Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 5/1 p. 24
  • Jehova Na-enye Ntọhapụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Na-enye Ntọhapụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka So n’Ozi Anyị Na-ejere Jehova
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Mgbe Mmiri Na-ekweghị Izo
    Teta!—1999
  • Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka
    Ihe Ndị E Ji Onyinye I Nyere Eme
  • Iso Ụzọ Kraịst Nọ n’Ọrụ n’Etiti Oké Ọgba Aghara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 5/1 p. 24

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Jehova Na-enye Ntọhapụ

N’OGE na-adịghị anya gara aga, Ndịàmà Jehova nọ na South Africa natara ozi banyere ọnọdụ ihe isi ike nke ụmụnna ime mmụọ ha ndị bi n’otu mba dị nso ebe ahụ, ebe a machibidoro ọrụ nkwusa ha iwu. A kọọrọ ha na n’ihi oké ụkọ mmiri ozuzo e nwere, na ụmụnna ha na-adị ndụ site n’iri ụdị mkpọrọgwụ osisi ụfọdụ. Ha enweghịkwa uwe oyiyi kwesịrị ekwesị, bụ́ nke mere ka ụfọdụ Ndịàmà na-ala azụ n’ikere òkè n’ije ozi ubi.

Ozugbo ahụ, ụmụnna ndị nọ na South Africa mere ihe. E zipụrụ ọkpụkpọ òkù n’ọgbakọ dị iche iche ndị dị n’ógbè Johannesburg banyere mkpa e nwere maka uwe oyiyi. N’ime ụbọchị ole na ole, a tụtawo tọn uwe atọ. Mgbe ahụ, ndị ọrụ afọ ofufo haziri uwe ndị ahụ. E mere ndokwa izije tọn 3 nke àgwà, 1 tọn mmanụ, 1 tọn nchà, na tọn 17 nke nri ọka. Mgbe ụlọ ọrụ a zụtara nri ọka ahụ n’aka ha nụrụ banyere ọnọdụ Ndịàmà ahụ nọ na ya ná mba ahụ nwere ụkọ mmiri ozuzo, ha tụnyere ihe karịrị otu tọn nke nri nke a dị oké mkpa n’efu.

Na Monday, April 16, 1990, otu ụgbọ obu ngwongwo nke bu 25 tọn ihe onyinye hapụrụ South Africa n’ogologo njem ya nke dị 5,500 kilomita. Ma ugbu a, ọ dị mkpa ịnata ikike site n’aka ndị ọchịchị ka e nwee ike iburu ngwongwo ndị ahụ gafee ala ha nke agha dọkasịworo.

Ndị ọrụ nọ n’ụlọ nnọchianya mba ahụ kwuru na ọ bụ ezie na iwu akwadoghị Ndịàmà Jehova ná mba ha, na ha maara nke ọma na ha nọ n’ebe ahụ. E nweghị ihe mgbochi ọ bụla dị n’izijere ụmụnna anyị ihe onyinye. E nyere ha ikike ahụ. E nyere ha akwụkwọ ndị dị mkpa, na Friday, April 20, Ndịàmà ahụ gafekwara ókèala n’enweghị nsogbu ọ bụla. N’agbanyeghị nke ahụ, ha zutere ihe karịrị 30 ebe dị iche iche a na-eche nche okporo ụzọ, bụ́ ebe a gwara ha mgbe mgbe ka ha gosi akwụkwọ ha. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ha maara otú akwụkwọ ndị ahụ dịruru ná mkpa.

Mgbe ha gaworo njem ihe dị ka 140 kilomita n’ime mba ahụ, e gbochiri ọganihu ha n’ihi otu nnukwute osimiri nke nọ ná ntoju. E bibiwo àkwà mmiri mbụ dị n’elu ya, obere àkwà mmiri a rụrụ ọhụrụ nke e ji dochie anya ya agaghị ebulikwa nnukwute moto ahụ. Otú ọ dị, ha chọpụtara na obere moto nke so na-aga njem ahụ pụrụ ịgafe àkwà ahụ nke mmiri tochiworo n’enweghị ihe ize ndụ ọ bụla. E kpebiri ikewa gaa n’ìgwè abụọ. E mere ka otu ìgwè nọdụ n’akụkụ osimiri ahụ tojuru etoju, ebe ìgwè nke ọzọ gara n’ihu na njem ha izute ụmụnna ahụ n’ihe dị ka 260 kilomita ná mgbago mgbago ebe ugwu. Lee nnọọ ka ha si nwee obi ụtọ na ha mesịrị jekwute ụmụnna ndị ahụ! Ha apụghị ịkwụsị imumu ọnụ ọchị, ịmakụ onwe ha na ikwe n’aka. N’oge na-adịghị anya, moto abụọ nke ndị ebe ahụ nọ n’ụzọ ije zute ìgwè ụmụnna ndị nke ọzọ ahụ na-echere n’akụkụ osimiri ahụ. N’ebe ahụ, e bufere ihe onyinye ndị ahụ site na moto nke ukwu ahụ gaa na moto abụọ ndị obere ahụ.

Akụkọ a natara na-egosi na e nwere ekele dị omimi maka nzite Jehova zitere ihe onyinye ndị a. Ma, n’agbanyeghị ọnọdụ ha nke anụ ahụ, agụụ ụmụnna ahụ nwere maka nri ime mmụọ dị ukwuu ọbụna karị. Otu ọgbakọ nwere ike inweta nanị otu Ụlọ Nche, bụ́ nke a na-edepụtagharị maka ezinụlọ nke ọ bụla. Ekele dịrị Jehova na e mewo ndokwa ugbu a ịdị na-enweta nri ime mmụọ mgbe mgbe nye ụmụnna ndị nọ ná mba ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya