Ochịchọ Ihe A Kpọrọ Mmadụ Na-achọ Chineke
N’IHI gịnị ka e jiworo nye anyị ‘asụsụ ahụ dị ọcha’ dị ka Ndịàmà Jehova? O doro anya na ọ bụghị ka anyị debere ya nanị onwe anyị. Ọ bụghịkwa ka anyị nwee ike ibi ndụ ntụsara ahụ nke yiri ụzọ ndụ dị nro nke Krisendọm, bụ́ nke na-anakwere ihe nile. Kama nke ahụ, ọ bụ ka ‘mmadụ nile, nwee ike ịkpọku aha Jehova, na-ejekwara ya ozi n’otu ubu.’ (Zefanaịa 3:9) Ee, asụsụ ahụ dị ọcha metụtara iso ọtụtụ nde ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ ndị Kraịst na-arụkọ ọrụ—ndị sitere n’agbụrụ nile, mba nile, na asụsụ nile—ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ekwusa ozi ọma ahụ tupu ọgwụgwụ ihe nile eruo.—Mak 13:10; Ndị Rom 13:11; Mkpughe 14:6, 7.
Mgbe ụfọdụ, ọrụ nkwusa anyị n’oge a na-eweta ihe ịma aka ndị pụrụ iche. Gịnị kpatara nke ahụ? N’ime narị afọ nke 20 nke a, e nwewo oké nkwagharị nke ndị mmadụ n’ihi agha, mkpagbu, ihe isi ike nke akụ na ụba, na ihe ndị ọzọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, ndị nọkwa n’okpukpe dị iche akwagawo n’ebe e nwere omenala ndị dị iche na nke ha. Otú a, e nwewo òtù buru ibu nke ndị Hindu, ndị okpukpe Buddha, na ndị Alakụba ndị kwagaworo n’akụkụ Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ka anyị nọ na-ekesa asụsụ ahụ dị ọcha site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị na-ezute ndị a. Mgbe ụfọdụ, anyị na-enwe ihe mgbochi n’ihi na anyị maara nanị ihe dị nnọọ nta banyere nzụlite ha n’ụzọ okpukpe. Gịnị ka anyị pụrụ ime banyere ya?—Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 2:5-11.
Olee otú anyị pụrụ isi soro onye Alakụba ma ọ bụ onye Juu kerịta eziokwu ahụ? Gịnị bụ ọdịiche dị n’etiti ha? Gịnị ka onye Hindu kwere na ya n’ezie? N’ihi gịnị ka ndị okpukpe Sikh na-eji eke ihe n’isi? Gịnị bụ akwụkwọ nsọ ha? Olee otú onye okpukpe Buddha si dị iche n’onye Hindu? Gịnị ka ndị okpukpe Shinto nke Japan kwenyere? Ndị okpukpe Tao nke China ma ọ bụ ndị okpukpe Confucius hà kwenyere na Chineke?a Olee ụzọ onye Juu nke Orthodox si dị iche n’onye Juu nke Reform ma ọ bụ onye Juu nke Conservative? Iji wee rute ndị dị iche iche n’ụzọ dị ukwuu otú a, anyị aghaghị ibu ụzọ ghọta ụzọ ha si ele ihe anya, wee mata ụzọ anyị ga-esi duzie ha site n’obi ọma na n’ụzọ akọ gaa n’ebe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, nọ.—Ọrụ 17:22, 23; 1 Ndị Kọrint 9:19-23; Ndị Kọlọsi 4:6.
Iji nyere anyị aka inwe nghọta doro anya karị banyere okpukpe ndị ọzọ, ozizi ha, na akụkọ ihe mere eme banyere ha, Watch Tower Society wepụtara akwụkwọ ọhụrụ nke aha ya bụ Mankind’s Search for God ná Mgbakọ ‘Asụsụ Dị Ọcha’ ndị e mere gburugburu ụwa na 1990. N’ịbụ ndị e ji ngwá ọrụ nke a kwadebe, anyị ga-enwe ike ịgwa ndị na-abụghị ndị Kristian okwu nke ọma karị, tinyekwara ndị ọzọ nọ na Krisendọm.
Ngwá Ọrụ nke A Pụrụ Iji Mee Ihe
Akwụkwọ nke a nke nwere 384 peji nwere 16 isiakwụkwọ ndị na-akọ banyere ọchịchọ ihe a kpọrọ mmadụ chọworo Chineke n’ime puku afọ isii gaworo aga. Ọ na-aza ọtụtụ narị ajụjụ banyere okpukpe ndị e nwere n’ụwa. Nke a bụ ihe atụ nke ụfọdụ n’ime ha: Olee ihe ndị na-ekpebikarị ihe ga-abụ okpukpe mmadụ? N’ihi gịnị ka ọ na-abụghị ihe ọjọọ inyocha okpukpe ndị ọzọ? Olee myirịta ndị dị n’etiti okpukpe Roman Katọlik na okpukpe Buddha? Ọnọdụ dị aṅaa ka akụkọ ifo nwere n’ọtụtụ okpukpe? N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji kwere na majik, mgbaasị, na ịgụ kpakpando? N’ihi gịnị ka ndị Hindu ji nwee ọtụtụ chi nwoke na chi nwanyị? Olee ụzọ ndị Sikh si dị iche n’ebe ndị Hindu nọ? Ònye bụ Buddha, gịnịkwa ka ọ kụziri? N’ihi gịnị ka okpukpe Shinto ji bụrụ okpukpe ndị Japan n’ụzọ bụ isi? N’ihi gịnị ka ndị Juu ji nwee iwu nke okwu ọnụ efu, nweekwa nke e dere ede? Olee ụzọ anyị si mara na Kraịst abụghị nanị ihe dị n’akụkọ ifo? Olee ụzọ Koran si dị iche na Bible? N’ihi gịnị ka ndị Katọlik ji sị na Pita bụ popu mbụ? N’ihi gịnị ka onye ụkọchukwu Katọlik bụ Luther ji kewapụ onwe ya site na Chọọchị Roman Katọlik?
O yiri ka ajụjụ ndị ahụ adịghị agwụ agwụ, akwụkwọ nke a nwezukwara azịza ha ka anyị wee nwee ike ịdịkwu irè n’ikwusara ndị nọ n’ọtụtụ okpukpe ndị a dị iche iche ozi ọma. Akwụkwọ ahụ na-anakwere eziokwu ahụ nke bụ na ọtụtụ ndị nwere okpukpe nke aka ha, na okpukpe bụkwa okwu dịịrị mmadụ n’onwe ya. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, na peji 8, o kwuru, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ site na mgbe a mụrụ anyị, ndị mụrụ anyị na ndị ikwu anyị na-akụnye n’ime uche anyị echiche ndị metụtara okpukpe na omume ọma. N’ihi nke a, anyị na-agbasokarị echiche okpukpe nke ndị mụrụ anyị ma ọ bụ ndị mụrụ ndị mụrụ anyị.” Nke ahụ pụtara na “n’ọtụtụ ọnọdụ, ndị ọzọ ahọpụtaworo anyị okpukpe nke anyị ga-ekpe. Ọ bụwo nnọọ okwu metụtara ebe a mụrụ anyị na mgbe a mụrụ anyị.”—Tụlee Ndị Filipaị 3:4-6.
Mgbe ahụ, akwụkwọ ahụ na-ewelite ajụjụ ahụ ezi uche dị n’ime ya, bụ́: “Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya iche na okpukpe nke a mụnyere mmadụ n’ime ya bụ n’ezie eziokwu ahụ dum?” Otú a, a na-agba mmadụ nile ume iji uche ghere oghe nyochaa okpukpe ndị ọzọ. Dị ka e kwuru ya na peji 10: “Ịghọta ụzọ mmadụ ndị ọzọ si ele ihe anya pụrụ iduje ná mkparịta ụka bara uru karị n’etiti ndị sitere n’okpukpe dị iche iche.” Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “N’eziokwu, ụmụ mmadụ pụrụ inwe nghọtahie siri ike n’ihe banyere ihe ndị okpukpe ha kwere na ha, ma e nweghị ihe ndabere ọ bụla maka ịkpọ mmadụ asị nanị n’ihi na onye ahụ na-ele ihe anya n’ụzọ dị iche.”—Matiu 5:43, 44.
Otu ajụjụ bụ isi nke na-ebilite n’ime akwụkwọ ahụ dum bụ, Mmadụ ò nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-anọgide na-adị ndụ mgbe onye ahụ nwụsịrị, ma gaa na-adị ndụ n’ebe ọzọ? N’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile na-akụzi echiche ahụ. Dị ka akwụkwọ ahụ bụ Mankind’s Search for God kwuru (peji 52): “N’ọchịchọ ọ na-achọ Chineke, mmadụ ejigidewo ụmụ irighiri ihe aka, na-abụ onye echiche nke anwụghị anwụ rafuru. . . . Ikwere ná mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ ma ọ bụ n’ụdị dị iche iche nke ozizi ahụ bụ ihe si n’aka fere n’aka nke ruteworo anyị aka site n’ọtụtụ puku afọ gaworo aga.” Ajụjụ ndị ọzọ bụ: È nwere ebe dị ka hell, ebe a na-ata mkpụrụ obi ahụhụ? Gịnị bụ olileanya bụ ezie nke ndị nwụrụ anwụ? È nwere otu Chineke, ka è nwere ọtụtụ chi dị iche iche?—Jenesis 2:7; Ezikiel 18:4.
Ihe Ndabere maka Ọmụmụ Bible
N’ịbụ nke a haziri ịgbaso ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnọdụ ha n’ọgụgụ oge n’ihe banyere oge ha pụtara n’ụwa, akwụkwọ ahụ tụlere mbilite nke okpukpe ndị bụ isi nke ihe a kpọrọ mmadụ—okpukpe Hindu, okpukpe Buddha, okpukpe Tao, Okpukpe Confucius, okpukpe Shinto, okpukpe ndị Juu, Iso Ụzọ Kraịst, Krisendọm, na Alakụba. N’isiakwụkwọ nke ọ bụla, e hotara okwu sitere n’akwụkwọ nsọ nke okpukpe ndị a ka onye ọ bụla kwere ekwe nke nwere obi eziokwu nwee ike ịchọta ebe ndị ahụ e si hota okwu n’onwe ya. Maka isiakwụkwọ ahụ nke metụtara okpukpe Alakụba, e ji nsụgharị asụsụ Bekee atọ dị iche iche nke Koran mee ihe. E hotara okwu site ná nsụgharị kasị ọhụrụ nke ndị òtù Jewish Publication Society nke Tanakh—A New Translation of the Holy Scriptures n’isiakwụkwọ ahụ metụtara okpukpe ndị Juu.—Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 17:28; Taịtọs 1:12.
Gịnị dị n’ime akwụkwọ ahụ maka onye na-ekweghị na Chineke na onye na-amaghị ma è nwere Chineke dịnụ? Isi nke 14 na-atụle ekwenyeghị na Chineke nke dị n’oge a na ihe mere Ndịàmà Jehova ji mara na Chineke dị adị. N’isiakwụkwọ nke ọ bụla, a na-adọrọ uche onye na-agụ akwụkwọ ahụ gaa na Bible. Otú a, n’iji akwụkwọ nke a, bụ́ Mankind’s Search for God mee ihe, anyị ga-abụ ndị a kwadebere nke ọma karị ịmalitere ndị nwere okpukpe ọ bụla ma ọ bụ ndị na-anọghị n’okpukpe ọ bụla ọmụmụ Bible. O ji nkwanye ùgwù na akọ tụlee okpukpe nke ọ bụla, ma ọ na-ewelite ajụjụ ndị pụrụ iduru mmadụ gaa n’ebe Jehova na eziokwu ahụ dị. Nye ndị ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi na-achọ Chineke, akwụkwọ nke a ga-abụ ihe ngọzi n’ezie.—Abụ Ọma 83:18; Jọn 8:31, 32; 2 Timoti 3:16, 17.
E tinyere igbe izi ihe ndị na-enye ihe ọmụma n’isiakwụkwọ nke ọ bụla. Dị ka ihe atụ, na peji 226 na 227, e nwere igbe nke isiokwu ya bụ “Okpukpe Ndị Juu—Okpukpe nke Nwere Ọtụtụ Olu” nke na-akọwa nkewa ndị bụ isi dị n’okpukpe ndị Juu. N’okpuru isiokwu bụ “Okpukpe Hindu—Ọchịchọ A Na-achọ Ntọhapụ,” e nwere igbe dị na peji 116 na 117, bụ́ “Okpukpe Hindu—Ụfọdụ Chi Nwoke na Chi Nwanyị.” Nke a depụtara nanị ole na ole n’ime ihe karịrị 330 nde chi dị iche iche ndị okpukpe Hindu na-efe. Ndị okpukpe Buddha hà kwenyere na Chineke dị ka ndị Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa si ghọta okwu ahụ? Igbe ahụ isiokwu ya bụ “Okpukpe Buddha na Chineke” nke dị na peji 145 na-aza ajụjụ ahụ. Akwụkwọ ahụ nwekwara ihe ndepụta ntụaka bara uru maka iji chọta isiokwu ndị bụ isi ngwa ngwa. Ndekọ nke akwụkwọ ndị bụ isi e hotara mgbe a na-eme nnyocha bụkwa ihe ndabere maka ịgụkwu ihe ma ọ bụrụ na mmadụ achọọ inwetakwu ihe ọmụma.
Akwụkwọ ahụ nwere ihe karịrị 200 foto na ihe osise dị iche iche, ma ọ bụghị nanị iji chọọ akwụkwọ ahụ mma ka ha dị n’ebe ahụ. Ihe osise nke ọ bụla nwere isi ihe ọ na-achọ iwepụta iji zie ihe, nke na-eme ka a ghọtakwuo okpukpe nke a na-atụle. Dị ka ihe atụ, na peji 238, e nwere foto dị iche iche ndị na-akọwa ụfọdụ n’ime ilu ndị ahụ Jisọs kụziri. N’ebe ọzọ, e nwere usoro nke foto ise ndị na-akọwakwa akụkụ dị iche iche nke ije ozi Kraịst—ọrụ ebube ya, mwogha ya, ọnwụ ọchụchụ àjà ya, na onyinye o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ikwusa ozi ọma n’elu ụwa dum.
Na peji 289, e nwere usoro foto dị iche iche ndị ga-amasị ndị Alakụba. Ọ na-eduru onye na-ekiri ya banye na Mecca, banyekwa ná nnukwute ụlọ okpukpe ndị Alakụba ahụ ebe Kaaba ahụ dị, banyekwa kpọmkwem n’ebe nkume ojii ahụ ndị Alakụba na-enye oké nsọpụrụ dị. E mere ihe atụ nke ofufe dị iche iche nke okpukpe ndị Buddha na peji 157. Ndị Hindu ga-enwe mmasị ịhụ foto nke chi ndị ahụ na-amasịkarị ha, bụ́ Ganesa na Krishna na peji 96 na 117.
E jekwuuru ndị ozi bụ ndị Kraịst ruru eru gburugburu ụwa iji tụlee nke ọ bụla n’ime okpukpe ndị bụ isi n’ụzọ doro anya. Dị ka ihe atụ, e si Israel nweta ihe ndị bara uru maka isiakwụkwọ ndị ahụ metụtara okpukpe ndị Juu na okpukpe Bahaʼi. Ndịàmà ndị bi ná mba ndị Alakụba ji nlezianya mee nchọpụta iji kwadoo na ihe ndị ahụ e dere n’isiokwu metụtara okpukpe Alakụba ziri ezi. E nwetara ihe ọmụma bara uru site n’India n’ihe banyere ndị Hindu, ndị Sikh, na ndị okpukpe Jain. Ndị ozi ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa jidere n’aka na isiakwụkwọ nke ahụ metụtara okpukpe Shinto ziri ezi, ha tụkwara aro n’ihe banyere okpukpe Buddha, okpukpe Tao, na okpukpe Confucius.
N’ihi ntụle akwụkwọ ahụ ji nlezianya tụlee okpukpe nke ọ bụla, ndị nwere ya n’asụsụ ha ga-enwe ike ịmalite ọmụmụ Bible n’isiakwụkwọ ndị kwekọrọ n’okpukpe nke onye ọ bụla. E mesịa, ha pụrụ ịga n’isiakwụkwọ nke metụtara mbilite nke Iso Ụzọ Kraịst oge mbụ na ihe ndị mere a ga-eji kwere na Kraịst bụ ezi Onye Nnọchianya Chineke na onye e jiri mee ihe ịdọrọ ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’ebe Chineke nọ. E nwere isiakwụkwọ ndị kọwara otú isi n’ezi ofufe dapụ si malite, bụ́ nke kpatara ọtụtụ nkewa na ịrọ òtù dị iche iche nke Krisendọm. Isiakwụkwọ abụọ ndị ikpeazụ gosiri otú e siworo weghachite ezi ofufe n’oge ikpeazụ ndị a na ihe ọdịnihu na-adịghị anya nwere maka Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha Setan. Mgbe nke ahụ gasịrị, e mere ka ụwa ọhụrụ ahụ na olileanya mbilite n’ọnwụ nke Bible na-enye pụta ìhè.—Jọn 5:28, 29; 12:44-46; 14:6; Mkpughe 21:1-4.
Nke a bụ n’ezie akwụkwọ nke kwesịrị inyere ọtụtụ ndị gburugburu ụwa aka ịbịa Chineke nso, dị ka Jemes kwuru ya n’isi nke 4 nke akwụkwọ ozi ya, amaokwu 8, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso. Meenụ ka aka unu dị ọcha, unu ndị mmehie; meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị nwere uche abụọ.” Ee, dị ka Aịsaịa kwuru: “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta ya, kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso.”—Aịsaịa 55:6; Jọn 6:44, 65.
Ka anyị nile nọgide na-abụ ndị e mere ka ha chee ihu n’ebe kwesịrị ekwesị, n’ebe Eze Onyenwe eluigwe na ala, bụ́ Jehova Chineke, nọ. Sitekwa n’enyemaka nke akwụkwọ nke a, bụ́ Mankind’s Search for God, ka anyị nyere ọtụtụ puku ndị ọzọ aka ife Jehova “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:23, 24) Ka anyị nọgidesie ike n’ịchọta ndị na-achọ eziokwu ma gwa ha okwu banyere Chineke nke eziokwu, n’ihi na n’ezie, a pụrụ ịchọta ya!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Otú e si akpọpụta “Onye Tao” bụ onye dow; nke ụda ya kwekọrọ n’okwu Bekee bụ now.
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Mmadụ achọwo Chineke n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche
[Foto]
Ndị Katọlik nwere obi eziokwu na-echigharịkwuru Meri
[Foto]
Ndị Hindu na-efe osimiri Ganges ofufe
[Ebe E Si Nweta Foto]
Harry Burdich, Transglobe Agency, Hamburg
[Foto]
Ụfọdụ ndị Juu ji okpukpe kpọrọ ihe na-eke ihe okike phylactery
[Ebe E Si Nweta Foto]
GPO, Jerusalem
[Foto]
Ndị Alakụba na-aga njem okpukpe na Mecca
[Ebe E Si Nweta Foto]
Camerapix
[Foto]
Ọtụtụ ndị na-efe Buddha ofufe
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Jisọs ji ilu dị iche iche nyere ụmụ mmadụ aka ịchọta ezi Chineke ahụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.