Imempụ n’Ime Ụwa nke Nọ n’Ọgba Aghara
IMEMPỤ abụghị ihe ọhụrụ. Ogbugbu ọchụ mbụ e gburu weere ọnọdụ ọtụtụ puku afọ gara aga mgbe Ken gburu nwanne ya nwoke bụ Ebel. E hotakwara idina mmadụ n’ike na idina ụdị onwe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru oge ochie. (Jenesis 4:8; 19:4, 5; 34:1-4) Ndị omekome nọ na-awakwasị ndị mmadụ n’ime narị afọ mbụ nke Oge Anyị, dị ka ihe atụ nke onye Sameria ọma ahụ na-egosi. (Luk 10:29-37) Ma e nwere ọdịiche dị taa.
Echiche ụmụ mmadụ na-enwe n’ọtụtụ obodo ukwu ndị bụ isi dị n’ụwa, ma ọ̀ bụ na New York, London, Calcutta, ma ọ bụ Bogotá, bụ na imempụ jupụtaziri ebe nile karị, na-eyikwa egwu karị. Otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ India Today, nke nwere isiokwu bụ “Oké Nsọpụrụ A Na-enye Ịkpata Ọgba Aghara” na-asị: “Otu ihe omume ọhụrụ nke na-eyi egwu ịdọwasị ihe nkekọ ahụ na-esighị ike nke jikọtara mba nke a bụ mbuli e buliworo ime ihe ike, ịkpa àgwà isi ike nke ndị a na-azụghị azụ, na mmebi iwu gaa n’ịbụ ihe a na-enye oké nsọpụrụ.” N’ọgụ ha na-alụso imempụ, ọbụna na a na-anwa ndị uwe ojii mgbe ụfọdụ ịgabiga ihe ịkpa ókè nile nke nchebe iwu wee jiri usoro imempụ na-eme ihe n’onwe ha. Akụkọ mbụ ahụ si India na-asị: “Ọnwụ ndị ndị uwe ojii ji eji na-anwụ nọgidere na-abụ ihe akụkọ.” Nke ahụ bụkwa eziokwu ná mba ndị ọzọ.
Ohere mmadụ nwere ịbụ onye imempụ metụtara yiri ka ọ̀ na-ehiwanye nne. Otu akụkọ si United States na-ekwu na “imempụ nke ime ihe ike ma ọ bụ izu ohi metụtara otu n’ime ezinụlọ ndị America anọ ọ bụla na 1988.” Tụkwasị na nke ahụ, ndị mmadụ na-emezi mpụ nke ime ihe ike n’afọ ndụ dị ala karị. Magazin Latin-America ahụ bụ Visión kwuru na “itoolu n’ime ndị sicarios [ndị ogbu mmadụ e goro ego] iri ọ bụla bụ ụmụntakịrị. [Ha bụ] ‘ụmụntakịrị’ n’echiche nke bụ na ha ka dị nta, bụrụkwa ndị iwu na-echebe.” Ọzọkwa, imempụ ime ihe ike nke ụmụntakịrị bụ ihe zuru ụwa ọnụ.
Bible buru amụma n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga, sị: “Ma mara nke a, na oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, . . . ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu . . . Ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ, na-eduhie ndị ọzọ, a na-eduhiekwa ha.”—2 Timoti 3:1-4, 13.
Kemgbe 1914, e nwere ihe àmà ndị na-egosi na anyị anọwo na-ebi n’ime mgbe ikpeazụ ahụ dị oké egwu. Ebe ọ taworo ahụhụ agha ụwa abụọ na mburịta agha ndị ọzọ bụ isi, ụwa aghọwo n’ọtụtụ ụzọ, ebe a na-apụghị ịchị achị, ebe nọ n’ọgba aghara. Imempụ jupụtara ebe nile. N’akụkụ obodo ukwu dị iche iche, ndị omempụ ewegharawo ike, na-agbanwe ụzọ ndụ nke ihe ka n’ọtụtụ, bụ́ ndị na-edebe iwu. Dị ka otu onye a ma ama nke so n’ụlọ nzukọ senate nke mba U.S. kwuru: “E nwere ọtụtụ ihe mmadụ ga-echegburu onwe ya ugbu a, ihe ndị a anyị na-adịghị atụbu egwu ha. Mgbe ụfọdụ, anyị na-anọ n’egwu nke ukwuu nke na anyị na-aghọ ndị mkpọrọ, ebe ndị ahụ e kwesịrị ịkpọchi akpọchi nọ na-akpagharịrị onwe ha.”
N’ihi nke a, ụmụ mmadụ taa na-eme ihe iji chebe onwe ha, bụ́ ihe ndị na-adịghị mkpa 20 ma ọ bụ 30 afọ gara aga. Ọnụ ụzọ dị iche iche na-enwe ebe abụọ ma ọ bụ ebe atọ a na-akpọchi ha, a na-ejikwa ihe ígwè mee ka ha siwanye ike. N’ọtụtụ ebe, ndị mmadụ na-eji ego zuru ezu iji mejụọ obi nke onye mwakwasị n’olileanya nke izere ịbụ onye e tiri ihe n’ihi na ọ dịghị ihe o ji ọ ga-enye ndị ohi. Ọ na-afọ nke nta ka ọ bụrụ na ọtụtụ okporo ụzọ na-atọgbọ chakoo ozugbo anyanwụ dasịrị, ọ na-abụkwa nanị ndị na-amaghị ihe na-aga, ndị leziri anya na-achọ ihe ga-eme ha, na ndị ọnọdụ manyere ịpụta apụta na-anọ n’èzí—o wee na-adị mfe ha ịdaba n’aka ndị ndọgbu na-awagharị n’ime obodo.
Gịnị ka anyị pụrụ ime iji zere ịbụ ndị imempụ metụtara n’ime ụwa nke a nọ n’ọgba aghara, nke na-enweghịkwa nchịkwata? Olee ụzọ anyị pụrụ isi nagide ihe na-emenụ?