Nọgide Na-adọ Aka ná Ntị Banyere Ọrụ Dị Ịtụnanya nke Jehova
“Dị ka n’Ugwu Perazim, otú a ka Jehova ga-ebili; dị ka na ndagwurugwu Gibeọn, otú a ka ọ ga-ewe oké iwe.”—AỊSAỊA 28:21.
1, 2. Ọrụ dị aṅaa dị ịtụnanya ka Jehova rụrụ n’ihi ndị Ya n’oge Devid?
IHE omume na-eju anya! Ọrụ dị ịtụnanya nke ukwuu! Nke ahụ bụ ihe Jehova meere ndị ya n’oge ochie laa azụ na narị afọ nke 11 T.O.A. Oké ihe omume nke a bụkwa ihe atụ nke ọrụ dị ịtụnanya ọbụna karị nke ọ gaje ịrụ n’isi nso. Gịnị bụ ihe omume oge ochie ahụ? N’oge na-adịghị anya mgbe e guzobesịrị Devid dị ka eze na Jerusalem, ndị agbata obi ha bụ ndị Filistia busoro ha agha, nke a kpalikwara Jehova ime ihe na-eju anya. Nke mbụ, ndị Filistia malitere ịwabata na ndagwurugwu nke Refaim. Devid jụrụ Jehova ihe ya kwesịrị ime, a gwakwara ya ka ọ malite ibuso ha agha. N’irube isi n’okwu Jehova, Devid meriri oké usuu ndị agha Filistia oké mmeri na Beal-perazim. Ma ndị Filistia ahụ anabataghị mmeri e meriri ha. N’oge na-adịghị anya, ha lọghachitere ibibi na ịkwakọrọ ihe na ndagwurugwu Refaim, Devid jụkwara Jehova ọzọ maka nduzi.
2 N’oge nke a, a gwara ya ka ọ kpọrọ usuu ndị agha jee n’azụ ndị Filistia ahụ. Jehova sịrị: “Mgbe ị nụrụ olu ikiti ụkwụ n’elu osisi balsam ahụ, mgbe ahụ ka ị ga-eme ngwa: n’ihi na mgbe ahụ ka Jehova pụworo n’ihu gị itigbu ọmụma ụlọ ikwuu ndị Filistia.” Nke ahụ bụkwa ihe merenụ. Devid cheere ruo mgbe Jehova mere ka e nwee mkpatụ yiri nke ndị na-azọ ije n’elu osisi balsam ndị ahụ—ma eleghị anya site n’iji ifufe dị ike mee ihe. Ozugbo, Devid na ndị agha ya si n’ebe ha zoro mapụta wee busoo ndị Filistia ahụ nọ ná mgbagwoju anya agha, jiri oké ntigbu wee merie ha. A chịkọtara arụsị ndị Filistia gbahapụrụ n’ọgbọ agha ahụ ma bibie ha.—2 Samuel 5:17-25; 1 Ihe Emere 14:8-17.
3. N’ihi gịnị ka ihe omume Jehova nke dị ịtụnanya ji bụrụ ihe na-akpali mmasị nye ndị Juu nke oge Aịsaịa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o kwesịrị iji bụrụ ihe na-akpali mmasị nye Krisendọm nke oge a?
3 Nke a bụ ọrụ dị ịtụnanya, ihe omume na-eju anya, nke Jehova mezuru megide ndị Filistia nakwa n’ihi eze ya e tere mmanụ. Oké ihe omume a bụ nke na-akpali mmasị n’ụzọ pụrụ iche n’ihi na Aịsaịa onye amụma dọrọ aka ná ntị na Jehova ga-emekwa ihe dị ịtụnanya, dịkwa ike otú ahụ megide ndị Juda na-aṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ndị ndú okpukpe na-ekwesịghị ntụkwasị obi nke oge Aịsaịa rịba nke ahụ ama. Taa, Krisendọm kwesịkwara ịrịba ya ama n’ihi na ihe mere Juda bụ ihe atụ nke ihe ga-emesịa bịakwasị Krisendọm.
“Ihe Ndina Dị Mkpụmkpụ Karị”
4, 5. (a) Olee ụzọ Aịsaịa si mee ihe atụ pụtara ìhè nke ọnọdụ ọjọọ ndị ndú okpukpe nke oge ya nọ na ya? (b) Ọ̀ bụ gịnị kpatara ọnọdụ ọjọọ nke Krisendọm n’oge a?
4 Nke mbụ, Aịsaịa kpughere eziokwu ahụ nke bụ na nkwekọrịta ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche bụ́ nke ndị oge ochie ahụ na-aṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ ime mmụọ tụkwasịrị obi na ha bụ ihe nrafu, okwu ụgha. Mgbe ahụ, o mere ihe atụ pụtara ìhè nke ọnọdụ na-adịghị mma ndị na-atụkwasị obi n’okwu ụgha ahụ nọ na ya. Ọ sịrị: “N’ihi na ihe ndina dị mkpụmkpụ karị nke mmadụ ga-esetịpụ onwe ya n’elu ya; ákwà mkpuchi dịkwa warara karị nke mmadụ ga-afụchi onwe ya.” (Aịsaịa 28:20) Onye ọ bụla nke na-agbatịpụ onwe ya n’elu ihe ndina nke dị mkpụmkpụ nke ukwuu ga-achọpụta na ụkwụ ya ga-achịpụ ebe oyi ga na-atụ ya. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ọ sụkọta ikpere ya iji wee bata n’ihe ndina ahụ dị mkpụmkpụ, ákwà mkpuchi na-adị warara nke ukwuu, akụkụ dị ukwuu nke ahụ ya ka ga-eghekwa oghe. N’agbanyeghị ihe o mere, akụkụ ụfọdụ nke ahụ ya ga-anọ ebe oyi ga na-atụ ya.
5 N’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, nke ahụ bụ ọnọdụ nke ndị biri n’oge Aịsaịa, bụ́ ndị tụkwasịrị obi n’ebe mgbaba nke okwu ụgha. Nke ahụ bụkwa ọnọdụ ọjọọ nke ndị na-atụkwasị obi n’ebe mgbaba okwu ụgha nke Krisendọm taa. Ha nọ n’ebe oyi ga na-atụ ha, dị ka a pụrụ ikwu ya. Ugbu a abụghị oge nke ịchọ ntụsara ahụ n’ime ndokwa dị iche iche ụwa na-eme maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. N’ihu ihe iyi egwu nke ihe dị iche iche Chineke gaje ime iji mezuo ikpe ya, njikọ aka nke Krisendọm na ndị ọchịchị dị iche iche agaghị enye ya okpomọkụ ọ bụla nke ntụsara ahụ.
Ihe Omume Na-eju Anya nke Jehova
6. Olee ụzọ Jehova gaje isi mee ihe megide Juda, oleekwa ụzọ ọ ga-esi mee ihe megide Krisendọm?
6 Mgbe ọ kọwasịrị ọnọdụ ọjọọ nke Jerusalem na-ekwesịghị ntụkwasị obi nke oge ya nọ na ya—nakwa nke Krisendọm na-ekwesịghị ntụkwasị obi nke oge a—Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: ‘Dị ka n’ugwu Perazim, otú a ka Jehova ga-ebili; dị ka na dagwurugwu Gibeọn, otú a ka ọ ga-ewe oké iwe; ka o wee nwee ike ime ihe omume ya—ihe omume ya na-eju anya—ka o wee nweekwa ike ịrụ ọrụ ya—ọrụ ya dị ịtụnanya.’ (Aịsaịa 28:21) Ee, Aịsaịa dọrọ aka ná ntị na Jehova ga-ebili n’oge na-adịghị anya dị ka o mere na Beal-perazim. Ma n’oge nke a, ọ gaje ime ihe megide ndị ya na-enweghị okwukwe, ọ gajekwa ime nke a dị ka idei mmiri a na-apụghị iguzogide eguzogide nke si n’oghere dị n’ihe mgbochi osimiri na-asọpụta n’ike. A gaje igosipụta na ọgbụgba ndụ Jerusalem na ọnwụ gbara bụ ihe na-adịghị irè. N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova gaje ime ihe n’ọdịnihu dị nso megide Krisendọm, ọ ga-achọpụtakwa na nkwekọrịta nile na-egbu ya ka mmanya nke ya na ụwa nke a meworo abaghị uru ọ bụla. A ga-etikpọsị nnukwu nzukọ ya, chụsasịakwa ndị na-akwado ya. A ga-esure chi ụgha ya nile n’ọkụ kpam kpam.
