Ndị Na-aṅụbiga Mmanya Ókè n’Ụzọ Ime Mmụọ—Olee Ndị Ha Bụ?
“Ahụhụ ga-adịrị okpueze mpako nke ndị Efraim na-aṅụbiga mmanya ókè.”—AỊSAỊA 28:1.
1. Olileanya ezi ihe dị aṅaa ka ọtụtụ ndị nweworo, ma à gaje imezu olileanya ha?
ANYỊ na-ebi n’oge ndị na-akpali akpali. Ọtụtụ ndị na-enwe oké mkpali n’ihi oké mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị e nweworo gburugburu ụwa nakwa n’ịhụ ntinye aka ka ukwuu òtù United Nations na-etinye n’ihe a na-eme. Na December 1989, akwụkwọ akụkọ Detroit Free Press kwuru, sị: “Ka mbara ala anyị bụ ụwa na-abanye n’afọ ndị 1990, udo etiwapụwo.” Otu magazin ndị Soviet mara ọkwa, sị: “Anyị na-akwadebe ịkpụgharị mma agha ka ha bụrụ mma ogè,” ebe odeakwụkwọ ukwu nke òtù United Nations kwuru, sị: “Anyị anọghịzi n’oge agha nzuzo ahụ.” Ee, e nwewo olileanya ndị dị elu, ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghịkwa ya na ọnọdụ ụwa na-agbanwe. N’oge ndị na-adịbeghị anya, agha ahụ e nwere n’ógbè Gulf emewo ihe atụ nke otú mgbanwe pụrụ isi bịa ngwa ngwa. Ma, ọ̀ dị mgbe ọ bụla ụwa nke dị ugbu a ga-enweta oge nke udo na ịnọ ná ntụkwasị obi n’ezie, gụnyere abamuru nile na-eso ya abịa? Azịza ya bụ ee e. N’ezie, oké ọdachi na-akwado itiwapụ, bụ́ nke ga-eme ka ụwa mee mkpatụ ruo na ntọala ya nile! Ọ bụ oké ọdachi nke metụtara okpukpe n’ụzọ dị ukwuu.
2. Olee otú ọnọdụ e nwere n’oge a si yie nke dịrị n’Israel na Juda oge ochie?
2 Ọdachi nke a bụ nke ihe ndị mere n’Israel na Juda oge ochie n’ime narị afọ nke asatọ na nke asaa T.O.A. sere onyinyo ya. Laa azụ n’oge ahụ, ndị mmadụ chekwara na ọ pụrụ ịbụ na ha enwetawo udo. Ma Chineke, site n’ọnụ onye amụma ya bụ Aịsaịa, dọrọ ha aka ná ntị na olileanya ha inweta udo bụ ihe nrafu, nke a ga-ekpughe n’oge na-adịghị anya. N’ụzọ yiri nke ahụ taa, Jehova, site n’ọnụ Ndịàmà ya, na-adọ ihe a kpọrọ mmadụ aka ná ntị na ọ bụ nrafu ka a na-arafu ha ma ọ bụrụ na ha enwee olileanya inweta udo na-adịgide adịgide site ná mgbalị nke ụmụ mmadụ. Ka anyị gụọ ịdọ aka ná ntị amụma nke Jehova wee hụ otú o si metụta oge anyị a. A na-achọta ya n’isi nke 28 nke Aịsaịa, e dekwara ya tupu afọ 740 T.O.A., nke o yiri ka ọ̀ bụ n’oge ọchịchị Eze obi ọjọọ ahụ bụ Peka nke Israel na Eze Ehaz na-enupụ isi nke Juda.
“Ndị Efraim Na-aṅụbiga Mmanya Ókè”
3. Okwu nkatọ dị oké ike dị aṅaa ka Aịsaịa kwuru?
3 N’amaokwu 1 nke isi 28, e mere ka anyị kụja site n’otu okwu na-akpali akpali, bụ: “Ahụhụ ga-adịrị okpueze mpako nke ndị Efraim na-aṅụbiga mmanya ókè, ahụhụ ga-adịkwara okooko ọhịa na-akpọnwụ akpọnwụ nke ịma mma ya mara mma, nke dị n’isi nke ndagwurugwu dị uru nke ndị mmanya vine na-egbu!” Lee nnọọ ka ọ ga-esiworị nwụọ ndị Israel ibubo n’ahụ ịnụ okwu nkatọ ahụ siri ike! Òle ndị bụ “ndị Efraim na-aṅụbiga mmanya ókè”? Gịnị bụ “okpueze mpako” ha? Gịnịkwa bụ ‘isi nke ndagwurugwu dị uru’? Nke ka mkpa, gịnị ka okwu ndị a pụtara nye anyị taa?
4. (a) Gịnị bụ Efraim na isi nke ndagwurugwu ahụ dị uru? (b) N’ihi gịnị ka Israel ji nwee mmetụta nke ndị nọ ná nchebe?
4 Ebe ọ bụ na Efraim bụ nke kasị ibu n’ime ebo iri nke Israel, mgbe ụfọdụ, okwu ahụ bụ “Efraim” na-ezo aka n’ebe alaeze ebe ugwu dum ahụ dị. Ya mere, “ndị Efraim na-aṅụbiga mmanya ókè” bụ n’ezie ndị Israel na-aṅụbiga mmanya ókè. Isi obodo nke Israel bụ Sameria, bụ́ nke dị n’ebe kasị nnọọ elu nke otu isi ndagwurugwu dị uru. Ya mere, okwu ahụ bụ ‘isi nke ndagwurugwu dị uru’ na-ezo aka na Sameria. Mgbe e dere okwu ndị a, alaeze nke Israel rụrụ nnọọ arụ n’ụzọ okpukpe. Ọzọkwa, o sorowo Siria banye ná njikọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị megide Juda, na-enwekwa mmetụta nke ịnọ ná nchebe ugbu a. (Aịsaịa 7:1-9) Nke ahụ gaje ịgbanwe n’oge na-adịghị anya. Ọdachi na-abịa nso, nke bụ ihe mere Jehova ji kwupụta na “ahụhụ ga-adịrị okpueze mpako nke ndị Efraim na-aṅụbiga mmanya ókè.”
5. (a) Gịnị bụ okpueze mpako nke Israel? (b) Olee ndị bụ ndị Efraim ahụ na-aṅụbiga mmanya ókè?
5 Gịnị bụ “okpueze mpako” ahụ? Okpueze bụ ihe atụ nke ike ọchịchị. N’ihi ya, “okpueze mpako” ahụ bụ ọnọdụ nke Israel dị ka alaeze kwụụrụ onwe ya, nke na-adabereghị na Juda. Otu ihe gaje ime, nke ga-emebi ọnọdụ nnwere onwe nke ọchịchị Israel. Ya mere, olee ndị bụ “ndị Efraim na-aṅụbiga mmanya ókè”? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na e nwere ndị na-aṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ nkịtị n’Israel, ebe Sameria bụ ebe bụ isi nke ofufe arụsị rụrụ arụ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-ekwu banyere ụdị ịṅụbiga mmanya ókè nke dị njọ karị. N’Aịsaịa 29:9, anyị na-agụ, sị: “Ha aṅụbigawo mmanya ókè, ma ọ bụghị mmanya ka ha ṅụbigara ókè; ha aṅagharịwo, ma ọ bụghị ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya.” Nke a bụ ịṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ ime mmụọ, mmanya ogbugbu na-adịghị ọcha, nke na-eweta ọnwụ. O doro anya na ndị ndú Israel—karịsịa ndị ndú okpukpe ya—nwere ụdị mmanya ogbugbu ime mmụọ dị nnọọ otú ahụ.
6. Gịnị mere mmanya ji na-egbu Israel oge ochie?
6 Gịnị kpatara mmanya ogbugbu ime mmụọ nke Israel oge ochie? N’ụzọ bụ isi, ọ bụ njikọ aka ya na Siria mere megide Juda, bụ́ nke nyere ndị ndú nke mba ahụ mmetụta dị mma nke ịnọ ná ntụkwasị obi. Mmanya ogbugbu ime mmụọ nke a tinyere Israel n’ọnọdụ nke amakwaghị ihe na-eme eme n’ezie. Dị ka onye mmanya na-egbu n’ụzọ nkịtị, o nwere olileanya nke ezi ihe, ọ bụ ezie na e nweghị ihe mere ọ ga-eji nwee ụdị olileanya ahụ. Ọzọkwa, Israel ji mpako nọrọ ná njikọ ya na Siria nke na-egbu ya dị ka mmanya, dị ka okpu ọma nke ịma mma. Ma, dị ka Aịsaịa kwuru, ọ bụ okpu ọma nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke na-agaghị adịtekwa anya.
7, 8. N’agbanyeghị mmetụta ọma nile ọ na-enwe, gịnị gaje ịbịakwasị Israel oge ochie n’isi nso?
7 Aịsaịa mesiri nke a ike n’isi 28, amaokwu 2, sị: “Lee, otu onye dị ike nke nwere ume ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nwere; dị ka oké mmiri ozuzo nke akụ mmiri igwe, dị ka oké ifufe nke na-efechapụ efechapụ, dị ka oké mmiri ozuzo nke mmiri dị ike na-erubiga ókè, otú a ka o jiworo ihe ike tọgbọ ihe n’ala.” Ònye bụ ‘onye nke a dị ike nke nwere ume’? N’oge Israel oge ochie, ọ bụ Alaeze Ukwu Asiria ahụ siri oké ike. Alaeze ụwa nke a nke nwere obi ọjọọ, nke obi tara mmiri, ga-abịakwasị Israel dị ka oké mmiri ozuzo nke akụ mmiri igwe. Gịnị ka ọ ga-arụpụta?
8 Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “N’okpuru ụkwụ ka a ga-azọda okpueze mpako nke ndị Efraim na-aṅụbiga mmanya òkè: okooko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ nke ịma mma ya mara mma, nke dị n’isi nke ndagwurugwu dị uru, ga-adịkwa ka mkpụrụ fig buru ụzọ chaa tupu mgbe okpomọkụ eruo; nke mgbe onye ọ bụla nke na-ahụ ya anya na-ahụ, mgbe ọ na-adị n’ọbụ aka ya o loo ya.” (Aịsaịa 28:3, 4) Isi obodo Israel, bụ́ Sameria, yiri fig chara acha nye Asiria, bụ́ nke ruworo ka a ghọrọ ya ma loo ya. A gaje ịzọda njikọ Israel na Asiria nke yiri okpu ọma nke ịma mma. Ọ gaghị aba uru ọ bụla mgbe ụbọchị ime ngụkọ bịarutere. Ọbụna nke ka njọ, a ga-echipịa ebube ya yiri okpueze n’okpuru ụkwụ Asiria, bụ́ ndị iro. Lee nnọọ oké ọdachi nke a bụ!
‘Onye Nchụaja na Onye Amụma Agahiewo Ụzọ’
9. N’ihi gịnị ka Juda pụrụ ijiworị tụọ anya ozi ka mma site n’aka Jehova karịa nke Israel oge ochie nwetara?
9 Ee, ngụkọ dị egwu na-echere Israel, dịkwa nnọọ ka Jehova Chineke dọworo aka ná ntị, ngụkọ ahụ bịara n’afọ 740 T.O.A. mgbe Asiria bibiri Sameria, alaeze ebe ugwu ahụ wee kwụsịkwa ịdị adị dị ka mba nke nweere onwe ya. Ihe mere Israel oge ochie nọ dị ka ihe ịdọ aka ná ntị dị egwu nye okpukpe ụgha nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi taa, dị ka anyị gaje ịhụ. Ma gịnị banyere alaeze ahụ ya na Israel bụ nwanne, nke dị n’ebe ndịda, bụ́ Juda? N’oge Aịsaịa, ụlọ nsọ Jehova ka na-arụ ọrụ na Jerusalem, bụ́ isi obodo nke Juda. Usoro ndị nchụaja ka na-arụ ọrụ n’ebe ahụ, ndị amụma dị ka Aịsaịa, Hosea, na Maịka na-ekwukwa okwu n’aha Jehova. Ya mere, olee ozi Jehova nwere maka Juda?
10, 11. Ọnọdụ ihe arụ dị aṅaa dị na Juda?
10 Aịsaịa gara n’ihu ịgwa anyị, sị: “Ma ọbụna ndị a [ya bụ, ndị nchụaja na ndị amụma nke Jerusalem] adagharịwo site ná mmanya vine, ọ bụkwa site n’ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ka ha ṅagharịworo; onye nchụaja na onye amụma adagharịwo site n’ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya.” (Aịsaịa 28:7a) Ihe àmà gosiri na mmanya na-egbukwa ndị ndú okpukpe nke Juda. Dị ka Israel, ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ nkịtị, ọ bụrụkwa otú ahụ, nke a bụ ihe ihere. Iwu Chineke kwuru okwu hoo haa megide ndị nchụaja ịṅụ mmanya na-aba n’anya mgbe ha na-eje ozi n’ụlọ nsọ. (Levitikọs 10:8-11) Ịṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ nkịtị n’ụlọ Chineke ga-abụworị imebi Iwu Chineke n’ụzọ dị oké njọ.
11 Ma nke ka njọ, e nwere ịṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ ime mmụọ na Juda. Dị nnọọ ka Israel soroworo Siria jikọọ onwe ya megide Juda, otú a ka Juda chọworo nchebe site n’isoro Asiria jikọọ onwe ya. (2 Ndi Eze 16:5-9) N’agbanyeghị ịdị adị nke ụlọ nsọ Chineke na ndị amụma ya, Juda tinyere okwukwe n’ebe ụmụ mmadụ nọ mgbe o kwesịrị ịtụkwasịworịị Jehova obi. Karịsịa, ebe ọ banyeworo ná njikọ dị otú ahụ nke ezi echiche na-adịghị ya, ndị ndú ya tụsaara ahụ dị ka ndị agbata obi ha bi n’ebe ugwu, bụ́ ndị mmanya na-egbu n’ụzọ ime mmụọ. Omume ha nke ejighị ihe kpọrọ ihe bụ ihe arụ n’anya Jehova.
12. Gịnị ka mmanya ogbugbu ime mmụọ nke Juda ga-arụpụta?
12 Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Mmanya vine elodawo ha, ha aṅagharịwo site n’ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya; ha adagharịwo n’ọhụhụ, ha asụwo ngọngọ n’ihe nile e kpere n’ikpe. N’ihi na table nile jupụtara n’ihe ọgbụgbọ ruru unyi, ọ dịghị ebe dị ọcha.” (Aịsaịa 28:7b, 8) Ọ pụrụ ịbụ na n’ọnọdụ mmanya ogbugbu ha, ụfọdụ ndị gbọrọ ihe n’ụzọ nkịtị n’ụlọ nsọ ahụ. Ma nke ka mkpa, ndị nchụaja na ndị amụma, bụ́ ndị kwesịrị inyeworị nduzi okpukpe, nọ na-agbọpuṭa unyi ime mmụọ. Karịsịa, e wezụgakwa mmadụ ole na ole ndị kwesịrị ntụkwasị obi, mkpebi ndị amụma ahụ na-eme gbagọrọ agbagọ, ha nọkwa na-ahụ ihe ndị na-abụghị ezie maka mba ahụ. Jehova gaje ịta Juda ahụhụ n’ihi adịghị ọcha ime mmụọ nke a.
Ndị Na-aṅụbiga Mmanya Ókè n’Ime Mmụọ Taa
13. Ọnọdụ dị aṅaa nke yiri nke dịrị n’Israel na Juda ka e nwere na narị afọ mbụ O.A., myirịta dị aṅaa ka e nwekwara n’oge a?
13 Amụma Aịsaịa hà mezuru nanị n’isi Israel na Juda oge ochie? Ọ dịghị ma ọlị. Ma Jisọs ma Pọl onyeozi hotara okwu ya banyere ịṅụbiga mmanya ókè n’ime mmụọ, jirikwa ha mee ihe banyere ndị ndú okpukpe nke oge ha. (Aịsaịa 29:10, 13; Matiu 15:8, 9; Ndị Rom 11:8) Taakwa, ọnọdụ yiri nke dị n’oge Aịsaịa ebilitewo—ugbu a, ọ bụkwa n’ime Krisendọm, bụ́ òtù okpukpe zuru ụwa ọnụ nke na-ekwu na ha na-anọchite anya Chineke. Kama iguzosi ike n’akụkụ nke eziokwu na ịdabere n’ebe Jehova nọ, Krisendọm, ma Katọlik ma Protestant, na-etinye okwukwe ya n’ụwa. Otú a, ọ na-aṅagharị, dị ka ndị mmanya na-egbu n’Israel na Juda. Ndị ahụ mmanya na-egbu n’ụzọ ime mmụọ ná mba ndị ahụ nke oge ochie sere nnọọ onyinyo nke ndị ndú ime mmụọ nke Krisendọm taa. Ka anyị hụ kpọmkwem ụzọ o si dị otú ahụ.
14. Olee ụzọ ndị ndú okpukpe Krisendọm si bụrụ ndị mmanya na-egbu dị ka ndị ndú nke Sameria na Jerusalem oge ochie?
14 Dị ka Sameria na Jerusalem, Krisendọm aṅụjuwo afọ site ná mmanya nke njikọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche. Na 1919, o so ná ndị kasị kwalite òtù League of Nations. N’agbanyeghị na Jisọs kwuru na ndị Kraịst agaghị abụ akụkụ nke ụwa, ndị ndú Krisendọm na-eguzobe mmekọrịta enyi nke ha na ndị isi ọchịchị dị iche iche. (Jọn 17:14-16) Mmanya ihe atụ nke ihe omume dị otú ahụ na-akpali akpali nye ndị ndú okpukpe. (Tụlee Mkpughe 17:4.) Ọ na-amasị ha ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ajụta ha ihe, ka ha sorokwa ndị oké mmadụ nke ụwa nke a na-akpakọrịta. N’ihi nke a, ha enweghị ezi nduzi ime mmụọ ha ga-enye. Ha na-agbọpụta ihe ruru unyi kama ikwu ozi ahụ dị ọcha nke eziokwu. (Zefanaịa 3:9) Ebe ha na-ahụ ihe inyoghi inyoghi, nọrọkwa ná mgbagwoju anya, ha abụghị ezi ndị nduzi maka ihe a kpọrọ mmadụ.—Matiu 15:14.
“Ihe E Nyere n’Iwu Tụkwasị Ihe E Nyere n’Iwu”
15, 16. Gịnị bụ mmeghachi omume nke ndị dịrị ndụ n’oge Aịsaịa n’ebe ịdọ aka ná ntị ya dị?
15 Na narị afọ nke asatọ T.O.A., Aịsaịa kpughere ụzọ ọjọọ nke ndị ndú ime mmụọ nke Juda karịsịa. Olee otú ha si meghachi omume? Ha kpọrọ ya asị! Mgbe Aịsaịa nọgidere na-akpọsa ịdọ aka ná ntị nke Chineke, ndị ndú okpukpe zaghachiri, sị: “Ònye ka ọ ga-ezi ihe ọmụma? Ọ̀ bụkwa onye ka ọ ga-eme ka ọ ghọta ihe a nụrụ? Ọ̀ bụ ndị e meworo ka ha hapụ ịṅụ mmiri ara, ndị a napụrụ ara?” (Aịsaịa 28:9) Ee, Aịsaịa ò chere na ọ bụ ụmụ ọhụrụ ka ọ na-agwa okwu? Ndị ndú okpukpe nke Jerusalem lere onwe ha anya dị ka ndị toruworo ogo mmadụ, ndị nwere ike zuru ezu imere onwe ha mkpebi. Ọ dịghị ha mkpa ige ntị n’ihe ncheta ndị Aịsaịa nọgidere na-enye ha.
16 Ọbụna na ndị okpukpe ndị ahụ jiri ọrụ nkwusa nke Aịsaịa mere ihe ịkwa emo. Ha gụkwasịrị ya egwu, sị: “N’ihi na ọ bụ ihe e nyere n’iwu tụkwasị ihe e nyere n’iwu, ihe e nyere n’iwu tụkwasị ihe e nyere n’iwu; usoro tụkwasị usoro, usoro tụkwasị usoro; nwa ntịị n’ebe a, nwa ntịị n’ebe ahụ.” (Aịsaịa 28:10) Ha sịrị na ‘Aịsaịa na-ekwughachi ihe o kwuburu na mbụ. Ọ nọgidere na-asị: “Nke a bụ ihe Jehova nyere n’iwu! Nke a bụ ihe Jehova nyere n’iwu! Nke a bụ ụkpụrụ Jehova! Nke a bụ ụkpụrụ Jehova!”’ N’asụsụ Hibru mbụ, Aịsaịa 28:10 bụ ukwe nkweghachi e dere n’ụzọ na-adakọ adakọ, dị nnọọ ka abụ ụmụ ọta akara na-agụ. Ọ bụkwa otú ahụ ka onye amụma ahụ dị n’anya ndị ndú okpukpe ahụ, dị ka onye na-ekwughachi otu ihe ahụ ọtụtụ ugbo, onye na-eme dị ka nwata.
17. Olee ụzọ ọtụtụ ndị na-esi emeghachi omume taa n’ebe ozi ịdọ aka ná ntị nke Ndịàmà Jehova na-akpọsa dị?
17 N’ime narị afọ mbụ O.A., nkwusa Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya dakwara dị ka okwu nkwughachi efu na ihe dịịrị ndị na-emepeghị anya. Ndị ndú okpukpe ndị Juu lere ndị ahụ sooro Jisọs anya dị ka ndị a na-abụ ọnụ, ndị nzuzu na-emepeghị anya, ndị na-amaghị akwụkwọ na ndị nkịtị. (Jọn 7:47-49; Ọrụ 4:13) Ọtụtụ mgbe, a na-elekwa Ndịàmà Jehova anya n’ụzọ dị otú ahụ taa. Ha agaghị ụlọ akwụkwọ seminarị dị iche iche nke Krisendọm, ha adịghị eji utu aha ma ọ bụ okwu nkà mmụta okpukpe ndị na-ada oké ụda na-eme ihe dị ka ndị ụkọchukwu na-eme. Ya mere, ndị dị elu na Krisendọm na-eleda ha anya, na-eche na ha kwesịrị ịmara ọnọdụ ha, ma na-akwanyere ndị ndú okpukpe ndị a ùgwù karị.
18. Gịnị ka ndị ndú okpukpe nke oge a na-elefuru anya?
18 Otú ọ dị, e nwere ihe ndị ndú okpukpe ahụ na-elefuru anya. Ọ bụ ezie na ndị ukwu nke oge Aịsaịa jụrụ ozi ya, ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu, ịdọ aka ná ntị ya ndị ahụ mezukwara! N’otu aka ahụ, ịdọ aka ná ntị Ndịàmà Jehova na-enye taa bụ eziokwu, ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’Okwu eziokwu nke Chineke, bụ́ Bible. (Jọn 17:17) N’ihi ya, ha gaje imezu.
Oge Ngụkọ
19. Olee ụzọ e si manye Juda ige ntị n’olu ndị mba ọzọ, bụ́ ndị na-asụ asụsụ yiri nke ịsụ nsụ?
19 N’Aịsaịa 28:11, anyị na-agụ, sị: “N’ezie site n’ịsụ nsụ nke egbugbere ọnụ na site n’ire dị iche ka ọ ga-agwa ndị nke a okwu.” Ozizi ihe Aịsaịa dara ụda ka asụsụ ndị mba ọzọ a na-adịghị aghọta aghọta nye Juda. Ọ bụ ezie na Juda gabigara mwakwasị ndị Asiria ahụ nke rikpuru Israel, mgbe oge na-aga, Jehova jiri onye ọzọ nke bụ onye mba ọzọ, bụ́ Nebukadneza, mesoo Juda ihe. (Jeremaịa 5:15-17) Asụsụ ndị Babilọn dara ụda ike ike, dịkwa ka nke ịsụ nsụ ná ntị ndị Hibru ahụ. Ma a manyere ha ige ya ntị mgbe e bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya na 607 T.O.A., mgbe a dọrọkwara ndị bi na ya n’agha laa na Babilọn. N’otu ụzọ ahụ taa, Krisendọm ga-ata ahụhụ n’oge na-adịghị anya n’ihi na, dị ka Juda oge ochie, ọ na-elefuru ndụmọdụ Jehova anya.
20, 21. Gịnị ka Ndịàmà Jehova nọgidere na-akpọsa n’esepụghị aka, ma gịnị ka ndị ndú okpukpe Krisendọm jụworo ime?
20 Amụma ahụ kwuru banyere ndị dị otú ahụ, sị: “Onye sịrị ha, Nke a bụ izu ike ahụ, meenụ ka onye ike gwụrụ zuru ike; nke a bụkwa ịgba ume ahụ: ma ha ekweghị ịnụ. Okwu Jehova ga-abụkwara ha ihe e nyere n’iwu tụkwasị ihe e nyere n’iwu; ihe e nyere n’iwu tụkwasị ihe e nyere n’iwu; usoro tụkwasị usoro, usoro tụkwasị usoro; nwa ntịị ebe a, nwa ntịị ebe ahụ; ka ha wee jee, sụọ ngọngọ daa n’azụ, e wee tijie ha, ha ama n’ọnyà, e jide ha.”—Aịsaịa 28:12, 13.
21 N’esepụghị aka, dị nnọọ ka Aịsaịa kpọsara ozi Chineke, Ndịàmà Jehova na-agwa Krisendọm na o kwesịrị ka ọ tụkwasị olileanya ya n’okwu Jehova. Ma ọ jụrụ ige ntị. Nye ya, o yiri ka Ndịàmà ahụ hà na-ekwugheri ọnụ n’asụsụ ndị mba ọzọ. Ha na-asụ asụsụ nke ọ na-apụghị ịghọta. Krisendọm na-ajụ ime ka ndị ike gwụrụ zuru ike site n’ikwu banyere Alaeze Chineke na ụwa ọhụrụ ahụ nke gaje ịbịa. Kama nke ahụ, mmanya nke mmekọrịta ya na ụwa nke a na-egbu ya. Ọ kaara ya mma ịkwado atụmatụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị iji gboo mkpa nke ihe a kpọrọ mmadụ. Dị ka ndị Juu nke oge Jisọs, ọ chọbeghị ebe izu ike nke Alaeze ahụ n’onwe ya, ọ chọghịkwa ịgwa ndị ọzọ banyere ya.—Matiu 23:13.
22. Gịnị ka Jehova na-eme ka ndị ndú Krisendọm mara?
22 Ya mere, okwu amụma Aịsaịa na-eme ka ndị ndú okpukpe mara na Jehova agaghị anọgide na-eji Ndịàmà ya na-adịghị emerụ mmadụ ahụ na-ekwu okwu mgbe nile. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-etinye “ihe e nyere n’iwu tụkwasị ihe e nyere n’iwu; usoro tụkwasị usoro” n’ọrụ ihe ọ ga-arụpụta ga-abụkwa oké mbibi nye Krisendọm. ‘A ga-etiji ha, maa ha n’ọnyà, jide ha,’ bụ́ ndị ndú okpukpe ya na ìgwè ndị na-eso ha. Ee, dị ka Jerusalem oge ochie, a gaje ibibi usoro nile nke okpukpe Krisendọm kpam kpam. Lee oké ihe ọdachi a na-atụghị anya ya nke ahụ ga-abụ! Leekwa ihe egwu ọ bụ n’ihi na ndị ndú okpukpe họọrọ ịṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ ime mmụọ kama ịnakwere ihe ncheta nile nke Jehova!
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Olee ndị bụ ndị Efraim na-aṅụbiga mmanya ókè, gịnịkwa mere mmanya ji na-egbu ha?
◻ È si aṅaa zọda okpueze mpako nke ndị Efraim na-aṅụbiga mmanya ókè?
◻ Ọnọdụ ihere dị aṅaa nke dị na Juda ka Aịsaịa kpughere?
◻ N’òle ebe taa ka anyị na-ahụ mmanya ogbugbu n’ụzọ ime mmụọ?
◻ N’ihi gịnị ka Krisendọm kwesịrị iji gee ntị n’ihe mere mba Juda nke oge ochie?