Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 8/1 p. 15-20
  • Ì Nwere Ekele Maka Ihe Chineke Meworo?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Nwere Ekele Maka Ihe Chineke Meworo?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwukwe na Ọrụ
  • Ọ Na-emetụta Ndụ
  • Imeri Ihe Ndị Na-egbochi Gị Ime Baptism
  • Ihe Onwunwe
  • Ijere Chineke Ozi Site n’Enyemaka Chineke
  • Gịnị Ka Anyị Na-aghaghị Ime Ka A Zọpụta Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Nhọrọ E Ji Aka na Ọ Ga-enye Ndụ nke Ezi Udo na Ntụkwasị Obi
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Inwe Okwukwe na Ime Ihe Dị Mma Nwere Ike Ime Ka Anyị Bụrụ Ndị Ezi Omume
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 8/1 p. 15-20

Ì Nwere Ekele Maka Ihe Chineke Meworo?

“Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ka o soo m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa [osisi ịta ahụhụ, NW] ya kwa ụbọchị, na-esokwa m.”—LUK 9:23.

1. Olee ụfọdụ n’ime onyinye ndị dị ebube Chineke nyeworo?

ANYỊ nwetara ndụ anyị site n’aka Chineke. A sị na o keghị ihe a kpọrọ mmadụ, a garaghị amụ anyị. Ma Chineke kere ihe karịrị ndụ. O mere anyị otú anyị ga-enwe ike ịma ụtọ ọtụtụ ihe: ụtọ ihe oriri, okpomọkụ nke ìhè anyanwụ, ụda egwú, ịdị mma nke ụbọchị oge opupu ihe ubi, ịdị nro nke ịhụnanya. Ọbụna karịa nke ahụ, Chineke nyere anyị uche na ọchịchọ nke ịmụta ihe banyere ya. O ji mmụọ ya kpalie odide nke Bible, bú nke na-enye anyị ezi nduzi, na-egosi anyị otú anyị ga-esi bie ndụ obi ụtọ karị, na-enyekwa anyị olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume ya. Chineke na-enyekwa mmụọ nsọ ya, nkwado nke ọgbakọ dị n’ógbè anyị, na ndị okenye na-ahụ n’anya ndị pụrụ inyere anyị aka iguzosi ike n’ije ozi ya.—Jenesis 1:1, 26-28; 2 Timoti 3:15-17; Ndị Hibru 10:24, 25; Jemes 5:14, 15.

2. (a) Gịnị bụ ihe kasị pụta ìhè Chineke mewooro anyị? (b) Nzọpụta ọ̀ pụrụ ịbụ ihe ruuru anyị n’ihi ọrụ ndị anyị rụrụ?

2 Tụkwasị n’ihe ndị ahụ nile, Chineke zitere Ọkpara nke ya onwe ya ịgwakwu anyị banyere ihe Nna ahụ na-atụ anya ya n’aka anyị, iweta-kwa “mgbapụta” nye onye ọ bụla nke ga-anakwere ya. (Ndị Efesọs 1:7; Ndị Rom 5:18) Ọkpara ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kweere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16, King James Version) Nzọpụta nke a pụrụ inweta n’ihi àjà mgbapụta ahụ dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu otú a nke na ọ dịghị ọrụ ọ bụla mmadụ pụrụ ịrụ ka o wee bụrụ ihe ruuru ya, o doro anya na ọ bụghị ọrụ ndị a na-arụbu n’okpuru Iwu Moses ahụ. Otú a, Pọl dere, sị: “A gụghị mmadụ n’onye ezi omume site n’ọrụ dị iche iche nke iwu, ma ọ bụ nanị okwukwe e kwere na Jisọs Kraịst ka e ji gụọ mmadụ n’onye ezi omume.”—Ndị Galetia 2:16; Ndị Rom 3:20-24.

Okwukwe na Ọrụ

3. Gịnị ka Jemes kwuru banyere okwukwe na ọrụ?

3 Nzọpụta na-abịa site n’okwukwe, ma okwukwe na inwe ekele maka ihe nile Chineke meworo kwesịrị ịkpali anyị ime ihe. O kwesịrị ịkpali anyị ime ihe ndị na-egosipụta okwukwe anyị. Onye ahụ otu nne ji ya na Jisọs, bụ́ Jemes, dere, sị: “Okwukwe, ma ọ bụrụ na o nweghị ọrụ, ọ bụ ihe nwụrụ anwụ n’onwe ya.” Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Gosi m okwukwe gị ma ọrụ gị adịghị ya, mụ onwe m ga-esitekwa n’ọrụ m gosi gị okwukwe m.” Jemes mere ka ọ pụta ìhè na ọbụna ndị mmụọ ọjọọ “kwekwara, wee kụja,” ma o doro anya na ndị mmụọ ọjọọ adịghị arụ ọrụ nke Chineke. N’aka nke ọzọ, Abraham nwere okwukwe, nweekwa ọrụ. “Okwukwe ya sooro ọrụ ya rụkọọ ọrụ, e sitekwara n’ọrụ ahụ mee ka okwukwe ahụ zuo okè.” Jemes kwughachiri, sị: “Okwukwe bụ ihe nwụrụ anwụ ma ọrụ adịghị ya.”—Jemes 2:17-26.

4. Gịnị ka Jisọs kwuru na ndị chọrọ iso ya kwesịrị ime?

4 Jisọs gosikwara mkpa ezi ọrụ dị, na-asị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu nke bi n’eluigwe.” “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ka o soo m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa [osisi ịta ahụhụ, NW] ya kwa ụbọchị, na-esokwa m.”a Ọ bụrụ na anyị ‘ajụ’ onwe anyị, anyị na-ahapụ ịgbaso ọtụtụ ụzọ ndụ nke anyị họpụtara n’onwe anyị. Anyị na-amata na ihe nile anyị nwere bụ nke anyị nwetara n’aka Chineke, ya mere anyị na-enye ya onwe anyị dị ka ndị bụ ohu ya, na-achọ ịmụta ma na-eme uche ya dị ka Jisọs mere.—Matiu 5:16; Luk 9:23; Jọn 6:38.

Ọ Na-emetụta Ndụ

5. (a) Gịnị ka Pita gosiri na o kwesịrị imetụta ụzọ ndụ anyị dum? (b) Ọrụ ọma dịgasị aṅaa ka ọ tụrụ aro ka a na-arụ?

5 Pita mere ka ọ pụta ìhè na “ọbara dị oké ọnụ ahịa” nke Kraịst, bụ́ nke e nyere n’ihi anyị, nwere abamuru dị ukwuu nke na anyị kwesịrị igosipụta obi ekele anyị maka ya n’ụzọ ndụ anyị dum. Onyeozi ahụ depụtara ọtụtụ ihe ndị obi ekele anyị kwesịrị ịkpali anyị ime, O nyere ndụmọdụ, sị: “Tụpụnụ ihe ọjọọ nile.” “Ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike.” “Kwusaa ịdị mma nile nke onye ahụ onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè ya dị ebube.” ‘Sinụ n’ihe ọjọọ wezụga onwe unu, mee ezi ihe.’ ‘Na-agọpụrụnụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime unu.’ “Ghara ibi ọzọ n’oge fọdụụrụ unu n’anụ ahụ unu ime ihe ọjọọ dị iche iche na-agụ mmadụ, kama ime ihe Chineke na-achọ.”—1 Pita 1:19; 2:1, 2, 9; 3:11, 15; 4:2.

6. (a) Olee ụzọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ si gosipụta okwukwe ha? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka nke a kwesịrị isetịpụrụ anyị?

6 Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ biri ndụ dị ka okwukwe ha si dị. Ọ gbanwere otú ha si ele ihe anya na ọdịdị mmadụ ha, na-akpali ha ime ka ndụ ha kwekọọ n’ihe Chineke na-achọ. Ha tara ahụhụ ịbụ ndị a chụlagara ná mba ọzọ, ịtụ nkume, iti ihe, ịtụ mkpọrọ, na ọbụna ọnwụ kama imebi okwukwe ha. (Ọrụ 7:58-60; 8:1; 14:19; 16:22; 1 Ndị Kọrint 6:9-11; Ndị Efesọs 4:22-24; Ndị Kọlọsi 4:3; Faịlimọn 9, 10) Ọkọ akụkọ onye Rom ahụ a ma ama, bụ́ Tacitus, onye a mụrụ n’ihe dị ka afọ 56 O.A., kwuru na ndị Kraịst tara ahụhụ “ịbụ ndị a tụbara n’ọkụ, wee suo ha ọkụ, iji wee bụrụ ihe e ji enye ìhè n’anyasị ọ bụla, mgbe ìhè nke ụbọchị na-adịghịkwa.” Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha guzosiri ike.— The Annals, Akwụkwọ nke Iri na Ise, amaokwu 44.

7. N’ọnọdụ dị aṅaa ka ụfọdụ ndị pụrụ ịchọta onwe ha?

7 N’ọgbakọ ụfọdụ, ị pụrụ ịhụ ndị bịaworo nzukọ dị iche iche ruo ọtụtụ afọ. Ha hụrụ nzukọ Jehova n’anya, na-eche na ndị ya bụ ndị kasị mma ha hụtụworo mgbe ọ bụla, na-ekwu okwu dị mma banyere eziokwu ahụ, na-ekwu-chitekwara eziokwu ahụ okwu n’ebe ndị nọ n’èzí nọ. Ma ọ dị ihe na-egbochi ha, ọ dị ihe na-adọla ha azụ. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ha mere ihe ahụ 3,000 mmadụ mere n’ụbọchị Pentikọst, ihe ahụ onye Etiopia ahụ kwere ekwe jụrụ ajụjụ banyere ya, ma ọ bụ nke Ananaịas gbara Pọl ume ka o mee ozugbo onye ahụ bụbu onye mmegide ghọtara na Jisọs bụ n’ezie Mesaịa ahụ. (Ọrụ 2:41; 8:36; 22:16) Ọ bụ gịnị kọrọ ụdị ndị ahụ taa? N’ihi gịnị ka ha na-emebeghị ihe ahụ nke Bible kpọrọ “ajụjụ nke ezi akọ na uche n’ebe Chineke nọ”? (1 Pita 3:21) Ọ bụrụ na ị hụ onwe gị n’ọnọdụ nke a—onye maara eziokwu ma na-ala azụ ime ihe banyere ya—lee isiokwu nke a anya dị ka nke a kwadebere n’ihi ịhụnanya pụrụ iche e nwere n’ebe ị nọ.

Imeri Ihe Ndị Na-egbochi Gị Ime Baptism

8. Ọ bụrụ na ọ dịbeghị nnọọ mgbe ị bụ ezi onye mmụta, gịnị bụ ihe amamihe dị na ya nke i kwesịrị ime ugbu a?

8 Ọ̀ bụ gịnị na-anọchiri gị ụzọ? Isiokwu bu nke a ụzọ gosiri na ọmụmụ ihe onwe onye pụrụ ịdị na-esiri ụfọdụ ndị ike. Chineke nyere anyị uche dị ebube, ọ na-atụkwa anya ka anyị jiri ya mee ihe n’ijere ya ozi. Ụfọdụ ndị na-amụtabeghị ọbụna otú e si agụ ihe tinyere onwe ha n’ọrụ iji mụta nke ahụ ka ha nwee ike ịmụtakwu ihe banyere Chineke na nzube ya nile. Gịnị banyere gị? Ọ bụrụ na ị maworị otú e si agụ ihe, Ị̀ na-amụ ihe n’ezie dị ka ndị Beria ahụ mere, “na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị” iji mara ma ihe ndị a hà dịkwa otú ahụ? Ì nyochawo “obodobo na ogologo na ịdị elu na omimi” nke eziokwu ahụ? Ì gwumiwo ala n’Okwu Chineke? Ị̀ chọpụtawo otú ọ bụruru ihe na-akpali akpali n’ezie? Ì wulitewo ezi ọchịchọ nke ịmara ihe bụ uche Chineke? Ị̀ na-enwe ezi agụụ maka eziokwu ahụ?—Ọrụ 17:10, 11; Ndị Efesọs 3:18.

9. Gịnị bụ ihe o kwesịrị ka i mee ma ọ bụrụ na i nwere nsogbu n’etiti gị na otu onye nọ n’ọgbakọ?

9 Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ala azụ n’ihi nsogbu dị adị n’ezie ma ọ bụ nke ha chere na ọ dị n’etiti ha na otu onye nọ n’ọgbakọ. Ọ̀ dịwo onye mejọrọ gị oké mmejọ? Ya bụrụ otú ahụ, gbasoo nduzi ahụ e nyere site n’okwu Jisọs, bụ: “Jee, tụọ ya mmehie ya n’anya n’etiti nanị gị na ya abụọ.” (Matiu 18:15) Ọ pụrụ ịbụrụ gị ihe ịtụnanya ịhụ na ọbụna na onye ahụ amataghị na ihe ya mere wutere gị. Ma ọbụna ma a sị na ọ matara, ị ka pụkwara ‘irite nwanna gị n’uru,’ dị ka Jisọs kwuru. Ị pụkwara inyere ya aka ka ọ ghara ime ka onye ọzọ sụọ ngọngọ. Karịsịa, mgbe i chere echiche banyere ya, ọ̀ bụ onye ka ị na-ejere ozi n’ezie—ọ̀ bụ onye ahụ ka ọ̀ bụ Chineke? Ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ ọ̀ bụ nke a kpaara ókè nke na ị ga-ekwe ka mmejọ nke mmadụ ọ bụla na-ezughị okè gbochie ịhụnanya i nwere n’ebe Ọ nọ?

10, 11. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na otu mmehie nzuzo na-adọla gị azụ?

10 Mmehie nzuzo pụrụ ịdị na-adọla mmadụ azụ site n’ime baptism. Nke a pụrụ ịbụ ihe mere n’oge gara aga, ma ọ̀ bụkwanụ ọ pụrụ ịbụ usoro na-ezighị ezi nke nọgidere na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na nke a bụụrụ gị nsogbu, ọ̀ bụ na oge erubeghị iji dozie ọnọdụ ahụ? (1 Ndị Kọrint 7: 29-31) Ọ dịwo mkpa ka ọtụtụ n’ime ndị Jehova gbanwee ndụ ha. Bible na-asị: “Chegharịanụ, chigharịakwanụ, ka e wee hichapụ mmehie nile unu, ka oge inwe ume ndụ wee si n’ihu [Jehova, NW] bịa otú a.”—Ọrụ 3:19.

11 N’agbanyeghị ihe i meworo n’oge gara aga, ị pụrụ ichegharị, mee mgbanwe, rịọkwa maka mgbaghara Chineke. “Ya mere, meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, . . . ebe unu yipụchasịworo mmadụ ochie ahụ, ya na omume ya nile, yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ ahụ, nke a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ ruo ná mmazu dị ka onyinyo nke Onye kere ya si dị.” Ị pụrụ ime ka ndụ gị kwekọọ n’ụzọ ya nile, nwee akọ na uche dị ọcha, nweekwa olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume ya. Nke ahụ ó kwesịghị mgbalị ọ bụla ọ pụrụ ịchọ iji nweta ya?—Ndị Kọlọsi 3:5-10; Aịsaịa 1:16, 18; 1 Ndị Kọrint 6:9-11; Ndị Hibru 9:14.

12. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na iji ụtaba eme ihe, ịṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ọgwụ ndị na-eri mmadụ ahụ, na-egbochi gị inwe ezi akọ na uche?

12 Iji ụtaba eme ihe, ịṅụbiga mmanya okè, ma ọ bụ ịbụ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ ọ̀ na-egbochi gị inwe akọ na uche dị ọcha? Ọ̀ bụ na àgwà ndị dị otú ahụ ndị na-eyi ndụ egwu adịghị egosipụta enweghị nsọpụrụ maka onyinye Chineke dị ebube nke bụ ndụ? Ọ bụrụ na àgwà ndị dị otú ahụ na-egbochi gị, o doro anya na oge eruwo ka e dozie ha. Àgwà ndị a na ndụ gị hà ha nhata? Pọl sịrị: “Ka anyị sachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ, na-emezu ịdị nsọ n’egwu Chineke.” Ì nwere mmasị n’ụzọ ezi omume nile dị ọcha nke Chineke ruo n’ókè ime nke ahụ?b—2 Ndị Kọrint 7:1.

Ihe Onwunwe

13, 14. (a) Gịnị ka Akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere ihe mgbaru ọsọ nke ihe onwunwe? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa idebe ihe nke eluigwe n’ọkwá mbụ?

13 Ụwa nke oge a na-edebe inwe ihe ịga nke ọma na “oké ngosi nke ihe mmadụ nwere” n’ihu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla ọzọ. Ma Jisọs jiri “nchegbu nile nke oge a, na aghụghọ nke akụ” tụnyere “ogwu” nke na-akpagbu okwu Chineke. Ọ jụkwara, sị: “Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, ma ọ bụrụ na ọ ga-erite ụwa dum n’uru, e wee napụ ya ndụ ya?”—1 Jọn 2:16, NW; Mak 4:2-8, 18, 19; Matiu 16:26.

14 Jisọs mere ka ọ pụta ìhè na Chineke mere ndokwa ka nnụnụ nile na-enweta ihe oriri, ka urodi nile nke ọhịa na-agbawakwa okooko osisi ndị mara mma. O wee jụọ, sị: “Únu onwe unu abụghị ihe oké ọnụ ahịa karị anụ ufe nke ukwuu? . . . [Chineke] ọ́ gaghị eyikwasị karị unu uwe nke ukwuu.” N’ụzọ amamihe dị na ya, Jisọs gwara anyị ka anyị ‘ghara ichegbu onwe anyị’ banyere ihe onwunwe. O kwuru, sị, “Chọọnụ alaeze [Chineke], a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a.” O mere ka ọ pụta ìhè na anyị kwesịrị idebe ihe nke eluigwe n’ọkwá mbụ n’ihi na ‘ebe akụ anyị dị, n’ebe ahụ ka obi anyị ga-adịkwa.’—Luk 12:22-31; Matiu 6: 20, 21.

Ijere Chineke Ozi Site n’Enyemaka Chineke

15. Ezi agbamume dị aṅaa ka ihe nlereanya nke ndị Kraịst nke narị afọ mbụ na-enye anyị?

15 Ịgbara ndị ọzọ àmà ò yiri ihe na-esiri gị ike? Ime ihere ọ̀ na-eme ka ị na-ala azụ? Ya bụrụ otú ahụ, ọ dị mkpa icheta na ndị Kraịst nke narị afọ mbụ nwekwara otu ụdị mmetụta ndị ahụ anyị na-enwe taa. Chineke ahọrọghị ọtụtụ ndị nwere amamihe na ndị dị ike, kama ọ bụ “ihe na-adịghị ike nke ụwa ka Chineke họpụtara, ka o wee mee ka ihere mee ihe dị ike.” (1 Ndị Kọrint 1:26-29) Ndị ndú okpukpe ndị dị ike megidere ndị “nkịtị” ndị a, nyekwa ha iwu ka ha kwụsị ime nkwusa. Gịnị ka ndị Kraịst ahụ mere? Ha kpere ekpere. Ha rịọrọ Chineke maka nkwuwa okwu, o nyekwara ha ya. N’ihi nke a, ozi ha mejupụtara Jerusalem, mesịakwa mee ka ụwa dum mee mkpatụ!—Ọrụ 4:1-4, 13, 17, 23, 24, 29-31, NW; 5:28, 29; Ndị Kọlọsi 1:23.

16. Gịnị ka anyị na-amụta site n’aka “oké ìgwè ndịàmà . . . dị ka igwe ojii” ndị a kọwara ná Ndị Hibru isi 11?

16 Otú a, egwu nke mmadụ ekwesịghị igbochi anyị mgbe ọ bụla ijere Chineke ozi. Ndị Hibru isi 11 na-agwa anyị banyere “oké ìgwè ndịàmà . . . dị ka igwe ojii” ndị tụrụ Chineke egwu, ọ bụghị mmadụ. Anyị kwesịrị igosipụta okwukwe yiri nke ahụ. Onyeozi ahụ dere, sị: “Ya mere ka anyị onwe anyị, ebe anyị nwere oké ìgwè ndịàmà dị otú a ndị gbara anyị gburugburu dị ka igwe ojii, ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, ya na mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.”—Ndị Hibru 12:1.

17. Agbamume dị aṅaa ka Chineke nyere site n’ọnụ Aịsaịa?

17 Chineke pụrụ inyere ndị ohu ya aka ebe ọ di ukwuu. Onye Okike nke eluigwe na ala gwara Aịsaịa, sị: “Ndị na-ele anya Jehova [ga-enwetaghachi, NW] ike ha; ha ga-efego elu na nkù dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.”—Aịsaịa 40:31.

18. Olee ụzọ ị pụrụ isi merie ime ihere ka i wee kere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze?

18 Ndịàmà ahụ nwere obi ike ndị nwekwara obi ụtọ ndị ị na-ahụ n’ọgbakọ nke unu bụ nanị akụkụ dị nta nke ihe karịrị nde atọ na ọkara nke ndị ozi na-anụ ọkụ n’obi n’ụwa dum. Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ikere òkè n’ọrụ ahụ nke Jisọs Kraịst n’onwe ya buru amụma ya n’okwu ndị a: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” Ọ bụrụ na ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na-abụrụ gị ihe isi ike ọ bụ ezie na i ruru eru ime otú ahụ, gịnị mere ị rịọghị Onyeàmà nke na-eme nke ọma n’ozi ahụ ka gị na ya soro jee ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ? N’ezie Chineke na-enye “ọkịka nke ike,” ọ pụkwara ịbụrụ gị ihe ịtụnanya ịchọpụta otú ije ozi Chineke nke a si bụrụ ihe ọṅụ n’ezie.—Matiu 24:14; 2 Ndị Kọrint 4:7; leekwa Abụ Ọma 56:11; Matiu 5: 11, 12; Ndị Filipaị 4:13.

19. Ọrụ ozizi ihe dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha rụọ?

19 Jisọs na-atụ anya ka ndị nwere mmasị n’ozi Alaeze ahụ mee ihe kwekọrọ na ya. Ọ sịrị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà bụ́ nke m nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.

20. Ọ bụrụ na ị na-enwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, olee ajụjụ nke ọ pụrụ ịbụ na o kwesịrị ekwesị ka ị Jụọ?

20 Obi ekele i nwere maka ngọzi nile nke Chineke, maka “ọbara dị oké ọnụ ahịa” nke Jisọs na olileanya ahụ dị ebube nke ndụ ebighị ebi, ọ̀ na-akpali gị ime ihe? (1 Pita 1:19) Ì mewo ka ndụ gị kwekọọ n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Chineke? Ị̀ na-ekerechi òkè anya n’ime ndị na-eso ụzọ? Ì jụwo onwe gị wee rara ndụ gị nye Chineke? Ọ bụrụ na azịza nye ajụjụ ndị a nile bụ ee nke doro anya, ọ pụrụ ịbụ na oge eruwo ka ị jụọ otu n’ime ndị okenye nọ n’ọgbakọ ị nọ na ya otu ajụjụ ahụ nke onye Etiopia ahụ kwere ekwe jụrụ Filip, sị: “Gịnị na-anapụ ime m baptism?”—Ọrụ 8:36.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a The Jerusalem Bible sụgharịrị nke a ịbụ “gbakụta onwe ya azụ.” Nsụgharị nke J. B. Phillips sịrị “gbahapụ ihe nile ruuru ya.” The New English Bible sịrị “hapụ onwe ya n’azụ.”

b Maka ihe a ga-eme iji hapụ àgwà ndị dị otú ahụ, lee Ụlọ Nche, August 1, 1981, peji 3-12; July 1, 1974 peji 208-214; na Teta! [Bekee] July 8, 1982, peji 3-12; May 22, 1981, peji 3-11. A pụrụ inwe ndị a n’ebe ndebe akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè unu.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee ihe ndị pụrụ iche mere anyị ga-eji nye Chineke ekele?

◻ Gịnị ka okwukwe na obi ekele kwesịrị ịkpali anyị ime?

◻ Nsogbu dịgasị aṅaa pụrụ ịbụ ihe mgbochi n’etiti anyị na irubere Chineke isi, gịnịkwa ka anyị pụrụ ime banyere ha?

◻ Ajụjụ dịgasị aṅaa ka ndị na-emebeghị baptism pụrụ ịjụ onwe ha?

[Igbe dị na peeji nke 18]

‘Ụdị “ala” dị aṅaa ka m bụ?’

Jisọs mere ihe atụ nke otu nwoke onye pụrụ jee ịgha mkpụrụ. Ụfọdụ n’ime mkpụrụ ya dara n’akụkụ okporo ụzọ ụmụ nnụnụ wee rie ha. Ndị ọzọ dara n’ala nkume ebe na-enweghị ájá hiri nne. Ndị a pupụtara, ma mgbe anyanwụ bilitere, ha kpọnwụrụ wee nwụọ. Mkpụrụ ndị ọzọkwa dara n’etiti ogwu e wee kpagbuo ha. Jisọs sịrị na ìgwè atọ ndị a nọchiri anya: nke mbụ, onye nke ‘na-anụ okwu alaeze ahụ ma ọ ghọtaghị ya’; nke abụọ, onye na-anara okwu ahụ ma bụrụ onye e chigharịrị ihu n’ihi okpomọkụ nke “mkpagbu ma ọ bụ nsogbu”; nke atọ bụkwa onye “nchegbu nke oge a na aghụghọ nke akụ na-akpagbu okwu ahụ” n’ime ya.

Ma Jisọs kwukwara okwu banyere mkpụrụ ọzọ nke dara n’ala dị mma. Ọ sịrị: “Mmadụ a bụ onye na-anụ okwu ahụ, wee ghọta ya; onye na-amị mkpụrụ n’ezie.”—Matiu 13:3-8, 18-23.

Ọ pụrụ nnọọ ịdị mma ịjụ onwe anyị, si: ‘Ụdị “ala” dị aṅaa ka m bụ?’

[Igbe dị na peeji nke 19]

Ha nwụrụ n’ihi okwukwe ha

Ị̀ maara onye ọ bụla ọ ga-akara mma ịnwụ anwụ kama imebi okwukwe ya. Ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova emewo otú ahụ. N’akwụkwọ bụ The Nazi State and the New Religions: Five Case Studies in Non-Conformity, Dr. Christine E. King dere, sị: “A tụrụ otu n’ime Ndịàmà abụọ ọ bụla bụ ndị Germany mkpọrọ, otu n’ime anọ ọ bụla tụfuru ndụ ya.”

Mgbe ihe egwu nke ogige ịta ahụhụ ndị ahụ mesịrị bịaruo ná njedebe na 1945, “ọnụ ọgụgụ Ndịàmà ahụ amụbawo, ha emebibeghịkwa okwukwe ha.” N’akwụkwọ bụ The Nazi Persecution of the Churches, J. S. Conway dere banyere Ndịàmà ahụ, sị: “Ọ dịghị òtù ọ bụla ọzọ nke gosipụtara otu ụdị mkpebisi ike dị otú ahụ n’agbanyeghị oké mmekpọ ọnụ nke ndị òtù Gestapo.”

A kpagbughị Ndịàmà Jehova n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’ihi agbụrụ ha. Kama, ha tara ahụhụ nanị n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ na ọjụjụ ha jụrụ imebi akọ na uche ha nke e ji Bible zụọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya