gịnị bụ ‘akụ a dị n’ite ájá’?
◻ N’ihi gịnị ka Chineke jiworo jiri ite ájá na-esighị ike mee ihe maka akụ nke ije ozi ya?
◻ Olee otú Ndịàmà Jehova si ele “akụ a” anya, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
[Foto dị na peeji nke 17]
Ihu Jisọs Kraịst, bụ́ Moses ahụ Ka Ukwuu. na-egosiputa ebube Chineke. Ndịàmà Jehova nwere ihe ùgwù nke ịhụta ìhè dị ebube nke Chineke site na Bible, na-egosipụtakwara ya ndị ọzọ