Asụsụ Ahụ Dị Ọcha Ejikọta Oké Ìgwè Ndị Na-efe Ofufe
ASỤSỤ ahụ dị ọcha nke Chineke nyeworo bụ ihe na-eme ka ndị Kraịst dịrị n’otu. Ihe àmà nke ahụ pụtara ìhè nye ndị nile bịara mgbakọ Ndịàmà Jehova nwere na West Berlin site Tuesday ruo Friday, July 24 ruo 27, 1990, ebe ọ bụ na Ndịàmà sitere na 64 mba dị iche iche bịara n’ebe ahụ.
Mgbe e mere Mgbakọ Distrikti “Nsọpụrụ Chineke” na Poland n’oge ọkọchị nke 1989, ọtụtụ puku mmadụ sitere Russia na Czechoslovakia wee bịa, ma ọ bụ nanị narị mmadụ ole na ole si East Germany bịa. Lee nnọọ ka ọnọdụ ụwa siworo gbanwee n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị eri mgbe ahụ! N’oge a, ọnụ ọgụgụ e chere na o ruru 30,000 ndị mmadụ si East Germany sonyeere Ndịàmà n’ámá egwuregwu Olympia Stadium nke dị na West Berlin. Mgbakọ ahụ yiri nnọọ ọtụtụ narị ndị ọzọ e mere n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa, ndị bụkarịrị site na Thursday ruo Sunday.
N’okwu mmeghe nke nnabata ya, onye isi oche kọrọ banyere ọrụ mgbakọ dị iche iche rụworo eri afọ 1919 n’inyere Ndịàmà Jehova aka inwe ọganihu n’ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha. Mgbakọ nke a ga-enyekwara ndị nile bịara ya aka imeziwanye ikike ha nwere ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha nakwa ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya. O chetaara ndị ahụ bịaranụ na site n’ejiji na akparamagwa ha, ndị Jehova na-eme ka ọganihu ha nweworo n’ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha pụta ìhe.
“Asụsụ Dị Ọcha nye Mba Nile”
N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, okwu bụ isi nke mgbakọ ahụ bụ n’isiokwu dị n’elu ebe a. Ọ dabeere na Zefanaịa 3:9, ebe Chineke kwere nkwa, sị: “Mgbe ahụ ka m ga-agbanwere ndị nile dị iche iche egbugbere ọnụ [“asụsụ,” NW] dị ọcha, ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ife ya n’otu ubu.” Asụsụ ahụ dị ọcha gụnyere nghọta ziri ezi na ịmata uru nke eziokwu ahụ banyere Chineke na nzube ya nile. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ inye nke a site ná mmụọ nsọ ya. Ịhụnanya maka eziokwu ahụ aghaghị ịbụ ihe mkpali maka ịmụta asụsụ ahụ dị ọcha, bụ́ nke na-enweghị adịghị ọcha ọ bụla nke omume.
N’ịga n’ihu, ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha abụghị nanị okwu metụtara iji otu usoro okwu na-eme ihe. Kama nke ahụ, ụzọ ndụ anyị aghaghị ikwekọ n’ihe si n’egbugbere ọnu anyị na-apụta. N’eziokwu, ụda olu anyị, ọdịdị ihu anyị, na mmegharị ahụ anyị dịkwa mkpa, n’ihi na ha na-egosipụta ihe anyị bụ n’ime. Iji wee soro asụsụ ahụ dị ọcha nke na-agbasawanye na-aga ụkwụ na ụkwụ, anyị aghaghị inwe usoro ọmụmụ ihe nke a na-agbasochi anya, na-ejechikwa nzukọ ọgbakọ nile anya.
Ịmụta Asụsụ ahụ Dị Ọcha
Dị ka otu okwu e kwuru n’ehihie Tuesday mesiri ike, ịmụta asụsụ ahụ dị ọcha pụtara “Isite n’Ihe Mbụ Nile Garuo Ntozu Okè.” Ito eto dị mkpa ka anyị wee nọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ. Nke ahụ pụtara iji ndokwa nile e mere maka ọganihu ime mmụọ na-eme ihe, na-etinyekwa ụkpụru Bible n’ọrụ kwa ụbọchị.
Iji wee bụrụ ndị maara asụsụ ahụ dị ọcha nke ọma, anyị aghaghị “Ịbụ Ndị Jehova Ziri Ihe,” bụ́ isiokwu nke otu usoro okwu e kwuru n’ụtụtụ Thursday. Onye ọkà okwu nke mbụ gosiri ụzọ nke a si bụrụ ihe “Jisọs Gosiri Ihe Nlereanya Ya.” Eziokwu ahụ nke bụ na Jehova ziri Jisọs ihe pụtara ìhè n’okwu na omume ya nile. Ya mere anyị kwesịrị iṅomi ya n’ụzọ o si zie ihe. Dịkwa ka Jisọs na-edo onwe ya mgbe nile n’okpuru ihe Nna ya na-achọ, anyị aghaghị imekwa otú ahụ.
Ndị ọkà okwu atọ sochirinụ gosiri ụzọ Jehova si na-ezi ihe site ná nzukọ na mgbakọ dị iche iche. Anyị na-erite uru site ná nzukọ ọgbakọ ise nile, anyị ekwesịghịkwa ilefuru nke ọ bụla n’ime ha anya. Nzukọ nke ọ bụla dị oké mkpa maka ọganihu ime mmụọ anyị. Jehova na-ezikwa anyị ihe site ná mgbakọ sekit, mgbakọ distrikti, na usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị anyị na-enwe. Iji rite uru site n’ihe ndị a nile, anyị aghaghị ige ntị nke ọma, tinyekwa ihe anyị mụtara n’ọrụ.
Mgbe usoro okwu nke a gasịrị, a nụrụ okwu ahụ bụ “Iji Ihe Ụfọdụ Chụọ Àjà maka Ọmụmụ Ihe Onwe Onye.” Iji wee wepụta oge maka ya, anyị aghaghị ịgbaso ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Efesọs 5:15, 16 ịzụchapụta oge site n’ihe ndị na-adịchaghị mkpa.
Otu ihe mgbaru ọsọ ezi uche dị na ya nke ọmụmụ anyị na-amụ asụsụ ahụ dị ọcha bụ nraranye na ime baptism. E mere ka eziokwu nke a pụta ìhè n’okwu ahụ bụ “Baptism nke Ndị Ahụ Na-amụ Asụsụ ahụ Dị Ọcha.” Asụsụ nke a na-eduje ọtụtụ ndị n’ịrara onwe ha nye na ime baptism. Otú ọ dị, mgbe nke a gasịrị, mmadụ aghaghị ịnọgide na-agbaso ihe nlereanya Jisọs site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ, na-eyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, na-anọpụkwa iche site n’ụwa.
Nri Ime Mmụọ Siri Ike
Ndị bịara mgbakọ ahụ nwekwara obi ụtọ ịnata nri ime mmụọ siri ike, ndị dabeere ná mmezu nke amụma dị iche iche na-akpali akpali. N’ehihie Thursday, okwu abụọ dabeere n’isiokwu ndị e wetara site n’amụma Ezikiel. Nke mbụ, bụ́ “Ụgbọ Ịnyịnya Eluigwe nke Jehova nke Na-aga n’Ihu,” kọwara otu nnukwute ụgbọ njem eluigwe nke dị ebube, na-akpalikwa egwu, nke na-aga oké ọsọ ọsọ dị ka àmụ̀mà mmiri. O sere onyinyo nzukọ Jehova nke dị n’eluigwe, nke Jehova na-anọkwasị n’elu ya n’echiche nke bụ na o ji ịhụnanya na-achịkwa ihe ọ bụla ọ na-eme, jiri ya na-emezu nzube ya nile. Ezikiel sere onyinyo ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ, karịsịa kemgbe 1919. N’ụzọ pụrụ iche kemgbe 1935, “oké ìgwè mmadụ” ahụ esonyeworo ha.—Mkpughe 7:9.
Okwu sochiri ya nwere isiokwu bụ “Soro Nzukọ ahụ A Na-ahụ Anya Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ.” Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na nzukọ Chineke a na-ahụ anya so nzukọ eluigwe ya ahụ nke yiri ụgbọ ịnyịnya na-aga ụkwụ na ụkwụ. Dị ka Ezikiel mere, ndị ohu Jehova taa aghaghị iji nrubeisi na-arụzu ọrụ amụma ahụ e nyere ha n’agbanyeghị enweghị mmasị, ịkwa emo, ma ọ bụ ọbụna mmegide. Iso ya na-aga ụkwu na ụkwụ na-eduje n’ọtụtụ ngọzi ugbu a nakwa ná ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke nke na-abịa ọsọ ọsọ.
N’ụtụtu Friday, e nyekwara nri ime mmụọ siri ike site n’okwu atọ ndị dabeere n’Aịsaịa isi 28. Nke mbụ n’ime ndị a ji okwu ndị siri ike gosi na ndị na-aṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ ime mmụọ n’Israel na Juda oge ochie sere onyinyo ndị na-aṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ ime mmụọ n’ime Krisendọm. Dịkwa ka ndị nke mbụ ahụ nwetara ikpe ọmụma Jehova, otú ahụkwa ka ndị nke Krisendọm ga-enweta.
Okwu sochiri ya, nke isiokwu ya bụ “Ebe Mgbaba Ha—Okwu Ụgha!,” bu ịdọ aka ná ntị ahụ siri ike nke bụ: Dị nnọọ ka ntụkwasị obi Juda oge ochie tụkwasịrị Ijipt bụ ebe mgbaba na-abaghị uru, otú ahụ ka njikọ Krisendọm so ike ọchịchị ndị nke oge a jikọọ ga-abụkwa. Okwu nke atọ nke dabeere n’Aịsaịa isi 28, bụ́ “Nọgide Na-adọ Aka ná Ntị Banyere Oké Ọrụ nke Jehova,” bụ nke e kwuru kpọmkwem gwa ndị Chineke. N’ụzọ ziri ezi, a kpọrọ ihe Jehova gaje ime Krisendọm oké ọrụ, n’ihi na ọ gaje ịbịakwasị ya na mberede. Taa, Jehova bụ okpueze nke ebube nye ìgwè nta nke ndị Kraịst e tere mmanụ, nyekwa ihe karịrị nde mmadụ anọ ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ. (Jọn 10:16) Onye ọkà okwu ahụ ji okwu na-akpali akpali wee mechie okwu ya, na-asị: ‘Ka ịnụ ọkụ n’obi anyị, mkpebi anyị siri ike, na ịnọgidesi ike anyị kere òkè n’inye Chineke anyị onye pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova, otuto ebighị ebi!’
Ịsụ Asụsụ ahụ Dị Ọcha Pụtara Igosi Ịhụnanya Ụmụnna
N’ehihie Wednesday, e mere ka ọ gbamie mkpọrọgwụ n’uche ndị bịara mgbakọ ahụ na ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha pụtakwara ‘Ileta Ụmụ Mgbei na Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ ná Mkpagbu Ha.’ A pụrụ inyere ụmụntakịrị na-enweghị nna aka site n’inye ha ọzụzụ onwe onye. Anyị pụrụ ilebara ndị inyom di ha nwụrụ anya site n’iji obi ọma gwa ha okwu agbamume, site n’ime ka ha sonye ná ndokwa anyị na-eme maka ịrụ ọrụ ndị Kraịst na nnọkọ ntụrụndụ, sitekwa n’inyere ha aka n’ụzọ ihe onwunwe ma ọ bụrụ na ha kwesịrị inweta nke ahụ, nọrọkwa ná mkpa n’ezie. Ajụjụ ọnụ dị iche iche a jụrụ gosiri ụzọ e siworo na-eme ihe ndị a.
N’ehihie Thursday, okwu ọzọ nke na-akpali obi gosiri “Ụzọ Ndị Kraịst Na-esi Elebara Ibe Ha Anya.” Ndịàmà Jehova bụ ndị a maara nke ọma n’ihi ilebara ibe ha anya, karịsịa mgbe ọdachi ndị dị ka oké ifufe na ala ọma jijiji mere, mgbe ọ dị mkpa idegara ndị isi ọchịchị akwụkwọ, ma ọ bụ mgbe e nwere mkpa n’ógbè dị iche iche. Ma mgbe ihe isi ike bilitere n’ihi ezughị okè nke mmadụ, anyị kwesịrị itinye ụkpụrụ ahụ dị n’okwu ndụmọdụ Jisọs n’ọrụ, nke dị na Matiu 5:23, 24 na 18:15-17. Karịsịa, mgbe a bịara n’okwu metụtara ọrụ n’etiti ụmụnna, ọ dị mkpa inwe nkwanyerịta ùgwù, leziekwa anya ka ma onye were mmadụ n’ọrụ ma onye e were n’ọrụ ghara irigbu ibe ya n’ihi mmekọrịta ime mmụọ dị n’etiti ha.
Ịsụ Asụsụ ahụ Dị Ọcha Pụtara Iche Akparamagwa Anyị Nche
Ọtụtụ ugbo, e mesiri ya ike mkpa ọ dị iche akparamagwa anyị nche. Otú a, onye ọkà okwu mbụ n’ehihie Tuesday kwuru okwu n’isiokwu bụ “Ịnụ ma Na-edebe Okwu Chineke.” O gosiri na e nwere isi ihe abụọ anyị ji na-abịa mgbakọ dị iche iche: ịnara ezi ihe ọmụma na ịbụkwa ndị a kpaliri ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ọmụma ahụ.
Okwu mbụ e kwuru n’ụtụtụ Wednesday jụrụ ajụjụ ahụ na-enyocha obi, bụ́, “Kraịst ‘Kpọrọ Mmebi Iwu Asị’—Ị̀ Kpọrọ Ya Asị?” O zughị ezu nanị ịhụ ezi omume n’anya. Anyị aghaghịkwa ịkpọ mmebi iwu asị ka anyị wee nwee akọ na uche dị ọcha, nọgide na-enwe ezi mmekọrịta n’etiti anyị na Jehova, na-ezere iwetara aha ya nkọcha, na-ezerekwa iweta ihe ubi nke mmebi iwu—mmerụ na ọnwụ.
Okwu na-esochinụ nwere njikọ chiri anya n’ebe okwu ahụ dị, nke isiokwu ya bụ “Na-ajụ Echiche Efu nke Ụwa, Ma Na-agbaso Ihe Ndị Dị Adị n’Ezie nke Alaeze.” Setan, Iv, na ndị mmụọ ozi ahụ dara ada chụsochara echiche efu, bụ́ nke wetaara ha mmerụahụ. Echiche efu nke ụwa, nke ihe mejupụtara ya bụ ịrọ nrọ ihe onwunwe ma ọ bụ ndị metụtara omume ndị na-ezighị ezi, na-arụpụta mmechuihu ma ọ bụrụ na ọ rụpụtaghịkwa ajọ omume. Iji guzogide echiche efu ndị ahụ, anyị aghaghị ịgbaso ihe Alaeze ndị dị adị n’ezie site n’ọmụmụ ihe, ikpe ekpere, ije nzukọ, na ije ozi ihu ọha.
Iji wee na-adị ndụ ndị Kraịst nke guzoziri eguzozi, anyị aghaghịkwa ịṅa ntị na ndụmọdụ ahụ e nyere n’ehihie Wednesday n’okwu ahụ bụ “Ndị Kraịst—Na-ebinụ Ndụ Otú Ego Unu Nwere Hà.” Ịghara ime nke a aghaghị iweta mmerụahụ ma n’anụ ahụ ma n’ime mmụọ. Ụzọ amamihe dị na ya bụ mmadụ ibelata ọchịchọ ọdịmma onwe onye ya site n’ịghara ịbanye n’ụgwọ aghara aghara, sitekwa n’ime atụmatụ mmefu ego nke kwesịrị ekwesị, gbasochiekwa ya anya. Mgbe nile, ọ dị mkpa ka anyị na-ewulite nsọpụru Chineke. Ọ bụrụ na a tụkwasị ya inwe afọ ojuju, nke a na-eweta abamuru dị ukwuu.—1 Timoti 6:6-8.
E mere ka mkpa ọ dị iche mkpakọrịta anyị nche pụta ìhè n’okwu ahụ e kwuru na Tuesday, bụ́ “Ndị Enyi Gị Hà Bụ Ndị Enyi Jehova?” Ndị enyi anyị kwesịrị ịbụ ndị Kraịst ndị yikwasịworo ọdịdị mmadụ yiri nke Kraịst, ndị na-anụkwa ọkụ n’obi n’ọru nkwusa ahụ. Ndị ụwa anyị maara abụghị ndị enyi nke Chineke, anyị apụghịkwa iso ha nwee mkpakọrịta n’ewetaghịrị onwe anyị ihe mmerụ ahụ. Ọbụna n’ime ọgbakọ, anyị aghaghị ime nhọrọ ka mkpakọrịta anyị wee bụrụ ihe na-ewuli elu n’ezie.
E mere ka ịdị mkpa nke okwu ndụmọdụ nke a banyere akparamagwa pụta nnọọ ìhè n’ihe nkiri ahụ dabeere n’ihe na-eme n’oge a. Isiokwu ya bụ “Iguzogide Ụzọ Aghụghọ Nile nke Ekwensu.”
Ndụmọdụ Banyere Asụsụ Dị Ọcha nye Ezinụlọ Dị Iche Iche
Okwu ahụ e kwuru na Wednesday dị nnọọ oké mkpa, bụ́ “Ndị Mụrụ Ụmụ—Rụzuonụ Ọrụ Dịịrị Unu!” Ndị mụrụ ụmụ n’onwe ha aghaghị ịmara ihe bụ uche Chineke, na-emekwa ya ruo ókè ha nwere ike. Ha aghaghịkwa ịkụnye Okwu Chineke n’ime ụmụ ha. Ọzọkwa, o zughị ezu nanị ịkpọrọ ụmụntakịrị jee nzukọ dị iche iche nke ndị Kraịst, jeekwa ozi ubi. A ghaghị ịkụziri ha ịhụ Jehova n’anya na ịhụ ezi amamihe dị n’ime ihe ndị na-egosi nsọpụrụ Chineke.
Ihe ọzọ e nwere bụ otu usoro isiokwu bụ “Ezinụlọ n’Oge Anyị A.” Onye ọkà okwu nke mbụ gosiri na ọ bụ Chineke malitere ndokwa ezinụlọ. Ndị bụ nna aghaghị ịdị na-enwe ezi mkparịta ụka n’ihe ime mmụọ. Ndị bụ nne aghaghị ịbụ ndị na-elekọta ụlọ nke ọma, ụmụntakịrị aghaghịkwa igosi nsọpụrụ nye Jehova site n’ikwenyere ndị mụrụ ha.
Onye ọkà okwu sochirinụ gosiri na ‘Ndị Iro Na-ebuso Ezinụlọ Agha.’ Ihe isi ike akụ na ụba na-eweta ihe isi ike nke ya. Ụlọ ọrụ jupụtara n’ọnwụnwa ime ihe ọjọọ, usoro mgbasa ozi dị iche iche jupụtara n’ime ihe ike, mmekọahụ na-ezighị ezi, na ihe ndọrọ gaa n’ịhụ ihe onwunwe n’anya. A ghaghị ịmalite n’oge inye ọzụzụ, ọ dịkwa mkpa itinye uchu iji wee merie mmetụta nile nke ụwa. A ghaghị iji ngwá ọrụ dị iche iche nke ọchịchị Chineke mee ihe nke ọma, bụ́ ndị Watch Tower Society na-ewepụta.
Okwu sochirinụ, nke lebara anya ná ‘Nchebe Ezinụlọ Banye n’Ime Ụwa Ọhụrụ,’ gara n’ihu ime ka ọ pụtakwuo ìhè bụ́ ibu ọrụ dị mkpa nke ndị mụrụ ụmụ nwere. A ghaghị ịrụsi ọrụ ike nke ukwuu n’ịzụ ụmụntakịrị. E nyere ezi ndụmọdụ n’ihe banyere ọmụmụ Bible ezinụlọ na ihe a ga-amụ, bụ́ nke ha nile bụ ná nzube nke irute n’obi ụmụntakịrị. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ndị mụrụ ụmụ na ụmụntakịrị ha pụrụ inwe olileanya ịbụ ndị e chebere banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ dị ka otu ezinụlọ.
Okwu ahụ bụ “Imeri Ihe Isi Ike nke Ezinụlọ E Kewara Ekewa” nyere ezi ndụmọdụ maka ọnọdụ ezinụlọ nke ọtụtụ Ndịàmà na-achọta onwe ha n’ime ya. E nyere ndị nọ n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ ndụmọdụ ka ọ ghara ịdị mgbe ọ bụla ha ga-akwụsị inwe olileanya na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe pụrụ imesị ghọọ onye kwere ekwe. Soro di ma ọ bụ nwunye gị nke na-ekweghị ekwe na-anọkọ, jidekwa n’aka na ị na-emezu ihe nile a na-atụ anya ya n’aka gị dị ka di ma ọ bụ nwunye bụ onye Kraịst. Ị pụrụ inweta enyemaka site n’aka ndị okenye ma ọ bụ ma eleghị anya site n’aka ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ e kewara ekewa.
Ịgwa Ndị Ọzọ Okwu n’Asụsụ ahụ Dị Ọcha
N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, e lebara anya nke ọma n’ojiji anyị na-eji ohere dị iche iche eme ihe ịkụziri ndị ọzọ asụsụ ahụ dị ọcha. Otú a, n’ụtụtụ Wednesday, ndị bịara mgbakọ ahụ nụrụ okwu ahụ nke isiokwu ya bụ “Jiri Oge Gị Dị Oké Ọnụ Ahịa Mee Ihe n’Ụzọ Amamihe.” Iji mee nke ahụ, anyị aghaghị iguzobe ihe ndị ka ibe ha mkpa, n’ime ihe kwekọrọ na Matiu 6:33, nke na-asị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya.” Nke ahụ gụnyere iwepụta oge maka ọmụmụ Bible onwe onye, ijezu nzukọ nile, na ikerechi òkè anya n’ozi ubi. Nke a chọrọ anyị n’aka ịzụpụta oge site n’ihe ndị na-adịchaghị mkpa, ọ bụ ezie na ha pụrụ ịbụ ihe ndị na-enye obi ụtọ. Ọtụtụ ajụjụ ọnụ a gbara ndị mmadụ gosiri ụzọ ụfọdụ ndị si na-eme nke a.
Anyị ekwesịghị ichefu mgbe ọ bụla na anyị bụ Ndịàmà Jehova. N’ehihie Thursday, ihe ngosi dị iche iche e mere mere ka isi ihe ahụ gbamie mkpọrọgwụ n’uche ndị mmadụ n’okpuru isiokwu ahụ bụ “Nọgide Na-asụ Asụsụ ahụ Dị Ọcha n’Oge Nile.” Ihe ngosi ndị a gosiri ụzọ a pụrụ isi mee nke a n’ịgba àmà okporo ámá, ịgba àmà mberede, sitekwa n’iji telifonu eme ihe. Ịhụnanya anyị na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị n’ebe Jehova Chineke na ndị agbata obi anyị nọ ga-akpali anyị ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha n’ohere ọ bụla dapụtaranụ.
Isiokwu sochirinụ, bụ́ “Ngọzi nke Ndị ahụ Na-adịghị Arịọ Ka A Hapụ Ha,” nwere njikọ chiri anya n’ebe isiokwu nke a dị. Nzukọ Ndịàmà Jehova nke na-ezi ihe gburugburu ụwa guzopụrụ nnọọ iche n’ebe Krisendọm nọ. Dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, anyị aghaghị iguzogide nrụgide nile, dị ka mmegide ndị ọchịchị, enweghị mmasị gbasazuru ebe nile, na ihe isi ike akụ na ụba. Ihe ngosi dị iche iche ndị dabeere n’akwụkwọ ahụ bụ Reasoning From the Scriptures gosiri ụzọ a pụrụ isi merie nrụgide ndị a.
Ihe ọzọ na-agbakwa ume iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ bụ ihe nkiri ahụ dabeere na Bible nke isiokwu ya bụ Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-eme Uche Chineke. O gosiri otú Jihu si nwee ịnụ ọkụ n’obi maka aha Jehova na ụzọ o si dị mkpa ka anyị gosipụta obi ike na ịnụ ọkụ n’obi yiri nke ahụ maka ọrụ Chineke.
Akwụkwọ Ndị E Wepụtara ná Mgbakọ
E nwere akwụkwọ abụọ ndị mara oké mma e wepụtara n’asụsụ Bekee na n’asụsụ German n’oge mgbakọ ahụ. Nke mbụ n’ime akwụkwọ ndị a bụ nke e wepụtara n’oge a na-ekwu okwu ahụ isiokwu ya bụ “Iji Ọbara Azọpụta Ndụ Gị—n’Ụzọ Dị Aṅaa?” Onye ọkà okwu ahụ buru ụzọ kwuo ihe banyere ihe ize ndụ ndị na-esite ná mmịnye ọbara. O mere ka ọ pụta ìhè na e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-abụghị ọbara a pụrụ iji dochie anya ọbara gbapụrụ mmadụ n’ahụ. Ma Ndịàmà Jehova na-ezere ọbara, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ ihe na-eweta nsogbu ahụ ike kama n’ihi na ịnara ya bụ ihe na-adịghị nsọ. Ha na-ezere ya, ọ bụghị n’ihi na ọ pụrụ ịbụ na ọbara abụwo nke e metọrọ, kama n’ihi na ọ bụ ihe dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. Ọbara nke na-azọpụta ndụ n’ezie bụ ọbara mgbapụta ahụ nke Jisọs Kraịst. Ná mmechi, onye ọkà okwu ahụ mere ka ndị na-ege ya ntị nwee obi ụtọ site n’igosi ha akwụkwọ nta ahụ nwere 32 peji, bụ́ How Can Blood Save Your Life?
Akwụkwọ nke abụọ bara uru e wepụtara bụ nke e jikọtara ya na okwu ahụ bụ “Chọọnụ Jehova.” N’ozuzu, ndị mmadụ adịghị achọ Chineke. Ịdị adị nke ọtụtụ okpukpe dị iche iche na-egosi otú ọchịchọ mmadụ na-achọ Chineke siworo bụrụ nke e duhiere ụzọ n’ihi na o lefuruwo Okwu Chineke anya. Dị ka a na-ahụta site n’akụkọ Ememe Ncheta anyị kwa afọ, ọ dị mkpa ka e nyere ọtụtụ nde mmadụ aka iwere ọnọdụ ha n’akụkụ nke Jehova. Aịsaịa 55:6, 7 na-egosi na Jehova bụ n’ezie Chineke ịhụnanya nke nwere obi ebere, onye dị njikere ‘ịgbaghara mmehie n’ụba.’ Dị ka Ndịàmà ya, e nyewo anyị asụsụ ahụ dị ọcha ka anyị wee nwee ike inyere ndị ọzọ aka isonyere anyị n’ijere Jehova ozi n’otu ubu.
Taa, ndị Jehova na-eche ihe ịma aka ihu n’ihi nkwagharị nke ndị mmadụ na-akwagharị n’ìgwè. N’ihi nke a, a pụrụ inwe ndị na-ekpe ụdị okpukpe nile n’ókèala anyị. Ka anyị wee nwee ike inyere ndị Hindu, ndị okpukpe Buddha, ndị okpukpe Shinto, na ndị nọ n’ọtụtụ okpukpe ọtụtụ ndị ọzọ aka, Society ebipụtawo ọmarịcha akwụkwọ nwere 384 peji, bụ́ Mankind’s Search for God. O wepụtara n’ụzọ doro anya ozizi ndị bụ isi nke okpukpe ndị bụ isi na-abụghị ndị nke Krisendọm. Ma o mekwara ka ọ pụta ìhè ebe okpukpe ụgha nke dị n’ime Krisendọm si bịa. Akwụkwọ nke a pụrụ imeghe ụzọ ịmalitere ndị nọ n’ọtụtụ okpukpe dị iche iche ọmụmụ Bible.
Okwu Ihu Ọha na Okwu Mmechi
“Bụrụnụ Ndị Dị n’Otu Site n’Asụsụ ahụ Dị Ọcha” bụ isiokwu nke okwu ihu ọha ahụ e kwuru na Friday. Onye ọkà okwu gosiri na ọ bụ ezie na puku asụsụ atọ nọ ugbu a dị ka ihe ndị na-egbochi ịdị n’otu, asụsụ ahụ dị ọcha bụ ihe siri ike nke na-eme ka a dị n’otu. O chebewo Ndịàmà Jehova megide mmehie ihe nile nke Babilọn, ọ kụziworo ha ịsọpụrụ ịdị nsọ nke ndụ na ọbara, o nyewokwara ha aka ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, nke na-ewetakwara ha abamuru n’ụzọ ime mmụọ na n’anụ ahụ. Ọ dị mkpa ka mmadụ nile nwee nchegbu banyere ịmụta na ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha, n’ihi na ọ bụ nanị ndị na-eme otú ahụ ga-adị ndụ gabiga Amagedọn. E nweghị oge ọ bụla a ga-egbu n’ịgbaso ndụmọdụ ahụ dị na Zefanaịa 2:1-3.
Mgbe a natasịrị ezi ndụmọdụ ndị dabeere n’Akwụkwọ nsọ banyere mkpa ọ dị ‘Ịmụrụ Anya Ka Anyị Wee Na-ekpe Ekpere,’ a nụrụ okwu mmechi nke dabeere n’isiokwu ahụ bụ “Ije Ije n’Asụsụ ahụ Dị Ọcha.” Ọnụ ọgụgụ ndị na-eje ije ugbu a n’ụzọ kwekọrọ n’asụsụ ahụ dị ọcha na-amụbawanye n’ezie. Ndị bịara mgbakọ ndị a gosikwara nsọpụrụ nye asụsụ ahụ dị ọcha site n’ịdị ọcha ha, ịdị n’usoro, na ime ihe n’ụzọ a haziri ahazi. Akwụkwọ ọhụrụ ndị ahụ e wepụtara ga-enyere Ndịàmà Jehova nile aka ịgbasa asụsụ ahụ dị ọcha n’ụzọ dị irè karị.
Onye ikpeazụ kwuru okwu ná mgbakọ ahụ chetaara mmadụ nile mkpa ọ dị inwe ntachi obi. O gosiri na dị ka ihe si ná mgbakọ nke a pụta, mmadụ nile kwesịrị iwusiwanye mkpebi ha ike ịnọgide na-aga n’ihu. Mgbe ahụ, o mechiri okwu ya site n’ịsị: “Ka anyị nọgide na-eje ije n’ụzọ kwekọrọ n’asụsụ ahụ dị ọcha nke Chineke nyeworo ka anyị wee wetara Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova Chineke, otuto ugbu a, ruokwa mgbe nile ebighị ebi!”
Igbe dị na peeji nke 26]
Ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwere ná mgbakọ ahụ e mere na West Berlin bụ 44,532, e mekwara 1,018 mmadụ baptism. O were ndị ahụ gaje ime baptism minit 19 ịkwụ n’ahịrị pụọ n’Olympia Stadium, n’oge ahụkwa a nọgidere na-akụ aka. E nwere akụkụ pụrụ iche maka ndị bịaranụ, bụ́ ndị na-asụ asụsụ Bekee. Ihe dị ka 6,000 n’ime ndị a nụrụ usoro ihe omume ahụ dum n’asụsụ nke ha. Ná mgbakọ nke a, e nwekwara 4,500 ndị si Poland bịa; n’oge ehihie abụọ, ndị so n’Otu Na-achị Isi kwuru okwu ndị dị mkpirikpi maka abamuru nke ha.
[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]
1. Olympia Stadium, West Berlin
2. Usoro ihe omume mgbakọ nke e biri ebi
3. Narị bọs abụọ butere ndị mmadụ site na East Germany
4. Ndị bịara mgbakọ site na Poland nwere obi ụtọ ịnata akwụkwọ ndị ahụ e wepụtara
5. Iji okooko osisi chọọ ihe mma mere ka ebe ahụ makwuo mma
6. A. D. Schroeder, otu n’ime ndị so n’Òtù Na-achị Isi so n’usoro ihe omume ahụ e mere na West Berlin