7. N’ihi gịnị ka e ji lee nzube Jehova n’ihe banyere Juda anya dị ka ‘ihe na-eju anya’ na ‘ọrụ di ịtụnanya’?
7 N’ihi gịnị ka Aịsaịa ji kpọọ ihe Jehova mere megide Jerusalem ọrụ na-eju anya, nke dịkwa ịtụnanya? Jerusalem bụ ebe bụ isi nke ofufe Jehova nakwa obodo nke eze Jehova e tere mmanụ. (Abụ Ọma 132:11-18) N’ihi nke a, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla e bibitụworo ya mbụ. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla e suru ụlọ nsọ ya ọkụ. Ụlọ eze nke Devid, ozugbo e guzobesịrị ya na Jerusalem, adịbeghị mgbe ọ bụla a kwaturu ya akwatu. Ihe ndị dị otú ahụ bụ ihe a na-apụghị ichetụdị n’echiche. Ọ bụ ihe dị ịtụnanya nke ukwuu na Jehova ga-eche echiche ikwe ka ihe dị otú ahụ mee.
8. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jehova nyere banyere ihe omume ya dị ịtụnanya nke na-abịanụ?
8 Ma Jehova nyere ịdọ aka ná ntị kwesịrị ekwesị site n’ọnụ ndị amụma ya na ihe dị otú ahụ na-anwụ ibubo n’ahụ gaje ime. (Maịka 3:9-12) Dị ka ihe atụ, onye amụma ahụ bụ Habakuk, onye dịrị ndụ n’ime narị afọ nke asaa T.O.A., kwuru, sị: “Hụnụ n’etiti mba nile, legidekwanụ anya, ka o jukwa unu anya nke ukwuu nke ukwuu: n’ihi na ọrụ ka m na-arụ n’ụbọchị unu, nke unu na-agaghị ekwe, mgbe a ga-akọrọ unu ya. N’ihi na, lee, m gaje ime ka ndị Kaldea bilie, bụ́ mba ahụ dị ilu nke na-emekwa ngwa ngwa; ndị na-ejegharị na mbara ụwa, inweta ebe obibi dị iche iche nke na-abụghị nke ha. Ndị na-atụ ụjọ, ndị dịkwa egwu, ka ha bụ.”—Habakuk 1:5-7.
9. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si mezuo ịdọ aka ná ntị ya megide Jerusalem?
9 Na 607 T.O.A., Jehova mezuru ịdọ aka ná ntị ya. Ebe o kweworo ka usuu ndị agha Babilọn bịakwasị Jerusalem, o kwere ka ha bibie ma obodo ahụ ma ụlọ nsọ dị na ya. (Abụ Akwa 2:7-9) Ọzọkwa, o kwere ka e bibie Jerusalem nke ugbo abụọ. N’ihi gịnị? Ee, mgbe ha nọsịrị 70 afọ ná ndọta n’agha, ndị Juu nwere nchegharị laghachiri n’ala nke aka ha, e mesịkwara wuo ụlọ nsọ ọzọ na Jerusalem. Otú ọ dị, ndị Juu sikwara n’ebe Jehova nọ wezụga onwe ha ọzọ. N’ime narị afọ mbụ O.A., Pọl hotara okwu Habakuk gwa ndị Juu nke oge ya, wee si otú a na-adọ ha aka ná ntị na a gaje inwe mmezu ọdịnihu nke amụma ahụ. (Ọrụ 13:40, 41) Jisọs n’onwe ya adọwo aka ná ntị kpọmkwem na a gaje ibibi Jerusalem na ụlọ nsọ ya n’ihi enweghị okwukwe nke ndị Juu. (Matiu 23:37–24:2) Ndị Juu nke narị afọ mbụ ahụ hà gere ntị? Ee e. Dị ka ndị nna ha ochie, ha jụrụ ịdọ aka ná ntị Jehova kpam kpam. N’ihi ya, Jehova rụghachiri ọrụ ya dị ịtụnanya ọzọ. E bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya n’afọ 70 O.A. site n’aka usuu ndị agha Rom.
10. Olee ụzọ Jehova ga-esi mee ihe megide Krisendọm n’ọdịnihu dị nso?
10 Ya mere, n’ihi gịnị ka onye ọ bụla ga-eji chee na Jehova agaghị eme ihe yiri nke ahụ n’oge anyị a? Eziokwu dị na ya bụ na ọ ga-emezu nzube ya ọ bụ ezie na o yiri ihe na-eju anya na ihe dị ịtụnanya nye ndị na-arụ ụka. N’oge nke a, ebe ihe omume ya ga-elekwasị anya bụ Krisendọm nke na-eme dị ka Juda oge ochie n’ịzọrọ na ya na-efe Chineke, ma bụrụ nke rụworo arụ n’ụzọ dị ukwuu. Site n’aka Devid ya Ka Ukwuu, bụ́ Kraịst Jisọs, Jehova ga-abịakwasị “ndị Filistia” nke Krisendọm n’oge hour ha na-atụghị anya ya. Ọ ga-arụ ọrụ ya dị ịtụnanya ruo n’ókè nke ikpochapụ akụkụ ikpeazụ nke usoro okpukpe Krisendọm.—Matiu 13:36-43; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10.
Ịdọ Aka ná Ntị Banyere Ihe Jehova Gaje Ime
11, 12. Olee ụzọ Ndịàmà Jehova siworo dọọ aka ná ntị banyere ikpe Jehova ndị na-abịanụ?
11 Ruo ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova adọwo aka ná ntị banyere mmezu ikpe nke a na-abịanụ nke Jehova. Ha emewo ka ọ pụta ìhè na mbibi nke Jerusalem na ụlọ nsọ ya na 607 T.O.A. nakwa na 70 O.A. bụ ịdọ aka ná ntị amụma nke ihe gaje ime Krisendọm. Ọzọkwa, ha egosipụtawo na n’ihi isi n’ezi ofufe dapụ, Krisendọm aghọwo akụkụ nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ. N’ihi nke a, ikpe Chineke n’isi Babilọn Ukwu ahụ ga-abịakwasị Krisendọm karịsịa, ebe ọ bụ akụkụ kasị nwee ikpe ọmụma ná njikọ nile nke Setan.—Mkpughe 19:1-3.
12 Ndịàmà Jehova ezowo aka n’ịdọ aka ná ntị amụma nke dị na Bible nke bụ na n’oge Jehova kara aka, ndị ọchịchị bụbu ndị enyi Babilọn Ukwu ahụ ga-echigharị imegide ya. N’ise onyinyo nke ndị a dị ka mpì iri nke otu anụ ọhịa na-acha uhie uhie, Mkpughe na-adọ aka ná ntị, sị: “Mpì iri ahụ ị hụrụ, ha na anụ ọhịa ahụ, ndị a ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko [Babilọn Ukwu ahụ] asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu, bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” (Mkpughe 17:16) A ga-esure okpukpe nile nke Krisendọm ọkụ ma bibikọta ya na okpukpe ụgha nile ndị ọzọ. Nke a ga-abụ ihe omume na-eju anya nke Jehova, ọrụ ya dị ịtụnanya nke oge anyị a.
13. Olee ụzọ mmeghachi omume n’ebe ịdọ aka ná ntị Jehova dị n’oge a siworo yie ihe Aịsaịa zutere?
13 Mgbe Ndịàmà Jehova na-akpọsa ịdọ aka ná ntị banyere oké mbibi nke a nke na-abịanụ, ha na-ezutekarị ịchị ọchị nke ịkwa emo. Ndị mmadụ na-echekarị echiche banyere ndị ha chere na ha bụ iji na-ekwu ihe ndị dị otú ahụ. Krisendọm yiri ihe guzosiri nnọọ ike, nke e guzobere nnọọ nke ọma. Ee, ọbụna na ụfọdụ ndị na-eche na ọnọdụ ya na-adịwanye mma. Gọọmenti dị iche iche ndị na-akpagbubu ya emewo ihe n’oge ndị na-adịbeghị anya inyekwu ya ohere ime ihe. Ma n’eziokwu, Krisendọm kwesịrị ige ntị na ndụmọdụ Aịsaịa: “Unu aghọla ndị na-akwa emo, ka agbụ unu wee ghara isi ike: n’ihi na ngwụsị, nke a kakwara aka, ka m nụworo n’ọnụ Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, n’elu ụwa nile.”—Aịsaịa 28:22; 2 Pita 3:3, 4.
14. Olee ụzọ agbụ nile nke Krisendọm ga-esi siwanye ike, bụrụkwa ihe e kesiwanyere ike?
14 N’akụkụ ka ukwuu, Krisendọm ga-anọgide na-emegide Eze na Alaeze ahụ. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 4, 8) Otú ọ dị, n’otu mgbe ahụ, agbụ ya ga-esiwanye ike ma bụrụ nke e kesiri ike karị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mbibi ya ga-abụwanye ihe e ji n’aka. Jehova agaghị ala azụ ná mkpebi ya ịhụ na e bibiri Krisendọm dị ka ọ na-alaghị azụ site ná mkpebi ya ikwe ka e bibie Jerusalem na ụlọ nsọ ya na 607 T.O.A.
“Sinụ n’Ime Ya Pụta”
15. Ụzọ mgbapụ dị aṅaa ghere oghe nye mmadụ ndị obi ha ziri ezi?
15 Olee otú onye ọ bụla pụrụ isi zere ihe na-abịakwasị Krisendọm? Laa azụ n’oge Israel, Jehova zipụrụ ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi ịkpọghachite ndị nwere obi ziri ezi bịa n’ofufe dị ọcha. Taa, ọ kpọlitewo Ndịàmà ya, ndị ọnụ ọgụgụ ha ruru ọtụtụ nde ugbu a, maka nzube yiri nke ahụ. N’atụghị egwu, ha na-ekpughe ọnọdụ ọnwụ ime mmụọ nke Krisendọm. N’ime nke ahụ, ha na-eji ikwesị ntụkwasị obi na-ekwupụtaghachi mkpọsa yiri ihe otiti nke ụda opi ndị mmụọ ozi ahụ nke Mkpughe isi 8 na 9. Ọzọkwa, ha adịwo uchu n’ịkpọsa agbamume ahụ e dekọrọ ná Mkpughe 18:4, bụ́: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee . . . gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.” “Ya” nke a a na-ekwu okwu ya n’ebe a bụ Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, nke akụkụ bụ isi n’ime ya bụ Krisendọm.
16. N’ụzọ dị aṅaa ka ọtụtụ nde mmadụ siworo gbapụ site n’okpukpe ụgha?
16 Kemgbe 1919, karịsịakwa kemgbe 1922, ìgwè mmadụ na-abawanye ụba nke ndị dị umeala n’obi, ndị na-azaghachi n’ọkpụkpọ òkù ahụ, agbakụtawo Babilọn Ukwu ahụ azụ. Ná mmalite, ọtụtụ puku, e mesịa ọtụtụ narị puku, ugbu a kwa, ọtụtụ nde mmadụ, ekewapụwo onwe ha site n’okpukpe ụgha, karịsịa site na Krisendọm, ma gbaba n’ime ofufe dị ọcha. (Aịsaịa 2:2-4) Ha maara na ọ bụ nanị site n’isi otú a hapụ Babilọn Ukwu ahụ ka ha ga-enwe ike izere ịta ahụhụ ihe otiti ya nile, nke ga-ejedebe ná mbibi ya mgbe oge ruru maka ịrụzu ọrụ dị ịtụnanya nke Jehova.
17, 18. Olee ụzọ Jehova siworo ghọọ okpueze mara mma na okpu ọma nke ịma mma nye ndị ya?
17 Aịsaịa onye amụma na-akọwa ọnọdụ obi ụtọ nke ndị ahụ wereworo ọnọdụ n’akụkụ ofufe dị ọcha. Ọ na-asị: “N’ụbọchị ahụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-aghọrọ ndị ya fọdụrụ okpueze nke mara mma, na okpu ọma nke ịma mma: ọ ga-aghọkwara onye na-anọkwasị n’oche ikpe mmụọ nke ikpe, ọ ga-aghọkwara ndị na-achụghachi ndị na-ebu agha ruo ọnụ ụzọ ama ịdị ike.”—Aịsaịa 28:5, 6.
18 N’ihi iguzosi ike ha nye eziokwu ahụ, Jehova bụ okpu amara na-adịghị anwụ anwụ nye ndị so n’òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche. Nke a abụrụwo eziokwu karịsịa kemgbe 1926. N’afọ ahụ, mbipụta January 1 nke Ụlọ Nche (Bekee) mesiri ike mkpa ọ dị inye aha Jehova otuto n’isiokwu na-akpali akpali nke bụ “Ònye Ga-asọpụrụ Jehova?” Eri mgbe ahụ, ndị Kraịst e tere mmanụ ekwusawo aha ahụ n’ụwa nile otú a na-emetụbeghị na mbụ. Na 1931, ha ghọrọ ndị e ji Jehova mara n’ụzọ chiri anya karị site n’ịnara aha ahụ bụ Ndịàmà Jehova. Ọzọkwa, oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ esiwokwa na Krisendọm na ihe fọdụrụ na Babilọn Ukwu ahụ pụta. Ndị a anabatawokwa aha Chineke. Gịnị si na nke a pụta? Jehova n’onwe ya—ọ bụghị nnwere onwe mba ọ bụla nke na-adị nwa oge—aghọwo okpu ịchọ mma na okpu ọma nke ịma mma nye ihe karịrị nde mmadụ anọ ndị nọ n’ihe dị ka 212 ala na agwaetiti dị iche iche nke oké osimiri. Lee nnọọ ihe ùgwù ndị a nwere ịbụ ndị a kpọkwasịrị aha nke nanị ezi Chineke ahụ dị ndụ!—Mkpughe 7:3, 4, 9, 10; 15:4.
“Mmụọ nke Jehova Ga-enwekwa Ọnọdụ Ya n’Ahụ Ya”
19. Ònye bụ onye na-anọkwasị n’oche ikpe, oleekwa ụzọ Jehova siworo ghọọrọ ya mmụọ nke ikpe ziri ezi?
19 Nye Jisọs, bụ́ “onye na-anọkwasị n’oche ikpe,” Jehova aghọwo ‘mmụọ nke ikpe ziri ezi.’ Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, ọ jụrụ ikwe ka mmụọ na-egbu ka mmanya nke njikọ ụwa dị iche iche rikpuo ya. Taa, dị ka Eze Jehova nke nọkwasịworo n’ocheeze, o jupụtara ná mmụọ nsọ, bụ́ nke na-eduzi ya ime mkpebi ndị ezi uche dị na ha, ndị zikwara ezi. Amụma ahụ emezuwo n’ahụ Jisọs, nke bụ: “Mmụọ nke Jehova ga-enwekwa ọnọdụ ya n’ahụ ya, bụ́ mmụọ nke amamihe na nghọta, mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike, mmụọ nke ihe ọmụma na egwu Jehova.” (Aịsaịa 11:2) N’eziokwu, site n’aka Jisọs, Jehova ‘ga-eme ka ikpe ziri ezi bụrụ eriri, meekwa ka ezi omume bụrụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀.’ (Aịsaịa 28:17) Mgbe a ga-ebibi ndị iro na-aṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ ime mmụọ, a ga-eji ikpe ziri ezi mesoo aha nsọ Jehova na ịbụ ọkaaka eluigwe na ala ya.
20, 21. N’ụzọ dị aṅaa ka okwu ndị dị n’Aịsaịa 28:1-22 si emetụta gị?
20 Ya mere, lee nnọọ ihe dị ukwuu amụma nke a nke Aịsaịa isi 28 pụtara nye anyị taa! Ọ bụrụ na anyị ewezụga onwe anyị iche pụọ ná ndị Krisendọm na-aṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ ime mmụọ, ma rapagidesie ike n’ofufe dị ọcha, a ga-echebe anyị mgbe Jehova ga-eme ihe omume ya na-eju anya, rụọkwa ọrụ ya dị ịtụnanya. Lee ka anyị si na-aṅụrị ọṅụ ịmata nke a! Leekwa ka anyị si nwee obi ụtọ ịtụgharị uche na mgbe ihe ndị a mezuru, a ga-amanye onye ọ bụla ịmata na Jehova nke usuu nile nke ndị agha emewo ihe n’ihi ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi nakwa n’ihi ibuli aha nke ya onwe ya elu site n’aka Jisọs Kraịst!—Abụ Ọma 83:17, 18.
21 Ya mere, ka ezi ndị Kraịst nile nọgide n’atụghị egwu, na-adọ aka ná ntị banyere ihe omume na-eju anya nke Jehova. Ka ha nọgide na-ekwu banyere ọrụ ya dị ịtụnanya. Mgbe ha na-eme nke a, ka ha na-akpọsara mmadụ nile na olileanya anyị nke guzosiri ike bụ n’ebe Alaeze Chineke nke dị n’okpuru Eze ya nke nọkwasịworo n’ocheeze dị. Ka ịnụ ọkụ n’obi ha, mkpebi ha siri ike, na iguzosi ike n’ihe ha tụnye ụtụ n’iweta otuto ebighị ebi nye Chineke anyị onye pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova.—Abụ Ọma 146:1, 2, 10.
Ị̀ Pụrụ Icheta?
◻ N’ihi gịnị ka Krisendọm ji nọrọ n’ọnọdụ dị njọ?
◻ Gịnị ka Jehova zubere maka Jerusalem, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ ‘ihe na-eju anya’ na ‘ọrụ dị ịtụnanya’?
◻ Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova kpọsaworo n’ihe banyere Krisendọm, mmeghachi omume dị aṅaa ka ha zutewokwara?
◻ Olee ụzọ ụmụ mmadụ pụrụ isi zere ihe ga-abịakwasị Krisendọm?
[Foto dị na peeji nke 24]
Jehova ga-emeghachi ihe omume ya dị ịtụnanya, nke ugbu a bụ megide Krisendọm