Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/1 p. 26-29
  • Ịgụzi Ihe Ịkwalaga ná Mba nke Bara Ọgaranya Ga-ewe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgụzi Ihe Ịkwalaga ná Mba nke Bara Ọgaranya Ga-ewe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ọnọdụ Dị n’Ezie Banyere Ndụ A Na-ebi ná Mba Ọzọ
  • Nrụgide Ndị Metụtara Omume
  • Ndị Mụrụ Ụmụ Ndị Na-anọghị Ya
  • Inwe Obi Ike n’Ihe Ndị Chineke Na-enye
  • M̀ Kwesịrị Ibi ná Mba Ọzọ?
    Teta!—2000
  • ‘Inye Ezinụlọ Mmadụ Ihe Na-akpa Ha’—Izute Ihe Ịma Aka Ya n’Ala Ndị Na-emepe Emepe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma Mgbe M Nọ ná Mba Ọzọ?
    Teta!—2000
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ezinụlọ Anyị Dara Ogbenye?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/1 p. 26-29

Ịgụzi Ihe Ịkwalaga ná Mba nke Bara Ọgaranya Ga-ewe

ỌBỤ ọnọdụ a ma ama n’ụlọ ọrụ nnọchianya mba dị iche iche ndị dị n’akụkụ ụwa ebe ka na-emepe emepe: ụlọ nchere nke jupụtara n’ụmụ mmadụ ndị ahụ na-erughị ala ka ha na-echere ajụjụ ọnụ a ga-agba ha. N’ịdabere ná mkparịta ụka ahụ dị mkpirikpi ma dị oké mkpa, a ga-ekpebi ma hà nwere ike inweta akwụkwọ njem visa ha ga-eji jee mba nke mepeworo emepe n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ọtụtụ ndị chere na nke a ga-abụ mkpịsị ugodi nke ga-eduba ha n’inwe ihe ịga nke ọma. Otu nwa okoro onye sitere n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa kwuru, sị, “Anọwo m na-arụsi ọrụ ike ruo afọ anọ, enwebeghịkwa m ike ịzụta redio. A sị na m bi n’England ma ọ bụ na United States, agaara m enweworị moto na ebe obibi nke aka m ugbu a.”

Ọ bụghị ihe siri ike ịghọta ihe mere na ọtụtụ ndị bi ná mba ndị dara ogbenye, ndị ka na-emepe emepe, ji nwee echiche ndị dị otú ahụ. O siiri ha ike ịchọta ọrụ, ụgwọ a na-akwụ dịkwa ala. Ihe ịda oké ọnụ ahịa na-erikpọkwa ego ndị ha chebeworo. Ụlọ obibi dị ụkọ, jubigakwa ókè ná mmadụ, ndị mmadụ na-eyi uwe nke ndị bi ná mba ndị bara ọgaranya karị yifọrọ eyifọ. Ọtụtụ ndị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị ọnọdụ akụ na ụba na-adịghị mma jibidoro.

Leekwa nnọọ ka Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa nke bara ọgaranya si na-akpọ ndị mmadụ òkù! Otu nwa okorobịa bi na Sierra Leone kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị agawo ná mba ndị ọzọ ma lọghachi na-akọrọ anyị akụkọ ndị na-eme ka obi sie anyị ike ịga wee hụ mba ndị ahụ mepeworo emepe n’onwe anyị. Ha na-ekwu na ọ ga-adị mkpa ka ị rụsie ọrụ ike, kama na ị ga-enweta ego dị mma iji nwee ike ịkwado onwe gị, ọbụna nweta ihe ntụsara ahụ ụfọdụ, dị ka moto. Ọ bụrụkwa na i jiri ihe dị ka puku dollar abụọ lọghachi, ị pụrụ ịmalite ahịa, lụọkwa nwunye.”

Ọ bụghị ihe ịtụnanya ịhụ na ụfọdụ n’ime ndị ohu Chineke na-echekwa echiche otú ahụ. Otu nwanna nwanyị onye Africa kwuru, sị: “Anyị bụ ndị na-eto eto ndị nọ ná nzukọ Chineke na-anụ mkparịta ụka banyere otú ndị ọzọ si na-eme nke ọma, bụ́ ndị gaworo ná mba ndị ọzọ. Ya mere mgbe ụfọdụ ana m ajụ onwe m, sị, ‘Gịnị banyere m? N’ihi gịnị ka m ji na-ata ahụhụ n’ebe a? M̀ kwesịrị ije ka m̀ kwesịrị ịnọdụ?’”

Ọ bụrụ na i bi ná mba nke dara ogbenye, ị pụkwara iche echiche n’ụzọ dị otú ahụ ma ịkwapụ jee n’ebe ọzọ ọ̀ ga-emeziwanye ọnọdụ ndụ gị. Otú ọ dị, ịkwaga ná mba ọzọ abụghị obere ihe, ọ bụ nzọụkwụ nke na-efu oké ego, nke e kwesịkwara iji nlezianya mee. Ọ pụrụ imetụta ịmụ asụsụ ọhụrụ, ịmụta ọrụ ọhụrụ, ịhazigharị ihe iji kwekọọ n’ọdịbendị ndị ọhụrụ, ịnagide ịkpọasị nke ọtụtụ ndị na-egosi ndị mba ọzọ, na ịmụta ụzọ ndụ dịwaga nnọọ ọhụrụ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị Kraịst enwewo ihe ịga nke ọma n’ime nke ahụ, wee bụrụ ezi ihe enyemaka nye ọgbakọ ndị dị ná mba ọhụrụ ha bi na ha, na-abụ ezi ihe nlereanya n’ije ozi dị ka ndị nkwusa, ndị ọsụ ụzọ, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi.

Ma otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile nweworo ihe ịga nke ọma. Nrụgide na ihe isi ike nile dị n’ịkwafe ná mba ọzọ akpataworo ụfọdụ ndị ndakpọ ime mmụọ. Ya mere, o doro anya na e kwesịghị ime nkwali dị otú ahụ n’ebughị ụzọ jiri ekpere chesie echiche ike. Bible nyere ndụmọdụ n’Ilu 3:5, 6, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.” Ee, i kwesịrị ijide n’aka na ị na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Jehova. (Jemes 4:13-15) Jisọs tụkwara aro bara uru nke ga-enyere gị aka ime nke a mgbe ọ gbara ndị na-ege ya ntị ume ka ha ‘gụkọọ ihe ọ ga-ewe.’ (Luk 14:28) Nke a metụtara ihe karịrị ịtụle ihe banyere ego. Ọ pụtara icheba echiche n’ihe ọ pụrụ iwe n’ụzọ ime mmụọ iji kwafee ná mba ọzọ.

Otú Ọnọdụ Dị n’Ezie Banyere Ndụ A Na-ebi ná Mba Ọzọ

Tupu ị kwapụ jee n’ebe ọzọ, i kwesịrị inwe nghọta ziri ezi nke bụkwa eziokwu bayere ihe ị ga-atụ anya ya mgbe i ruru n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na o kwe mee, buru ụzọ jerugodi n’ebe ahụ iji hụ otú ọnọdụ dị n’ebe ahụ. Ma ọ bụghị otú ahụ, ị ga-adabere n’akụkọ onye ọzọ kọọrọ gị. Bible dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ije ụkwụ ya.”—Ilu 14:15.

Ụfọdụ ndị enwetawo ihe nile ha maara banyere ndụ ná mba dị iche iche nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa site n’ihe nkiri sinima na nke telivishọn. Otú a, ha na-ekwere na onye ọ bụla bi n’ebe ahụ bara ọgaranya, na-agba moto ọhụrụ, biri n’ụlọ mara mma. Ma ihe mere eme n’ezie adịghị otú ahụ. Ọtụtụ mba ndị bara ọgaranya nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu nke ịda ogbenye, enweghị ebe obibi, na enweghị ọrụ. Ọtụtụ n’ime ndị kasịkwa daa ogbenye ná ndị bi ebe ahụ bụ ndị kwabatara ọhụrụ. Otu onye nnọchianya na-arụ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ nnọchianya mba U.S. dị n’otu mba dara ogbenye kọwara, sị: “Ụmụ mmadụ adịghị aghọta n’ezie otú o si bụrụ ihe siri ike ịnọru ebe mmadụ ga-amalite inwe ihe ịga nke ọma n’America. Ụfọdụ ndị na-esi ebe ahụ na-edelata akwụkwọ ozi na-akọ otú ha si na-enwe ihe ịga nke ọma—otú ha siworo zụọ moto abụọ na ụlọ—ma n’eziokwu, ha na-adọlịgbu onwe ha.”

Ọnọdụ dịkwa otú ahụ n’ebe ndị ọzọ. Mazị Sahr Sorie bụ onye nkụzi bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, onye biworo, ma gụọkwa akwụkwọ na London. O kwuru, sị: “Ọ dịghị mfe isi n’Africa kwapụ jee biri n’England. Ọtụtụ ndị mere nkwafe dị otú ahụ na-ebi ndụ ogbenye. Ị na-ahụ akara nke ihe isi ike n’ihu ha. Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịchọta 20 pence ha ga-eji kpọọ telifon. Ọtụtụ mgbe, ha na ọtụtụ ndị ọzọ na-ebikọ n’otu ọnụ ụlọ, nke nwere nanị obere ihe na-enye okpomọkụ nke ga-eme ka ahụ na-ekpotụ ha ọkụ n’ime ụlọ. Ha na-enwe ike inweta nanị ọrụ ndị a na-adịghị akwụ oké ụgwọ na ha, ọbụna mgbe ha nwetara ọrụ dị otú ahụ, ego ha na-enweta adịghị ezu iji kwụọ ụgwọ ndị ha ji. Ọtụtụ mgbe, ndị ahụ na-ahapụ Africa iji zere ịda ogbenye na-ahụ na ọnọdụ ha na-adị njọ karị mgbe ha na-ebi n’ógbè mkpọmkpọ ụlọ dị iche iche nke Europe.”

Ọ pụrụ ịdị mfe ka ihe nrụgide nke na-eso mmadụ ịkwụrụ n’ụkwụ ya ná mba ọhụrụ kpagbuo ndụ ime mmụọ mmadụ. (Matiu 13:22) N’eziokwu, Bible jara ịrụsi ọrụ ike mma. (Ilu 10:4; 13:4) Ma ọtụtụ ndị na-akwalaga ná mba ndị ọzọ na-abụ ndị a manyere ịdị na-arụ ọrụ abụọ ma ọ bụ atọ ka ha wee kpata ego otú ha chọrọ—ma ọ bụ nanị iji nweta ihe ga-ezuru ha. A na-ahapụrụ ha nanị oge dị nta ma ọ bụrụ na o nwere nke fọdụụrụ ha iji chụsoo ofufe Chineke. A na-elefuru nzukọ dị iche iche nke ndị Kraịst anya, ọmụmụ Bible, na iso ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu Bible ahụ. Okwu ahụ Jisọs kwuru na-aghọ eziokwu n’ụzọ dị mwute: “Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na akụ.”—Matiu 6:24.

Nrụgide Ndị Metụtara Omume

I kwesịkwara icheba echiche n’ọnọdụ omume nke mba ọhụrụ ahụ ị na-achọ ije na ya. Bible na-agwa anyị na Lọt họọrọ ibi na Gburugburu ala nile nke Jọdan. N’ile ya anya n’ụzọ metụtara ihe onwunwe, mkpebi ahụ yiri nke amamihe dị na ya, n’ihi na “ala ahụ nile bụ ala mmiri na-ede nke ọma, . . . dị ka ubi Jehova a gbara ogige.” (Jenesis 13:10) Otú ọ dị, ndị agbata obi ọhụrụ nke Lọt bụ “ndị mmehie megide Jehova nke ukwuu”—ndị na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ! (Jenesis 13:13) N’ihi nke a, “onye ezi omume ahụ, ebe ọ na-ebi n’etiti ha, o weere ọrụ ha nke na-emebi iwu mekpaa mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ kwa ụbọchị, n’ile ihe na ịnụ ihe.”—2 Pita 2:8.

N’otu aka ahụkwa taa, ịkwafe n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa pụrụ ikpughe gị na ezinụlọ gị nye nrụgide na ọnwụnwa ndị metụtara omume, ndị siri ike karịa ka ọ dị ná mba nke aka gị. Tụkwasị na nke a, ọ pụrụ ịbụ na a dịghị enye ndị agadi nsọpụrụ dị ka a na-enye ha n’obodo gị. Ọ pụrụ ịbụ na a dịghị agba ụmụntakịrị ume ịsọpụrụ ndị mụrụ ha. Ọ pụrụ ịbụ na ndị agbata obi adịghị enwe oké mmasị n’ihe metụtara ndị ọzọ. Olee ụzọ ihe nrụgide ndị dị otú a pụrụ isi metụta gị na ezinụlọ gị? Nke a bụ ihe e kwesịrị iji ekpere chebara echiche.

Ndị Mụrụ Ụmụ Ndị Na-anọghị Ya

Ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ ahọrọwo ịhapụ ezinụlọ ha ma jee mba ọzọ nanị ha. Atụmatụ ha na-eme bụ izi ozi ka ezinụlọ ha bịa ozugbo ụkwụ siri ha ike n’ala n’ebe ọhụrụ ahụ ma ọ bụkwanụ iji nnukwute ego wee lọghachi. Amamihe ọ̀ dị ná ndokwa dị otú ahụ?

Akwụkwọ nsọ mere ka ọ bụrụ ibu ọrụ nke ndị mụrụ ụmụ ilekọta mkpa anụ ahụ nke ezinụlọ ha, n’ọnọdụ ụfọdụ pụrụ iche, ọ pụkwara ịbụ na ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ nne ma ọ bụ nna pụrụ ime ma e wezụga ije rụọ ọrụ ná mba ọzọ iji nye nlekọta dị otú ahụ. (1 Timoti 5:8) Ma, e mekwara ka ọ bụrụ ibu ọrụ nke ndị mụrụ ụmụ ilekọta mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ha. Okwu Chineke na-asị: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW].”—Ndị Efesọs 6:4.

Onye bụ nna ọ̀ pụrụ ime nke a n’ụzọ dị irè ma ọ bụrụ na ọ na-ahapụ ezinụlọ ya ruo ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọtụtụ afọ n’otu oge? O yighị ka ọ̀ pụrụ ime nke ahụ. Ya mere, ị ghaghị ịtụle ma uru ihe onwunwe ọ bụla e nwetara ọ̀ ga-eru eru iji chụọ àjà maka mmetụta ọnụnọ ị na-anọghị ya pụrụ inwe n’ahụ ụmụ gị. E wezụgakwa nke a, ndị na-akwaga ná mba ọzọ na-achọpụtakarị na ọ dịghị adị mfe ma ọlị “igbu ego mma” dị ka ha chere. Ọ bụrụ na onye ahụ na-akwafe ná mba ọzọ enweghị ike ịkwụ ụgwọ ụgbọ ezinụlọ ya ga-eji gafeta, nkewa ahụ pụrụ ịnọgide ruo ọtụtụ afọ. Nke a pụkwara ịkpata ihe ize ndụ ndị siri ike n’ihe banyere omume. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 7:1-5.) Ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ ndị nọ n’ọnọdụ ọnwụnwa dị otú ahụ adabawo n’ịkwa iko.

Inwe Obi Ike n’Ihe Ndị Chineke Na-enye

Ka ọnọdụ akụ na ụba nke ụwa na-adakpọ na-aga n’ihu, ọ dị mma icheta na ndị ohu Chineke ekwesịghị ịtụ egwu na a ga-agbakụta ha azụ. Jisọs kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu, sị, Gịnị ka anyị ga-eri? ma ọ bụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ? ma ọ bụ, Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị? N’ihi na ihe ndị a nile ka ndị mba ọzọ na-achọ; n’ihi na Nna unu nke eluigwe na-amata na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—Matiu 6:31-33.

Ndịàmà Jehova n’oge a na-eje ozi maka ọdịmma nke Alaeze Chineke site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) N’ọtụtụ mba ndị dara ogbenye, e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. E nwere mkpa karịsịa maka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi tozuru okè. Kama ije ná mba ihe na-agara nke ọma n’ụzọ akụ na ụba ebe mkpa e nwere na-adịghị ukwuu hie nne, ọtụtụ ndị ahọrọwo ịnọgide ná mba nke aka ha dị iche iche. Olee otú ihe siworo gaara ụfọdụ n’ime ndị dị otú ahụ?

Alethia, bụ́ onye sitere n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa nke rụworo ọrụ n’ije ozi oge nile ruo 30 afọ ná mba nke aka ya kwuru nke a: “Enwere m ohere ibi ná mba ọzọ. Ihe mere na ejeghị m bụ na ọ masịrị m nke ukwuu mụ na ndị nke m na ndị ikwu m ịnọ. Ọ na-enye m obi ụtọ inyere ha aka ịmụta eziokwu ahụ ka anyị nile wee nwee ike ifekọ Jehova ọnụ. Ọ dịbeghị ihe ọ bụla gafenahụrụ m site n’ịnọ n’ebe a, ọ dịghịkwa ihe m na-akwa ụta n’ihi ya.”

N’otu aka ahụ, Winifred bikwa n’otu mba dị n’Africa. Ọnọdụ ndụ a na-adị n’ebe ahụ dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke e kwuru na ọ bụ otu n’ime ndị kasị dịrị ala n’ụwa. Ma mgbe ọ nọsịworo 42 afọ n’ije ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ, ọ sịrị: “Ọ naghị adị mfe mgbe nile ịgbalị ịdị ndụ n’okpuru ọnọdụ akụ na ụba na-adịchaghị mma. Setan na-anwa ime ka ihe sie ike, ma Jehova enyezuwo m ihe nile m chọrọ, lekọtakwa mkpa m nile.”

N’oge ochie, Abraham ‘kwezuru na ihe nile [Chineke] kwererịị ná nkwa, ọ pụrụ imekwa ha.’ (Ndị Rom 4:21) Ì kwezuru n’otu aka ahụ na Jehova pụrụ imezu nkwa ya, lekọtakwa gị ma ọ bụrụ na i debe ọdịmma Alaeze n’ọkwá mbụ ná ndụ gị? Ì kwenyere n’ihe ahụ onye ọbụ abụ dere, bụ́: “Iwu ọnụ [Chineke] dị m mma karịa ọlaedo na ọlaọcha na-adịghị ịgụta ọnụ”? (Abụ Ọma 119:72) Ka ọ̀ pụrụ ịbụ na ọ dị mkpa ka i tinye ndụmọdụ Pọl onyeozi ahụ n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu karị? Na 1 Timoti 6:8 o dere, sị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.” Ọ̀ pụrụ ịbụ na ihe amamihe dị na ya ime abụghị ịchọ gburugburu ebe ọhụrụ a ga-ebi, kama ime ihe nile ị pụrụ ime n’ebe i bi ugbu a?

Ọnọdụ akụ na ụba dị n’ọtụtụ mba dị iche iche pụrụ ịkpatara ndị Kraịst oké ihe isi ike. Otú a, ọ bụrụ na, mgbe a tụlesịrị ihe nile o metụtara, ezinụlọ ekpebie ịkwaga mba ọzọ, ọ dịghị mkpa ka ndị ọzọ malite ịkatọ ha. (Ndị Galetia 6:5) Ndị ahụ na-akwapụghị pụrụ ịnọgide na-arịọ enyemaka Jehova n’ịnagide ihe isi ike nile nke usoro ihe nke a na-eweta, ka ha nọ na-aṅụrị ọṅụ ná ngọzi ime mmụọ ndị Chineke na-enye ha. Cheta na n’oge na-adịghị anya, a ga-edozi ikpe na-ezighị ezi na ajọ ihe dị iche iche nke ụwa nke a n’okpuru Alaeze Chineke. Mgbe ahụ, ọ ga-abụ dị ka onye ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ị [Jehova] na-asaghe aka gị, ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.”—Abụ Ọma 145:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya