Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/15 p. 26-27
  • “Ụbọchị Onyenwe Anyị”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ụbọchị Onyenwe Anyị”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Jisọs Kraịst Bụ Onyenwe Anyị”—N’ụzọ Dị Aṅaa, Olè Mgbe Kwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Jọn Hụrụ Jisọs ahụ E Meworo Ka Ọ Dị Ebube
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/15 p. 26-27

“Ụbọchị Onyenwe Anyị”

“E MERE ka m nọọ n’ime mmụọ nsọ n’ụbọchị Onyenwe anyị.” (Mkpughe 1:10) Otú ahụ ka Jọn onyeozi ahụ meworo agadi kwuru, bụ́ onye e sere ihe osise ya n’elu ebe a, n’isiakwụkwọ nke mbụ nke akwụkwọ Bible ahụ bụ Mkpughe. Okwu ya na-enyere anyị aka ịmata oge mmezu nke ọhụụ ndị ahụ dị ebube ọ gara n’ihu ịkọwa.

Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile kweere n’ụzọ nke a e si sụgharịa Mkpughe 1:10. Dị ka ihe atụ, onye nsụgharị Bible ahụ bụ onye Germany, bụ́ Jörg Zink dere ya n’ụzọ dị otú a: “Ejupụtara m ná mmụọ nsọ—ọ bụ n’ụbọchị Sunday.” Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná nsụgharị Bible dị iche iche sụgharịrị ahịrị okwu Grik ahụ bụ teiʹ ky·ri·a·keiʹ he·meʹrai dị ka “ụbọchị Onyenwe anyị.” Ma ná nkọwa ala ala peji, ọtụtụ na-ekwu na ọ na-ezo aka n’ụbọchị Sunday. Nke a ò ziri ezi?

Akwụkwọ ahụ e dere n’asụsụ German bụ Herders Bibelkommentar, bụ́ akwụkwọ ihe ọmụma ndị Katọlik, kọwara ihe kpatara e ji nwee echiche nke a mgbe ọ sịrị: “N’ebe a, [ná Mkpughe 1:10], a na-ezo aka, ọ bụghị n’Ụbọchị Ikpe Ikpeazụ ahụ, bụ́ nke a makwaara dị ka ‘Ụbọchị Onyenwe anyị’, kama ọ bụ n’otu ụbọchị kpọmkwem n’ime izu. Ndị Kraịst oge mbụ malitere ime ememe ụbọchị mbụ n’izu dị ka ụbọchị bụ isi ha na-eji ekpe chọọchị laarị azụ ruo n’etiti narị afọ nke mbụ. (Ọrụ 20:7; 1 Kọr. 16:2)” Otú ọ dị, akụkụ akwụkwọ nsọ abụọ ahụ a kpọtụrụ uche n’akwụkwọ ihe ọmụma ahụ adịghị ụzọ ọ bụla ha si na-akwado echiche ahụ nke bụ na ndị Kraịst nke narị afọ mbụ lere ụbọchị mbụ n’izu anya dị ka “ụbọchị bụ isi ha na-ekpe chọọchị.”

Nanị ihe akụkụ akwụkwọ nsọ nke mbụ ahụ, bụ́ Ọrụ Ndị Ozi 20:7, mere bụ idekọ na Pọl, ndị ya na ha so na njem, na ndị Kraịst si Troas zukọtara n’ụbọchị mbụ n’izu maka iri nri. Ebe ọ bụ na Pọl gaje ịhapụ ebe ahụ n’echi ya, ọ gajeghịkwa ịhụ ha ọzọ ruo ogologo oge ụfọdụ, o jiri ohere ahụ mee ihe ịgwa ha ogologo okwu.

Akụkụ akwụkwọ nsọ nke abụọ, bụ́ 1 Ndị Kọrint 16:2, gbara ndị Kraịst nọ na Kọrint ume ka ha wepụta ego “kwa ụbọchị mbụ n’izu ụbọchị asaa” ka ha wee nwee ihe ha ga-atụnye iji nyere ndị ahụ nọ ná mkpa na Judia aka. Onye ọkà mmụta bụ Adolf Deissmann na-atụ aro na ọ pụrụ ịbụworị na nke a bụ ụbọchị a na-akwụ ndị ọrụ ụgwọ. Otú o sina dị, aro Pọl tụrụ bụ ihe kwere omume, ebe ọ bụ na ego pụrụ ịgwụnarị mmadụ n’ime izu ahụ.

Ọ dịghị ebe ọ bụla n’ime Bible e kwuru na ndị Kraịst biri n’oge ndị ozi ahụ lere ụbọchị mbụ nke izu anya, bụ́ nke a na-akpọzi Sunday ugbu a, dị ka ụbọchị izu ike nke ndị Kraịst, bụ́ ụbọchị e wepụrụ iche maka nzukọ ofufe ha na-enwe mgbe mgbe. Ọ bụ nanị mgbe ndị ozi ahụ nwụsịrị ka a malitere ile Sunday anya n’ụzọ dị otú a, e wee malitekwa ịkpọ ya “ụbọchị Onyenwe anyị.” Nke a bụ otu akụkụ n’ime ndapụ n’ezi ofufe ahụ nke Jisọs na ndị ozi ahụ n’onwe ha buru amụma ya.—Matiu 13:36-43; Ọrụ 20:29, 30; 1 Jọn 2:18.

Ya mere, gịnị bụ “ụbọchị Onyenwe anyị”? Amaokwu ndị gbara Mkpughe 1:10 gburugburu na-ezo aka n’ebe Jisọs nọ dị ka Onyenwe anyị onye ọ bụ ụbọchị ya. Okwu Chineke na-ejikọ okwu ndị dị ka “ụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst” na oge ikpe ihe a kpọrọ mmadụ ikpe nakwa maka iweghachite Paradaịs.—1 Ndị Kọrint 1:8; 15:24-26; Ndị Filipaị 1:6, 10; 2:16.

N’ihi nke a, Hans Bruns, ná nsụgharị ya nke nwere nkọwa, bụ́ Das Neue Testament (Agba Ọhụrụ) ziri ezi mgbe ọ sịrị: “Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ [Jọn] na-ekwu okwu ebe a banyere Sunday, ma o yikarịsịrị ka ọ̀ na-ezo aka n’Ụbọchị Onyenwe anyị ahụ dị ebube, bụ́ nke nkọwa ndị ọzọ nile o mesịrị nye metụtara.” W.E. Vine na-asị: “‘Ụbọchị Onyenwe anyị’ . . . bụ Ụbọchị nke ikpe Ya pụtara ìhè n’elu ụwa.” Akwụkwọ Lexikon zur Bibel (Akwụkwọ Ọkọwa Okwu nke Bible) nke Fritz Rienecker na-ekwu na o doro anya na “ụbọchị Onyenwe anyị” na-ezo aka n’ebe “ụbọchị ikpe” ahụ dị.

Nghọta ziri ezi nke okwu ahụ bụ “ụbọchị Onyenwe anyị” na-enyere anyị aka ịghọta akwụkwọ Mkpughe dum. Karịsịa, ihe àmà dịnụ na-egosi na ụbọchị ahụ amaliteworị. Ya mere, lee ka o si dị mkpa ka anyị ‘nụrụ okwu nile nke amụma dị ná Mkpughe, debekwa ihe nile e dere n’ime ya’!—Mkpughe 1:3, 19.

[Foto dị na peeji nke 27]

E nyere nkọwa doro anya nke kwekọkwara n’oge a nke amaokwu ọ bụla dị n’akwụkwọ Mkpughe n’akwụkwọ ahụ bụ “Revelation—Its Grand Climax At Hand!” A pụrụ inweta ọmarịcha akwụkwọ nke a na-enye aka ịmụ Bible na 33 asụsụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya