Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 8/15 p. 3-4
  • Ikwere n’Akara Aka Ọ̀ Na-achị Ndu Gi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikwere n’Akara Aka Ọ̀ Na-achị Ndu Gi?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọnọdụ nke Okpukpe
  • Ịtụ Mkpụrụ Ego na Ịgụ Kpakpando
  • Ọ̀ Bụ Akara Aka Ka Ọ Bụ Nanị Ihe Ndabara?
    Teta!—1999
  • Bible Ọ̀ Na-akụzi Nkweta n’Akara Aka?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Akara Aka Ò Kwesịrị Ịchị Ndụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ịchọ Ọdịnihu A Kara Aka nke Mmadụ
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 8/15 p. 3-4

Ikwere n’Akara Aka Ọ̀ Na-achị Ndu Gi?

NA September 1988 oké ọdachi mere. Mmiri na-adịghị atalata atalata nke ụsọ osimiri’ ahụ buru ibu nke Ganges na Brahmaputra tolitere ruo 30 amaụkwụ [9 mita] wee rikpuo ụzọ atọ n’ụzọ anọ nke Bangladesh. Mmiri riri ọtụtụ puku mmadụ. E mekwara ka ihe dị ka 37,000,000 mmadụ nọrọ n’enwe-kwaghị ebe obibi. E kpochapụkwara ihe karịrị 40,000 maịlụ [60,000 kilomita] nke okporo ụzọ.

Ebe ọ bụ na ụdị iju mmiri ahụ erikpuwo Bangladesh ọtụtụ ugbo, otu akwụkwọ akụkọ kpọrọ mba ahụ “Ọnụ Mmiri nke Ihe Ndabara Ọjọọ.” Nkọwa dị otú ahụ na-egosipụta ihe ọtụtụ ndị na-eche na ọ bụ ya na-akpata oké ọdachi ndị dị otú ahụ: ihe ndabara ọjọọ, ma ọ bụ akara aka. Ọ bụ ezie na ndị ọzọ pụrụ ịbụ na ha adịghị eche na akara aka na-achị ndụ, echiche nke ikwere n’akara aka zuru ebe nile n’ụwa. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji kwere n’akara aka, gịnịkwa bụ nkwenkwe akara aka?

Ọnọdụ nke Okpukpe

Okwu Bekee ahụ bụ “fate” (akara aka) sitere n’okwu Latin bụ fatum, nke pụtara “ihe e kwuworo ekwu.”a Ndị kweere n’akara aka na-eche na a na-ebu ụzọ kaa ihe nile ga-emenụ aka tupu ha emee, na ọ dịghịkwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ ime iji gbanwee ihe. Okpukpe dị iche iche agbasawo echiche nke a, o metụtawokwa otú ọtụtụ nde ndị kweere na ya si ele ihe anya. Ile anya n’okpukpe atọ kasị ibu n’ụwa na-egosi na akara aka nwere ngosipụta dị iche iche—ngosipụta ndị dị iche iche dị ka ọdịdị nke ụlọ nsọ ndị Hindu, ụlọ okpukpe ndị Alakụba, na chọọchị dị iche iche nke Kri-sendọm.

Dị ka ihe atụ, ihe dị ka 900 nde ndị Alakụba bi n’ụwa na-eche na akara aka (Kismet) bụ nke uche Chineke na-ekpebi.b Akwụkwọ Qur’ān na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ihe ọjọọ na-eme n’elu ala . . . , kama e dewo ya n’akwụkwọ tupu anyị emee ka ọ dịrị.” “Ọ dịghịkwa mkpụrụ obi nke ga-anwụ ma Allah ekweghị ka ọ nwụọ; a kawo ogologo oge ọ ga-anọ aka.”—Surah 57:22; 3:145.

Karma bụ iwu nke bụ na ihe ọ bụla merenụ nwere ihe kpatara ya—bụ́ akụkụ ọzọ nke akara aka—nke na-emetụta ndụ nke ihe karịrị 700 nde ndị okpukpe Hindu bi n’ụwa. A na-eche na ihe ndị na-eme ná ndụ nke onye Hindu na-adị ugbu a bụ nke e kpebiri site n’ihe ndị o mere ná ndụ nke ọ dịrị mgbe ọ lọrọ ụwa nke mbụ. Garuda Purana, bụ́ ihe odide oge ochie nke ndị Hindu, sịrị: “Ọ bụ ọrụ nile nke anụ ahụ nke a rụrụ mgbe ọ dịrị ndụ n’oge gara aga na-ekpebi ụdị ndụ ọ ga-adị ná ndụ ọzọ, tinyekwara ụdị ọrịa, ma ọ bụ nke anụ ahụ ma ọ bụ nke uche, ọ ga-arịa . . . Mmadụ na-enweta ihe ọ bụ akara aka ya na ọ ghaghị inweta ná ndụ.”

Gịnịkwanụ banyere ọnụ ọgụgụ ahụ dị ka 1,700 nde ndị nọ na Krisendọm? N’eziokwu, ụfọdụ ndị nọ na Krisendọm pụrụ ikwu na ha ejiriwo Chineke dochie anya akara aka, jirikwa ikwere n’ọdịnihu e buru ụzọ kaa aka dochie anya ikwere n’akara aka. Ma, akwụkwọ bụ Encyclopædia of Religion and Ethics kwetara, sị: “A pụghị ikwu na okpukpe ndị Kristian . . . nweere onwe ya kpam kpam pụọ n’ikwere n’Akara Aka.” Ụfọdụ otù okpukpe ka na-agbaso nkwenkwe nke onye nhazi chọọchị narị afọ nke iri na isii ahụ bụ Martin Luther, onye kwuru n’otu mgbe na mmadụ bụ “onye na-enwereghị onwe ya dị ka ógwè osisi, nkume, ọkpụrụkpụ ụrọ, ma ọ bụ ogidi nnú.”

Ịtụ Mkpụrụ Ego na Ịgụ Kpakpando

Ọ bụ ezie na echiche ndị siri ike otú ahụ adịghị apụtachakwa ìhè na nkwenkwe ndị bụ isi nke Krisendọm, otu onyeọkà mmụta okpukpe kwetara na ọtụtụ n’ime ndị otù ya ka na-anakwere nkwenkwe ahụ “n’ụzọ e mere ka o kwekọọ n’ihe a na-eme n’ebe nile.” N’ọdịdị dị otú ahụ, akara aka pụrụ inwe ọdịdị na-adọrọ mmasị, e wee kpọọ ya ihe ndabara ọma. Ma eleghị anya ị maara banyere ọtụtụ ndị, ndị na-atụ mkpụrụ ego mgbe ụfọdụ iji chọọ ihe ndabara ma ọ bụ akara aka ọma. Ọ bụ ezie na ha pụrụ ilefuru nke a anya dị ka omenala efu, ha nọgidere na-eme ya, mghe ụfọdụ, o yikwara ka ọ na-agara ha nke ọma. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịghị anya gara aga, akwụkwọ akụkọ bụ The New York Times kọrọ na otu nwoke bi na United States chọtara otu (mkpụrụ ego) penny nke chere ihu n’elu mgbe ọ zụtasịrị otu tiketi lottery. Nwoke ahụ sịrị: “Mgbe ọ bụla m chọtara penny nke chere ịhu n’elu, ihe ọma na-emekarịrị m.” N’ọnọdụ nke a, o ritere 25.7 nde dollar. Ì chere na okwukwe o kwere n’ihe ndabara, ma ọ bụ akara aka ọma, ebelatawo?

Ufọdụ ndị pụrụ ịchị ọchị n’echiche nke ịtụ mkpụrụ ego. Ma, ọ pụrụ ịbụ na ha kweere na ọdịnihu ha bụ nke e bu ụzọ kaa aka site ná njegharị nke kpakpando—akụkụ ọzọ nke akara aka. Na North America nanị, 1,200 akwụkwọ akụkọ dị iche iche na-ebu akụkụ ebe e dere banyere ịgụ kpakpando. Otu njụta echiehe ọha gosiri na 55 pasenti nke ndị na-eto eto bi na United States kweere na ịgụ kpakpando na-enwe ihe ịga nke ọma.

Ee, ma à kpọrọ ya Kismet, Karma, Chineke, ihe ndabara ọma, ma ọ hụ kpakpando, ikwere n’akara aka zuru ụwa nile ọnụ, ọ dịwokwa otú ahụ ruo ọtụtụ ọgbọ. Dị ka ihe atụ, ì matara na n’ime ndị nile dị n’akụkọ ihe mere eme ndị e depụtara aha ha n’ebe a, ọ bụ nanị otu bụ nke na-ekweghị n’akara aka? Olee onye na-ekweghị? Oleekwa otú echiche ya banyere akara aka pụrụ isi metụta echiche nke gị?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Akwụkwọ bụ The Encyclopedia of Religion, Mpiakọta 5, peji 290, sịri: “FATE (Akara Aka). Nke e nwetara site n’okwu Latin bụ fatum (ihe e kwuru ekwu, nkwupụta okwu amụma, afa a gbara agba, ihe Chineke kpebiworo).”

b “Kismet di iche n’Akara Aka nanị n’echiche ahụ nke bụ na a sị na ọ bụ Uche nke ji ike nile na-ekpebi ya; arịrịọ nile mmadụ na-arịọ megide nke ọ bụla n’ime ha bụ n’efu.”—Encyclopædia of Religion and Ethics nke Hastings, Mpịakọta nke Ise, peji 774.

[Igbe dị na peeji 4]

ÒNYE KWERE N’AKARA AKA?

Maskarīputra Gośāla Jisọs Kraịst

Onye India na-anapụ onwe ya ihe ụtọ, Onye guzobere Iso Ụzọ Kraịst

Nari afọ nke isii/nke ise T.O.A. Narị afọ mbụ O.A.

Zeno onye Citium Jahm, nwa Safwān

Onyeọkà ihe ọmụma Grik, Onye nkuzi bụ onye Alakụba,

Narị afọ nke anọ/nke atọ T.O. A. Narị afọ nke asatọ O.A.

Publius Vergilius Maro John Calvin

Onye Rom na-ede abụ, Onyeọkà mmụta okpukpe na

Nari afọ mbụ T.O.A. Onye nhazi chọọchi bụ onye France,narị afọ nke iri na isii O.A.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya