Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 1/1 p. 29
  • Eziokwu Bible Emerie Omenala

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eziokwu Bible Emerie Omenala
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Na-akpụ Isi Agbazie Echiche Na-ezighị Ezi
  • Ịṅụrị Ọṅụ Maka ‘Mmeri O So Nwa Atụrụ ahụ Merie’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 1/1 p. 29

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Eziokwu Bible Emerie Omenala

OMENALA okpukpe pụrụ ịgbami mkpọrọgwụ nke ukwuu. Ọtụtụ nde mmadụ na-eche na ọ bụ ihe na-ezighị ezi mmadụ ịgbanwe okpukpe ya. Ihe àmà gosiri na Sọl, onye ghọrọ Pọl onyeozi, chekwara otú ahụ, ebe o kwuru, sị: “Obi m na-anụbigara ozizi ahụ ọkụ ókè karị, bụ́ nke nna m hà nyere anyị n’aka idebe [karị ọtụtụ ndị ọgbọ m].” Ma mgbe e gosiri ya eziokwu ahụ, ọ gbanwere site n’okpukpe ndị Juu gaa n’ịghọ onye Kraịst. (Ndị Galetia 1:13-16) Ọtụtụ ndị taa aghọtawo na eziokwu Bible sitere n’ebe dị elu karịa omenala. Lee otú eziokwu Bible si nwee mmeri n’Itali.

Otu nwanyị na-akọwa, sị: “Mụ na nwanne m nwanyị tolitere n’otu nnukwute ezinụlọ ndị nweworo omenala ndị Katọlik eri ogologo oge, anyị bụkwa ndị ji okpukpe Katọlik kpọrọ ihe nke ukwuu. Ka oge na-aga, alụrụ m di. E mesịa di m wee nwụọ, m nọrọ dị ka nwanyị di ya nwụrụ ruo ọtụtụ afọ nanị mụ na ụmụ m. Nwa nwanne m na-akụzi katekizm, ọ nọgidekwara na-ajụ onye ụkọchukwu ajụjụ ndị sitere na Bible, ma ọ dịghị azịza ndị na-eju afọ o nwetara.

“N’otu mgbe m jere obodo anyị, mụ na Ndịàmà Jehova zutere nke mbụ ya m wee nakwere ọmụmụ Bible. Ndị nile mụ na ha nọbu na Katọlik kwara m emo n’ihi ịmụ Bible. Otú ọ dị, nke a akụdaghị m aka. Na nke mbụ ya, enwere m Bible, ọ dịghịkwa onye gaje ịnapụ m ya. Nwanne m nwanyị werekwara ọnọdụ n’akụkụ nke Jehova, n’ihe na-erughị afọ abụọ anyị abụọ mekwara baptism.

“Akwara m ákwá mgbe mbụ m hapụrụ chọọchị n’ihi na egwu tụrụ m ịgbakụta omenala dị iche iche azụ, bụ́ ndị gbanyeworo mkpọrọgwụ n’ime m ruo 76 afọ. Ma ugbu a, enwere m obi ụtọ ije ije n’ụzọ nile nke Jehova nakwa ime ihe nile m pụrụ ime iji nyere ndị ọzọ aka ịpụta site n’ọchịchịrị ime mmụọ!”—Tụlee 1 Pita 2:9.

Onye Na-akpụ Isi Agbazie Echiche Na-ezighị Ezi

Ọ na-amasịkarị otu onye na-akpụ isi na Japan ikwu okwu banyere ndị mmụọ ọjọọ na ihe ndị na-efe na mbara igwe a na-amaghị ebe ha si bịa, bụ́ UFO, mgbe ọ na-akpụ ndị mmadụ isi. Otú ọ dị, mgbe ọ malitesịrị ịmụ Bible, ọ chọpuṭara otú àgwà nke a si bụrụ ihe ize ndụ. Ya mere kama nke ahụ, ọ na-akpọ ndị bịara na nke ya òkù ka ha sonyere ya n’ọmụmụ Bible. Ọ na-agbara ụmụntakịrị ndị ọ na-akpụ isi àmà banyere okike. Kwa izu, ọ na-arịọ ka Onyeàmà ahụ nke na-eduziri ya ọmụmụ ihe wetara ya ọtụtụ Bible na akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala ka o wee nyefee ha ndị na-abịa ka ọ kpụọ ha isi.

Ọ bụ ezie na ọ bụbeghị Onyeàmà, o tinyere ihe karịrị 30 njikọ nke Bible na akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime afọ mbụ nke ọmụmụ ihe ya. Ihe karịrị 25 mmadụ malitere ịmụ Bible dị ka ihe sitere n’ịgba àmà mberede ya. Mgbe ụfọdụ ihe ruru mmadụ iri na-ekere òkè n’ìgwè ọmụmụ Bible ya. Ugbu a, a gbaziwo echiche na-ezighị ezi nke mmadụ asaa n’ime ndị ahụ ọ na-agbara àmà mgbe ọ na-akpụ ha isi, ha aghọwokwa Ndịàmà Jehova mere baptism!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya