Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 10/1 p. 3
  • Ì Nwere Ọchịchọ Maka Oge Mgbe . . .

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Nwere Ọchịchọ Maka Oge Mgbe . . .
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Isiokwu Ndị dị n’Akwụkwọ a
    Teta!—2005
  • Enweghị Ebe Obibi—Gịnị Na-akpata Ya?
    Teta!—2005
  • Ò Nwere Mgbe Ime Mpụ Ga-akwụsị?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Enweghị Ebe Obibi—Gịnị Bụ Ngwọta Ya?
    Teta!—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 10/1 p. 3

Ì Nwere Ọchịchọ Maka Oge Mgbe . . .

□ ị puru ịnọ ná nchebe n’ụlọ gi—n’agbanyeghị oge ọ bụ n’ụbọchị?

□ ọ na-agaghị adị mkpa inwe ihe mkpọchi ụzọ, ihe mgbochi ígwè, ihe na-etikpo ndị ohi mkpu, ebe e si enyopụta anya iji hụ ndị bịaranụ, ogige, ndị nche, nkịta ndị e ji eche nche, na ihe ndị ọzọ a na-eme maka nchebe?

□ ị pụrụ ịkpagharị n’okporo ámá nanị gị n’enweghị ihe ize ndụ ọ bụla, ọbụna n’abalị?

□ ọgwụ ọjọọ nile na nsogbu ndị ọzọ nile na-esi na ya apụta ga-abụcha ihe mgbe ochie gara aga?

□ agha nile ga-akwụsịworị, a gaghị emepụtakwa ngwa agha ma ọ bụ kwakọba ha?

□ ị na-agaghị echegbukwa onwe gị ọzọ banyere nri, ikuku, na mmiri e metọrọ emetọ?

□ iyi ọha egwu, ịnwụde ma jichie ndị mmadụ, na iyi egwu ịtụ bọmbụ ga-abụ ihe e wepụchasịworo?

□ a ga na-echebe ihe e kere eke ndị dị n’ime ala, na-elekọtakwa ha, jirikwa ha na-eme ihe n’ụzọ amamihe maka ọdịmma nke mmadụ nile?

□ anyaukwu na ịchọ ọdịmma onwe onye na-agaghị abụkwa ihe mkpali n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ?

□ ụmụntakịrị ga-anọgide n’amaghị ihe ọjọọ ọ bula, na-asọpụrụkwa ndị ọzọ na ihe onwunwe ha?

□ a na-agaghị adị na-emegbu ndị inyom ma ọ bụ na-emeso ha omume aka ike?

□ iwu na ụkpụrụ nile ga-abụ ihe ziri ezi, ndị a ga-ejikwa ụzọ ikpe ziri ezi tinye ha n’ọrụ maka ọdịmma nke mmadụ nile?

□ ndị ọchịchị ga-eme mkpebi ndị dabeere ná mkpa ụmụ mmadụ nwere n’ezie, ọ bụghị ndị dabeere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

□ nnwere onwe na ịha nhata na-agaghị abụkwa nanị ihe a na-ekwu n’ọnụ kama ha ga-abụkwa ihe a na-eme eme?

□ ịda ogbenye na-agaghị adịkwa ọzọ, kama mmadụ nile ga-enwe ihe ọ bụla dị ha mkpa maka ahụ ike, ọdịmma, na obi ụtọ ha?

□ ụmụntakịrị ga-abụ ndị a chọrọ na ndị a na-elekọtakwa, ọ bụghị ndị a na-emekpọ ọnụ ma ọ bụ ndị a na-agbahapụ agbahapụ?

□ a ga-emerịworị ọrịa na ọnwụ, a gaghị enwekwa ajọ ihe otiti ndị na-atụ ụjọ?

□ onye ọ bụla i zutere ga-abụ onye nwere obi ọma, onye dị njikere inyere gị aka, na onye ị pụrụ ịtụkwasị obi?

□ a ga-eji ndụ nke onye ọ bụla kpọrọ ihe n’ezie, mmadụ nile ga-enwekwa ike ịchọta obi ụtọ na-adịgide adịgide?

□ okpukpe na-agaghị abụkwa ihe na-akpata nkewa, na-eduje n’anabataghị ndị ọzọ, ịkpọasị, na agha?

□ mmadụ nile ga-enwe ebe mara mma, kwesịkwa ekwesị ha ga-ebi, enweghị ebe obibi ga-abụkwa ihe mgbe ochie?

Ọ bụrụ na ị pụrụ ịza ee nye nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị a dị n’elu, ọ ga-amasị gị ịgụ isiokwu ndị na-esochi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya