Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/1 p. 15
  • Site n’Ịda Mbà n’Obi Gaa n’Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Site n’Ịda Mbà n’Obi Gaa n’Obi Ụtọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Chọtaworo Amamihe Bụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ịnakwere Ozi Ọma ahụ na Belgium
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya
    Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/1 p. 15

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Site n’Ịda Mbà n’Obi Gaa n’Obi Ụtọ

JEHOVA bụ Chineke obi ụtọ. (1 Timoti 1:11) Ọ chọrọ ka ndị na-ejere ya ozi nweekwa obi ụtọ. N’ihi nke a, ọ bụrụ na otụ n’ime ndị na-ejere ya ozi adaa mbà n’obi, Jehova ga-enyere ya aka inwe ndidi n’ihe mgbụ ahụ na ọbụna inwetaghachi mmụọ nke obi ụtọ mgbe ụfọdụ. Ahụmahụ nke a na-esonụ nke si Urụgụay na-egosipụta nke a.

Otụ nwanna nwanyị nọ na-echere oge nke ya n’ụlọ ọgwụ dị na Montevideo iji mata ihe foto e ji enyopụta ọrịa n’ime ahụ nke e sere ya gosipụtara. Otu nwanyị nke nọ ya n’akụkụ na-atụ egwu banyere ihe dọkịta pụrụ ịgwa ya n’ihi nnyocha nke e mere ya. Nwanna nwanyị ahụ gwara ya na kemgbe ya malitere ịbụ Onyeàmà Jehova, na ya atụbeghị egwu ihe ọ bụla. Otú ọ dị, nwanyị ahụ kwuru na ihe Ndị àmà adịghị amasị ya n’ihi na ha na-achọ ka ụmụ mmadụ debe ụkpụrụ ndị dị elụ nke ụkwuu.

Nwanna nwanyị ahụ gwara ya otú ihe ọmụma nke eziokwu Bible siworo nyere ya aka. Nwa ya nwanyị dị 18 afọ anwụnahụwo ya, ọ banyewokwa n’inwe oké ịda mbà n’obi ruo afọ asatọ. Ma ndị ọkà n’ọrịa uche ma ọgwụ ndị dị oké ọnụ enyereghị ya aka n’imeri ịda mbà n’obi nke a. O kwuru na ọtụtụ mgbe, a na-enye ya àkwà n’ụlọ ọgwụ, ma ọ dịghị ọganihu ọ bụla si na nke a pụta. Ọ bụ ndị odibo na-elekọta ezinụlọ ya n’ihi na o nweghị ike ịhụ maka ihe ọ bụla. Ọ nwara igbu onwe ya n’ihi na o nwekwaghị mmasị ná ndụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla yiri ka ò nyeere ya aka.

Mgbe ahụ, ọ gwara nwanyị ahụ, otụ ụbọchị Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya ma nye ya otu akwụkwọ ọgụgụ Bible. Nke ahụ kpaliri mmasị o nwere n’Okwụ Chineke, ọ malitekwara ịgụzu Bible dum. Ọ malitere inwe mgbanwe n’ime onwe ya. Ọ malitere ibilite n’ụtụtụ ma nwee mmasị n’ebe ezinụlọ ya nọ. N’ikpeazụ o kpebiri iịi aka ya lekọta ụlọ ahụ ma chọpụta na ya pụrụ ime otú ahụ. Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ rịatụrụ ọrịa! Nke a mere ka obi tọọ ya ụtọ nke ukwuu.

Ọ laghachikwurughị onye ahụ na-agwọ ọrịa uche. Ọchịchọ o nwere ịdị ndụ bụ nke a kpaliri site n’ihe ọmụma o nwere banyere Okwụ Chineke, nke a gosipụtakwara onwe ya ịbụ ọgwụ kachasị mma. Ọ chọgharịrị Ndịàmà Jehova, ha malitekwaara ya ọmụmụ ihe n’ụzọ chiri anya. Ọ malitekwara ịbịa nzụkọ, n’oge na-adịghịkwa anya o mere baptism. N’ịbụ onye na-adịghị enwekwa nsogbu nke ọrịa uche, ọ na-enweta ọṅụ ụgbu a n’ijere Jehova ozi.

Nwanyị ahụ nọ n’ime ụlọ nchere ahụ gere ntị nke ọma. Mgbe ahụ ọ gwara nwanna nwanyị ahụ, sị: “Anọgidewo m na-ezute Ndịàmà Jehova eri oge, ma ọ bụrụ na n’ọdịnihụ emesịrị m ghọọ Onyeàmà Jehova n’onwe m n’ezie, ọ ga-abụ n’ihi ihe ị gwara m. Ige gị ntị dị ka ịmalite ịhụ ìhè n’ebe gbara ọchịchịrị.”

Otụtụ ndị gbụrụgbụru ụwa na-ahụ ihe na-enweghị isi ọ bụ ịnwa iji aka ha dozie nsogbu nke ndụ n’onwe ha, ha na-echigharịkwurukwa Jehova Chineke. Lee aha obi ụtọ ha nwere ịmata banyere ụwa ọhụrụ Chineke nke na-abịanụ, bụ́ ebe mmadụ nile ga-enwe obi ụtọ, ịda mbà n’obi ga-abụkwa ihe mgbe ochie!—Ilu 16:20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya