“Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-achọ udo”
NA 1901 Onyinye Nobel maka Udo, bụ́ nke mbụ a na-enye ya, bụ nke e kere n’etiti Jean-Henri Dunant, bụ́ onye guzobere òtù Red Cross, na onyeọka n’ihe banyere akụ na ụba, bụ Frédéric Passy. Kemgbe ahụ, e nyewo onyinye ahụ 69 ugbo, 55 ugbo nye 71 ndị mmadụ dị iche iche n’otu n’otu ma ọ bụ n’ijikọ aka kee ya, 14 ugbo nyekwa 16 ìgwè ma ọ bụ òtù dị iche iche. Òtù ụfọdụ enwetawo onyinye ahụ ihe karịrị otu ugbo, dị ka òtù International Red Cross Committee (1917, 1944, na 1963) na Office of the United Nations High Commissioner for Refugees (ụlọ ọrụ na-elekọta ndị ọsọ ndụ) (1954 na 1981). N’ihi ihe pụtara ìhè na ọ bụ enweghị ndị ruru eru ịnata onyinye ahụ, òtù na-elekọta onyinye Nobel ahụ jụrụ inye ya 19 ugbo.
Dị ka mmadụ pụrụ iche n’echiche, ihe ka ọtụtụ ná ndị nwetara onyinye ndị ahụ abụwo ndị ọchịchị, ndị nnọchianya mba, ma ọ bụ ndị si n’ụzọ ọzọ nwee ihe jikọtara ha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma ndị ntá akụkọ, ndị ọkàikpe, ndị ọkà n’ihe banyere ọha mmadụ, ndị ọkà n’ihe banyere akụ na ụba, na ndị na-achọ ọdịmma nke ọha mmadụ enwetawokwa ya bụ onyinye. Ọbụna ndị ọkà mmụta sayensị, nke ụfọdụ n’ime ha bụ Linus Pauling na 1962 na Andrey Sakharov na 1975, abụwokwa ndị a kwanyeere ùgwù dị otú a, dịkwa ka e mewooro ndị ndú ndị ọrụ, nke pụtara ìhè n’ime ha bụ Lech Walesa na 1983. Na 1970, e nyekwara onyeọkà n’ihe banyere ọrụ ubi, bụ́ Norman E. Borlaug, onyinye ahụ.
Onye okpukpe mbụ e nyere onyinye ahụ bụ onye Sweden, bụ́ bishọp ukwu nke chọọchị Lutheran, bụ́ Nathan Söderblom, bụ́ onye a họọrọ maka ya bụ onyinye na 1930. Na 1946 onye okwuchukwu a na-echighị echichi na chọọchị Methodist, bụ́ John R. Mott so onye ọzọ kee onyinye ahụ, nke sochiri ya na 1952 bụ onyeọkà mmụta okpukpe ahụ bụkwa onyeọkà ihe ọmụma, bụ́ Albert Schweitzer nakwa na 1958, bụ́ mgbe ọ gaara onye ụkọchukwu bụ onye Belgium, Dominique Georges Pire. Na 1964 onye a họpụtara bụ onyendú ndị na-adọta ihe ruuru ndị mmadụ, bụ́ onye ụkọchukwu chọọchị Baptist, bụ́ Martin Luther King, Jr.
Ma n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, okpukpe anọwo na-eme ihe ndị pụtakwuru ìhè ná nchụso ụwa na-achụso udo. N’ikwekọ n’usoro ihe omume nke a, atọ n’ime mmadụ itoolu ndị ikpeazụ e nyeworo Onyinye Nobel maka Udo abụwo ndị a ma ama n’ihe banyere okpukpe: Onye ụkọchukwu nwanyị ndị Katọlik bụ Mother Teresa onye Calcutta na 1979, onye bishọp ndị Anglican bụ Desmond Tutu onye South Africa na 1984, nakwa n’afọ gara aga, onye Tibet ahụ a chụlagara ná mba ọzọ, bụ́ “chi bụ eze” ndị okpukpe Buddha, bụ́ Dalai Lama ahụ.
Ọ bụ eziokwu na Jisọs Kraịst sịrị: “Ngọzi na-adịrị ndị na-eme udo.” (Matiu 5:9, King James Version) Ma, mgbalị okpukpe ndị a na-eme—ma ọ̀ bụ nke Katọlik, Protestant, okpukpe Buddha, ma ọ bụ nke ndị ọzọ—iji nọrọ dị ka ndị na-eme udo n’ụwa hà ga-enwe ihe ịga nke ọma?
Bible na-agwa anyị na ajọ ụwa nke dị ugbu a nke e kewapụworo n’ebe Chineke nọ adịghị mgbe ọ bụla ọ ga-enweta udo na-adịgide adịgide, bụ́ eziokwu nke aka okpukpe na-etinye n’ihe omume ụwa nke ịrụ ọrụ ebere, ọha mmadụ, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-apụghị ịgbanwe. Site n’iji Alaeze nke ya nke dị n’aka Kraịst Jisọs, bụ́ “Onyeisi Udo” wee dochie anya ọchịchị nile dị ugbu a, Onye Okike ahụ n’onwe ya ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya iji udo gọzie ihe a kpọrọ mmadụ ndị kwere ekwe.—Aịsaịa 9: 6, 7; 57:21; ‘Abụ Ọma 46:9; Daniel 2:44.
Ndị na-achọ udo ndị matara eziokwu nke a, ndị mekwara ka ndụ ha kwekọọ na ya ga-enwe obi ụtọ n’ezie. Dị ka nsụgharị New World Translation si dee okwu Jisọs ndị ahụ: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-achọ udo.”