Olee Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Nara Ịhụnanya Chineke n’Achọghị Ọdịmma nke Nanị Onwe Anyị?
“Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otú a, anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịhụrịta onwe anyị n’anya.”—1 JỌN 4:11.
1, 2. Gịnị ka a chọrọ anyị n’aka iji zaghachi n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe anyị ná ngosipụta dị iche iche nke ịhụnanya Chineke?
JEHOVA bụ n’ezie ihe atụ zuru okè nke ịhụnanya. N’eziokwu, n’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị hụrụ otú ngosipụta dị iche iche nke ịhụnanya ya si baa ụba n’ezie. Anyị rịbakwara ama otú Mosis, Devid, na Jisọs Kraịst si zaghachi n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ha ná ngosipụta ndị ahụ nke ịhụnanya. Ọ̀ bụ na onye ọ bụla n’etiti Ndịàmà Jehova agaghị achọ ime otu ihe ahụ? N’ezie ha ga-achọ ime otú ahụ!
2 Gịnị ka a chọrọ anyị n’aka ka anyị wee zaghachi n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị n’ịhụnanya Chineke? Otu ihe bụ na anyị aghaghị idebe ya n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị, jiri obi anyị nile, mkpụrụ obi anyị nile, uche anyị nile, na ike anyị nile, na-ahụ ya n’anya. (Mak 12:29, 30) Nke ahụ pụtara mmadụ imikpu on we ya n’ihe banyere Chineke, na-enwe ezi mmekọrịta onwe onye n’ebe Jehova nọ. Anyị na-enwe ọchịchọ ịgwa Nna anyị nke eluigwe okwu site n’ekpere? Ànyị na-ekpe ekpere n’esepụghị aka, na-anọgidekwa n’ikpe ekpere? Ka ànyị na-ekpe ekpere anyị ngwa ngwa, mgbe ụfọdụkwa na-abụ ndị ji ọrụ n’aka nke ukwuu nke na anyị apụghị ikpe ekpere? (Ndị Rom 12:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Anyị na-adọrọ uche gaa n’ebe Jehova nọ, na-enye ya na nzukọ ya otuto maka ihe anyị pụrụ imezuworịị? (1 Ndị Kọrint 3:7; 4:7) N’ezie, ànyị nwere mmetụta yiri nke onye ọbụ abụ ahụ? Banyere Chineke, ọ sịrị: “Ugbo asaa n’ụbọchị ka m toworo gị.”—Abụ Ọma 119:164.
3. Mgbe anyị zukọtara maka ntụrụndụ, olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị na-anara ịhụnanya Chineke n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe anyị?
3 A ga-ekpughe ma ànyị na-azaghachi n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe anyị n’ịhụnanya Chineke ma ọ bụ na anyị adịghị eme otú ahụ mgbe anyị zukọtara maka ntụrụndụ efu. Mkparịta ụka anyị ọ̀ na-abụ banyere ihe nke anụ ahụ ka ọ̀ bụ ihe nke ime mmụọ? Nke a abụghị ikwu na ọ dị mkpa ka anyị na-enwe ọmụmụ Bible dị omimi mgbe ọ bụla anyị na ndị Kraịst ibe anyị zukọtara. Ma o doro anya na anyị pụrụ ịhụ ihe ime mmụọ ndị na-akpali mmasị anyị ga-etinye ná mkparịta ụka anyị. Gịnị banyere ịkọ ahụmahụ ndị e nwetara n’ubi, ịkparịta ụka banyere akụkụ Bible ndị na-amasị anyị, ịkọ banyere otú anyị si nata eziokwu ahụ, ma ọ bụ igosi ihe àmà dị iche iche nke nlekọta ịhụnanya na ngọzi Chineke?
4. Olee ụzọ anyị kwesịrị isi lee ihe anya ma ọ bụrụ na anyị enwetaghị ihe anyị tụrụ anya ya n’ihe banyere ihe ùgwù ije ozi ụfọdụ?
4 Ọnọdụ ọzọ nke pụrụ ikpughe ịdị omimi nke obi ekele anyị nwere maka ịhụnanya Chineke bụ mgbe e lefuuru anyị anya n’ihe banyere ihe ùgwù ije ozi ụfọdụ ná nzukọ Jehova. Olee ụzọ anyị na-esi emeghachi omume? Ọ bụrụ na isi ihe dị anyị mkpa bụ inye Jehova nsọpụrụ, anyị ga-ekwere na Chineke ga-enweta nsọpụrụ n’otu ụzọ ahụ site n’aka onye ọ bụla o bụ ya nwetara ihe ùgwù ije ozi nke ahụ. (Tụlee Luk 9:48.) Ma, ọ bụrụ na anyị na-echegbubiga onwe anyị ókè banyere abamuru ma ọ bụ aha nke onwe anyị, ọ ga-enye anyị nsogbu n’obi na e lefuruwo anyị anya, dị ka anyị pụrụ iche. Anyị kwesịrị icheta na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọbụna na ọ pụrụ ịmara na n’oge dị ugbu a, na anyị apụghị ibu ibu dị arọ nke ibu ọrụ ụfọdụ nke ọchịchị Chineke. Ọ pụrụ ịdị na-enye anyị ngọzi bara ụba n’ụzọ ndị ọzọ, ngosipụta ndị ahụ nke ịhụnanya ya kwesịkwara inyere anyị aka ịnọgide ná nguzozi ime mmụọ anyị.—Ilu 10:22.
Ịhụ Ezi Omume n’Anya, ịkpọ Mmebi Iwu Asị
5. Mmetụta dị aṅaa ka ngosipụta dị iche iche nke ịhụnanya Chineke kwesịrị inwe n’ebe àgwà anyị dị?
5 Ngosipụta nke ịhụnanya Chineke n’ebe anyị nọ kwesịrị ịkpali anyị iṅomi Kraịst n’ịhụ ezi omume n’anya na ịkpọ mmebi iwu asị. (Ndị Hibru 1:9) N’eziokwu, anyị apụghị ime nke a n’ụzọ zuru okè, dị ka Jisọs mere. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ ime ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ anyị ịbụ ndị dị nsọ, ndị na-eme ihe n’eziokwu, ndị na-edebekwa iwu ruo ókè o kwere mee n’ọnọdụ anyị nke na-ezughị okè. Iji mee nke a, ọ bụghị nanị na anyị ga-ewulite ịhụnanya maka ezi omume na ezi ihe, kama anyị ga-ewulitekwa ịkpọasị, enweghị mmasị, ịsọ oyi, maka ajọ ihe. Dị ka Pọl onyeozi si kwuokwa: “Na-akpọnụ ajọ ihe asị; na-arapara ezi ihe n’ahụ.” (Ndị Rom 12:9) ‘Ịkpọasị’ bụ okwu siri ike nke ukwuu, nke pụtara “iji oké enweghị mmasị na-ele ihe anya.”—Webster’s New Collegiate Dictionary.
6. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọ na nche megide ọnwụnwa a na-eche anyị n’ihu site n’ụwa, anụ ahụ anyị nke na-emehie emehie, na Ekwensu?
6 Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọ na nche megide ọnwụnwa ndị chere anyị ihu site n’ụwa nke a, anụ ahụ anyị nke na-emehie emehie, na Ekwensu? Iguzosi ike n’ihe n’ebe Jehova Chineke nọ. Ọ na-akpọ anyị òkù, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) Ee, iguzosi ike n’ihe n’ebe Jehova nọ ga-akpali anyị ịgbaso ụzọ amamihe nke a nke inwe ịkpọasị maka ihe ndị ọ kpọrọ asị. Ọzọkwa, n’agbanyeghị otú imebi otu n’ime iwu Chineke si yie ihe ụtọ ma ọ bụ ihe na-akpali akpali, anyị aghaghị ịnọgide na-agwa onwe anyị na ime otú ahụ ekwesịghị nnọọ ekwesị. (Ndị Galetia 6:7, 8) Obi mmadụ dị aghụghọ, na-arafu arafu, na-eduhiekwa eduhie, ọbụna dị ka e chetaara anyị na Jeremaịa 17:9. Obi onye Kraịst nwere mmasị n’ihe ndị dị mma, ndị mara mma, ndị dịkwa ọcha. Ma mgbe ụfọdụ, ọchịchọ mmehie na-akpali ya ịchọkwa ihe dị njọ. Dị ka obi ndị Israel ahụ ndị fere Jehova ma nọgide na-edebe “ebe dị elu” ha dị iche iche nke ikpere arụsị, otú ahụ ka obi anyi pụrụ isi bụrụ ihe na-achọ ọdịmma nke nanị onwe ya na nke na-aghọ aghụghọ. (1 Ndị Eze 22:43; Deuterọnọmi 12:2) Obi anyị nke na-ezughị okè pụrụ ịnwa ịchọta ihe ngọpụ ndị ọ ga-eji tinye anyị n’ọnwụnwa. Ọ pụrụ ịnwa ibelata ịdị njọ nke omume ọjọọ ahụ nke e ji na-anwa anyị ọnwụnwa. Obi anyị pụrụ ịnwa ime ka anyị kwere na ahụhụ ọ bụla a ga-enye anyị ga-abụ nanị nke na-adịru nwa oge.
7. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị ịnọ na nche megide inwe ọchịchọ maka ihe ọjọọ?
7 N’ihi ekele anyị nwere maka ịhụnanya Chineke, anyị aghaghị ịnọ na nche megide inwe ọchịchọ ihe ọjọọ, dị ka ịdalagara adịghị ọcha nke mmekọahụ, ma ànyị bụ ndị na-alụbeghị di na nwunye ma ọ bụ na anyị alụwo. Ọtụtụ ugbo, ihe malitere dị ka mkpakọrịta efu nke a na-ebughị ihe ọjọọ ọ bụla n’obi na-eme edubawo ndị Kraịst abụọ n’ịbụ ndị nwerịtara mmetụta dị omimi nke ukwuu nke na ha emewo mmehie, bụrụkwa ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ. Ọbụna ndị okenye, ndị kwesịrị ịbụ ihe nlereanya a na-apụghị ịta ụta nye ìgwè atụrụ ahụ, adabawo n’iru újú n’ihi okwu ndị a!—Tụlee 1 Ndị Eze 15:4, 5.
8. Ihe nlereanya dị aṅaa nke ịdọ aka ná ntị ka Pọl onyeozi nyere anyị, oleekwa ụzọ a pụrụ isi mee ihe atụ nke nsogbu dị otú ahụ?
8 Tụlee ihe banyere Pọl onyeozi, onye e ji ọhụụ na ike ndị karịrị nke mmadụ wee gọzie, nyekwa ya onyinye nke mkpali nke mmụọ Chineke. Iji nwee mmeri na mgba ọ na-agba megide mkpali mmehie dị iche iche, ọ dịrị mkpa ka o tipụta ahụ ya ọnyá—ee, tisie ahụ ya ihe ike. Ànyị ga-anwa anwa inwe afọ ojuju ime ihe dị ala karia nke ahụ? (Ndị Rom 7:15-25; 1 Ndị Kọrint 9:27) Ọ bụ dị ka à ga-asị na anyị nọ n’ime ụgbọ epeepe nke nọ n’osimiri nke na-achị ọkụ ọkụ, bụrụkwa ndị e bu na-agbada iru ebe ọ na-esi na nkume dị elu na-asọda n’ike. Iji wee zere ọdachi, anyị aghaghị ịgbalịsi ike ịkpara ụgbọ ahụ chee ihu n’ebe mmiri ahụ nke na-asọsi ike si na-asọdata. Ọ pụrụ ịdị ka à ga-asị na anyị adịghị enwe ọganihu dị ukwuu, ma, ruo ogologo oge anyị nọgidere na-agbalịsi ike, anyị agaghị adaba ná nsọda mmiri ahụ nke ga-ebibi anyị. N’ezie, ngosipụta dị iche iche nke ịhụnanya Jehova Chineke n’ebe anyị nọ kwesịrị ime ka anyị gbalịsie ike ịnọgidesi ike n’ihe n’ebe ọ nọ site n’ịkpọ mmebi iwu asị na ịhụ ezi omume n’anya.
Gosipụta Ịhụnanya Ụmụnna
9. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jọn onyeozi nyere anyị n’ihe banyere ịhụ ụmụnna anyị n’anya?
9 Ngosipụta nke ịhụnanya Chineke kwesịkwara ịkpali anyị ịhụ ụmụnna anyị n’anya dị ka Jisọs Kraịst hụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 13:1) N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, Jọn onyeozi kwuru, sị: “N’ime nke a ka ịhụnanya dị, ọ bụghị na anyị onwe anyị hụrụ Chineke n’anya, kama ọ bụ ya onwe ya hụrụ anyị n’anya, wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie anyị. Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otú a, anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịhụrịta onwe anyị n’anya.” (1 Jọn 4:10, 11) N’eziokwu, Jisọs kwuru na ụzọ a ga-esi mara ezi ndị na-eso ụzọ ya bụ site n’ịhụnanya ha nwere n’etiti onwe ha.—Jọn 13:34, 35.
10, 11. Gịnị bụ ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya ụmụnna?
10 Anyị maara na ndị Kraịst kwesịrị igosi ịhụnanya ụmụnna. Ma ọ bụghị ihe ọjọọ ichetaghachiri onwe anyị ụzọ dị iche iche anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya nke a yiri nke Kraịst n’ebe ibe anyị nọ. Ịhụnanya dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ilefuru ndịrịta iche dị iche iche anya n’ihe banyere agbụrụ, mba, ọnọdụ mmụta akwụkwọ, ọdịbendị, na ọnọdụ akụ na ụba mmadụ nọ na ya. Ọzọkwa, ịhụnanya ụmụnna ga-akpali anyị izukọta ná nzukọ dị iche iche. Ọ bụrụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya n’ezie, anyị agaghị ekwe ka ọnọdụ ihu igwe nke na-adịghị mma ma ọ bụ obere ahụ nsogbu gbochie anyị inweta ọṅụ nke iso ha kpakọrịta na ikere òkè ná nnyerịta nke agbamume. (Ndị Rom 1:11, 12) Karịa nke ahụ, ịhụnanya ụmụnna ga-eme ka anyị kwadebe nke ọma maka nzukọ anyị dị iche iche, ka anyị kerekwa òkè pụtara ìhè na ha ka anyị wee nwee ike ịkpalirịta onwe anyị n’ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche.—Ndị Hibru 10:23-25.
11 Gịnị banyere inyere ụmụnna anyị aka n’ozi ubi? A hụtawo na ọtụtụ mgbe, ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-esoro ibe ha na-ekere òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ ma ọ bụkwanụ na-aga nanị onwe ha ebe ọ bụ na ha pụrụ, ọ bụrụ na ha emee obere nhazi, ịkpọrọ ndị nkwusa Alaeze chọrọ enyemaka n’ije ozi ahụ ka ha sonyere ha. Igosi ịhụnanya n’ụzọ dị otú a ga-eme ka ije ozi ubi nke ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi bụrụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ okpukpu abụọ. Gịnịkwanụ banyere ịkpọrọ onye nkwusa ọhụrụ gaa mgbe a na-eje iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi?—Ndị Rom 15:1, 2.
12. Olee ụzọ anyị kwesịrị isi ghọta 1 Jọn 3:16-18?
12 Ịhụnanya ga-akpalikwa anyị ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka, ndị ọ pụrụ ịbụ na ha nọ n’ezi mkpa nke ihe onwunwe. Jọn onyeozi dere, sị: “N’ime nke a ka anyị mawooro ịhụnanya, n’ihi na ya onwe ya tọgbọrọ ndụ ya n’ihi anyị: anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịtọgbọ ndụ anyị n’ihi ụmụnna anyị. Ma onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa nke a o ji biri, nke hụkwara nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa, o wee mechigide ya obi ebere ya, ịhụnanya Chineke si aṅaa dịgide n’ime ya? Ụmụntakịrị m, ka anyị ghara ịhụ n’anya n’okwu, ma ọ bụ n’ire; kama ka anyị na-ahụ n’anya n’ọrụ na eziokwu.” (1 Jọn 3:16-18) Ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị mgbe a ga-asị ka anyị tọgbọ ndụ anyị n’ihi ha, kama n’oge ụfọdụ, anyị na-enwe ohere dị iche iche igosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ha nọ n’ụzọ ndị ọzọ, ọ bụghị nanị site n’okwu ọnụ ma ọ bụ site n’ire, kama site n’ihe omume. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla dị n’ịhụ ụmụnna anyị n’anya n’okwu ọnụ, kama anyị achọghị ka ịhụnanya anyị jedebe n’ebe ahụ mgbe ha nọ ná mkpa ihe onwunwe. Okwu Jisọs nke bụ na “ọ dị obi ụtọ inye ihe karịa ịnara ihe” metụtakwara inye enyemaka n’ụzọ ihe onwunwe.—Ọrụ 20:35, NW.
13. (a) Olee eziokwu ụfọdụ ndị bụ isi anyị mụtara site n’enyemaka nke nzukọ Jehova a na-ahụ anya? (b) Isi ihe dị aṅaa nke dị irè ka Charles Taze Russell mere ka ọ pụta ìhè?
13 Anyị nwere ohere igosi ịhụnanya maka ụmụnna anyị ndị na-edu ndú n’ọgbakọ ma ọ bụ n’ihe banyere nzukọ Jehova a na-ahụ anya gburugburu ụwa. Nke a gụnyere ịnọgidesi ike n’ịkwado “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Ka anyị chee eziokwu ahụ ihu nke bụ na n’agbanyeghị ókè anyị gụruworo na Bible, ọ dịghị mgbe anyị gaara amụtaworị eziokwu ahụ n’onwe anyị. Anyị agaraghị achọtaworị eziokwu banyere Jehova, nzube na àgwà ya nile, ihe aha ya pụtara na ịdị mkpa ya, Alaeze ahụ, àjà mgbapụta Jisọs, ọdịiche dị n’etiti nzukọ Chineke na nke Setan, ma ọ bụkwanụ ihe mere Chineke jiworo kwe ka ajọ omume dịgide. Ọ bụ nnọọ dị ka onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society, bụ́ Charles Taze Russell, dere na 1914, sị: “Ọ̀ bụ na anyị abụghị ndị a gọziri agọzi, ndị nwere obi ụtọ? Ọ̀ bụ na Chineke anyị abụghị onye kwesịrị ntụkwasị obi? Ọ bụrụ na onye ọ bụla maara ihe dị mma karị nke a, ya nara ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu achọta ihe dị mma karị nke a, anyị nwere olileanya na unu ga-agwa anyị. Anyị amaghị ihe ọ bụla dị mma karị nke a, ma ọ bụ ihe dị mma ruo ọkara nke ihe anyị chọtaworo n’ime Okwu nke Chineke. . . . Ọ dịghị ire ma ọ bụ mkpịsị akwụkwọ nke pụrụ ịkọ ụdị udo, ọṅụ, na ngọzi ndị ihe ọmụma doro anya nke ezi Chineke ahụ webataworo n’ime obi anyị na n’ime ndụ anyị. Akụkọ nke Amamihe, Ikpe Ziri Ezi, Ike, na Ịhụnanya nke Chineke na-enyezu ọchịchọ nile nke ma uche ma obi anyị afọ ojuju. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị na-achọ. Ọ dịghị ihe e kwesịrị ịchọ karịa inweta Akụkọ nke a dị ebube n’ụzọ doro anya n’uche anyị.” (ỤLỌ Nche [Bekee], December 15, 1914, peji 377, 378) Lee nnọọ ka okwu ndị ahụ e dere nke ọma si bụrụ eziokwu!
Ijere Ndị Nọ n’Èzí Ozi
14. Olee ụzọ ngosipụta dị iche iche nke ịhụnanya Chineke kwesịrị isi kpalie anyị imeso ndị nọ n’èzí ihe?
14 Ngosipụta nke ịhụnanya Chineke ndị anyị nwetaworo kwesịrị ịkpali anyị igosi ịhụnanya nke ndị agbata obi n’ebe ndị na-anọghị n’ime ọgbakọ nọ. Olee ụzọ anyị pụrụ isi mee nke a? Ọnọdụ dị iche iche pụrụ igosi na anyị nwere ike inyere ndị agbata obi anyị aka n’ụzọ ihe onwunwe. Ma, ihe dị mkpa karị bụ na anyị pụrụ igosi ịhụnanya ndị agbata obi site n’iwejere ndị ọzọ ozi ọma nke Alaeze Chineke na inyere ndị hụrụ ezi omume n’anya aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ànyị na-ekerechi òkè anya n’ije ozi ihu ọha nke a, ka ànyị na-elefuru ya anya? Ọ̀ ghọwo ihe omume nkịtị a na-eme mgbe mgbe ma ọ bụ ụdị ihe ngosipụta efu nke ije ozi? Ka ọ̀ bụ ịhụnanya ndị agbata obi na-akpali anyị n’ezie? Ànyị na-egosipụta ọmịiko? Ànyị nwere ndidi, na-echere ka ndị mmadụ zaghachi? Ànyị na-agba ndị nwe ụlọ ume ikwupụta echiche ha? Ee, kama ịbụ nanị anyị kwuru ihe nile, ka anyị kwere ka ịhụnanya nke ndị agbata obi kpalie anyị ige ntị na isoro ndị anyị na-ezute n’ije ozi ahụ nwee mkparịta ụka na-enyeghachi ụgwọ ọrụ ndị dabeere na Bible.
15. (a) N’ihi gịnị ka “ịgba àmà mberede” ji bụrụ aha dị mma karịa “ịgba àmà ndapụta”? (b) N’ihi gịnị ka e kwesịrị iji jiri ohere ndị e nwere maka ịgba àmà mberede mee ihe?
15 Anyị na-amụrụ anya otú o kwesịrị iji ohere nile dapụtaranụ mee ihe ịgba àmà mberede? O kwesịrị ka a rịba ama na nke a abụghi ịgba àmà ihe ndapụta efu, bụ́ nke na-atụ aro na ọ bụ ihe a na-emeghị atụmatụ banyere ya ma ọ bụ ihe na-adịghi mkpa nke ukwuu. Ịgba àmà mberede dị mkpa nke ukwuu, ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ ibe anyị nọ ga-akpali anyị ịchọta ohere ndị anyị ga-eji kere òkè na ya. Lee nnọọ ka ịgba àmà dị otú ahụ na-esi amịpụta mkpụrụ ọtụtụ mgbe! Di ka ihe atụ, mgbe ọ na-eje otu mgbakọ Ndịàmà Jehova nwere n’ebe ugwu Itali, otu nwanna nwoke jere n’ụlọ ọrụ ndị mekanik ka a gbanwee ọkụ moto ya. Mgbe ọ na-echere, ọ gbaara ndị nọ ya gburugburu àmà, wee nye ha mpempe akwụkwọ ndị na-akpọ ha òkù ịbịa okwu ihu ọha ahụ dabeere na Bible a ga-ekwu na Sunday. N’otu mgbakọ mba nile e nwere na Rom mgbe otu afọ gasịrị, otu nwanna nwoke ọ na-amataghị kelere ya nke ọma. Ònye bụ nwanna nke a? Ee, ọ bụ otu n’ime ndị ahụ o nyere mpempe akwụkwọ ahụ n’ụlọ ọrụ ndị mekanik ahụ n’afọ gara aga! Nwoke ahụ jere gee ntị n’okwu ihu ọha ahụ wee nye aha ya iji gosi na ya chọrọ ọmụmụ Bible. Ugbu a, ma ya ma nwunye ya bụ Ndịàmà Jehova raaraworo onwe ha nye. E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla na ịgba àmà mberede pụrụ ịbụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ nke ukwuu!
Nọgide Na-azaghachi n’Ịhụnanya Chineke
16. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
16 N’ezie, Jehova emewo ihe n’ụba n’igosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe ihe ndị o kere eke dị. Dị ka anyị rịbaworo ama, Akwụkwọ nsọ na-enye anyị ezi ihe nlereanya nke ndị zaghachiri n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe ha ná ngosipụta dị iche iche nke ịhụnanya Chineke. N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, onye ọbụ abụ ahụ nke nwere ike mmụọ nsọ tiri mkpu, sị: “Ka ha kelee Jehova ekele banyere ebere ya, na oké ọrụ ya nile nke ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ!” (Abụ Ọma 107:8, 16, 21, 31) Ànyị ga-anwa anwa ịnara obi ebere Chineke nke na-erughịrị mmadụ ma kwere ka nzube ya funarị anyị? Ka nke ahụ ghara ime! (2 Ndị Kọrint 6:1) Ya mere, ka onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị: ‘Ènwere m ekele n’ezie maka ngosipụta nile nke ịhụnanya Chineke ndị m nwetaworo na ndị m nwekwara obi ike na m ga-enweta n’ọdịnihu? Hà na-akpali m iji obi m nile, mkpụrụ obi m nile, uche m nile, na ike m nile hụ Jehova n’anya? Èmikpuru m onwe m n’ezie n’ihe banyere Chineke? Àhụrụ m ezi omume n’anya, kpọọkwa mmebi iwu asị? Àna m egosi ịhụnanya ụmụnna? Ruokwa ókè ha aṅaa ka m na-agbalị isochi nzọụkwụ Jisọs anya n’ihe banyere ije ozi m?’
17. Gịnị ka ọ ga-arụpụta ma ọ bụrụ na anyị azaghachi n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe anyị ná ngosipụta dị iche iche nke ịhụnanya Jehova Chineke?
17 N’ezie, anyị nwere ọtụtụ ụzọ isi gosipụta ekele sitere n’obi eziokwu maka ngosipụta nile nke ịhụnanya Chineke ndị anyị nwetaworo. Site n’iji ohere nile anyị nwere igosipụta ekele dị otú ahụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu, anyị ga-eme ka obi nke Nna anyị nke eluigwe ṅụrịa, bụrụ ngọzi nye ndị ọzọ, nwetakwa ọṅụ, udo, na afọ ojuju n’onwe anyị. Ya mere, ka anyị nọgide na-azaghachi n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe anyị ná ngosipụta nile nke ịhụnanya Chineke.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ Gịnị ka a chọrọ anyị n’aka iji zaghachi n’achọghị ọdịmma nke nanị onwe anyị n’ịhụnanya Chineke?
◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide ọnwụnwa?
◻ Olee ụzọ ndị anyi pụrụ isi gosi ịhụnanya ụmụnna?
◻ Olee ụzọ ngosipụta dị iche iche nke ịhụnanya Jehova kwesịrị isi kpalie anyị imeso ndị agbata obi anyị ihe.
[Foto dị na peeji nke 17]
Anyị aghaghị ịgba mgba megide ọchịchọ mmehie iji wee zere ọdachi
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndị okenye na-egosi ịhụnanya ụmụnna site n’isoro ndị ọzọ na-ejekọ ozi Alaeze ahụ
[Foto dị na peeji nke 19]
Charles Taze Russell, bụ́ onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society, dọọrọ uche gaa n’udo, ọṅụ, na ngọzi ndị ọ bụ nanị Chineke pụrụ inye