Ndụ A Na-adị Mgbe A Nwụsịrị—Ajụjụ Ndị A Na-azabeghị
“Ọ BỤRỤ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” (Job 14:14) Ajụjụ nke a, nke nna ochie ahụ bụ Job jụrụ ọtụtụ narị afọ gara aga, abụwo nke ndị biworo ná mba nile n’ime ọgbọ nile gaworo aga tụgharịworo uche banyere ya, e nwewokwa ọtụtụ ihe ndị e wepụtara dị ka azịza ya.
Ndị Grik oge ochie kwuru na mkpụrụ obi nke ndị nwụrụ anwụ na-anọgide na-adị ndụ. A na-eburu ha gabiga osimiri Styx gaa ná nnukwute mbara ebe dị n’okpuru ụwa nke a na-akpọ ala mmụọ. N’ebe ahụ, ndị ọkàikpe na-ekpebi ma onye ahụ ọ̀ ga-ata ahụhụ n’ime otu ụlọ mkpọrọ e wuliri mgbidi ya elu ma ọ̀ bụkwanụ na ọ ga-aga n’inwe ọṅụ n’ọzara ọṅụ nke Elysium. Ndị oge ochie ndị ọzọ na-eche na mkpụrụ obi dị iche iche na-aghọ kpakpando ma ọ bụkwanụ nkume mbara igwe bụ comet. Ndị ọzọkwa na-eche na mkpụrụ obi bụ ihe na-enye ìhè, na a na-adọrọkwa ha gaa n’ọnwa; n’ọnwa ọ bụla, mgbe ọnwa gbazururu, a na-ebufekwa ha n’anyanwụ.
Taa, a ka nọgidere na-enwe ọtụtụ echiche banyere ndụ a na-adị mgbe a nwụsịrị. Ndị Hindu na ndị okpukpe Buddha kwere n’ịlọ ụwa. Ndị Alakụba na-akuzi na mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị, na mgbe o ruru n’ụbọchị ikpe nke ikpeazụ, na ọ na-aga na paradaịs ma ọ bụ n’ọkụ ala mmụọ. A na-akuziri ihe ka ọtụtụ ná ndị Protestant na mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị iji jee nwee ọṅụ n’eluigwe ma ọ bụ ije taa ahụhụ n’ọkụ nke hell. Okpukpe Katọlik tụkwasịrị ozizi Limbo na nke pọgatrị n’ihe a nile.
N’ala ụfọdụ, nkwenkwe ndị e nwere banyere ihe ahụ e chere na ọ bụ mkpụrụ obi nke ndị nwụrụ anwụ bụ ngwakọta dị ịtụnanya nke omenala ọdịbendị na nke ndị bụ ndị Kristian n’ọnụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ihe a na-ahụkarị n’etiti ọtụtụ ndị Katọlik na ndị Protestant nke Odịda Anyanwụ Africa ikpuchisị enyo nile mgbe mmadụ nwụrụ ka mmadụ wee ghara ile anya na ya wee hụ mmụọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ. Iri ụbọchị anọ mgbe onye a hụrụ n’anya nwụsịrị, ndị ezinụlọ na ndị enyi ya na-eme oké oriri iji mee ememe maka nrịgo nke mkpụrụ obi ahụ n’eluigwe. Mgbe nke ahụ gasịrị, karịsịa n’oge Krismas ma ọ bụ ememe Afọ Ohụrụ, ndị ikwu na-eje n’ebe e liri onye ahụ ije wụsa mmanya na-aba n’anya n’ili ahụ. Ọbụna na ha na-agwa onye ahụ nwụrụ anwụ okwu, na-arịọ ka o meere ha ihe ụfọdụ, na-akọkwara ya ihe ndị na-eme n’ezinụlọ.
O doro anya na e nweghị nkwekọrịta dị ukwuu n’etiti okpukpe dị iche iche nke ụwa banyere kpọmkwem ihe na-eme mgbe mmnadụ nwụsịrị. Ma, e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nkwekọrịta zuru ebe nile n’otu okwu bụ isi: anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ. Ihe ka ọtụtụ banyere ndụ a na-adị mgbe a nwụsịrị bụ mgbanwegharị nke isiokwu a bụ isi.
Otú o sina dị, e nwere ọtụtụ ajụjụ na-enye nsogbu ndị na-ebilite: Olee nnọọ ebe e si nweta echiche ahụ nke bụ na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ? À kụziri ya n’ime Akwụkwọ nsọ? Ọ bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị ka ọbụna okpukpe na-abụghị nke ndị Kristian ji na-akuzi ya? Ndị a abụghị ajụjụ ndị a ga-elefuru anya. N’agbanyeghị okpukpe nke ị nọ na ya, ọnwụ bụ eziokwu nke a na-aghaghị iche ihu. Otú a, okwu ndị a metụtara gị onwe gị n’ụzọ dị nnọọ omimi. Ya mere, anyị na-akpọ gị òkù ka i jiri uche ghere oghe leba okwu ndị a anya.