Ụmụ Okoro na Agbọghọ Ndị Jere Ozi n’Oge Bible
BIBLE kọrọ banyere ọtụtụ ezi ndị na-eto eto ndị ji ozi ha na-ejere Chineke kpọrọ ihe dị mkpa, ndị a gọzikwara n’ụzọ bara ụba maka ime nke ahụ. Ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị okenye gbaworo isi awọ, ezi ihe nlereanya ndị a dị na Bible pụrụ ịbụrụ anyị ihe oké agbamume.
Josef dị nanị 17 afọ mgbe e rere ya gaa n’ịbụ ohu n’Ijipt. N’ebe ahụ, n’ebe ezinụlọ ya na-anọghị nso, ebe ndị maara ya na-agaghị ahụkwa ya, Josef gosipụtara ikwesị ntụkwasị obi ya. Mgbe nwunye Pọtifa nwara ịrafu Josef, ọ sịrị: “M ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?” Ọbụna mgbe ọ nọ n’ihu Fero ahụ dị oké ike, bụ́ eze nke kasị dịrị ike n’oge ya, Josef jiri ohere ahụ mee ihe inye Chineke otuto maka ịkọwa isi nrọ ndị Fero rọrọ. A gọziri ya n’ụba. Chineke jiri ya mee ihe ịzọpụta ma ndị Ijipt ma ezinụlọ nke ya site n’ọnwụ nke ụnwụ nri kpatara, nakwa iji kpọta nna ya, bụ́ Jekọb na ezinụlọ ya n’Ijipt.—Jenesis 37:2; 39:7-9; 41: 15, 16, 32.
Mosis na Ndị Ọzọ Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi Dị Ka Ndị Na-eto Eto
Ada Fero kpọọrọ Mosis dị ka nwa nke ya, ma nne na nna Mosis nwere ike ịkụziri ya ihe banyere ezi Chineke ahụ. Bible na-asị na mgbe o tolitere, Mosis “[jụrụ] ka a kpọọ ya nwa nwoke nke nwa nwanyị Fero; n’ihi na ọ họọrọ ka e mejọkọọ ya na ndị nke Chineke, kama inwe ihe ụtọ nke mmehie na nwa oge.” Chineke jiri Mosis mee ihe ịkpọpụta ndị ya site n’Ijipt, ịnata Iwu ahụ na Saịnaị, nakwa ide akụkụ dị ukwuu nke Bible. N’agbanyeghị ihe bụ afọ ndụ gị, ị̀ na-ewulite mkpebi siri ike ijere Chineke ozi dị ka Mosis jere?—Ndị Hibru 11:23-29; Ọpụpụ 2:1-10.
Akwụkwọ nsọ na-agwa anyị banyere “ụmụntakịrị” ndị sooro ihe fọdụrụ ná mba ahụ dum gee ntị mgbe a na-agụpụtara Israel Iwu Chineke. (Deuterọnọmi 31:10-13) “Onye ọ bụla nke na-aghọta ịnụ ihe” guzoro ọtọ “site n’ìhè ụtụtụ ruo etiti ehihie” ịnụrụ Iwu ahụ n’oge Nehemaịa. (Nehemaịa 8:1-8) Ọbụna ma a sị na ụmụntakịrị ndị ahụ aghọtachaghị ihe nile, ha pụrụ ịghọta na ha kwesịrị ịhụ Jehova Chineke n’anya, fee ya ofufe, rubekwara ya isi. N’agbanyeghị ihe bụ afọ ndụ gị, ì gewo ntị ná mgbakọ ukwu na mgbakọ nta dị iche iche ebe a na-atụle Okwu Chineke? Ị mụtawo mkpa ọ dị irubere ya isi, dị ka ụmụntakịrị ndị Israel ahụ mụtara?
Devid, Josaịa, na Jeremaịa
Chineke họọrọ Devid, bụ́ nke kasị dị nta n’ime ụmụnne asatọ maka ije ozi pụrụ iche, wee kwuo banyere ya, sị: “Achọtawo m Devid nwa Jesi, nwoke nke dị ka obi m si achọ, onye ga-eme ihe nile m na-achọ.” Chineke họpụtara ya ịbụ ‘onye na-azụ ndị ya dị ka atụrụ,’ Devid jezukwara ozi ahụ, ka ọ nọ na-egosipụta ịhụnanya ya n’ebe Jehova nọ ruo ọtụtụ afọ. O dere ihe karịrị 70 n’ime Abụ Ọma ndị ahụ, ghọọkwa onye so ná ndị nna ochie nke Jisọs Kraịst. Ma ị̀ bụ onye na-eto eto ma ọ bụ onye meworo okenye, ị̀ na-aghọta ụzọ nile nke Chineke, na-emekwa ihe ndị ọ na-achọ, dị ka Devid mere?—Ọrụ 13:22; Abụ Ọma 78:70, 71; 1 Samuel 16:10, 11; Luk 3:23, 31.
Josaịa ghọrọ eze mgbe ọ dị nanị afọ asatọ. Mgbe ọ gbara ihe dị ka 15 afọ, “mgbe ya onwe ya nọ na nwata, ọ malitere ịchọ Chineke nke Devid nna ya.” Tupu ọ gbaa 20 afọ, Josaịa malitere mkpọsa megide ofufe ụgha. Mgbe e mesịrị, o mere ka a rụzigharịa ụlọ nsọ ahụ, weghachikwa ofufe dị ọcha n’ala ahụ. Anyị na-agụ, sị: “Ụbọchị ya nile ha esighị n’iso Jehova, bụ́ Chineke nke ndị bụ nna ha, wezụga onwe ha.” Anyị nile apụghị ịbụ eze dị ka Josaịa, ma anyị pụrụ ijere Chineke ozi, guzogidesiekwa ofufe ụgha ike, n’agbanyeghị ihe bụ afọ ndụ anyị.—2 Ihe Emere 34:3, 8, 33.
Chineke onye pụrụ ime ihe nile gwara Jeremaịa, sị: “Tupu akpụọ m gị n’afọ amara m gị, ọ bụkwa tupu i si n’akpa nwa pụta ka m doro gị nsọ; ewerewo m gị nye ka ị bụrụ onye amụma dịịrị mba nile.” Jeremaịa jụrụ ajụ, na-asị na ya etorubeghị ịbụ onye amụma: “Ewó, Onyenwe anyị Jehova! lee, amaghị m ikwu okwu, n’ihi na nwata ka m bụ.” Jehova zaghachiri, si: “Asịla, Nwata ka m bụ: n’ihi na ọ bụ onye ọ bụla m ga-ezi gi ka i ga-ejekwuru, ọ bụkwa ihe ọ bụla m ga-enye gị n’iwu ka i ga-ekwu.” Ruo ihe karịrị 40 afọ, Jeremaịa mere kpọmkwem otú ahụ, ọbụnakwa mgbe ọ chọrọ ịkwụsị, ọ pụghị ịkwụsị. Okwu Chineke “dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro n’ọkpụkpụ [ya] nile.” Ọ ghaghị nnọọ ikwu okwu! N’agbanyeghị ihe bụ afọ ndụ gị ị̀ na-ewulite ụdị okwukwe ahụ Jeremaịa nwere, na-enwe ọganihu n’ije ozi Chineke dị ka o nwere?—Jeremaịa 1:4-8; 20:9.
Daniel, Jisọs, na Timoti
Ọ̀ bụ na i nụtụbeghị ihe banyere Daniel? Ọ pụrụ nnọọ ịbụ na ọ gbarubeghị 20 afọ mgbe a kpọkọọrọ ya na “ụmụ okoro” ndị ọzọ dị ka ndị a dọtara n’agha gaa n’obieze nke Nebukadneza onyeukwu, bụ́ eze Babilọn. N’agbanyeghị na Daniel bụ onye ka na-eto eto, o kpebisiri ike irubere Chineke isi. Daniel na ndị enyi ya jụrụ iri nri ndị pụrụ imebiworị iwu Chineke ka ha ghara imetọ onwe ha ma ọ bụ ndị a pụrụ ijiworị ihe omume ndị na-ekpere arụsị mebie. Ruo ihe karịrị 80 afọ, ọ dịghị mgbe ọ bụla Daniel gbanwere ọnọdụ ya, na-ejigide ikwesị ntụkwasị obi ya ruo n’okè nke ịjụ ịkwụsị ikpere Chineke ekpere, ọ bụ ezie na nke a ga-eduje na ya ịbụ onye a tụbaara ọdụm. Ị̀ na-ewe ozi ị na-ejere Chineke na ekpere gị ịbụ ihe dịruru mkpa otú ahụ? I kwesịrị.—Daniel 1:3, 4, 8; 6:10, 16, 22.
Mgbe ọ dị 12 afọ, a hụrụ Jisọs ka ọ na-anọdụ n’etiti ndị ozizi okpukpe n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem, “na-anụ okwu ha, na-ajụkwa ha ajụjụ: ibubo nghọta ya na ọzịza nile ya wee nwụọ ndị nile nụrụ okwu [nwa okoro ahụ bụ Jisọs] n’ahụ.” Okwu metụtara Akwụkwọ nsọ nke ndị okenye nọ n’ụlọ nsọ na-ekwu ọ̀ gaara adọrọworị mmasị gị dị ka ọ dọọrọ nke Jisọs? Nghọta na azịza gị nile hà gaara abụworị ihe ijuanya nye ndị ọzọ? Taa, ọtụtụ Ndịàmà bụ ndị na-eto eto ndị na-amụ ihe, na-ege ntị nke ọma, na-ekerekwa okè ná nzukọ ndị Kraịst dị iche iche na-enwe ihe ọmụma Akwụkwọ nsọ nke na-atụ ndị meworo okenye n’anya.—Luk 2:42, 46, 47.
Ị̀ dị ka Timoti, onye ‘a kụziiri ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ’ mgbe ọ dị na nwata? Mgbe ọ bụ nwa okorobịa, Timoti bụ ‘onye ụmụnna gbaara ezi àmà’ ma ọ dịkarịa ala site n’ọgbakọ abụọ. Pọl onyeozi họọrọ Timoti iso ya gaa njem, ọ bụghị nanị dị ka onye na-ejere ya ozi efu, kama ọ bụ ka o nyere Pọl aka n’izi ndị ọzọ ihe. A ga-ahọpụta gị maka ihe ùgwù ndị dị otú ahụ? ‘A na-agba àmà ọma’ banyere ọrụ gị nile, ọ bụghị nanị n’ọgbakọ nke unu, kamakwa n’ọgbakọ ndị ọzọ?—2 Timoti 3:15; Ọrụ 16:1-4.
Ụdị Ọdịnihu Dị Aṅaa Ka Ị Chọrọ?
Ò kwere omume na ndị na-eto eto taa ga-ekwesị ntụkwasị obi dị ka Josef, Mosis, Devid, na ndị ọzọ? Ee, o kwere omume. N’eziokwu, ọtụtụ ndị na-eto eto nwere mmasị nanị n’ime onwe ha obi ụtọ. Ma ndị ọzọ ji oge okoro na agbọghọ ha na-eme ihe n’ụzọ amamihe, na-amara Chineke na ihe bụ uche ya maka ha. Ndị a na-emezu amụma Bible ahụ bụ: “Ndị gị bụ onyinye afọ ofufo n’ụbọchị ụsụụ ndị agha gị; . . . gị nwe igirigi, bụ́ ụmụ okorobịa gị.”—Abụ Ọma 110:3.
Ezi ndị na-eto eto dị otú ahụ na-egosipụta amamihe karịrị afọ ndụ ha, ebe ọ bụ na Chineke pụrụ inyere ha aka inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ ha na-adị ugbu a, nyekwa ha ọdịnihu dị ebube n’ime ụwa ọhụrụ ahụ nke na-abịanụ. (1 Timoti 4:8) Ma, olee otú onye na-eto eto n’oge a pụrụ isi wulite okwukwe yiri nke ụmụ okoro na agbọghọ ahụ e hotara na Bible? Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịma, anyị na-akpọ gị òkù ịgụ isiokwu ahụ bụ “Ndị Na-eto Eto Ndị Nwere Obi Ụtọ n’Ozi Jehova,” nke na-amalite na peji 10 nke magazin nke a.
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
Akụ nke Ijipt arafughị nwa okoro ahụ bụ Mosis
Nwa okoro bụ Devid dị ka obi Jehova si achọ
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
Ọ bụ ezie na Jeremaịa chere na ‘nwata ka ya bụ,’ o ji obi ike kwusaa ozi nke na-adịghị ọha mma
Mgbe ọ dị 12 afọ, Jisọs ji nghọta ya nke Okwu Chineke mee ihe tụrụ ndị tọrọ ya n’anya
[Foto dị na peeji nke 7]
N’Israel, ọbụna ụmụntakịrị gere ntị mgbe a na-agụpụta Iwu Chineke. Ị̀ na-ege ntị?