Ụzọ Jehova Si Eme Ka Ọrụ Ya Na-aga n’Ihu
N’IRI afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, Ndịàmà Jehova enwewo uto dị ịrịba ama. Nanị n’ime afọ iri gara aga, ha amụbawo site na 42,600 ọgbakọ ruo ngụkọta nke 60,192 n’ime 212 mba dị iche iche. N’ihi nke a, ụfọdụ ajụwo, sị: Olee otú e si na-enweta ego e ji akwado ọrụ Ndịàmà? Obi dị Watch Tower Society ụtọ ịza ajụjụ nke a na ajụjụ ndị ọzọ metụtara ya n’isiokwu nke a.
Ndịàmà Jehova hà na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri?
Ee e. N’Israel oge ochie, e nyere iwu inye otu ụzọ n’ụzọ iri n’okpuru Iwu Mosis iji kwadoo ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ Chineke, ndị Livaị, na ndị nchụàjà. (Ọnụ Ọgụgụ 18:21, 24-29) Ndị a enweghị ala ọ bụla e kenyere ha dị ka otu agbụrụ e wezụga obodo ụfọdụ, ya mere nkwado nke a dị ha mkpa. Ọzọkwa, ndị Israel kwesịrị ntụkwasị obi nweere onwe ha inye onyinye afọ ofufo maka ihe owuwu ndị pụrụ iche, dị ka owuwu nke ụlọ ntu ahụ na, n’ikpe-azụ, ụlọ nsọ ahụ.—Ọpụpụ 25:1-8; 1 Ihe Emere 29:3-7.
Otú ọ dị, mgbe Jisọs nwụrụ, Bible sịrị na ‘e mere ka Iwu ahụ nke jupụtara n’ihe ndị e nyere n’iwu ghara ịdị irè.’ (Ndị Efesọs 2:15; Ndị Kọlọsi 2:13, 14) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, n’anya Chineke Iwu ahụ ejigideghịkwa ma ndị Juu ma ndị Kraịst. Ya mere, tinyere akụkụ ndị ọzọ nile nke Iwu ahụ, dị ka ịchụ àjà mgbe mgbe n’ụlọ nsọ ahụ, a chọkwaghị iweta otu ụzọ n’ụzọ iri n’aka ndị kwesịrị ntụkwasị obi.
N’etiti ndị Kraịst, ịhụnanya, ọ bụghị iwu, na-akpali inye ihe. Pọl onyeozi kọwara ụkpụrụ ahụ mgbe ọ na-ahazi ịnakọta ihe maka ndị Kraịst nọ ná mkpa na Judia. Ọ sịrị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) Usoro nke a nke Akwụkwọ nsọ kwadoro nke inye ihe site n’afọ ofufo ka Ndịàmà Jehova na-agbaso.
Ùnu na-eme oriri igba ọnyà ego, ike envelopu onyinye ego, ịrịọ arịrịọ ego, na ụzọ ndị yiri ha e si enweta ego?
Ee e, a dịghị amanye ezi ndị Kraịst amanye ma ọ bụ nye ha ihe iri ngó site n’idebe onyinye dị iche iche n’ihu ha iji wee mee ka ha nye ihe. Òtù okpukpe dị iche iche ndị na-etinye aka n’ịtụ kaadi, ime bazaa, ịgba chaa chaa, ememe carnival, ịkwụ ụgwọ oche, ma ọ bụ ibugharị efere ịnakọta ego na-egosi na ha enyebeghị ndị ha nri ime mmụọ, n’ihi ya, mmụọ Chineke adịghịkwa akwali ndị òtù ha ịtụ ego n’afọ ofufo. A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ndị na-etinye aka n’omume oge ochie nke inye otu ụzọ n’ụzọ iri.—Matiu 10:8.
Olee otú unu si enweta ego maka ihe owuwu ndị dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze na alaka ulo oru ndị ọhụrụ, nakwa maka mgbasa nke isi ụlọ ọrụ uwa nile ahu dị na Brooklyn nakwa na Patterson, New York?
Jehova na-awụsa mmụọ nsọ ya n’elu Ndịàmà ya, na-enye ha ike ịdị “na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya n’ọrụ ọma nile, ka ha bụrụ ndị kwadebeworo ime ka ndị ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha bụrụ ndị kwere ka ndị ọzọ soo ha nwekọọ ihe; ka ha kpadooro onwe ha ntọala ọma nye oge gaje ịbịa, ka ha wee jide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:18, 19) Mmụọ nke a na-akwali Ndịàmà Jehova ịkwado ọrụ Alaeze ahụ n’ụzọ ọ bụla.
Dị ka ihe atụ, na 1989, 3,787,188 Ndịàmà ndị nọ na 212 mba dị iche iche tinyere 835,-426,538 hour n’ịkụziri ndị ọzọ Okwu Chineke. Ha duzikwaara 3,419,745 ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible ebe obibi nke a na-eduzi mgbe nile. Ego nile e mefuru n’ọrụ nke a bụ site n’akpa ndị rụrụ ya. Jehova nyere nkwụghachi ụgwọ maka ọrụ ịhụnanya nke a site ná mmụba nke 263,855 Ndịàmà ọhụrụ e mere baptism.
Otu mmụọ ahụ nke inye ihe na-akwali Ndịàmà na ndị nwere mmasị ịkwado ọrụ ahụ n’ụzọ ego. E wezụga inye aka ịkwụ ụgwọ ihe ndị a na-emefu mgbe nile n’ọgbakọ nke ha, ha na-akwado ọrụ owuwu ihe ọ bụla nke pụrụ ịdị mkpa, dị ka idozigharị na ịgbasawanye Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ Ụlọ Mgbakọ ha ma ọ bụ iwu nke ọhụrụ. Kwa afọ, n’ihi ito uto ngwa ngwa, ọ dịwo mkpa na e wuru ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọbụna na ụfọdụ were ọtụtụ narị puku naira. Mmefu ego ndị a sitere n’akpa Ndịàmà e nwere n’ebe ndị ahụ site n’onyinye afọ ofufo ha na iji aka ha rụọ ọrụ.
Ọzọ, n’ọtụtụ mba ọ dị mkpa ịgbasawanye ebe alaka ụlọ ọrụ na-ebi akwụkwọ, ụlọ ọfis na ebe obibi dị iche iche—ma ọ bụ wuo ndị ọhụrụ —iji lekọta ndị ọrụ na ngwongwo dịwanyere ukwuu nke nzukọ ahụ na-eto eto chọrọ. A na-akwadokwa nke a site n’onyinye afọ ofufo na ọrụ, dịkwa ka ọ dị n’ọrụ iwu ụlọ na idozi ụlọ a na-arụ na Brooklyn nakwa na Patterson, New York. N’ebe o kwere omume, Ndịàmà e nwere ná mba ọ bụla na-enye ego maka ihe owuwu ahụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, Watch Tower Society na-eme ndokwa ka alaka ụlọ ọrụ dị iche
iche nata enyemaka—ma n’ụzọ ego ma n’ụzọ nke ndị ọrụ nwere nkà—site ná mba ndị ọzọ. Otú a, n’okpuru ntụzi Society, a na-enwe ‘ịha nhata.’—2 Ndị Kọrint 8:14.
Gịnị mere unu adịghị eguzobe ụlọ ọgwụ ma Ọ bụ ebe nlekọta ahụ ike dị iche iche ma na-etinye aka n’ọrụ enyemaka na n’ije ozi ndị ọzọ nke ọha mmadụ dị ka ọtụtụ òtù okpukpe na-eme?
Ndịàmà Jehova na-azaghachi ngwa ngwa mgbe ha nwere ike ime otú ahụ n’ebe e nwere ihe mberede n’oge a lụsịrị agha ma ọ bụ nwee ọdachi nke ọ na-abụghị mmadụ kpatara. N’ezie, ha na-esokarị ná ndị mbụ na-erute n’ebe ahụ, na-eji nri, uwe, na ndị ọrụ nyere onwe ha n’afọ ofufo iji nye aka n’iwugharị ụlọ. Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova adịghị eguzobe ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ebe nlekọta ahụ ike, dị ka ha na-adịghị ahụ maka ọrụ mmenyụ ọkụ ma ọ bụ ndị uwe ojii, bụ́ ndị bụkwa maka ịzọpụta ndụ.
Ha bụ ndị ozi raara onwe ha nye nke ozi ọma ahụ, ọrụ e kenyere ha bụkwa ikwusa na ịkụzi ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụwa nile ka ọ bụrụ àmà tupu ọgwụgwụ ahụ abịa. (Matiu 24:14) Dị ka Jisọs kwuru, owuwe ihe ubi ahụ hiri nne ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ọ ga-abụ ihe a na-agaghị agbaghara mmadụ ileghara ọrụ nke a kasị mkpa anya iji nwee ike iweghara ihe omume ndị ọzọ, n’agbanyeghị otú e si na-aja ha mma.—Matiu 9:37, 38.
Dị ka ihe mere eme, ọtụtụ Ndịàmà Jehova bụ ndị dọkịta, ndị nọọsụ, na ndị na-enye aka n’ụlọ ọgwụ. Ma ha na-ele ọrụ nke a anya dị ka ihe ọzọ ha na-eme e wezụga ọrụ ha bụ isi, bụ́ ozi ndị Kraịst.
È nwere onye ọrụ ọ bula ma ọ bụ onye òtù nke Watch Tower Society nke na-enweta ego site n’oké ọrụ obibi akwụkwọ unu?
Ọ dịghị ma ọlị! Dị ka ọ dị n’iwu, Society bụ òtù ọrụ na-adịghị achọ uru ego. E nweghị ndị tụkọtara ego e ji malite ya, e nweghị uru a na-eke eke, a dịghị akwụ ọbụna ụgwọ ọnwa. Onye ozi nke ọ bụla n’isi ụlọ ọrụ, gụnyere onye isi oche Society na ndị ntụzi ya, aṅụwo iyi nke iwu kwadoro ịbụ ogbenye. Ọ na-enweta nri, ebe obibi, na nlekọta ahụ ike dị mkpa, nakwa nwa obere ego akpa iji kwụọ ụgwọ ụmụ mmefu dị iche iche. Ọ bụrụ na Onyeàmà agaa njem n’ihi ọrụ Society, a na-akwụkarị ụgwọ ihe o mefuru ná njem ya.
Ọzọkwa, ọ dịghị ebe ọ bụla n’ụwa ebe ndị ozi anyị na-anara ego maka ikwu okwu alụmdi na nwunye, ime baptism, ma ọ bụ ili ozu. A dịghịkwa akwụ ụgwọ nnabata ọ bụla ma ọ bụ nara ego n’okwu ihu ọha dị iche iche ma ọ bụ ná mgbakọ dị iche iche.
Ebe ọ bụ na Ọ dịghị mgbe a na-ebugharị efere ịnata ụtụ, olee otú ọgbakọ nile si enweta onyinye iji kwụọ ụgwọ ihe ndị ha mefuru?
Ha na-edebe igbe onyinye dị iche iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka ndị mmadụ nwee ike inye onyinye afọ ofufo ma ọ bụrụ na ha achọọ. (2 Ndị Eze 12:9) A na-egosi ekele maka onyinye nile, n’agbanyeghị otú ha si hie nne ma ọ bụ dị nta. (Mak 12:42-44) Otu ugbo kwa ọnwa, onye ozi nke na-elekọta ihe ndekọ ego ọgbakọ na-agụpụta ihe ndekọ dị mkpirikpi nye ọgbakọ ahụ, na-eme ka ha mara ngụkọta onyinye ndị a natara, ihe ndị e mefuru, na onyinye ọgbakọ ahụ zigaara Watch Tower Society iji kwadoo ọrụ nkwusa a na-arụ n’ụwa nile na ihe ndị ọzọ.
Mgbe ndị mmadụ n’otu n’otu ghọtara ndokwa nke a, ha nweere onwe ha ikere òkè ma ọ bụru na ha achọọ, “otú ihe na-agara onye ọ bụla nke ọma.” (1 Ndị Kọrint 16:2) Nke a bụ ihe a na-eme na nke ọ bụla n’ime ihe karịrị 60,000 ọgbakọ n’ụwa nile.
N’oge Pentikọst, ndị Kraịst mbụ nwekọrọ ihe nile ọnụ. Ndịàmà Jehova hà na-eme nke a?
Ọnọdụ mberede bilitere mgbe Pentikọst afọ 33 O.A. gasịrị, mgbe ndị Juu si ebe ndị dị anya bụ́ ndị a ka tọghatasịrị gaa n’Iso Ụzọ Kraịst nọgidere na Jerusalem iji nwetakwuo nghọta ihe ime mmụọ. Ha chọrọ ebe obibi nwa oge na nri; n’ihi ya, ndị Kraịst e nwere n’ebe ahụ dokwara orire ihe site n’afọ ofufo na ikekọrịta ego e nwetara ka ha nwee ike ịnọkwu ruo ogologo oge maka ifekọ ofufe. (Ọrụ 2:1, 2, 38-47; 4:32-37) Ọ dịghị onye a manyere ire ihe ma ọ bụ inye onyinye. (Ọrụ 5:1-4) Inwekọ ihe ọnụ nke a abụghị usoro kọmunizm, dị ka ụfọdụ na-eche. Ọ bụ nanị ndokwa na-adị nwa mgbe. Mgbe ndị Kraịst ahụ laghachiri n’ebe obibi nke ha, ọ kwụsịrị.
Ùnu na-akụzi na inye ihe a na-ahụ anya bụ ụzọ nke ịkwụ ụgwọ mmehie?
Ọ dịghị ma ọlị! Bible na-asị: “Ebe unu matara na e jighị ihe a pụrụ imebi, bụ́ ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, gbapụta unu n’ibi obi efu unu nke nna unu ha nyere unu n’aka ibi; kama e ji ọbara dị oké ọnụ ahịa, dị ka nke nwa atụrụ nke ọrụ ma ọ bụ ntụpọ na-adịghị ya n’ahụ, bụ́ ọbara nke Kraịst.”—1 Pita 1:18, 19.
Ndịàmà Jehova na-etinye okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs maka nzọpụta. Ha adịghị enye onyinye afọ ofufo na-ele anya na nke a ga-ewetara ha nzọpụta. Ka o sina dị, ha matara na ego dị ukwuu dị mkpa iji gbasaa ozi ọma banyere ụwa ọhụrụ nke ezi omume Chineke. (2 Pita 3:13) Ha na-echekwa na itinye ihe ná mkpọsa nke a bụ ihe ùgwù nke Jehova nyere.
Mgbe ọ na-enye onyinye buru ibu maka ụlọ nsọ Jehova nke ọkpara ya bụ Solomọn ga-ewu, Eze Devid kpere ekpere, sị: “Jehova, gị nwe ịdị ukwuu, na ịdị ike, na ịma mma, na mmeri, na ebube: n’ihi na ihe nile dị n’eluigwe na n’ụwa bụ nke gị; . . . Ma ònye ka mụ onwe m bụ, olee ndị ka ndị m bụkwa, na anyị nwere ike iwere afọ ofufo nye gị onwe anyị otú a? N’ihi na n’ebe ị nọ ka ihe nile si bịa, ọ bụkwa ihe si n’aka gị bịa ka anyị nyere gị.”—1 Ihe Emere 29:11, 14.’
Taa, Ndịàmà Jehova na ndị ọzọ nwere obi ezi omume na-enwe otu ụdị mmetụta ahụ Devid nwere. Obi dị ha ụtọ inwe ihe ùgwù nke inye onyinye iji kwadoo ọrụ nke inye Jehova otuto, na-amata na ihe nile ha nyere maka ozi ya sitekwararịị n’aka ya. Jehova na-agọzi mmụọ nke a, ọ bụkwa otú a ka o si eme ka ọrụ ya na-aga n’ihu.
[Igbe dị na peeji nke 23]
ỤZỌ ỤFỌDỤ SI ENYE AKA N’ỌRỤ ALAEZE AHỤ
◻ ONYINYE: A pụrụ iziga onyinye ego afọ ofufo gaa kpọmkwem n’ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201, ma ọ bụ gaa n’alaka ụlọ ọrụ Society dị ná mba ọ bụla. A pụkwara inye ihe onwunwe ndị ọzọ dị ka ala, tinyekwara ọlaọcha na ọlaedo, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọ onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.
◻ ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI: A pụrụ inye Watch Tower Society ego ka ha jidere mmadụ ná ntụkwasị obi, jirikwa ya na-eme ihe n’ọnọdụ nke bụ na a ga-enyeghachi ya ma ọ bụrụ na onye nyere ya enwee mkpa.
◻ INSHỌRANSI: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransi ahụ anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú a.
◻ EGO NDEBE: A pụrụ iji ntụkwasị obi jiri aha Society meghee ihe ndekọ nchebe ego n’ụlọ akụ. Ọ bụrụ na e mee nke a, biko mee ka Society mara. A pụkwara inye satifiketi ndị e ji anata ego ọmụrụ nwa, na ala ná ndokwa nke ga-eme ka onye nyere ha na-erite uru site na ha n’oge ọ dị ndụ. Usoro nke a na-eme ka e wepụ mmefu ego na obi abụọ nke na-adị n’ịgbalị ịnwapụta ma ihe e dere n’akwukwọ ọ̀ bụkwa eziokwu, ma na-eme ka e jide n’aka na Society ga-enweta ihe ahụ ma ọ bụrụ na onye nyere ya anwụọ.
◻ IKE ÉKPÉ: A pụrụ idenyere Watch Tower Society ụlọ na ala ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ékpé nke e deziri nke ọma n’ụzọ iwu kwadoro. A ga-ezijere Society otu n’ime akwụkwọ ndị a.
Iji nwetakwuo ihe ọmụma na ndụmọdụ banyere okwu ndị a, dega akwụkwọ na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201, ma ọ bụ degara alaka ụlọ ọrụ Society dị n’ala unu akwụkwọ.
[Foto dị na peeji nke 24]
Akụkụ nke ebe nkụzi Bible nke Ndịàmà Jehova bụ nke a ka na-ewu ewu nà Patterson, New York
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Jehova na-eme ka ọrụ owuwu ihe nke ndị ya na-aga n’ihu, bụ́ ndị na-enye onyinye afọ ofufo